'Ndị ọrụ ahụike bu coronavirus n'Enugwu ruru 70'
Gọọmentị Enugwu steeti ekwuola na ndịọrụ ahụike buterela ọrịa coronavirus n'Enugwu eruola mmadụ iri asaa.
Onye isi Kọmiti na-egbochi ọrịa coronavirus n'Enugwu bụ Emmanue Ejim kwupụtara nke a n'ụbọchị Mọnde.
Ejim gbarụrụ ihu na ndị mmadụ anaghị edobe iwu niile gọọmentị tinyere iji gbochie mfesa ọrịa a.
O kwukwara na ndị uweojii anaghị enyechara gọọmentị aka ịhụ na ndị mmadụ na-eme ihe ha kwesịrị ime.
Ejim kwuru sị: "N'ime mmadụ 276 bụ ọrịa Covid-19 n'Enugwu, ihe karịrị 70 bụ ndị ọrụ ahụike."
Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị arịọla ndị agha nke ngalaba 82 'division' ka ha nyere ha aka n'ịmanye ndị mmadụ ka ha na-edebe iwu Covid-19.