You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Gabon amachiela ndị si Yurop ịbata mba ha

    Mba Gabon emeela ihe a kpọrọ ‘mmee m megwara adịghị ese okwu’ dịka ha machiri inye ndị chọrọ isi Yurop abịa mba ha visa.

    Nke a na-abịa dịka Yurop gụnyere ha na mba ndị ha achọghị ịhụ ụkwụ ha na mpaghara ahụ.

    Alain Claude Bilie By Nzé bụ Minista na-ahụ maka mmekọrịta mba Gabon na mba ndị ọzọ zipuru ozi ịgwa ndị nnọchiteanya mba 27 ndị nọ na Yurop maka mgbanwe a.

    Mara ndị European Union kpọpụtara naanị mba 14 mba ndị ha ga-ahapụ ka ha bata n'ogbe ha.

    Mba ndị ahụ gụnyere anọ dị n'Afrịka bụ Rwanda, Moroko, Ọljiria nakwa Tunishia.

    Marakwa na ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa coronavirus na mba Gabọn bụ 5,394, ebe mmadụ 42 bụ ihe ọ tarala isi ha.

  2. Donald Trump echegharịala n'okwu iyi mkpuchi imi

    Donald Trump bụ onyeisiala mba Amerịka echegharịala na mgba ọ na-agbabu maka iyi mkpuchi imi.

    Trump na-agbabu mgba na ọ bụghị iwu iyi mkpuchi imi ma mmadụ nọrọ n'ezi, kwuru sị na 'o kwetala na ọ dị mkpa iyi mkpuchi imi'.

    N’okwu o kwuru n’abalị, ọ sị na ọ hụ onwe ya n'etiti ndị mmadụ, na ọ ga-eyi mkpuchi imi, ma kwuo na ndị mmadụ ahụla ya ebe ọ yi mkpuchi imi na mbụ.

    Trump kwubukwara na ọrịa coronavirus "ga-efu" na mba ahụ, mana a chọtara ya bụ ọrịa n'ahụ mmadụ puku iri ise na abụọ n'ime otu ụbọchị.

    Marakwa na ihe ruru mmadụ nde abụọ na puku narị asaa (2.7m) ebutela ọrịa a na mba ahụ, ebe ihe karịrị mmadụ 128,000 anwụọla.

  3. A hụla coronavirus n'ahụ mmadụ narị asaa na iri itoolu ọhụrụ na Naịjiria

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ọrịa mbute na nje bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ahụla nje coronavirus n'ahụ mmadụ dị narị asaa na iri itoolu ọhụrụ na Naịjirịa.

    Nke a wetere ọnụọgụ ndị bu ya bụ nje na Naịjirịa ruo puku iri abụọ na isii, narị anọ na iri asatọ na anọ (26,4848).

    Ndị gbakegoro na ya bụ ọrịa ugbua dịzị puku iri, otu narị na iri ise na abụọ (10,152), ebe ya bụ nje tagoro isi mmadụ narị isii na atọ (603).

    N'ime ndị ọhụrụ a, Delta steeti chịtara mmadụ otu narị na iri isii na isii (166), Enugwu iri isii na isii (66), Imo iri abụọ (20), ebe Abia ji mmadụ iri (10).

  4. Unu asaala chi e? Taa dịrị onye ọbụla mma.

  5. Sirika anwalela etu njem ụgboelu ga-adị ma ebido

    Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika na ndị ọrụ ụgbọelu emeela nnwalee etu njem ụgbọelu ga-adị ma e bido njem ụgbọelu.

    N'ozi nke Mịnịsta wepụtara ụbọchị Wenezde, oge ya na ndị ntaakụkọ gara lee ka nkwadobe siri dị, O kwuru na e tinyechala ihe ga-enye aka ka mmadụ na mmadụ ibe ya ghara imetụkọ ahụ na ngwa nnyocha ndị ọzọ.

    Ọ gara bnn'ihu kwuo na ndị na-eme nje n'ime Naijiria ga abịọ́rute awa atọ tupu oge nfepụ, .

    N'aka nke ọzọ, o kwuru na e bido, ndcdị na-eeme nje mba ofesi ga-erute awa ise tupu oge nfepụ.

    Na nkọwa ya bụ iji hụ na ha mechara nnyocha niile kwesiri tupu oge nfepụ ha eruo.

    Gọọmenti etiti kwuburu na a ga-ebido njem ụgbọelu ụlọ n'abali iri abụọ na otu ọnwa Juune, ha mechaa kwụọ na ọ gaghị enwekwa isi.

  6. Ọnụọgụgụ ndị ụbịam ga-agbali n'ihi coronavirus - Buhari

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ọchịchị ya na-agba mbọ ịhụ na ihe isi ike akarịghị akarị na Naịjirịa n'ihi ọrịa coronavirus.

    Buhari kwuru nke a n'ọgbakọ pụrụ iche nke ndị otu mbaụwa bụ United Nations nwere n'igwe onyonyo n'ụbọchị Wenezde.

    O kwuru na a na-atụ anya na ọnụọgụgụ ndị dara ụbịam ga-agbali elu ruo ugboro atọ, mana ya na ndị otu ya na-agba mbọ ịhụ na nke a emeghị.

    Dịka Buhari si kwuo n'ọgbakọ ahụ, "ụzọ kacha mfe iji mee ka ndị mmadụ si n'ụbịam pụọ bụ itinye anya n'ịkọpụta nri.

  7. Gọvanọ Fayemi agụnyerela gọvanọ ndị buterela coronavirus

  8. Na Akpọtụ Ugbu A, Ndị bu egbe kposara ọgbakọ a kpọrọ ndị ntaakụkọ n'ihi Coronavirus

    Ụmụnwoke bu egbe wakpọrọ ụlọọgwụ 'Federal Medical Centre' dị na Lokoja, Kogi steeti kpọsaa mkparịtaụka ndị ụlọọgwụ ahụ kpọrọ ndị ntaakụkọ na steeti ahụ n'ụbọchị Wednezde.

    Ndị ụlọọgwụ ahụ kpọoro ndị ntaakụkọ oku ịkọrọ ha ihe ndị ọrụ ahụike na agabiga na steeti ahụ ma tie mkpu ka e nye ha ebe nnyocha maka covid-19 mana ndị anya na-acha ọbara ọbara bu egbe wuchiri n'ụgbọala atọ gbala egbe elu chụsaa onye ọbụla.

    Ọ nụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ gwra BBC na ya bụ ihe mere n'ezie mana ndị uweojii amabeghị ndị aka ha dị na ya.bụ

  9. Ụmụakwụkwọ Legọs ga-eketa redio maka ịmụ akwụkwọ n'ụlọ

    Gọọmentị Legọs steeti ekwuola na ha ga-ekesa redio puku iri ka ụmụakwụkwọ nwee ike ịnọ n’ụlọ mụọ akwụkwọ.

    Kọmishọna agụmakwụkwọ na steeti ahụ bụ Folasade Adefisayo kwuru na ha na ndị ụlọọrụ ekwentị ga-agbakọ aka nye ụlọakwụkwọ ‘data’ n’efu maka ikuziri ụmụakwụkwọ ihe n’ịntanetị.

  10. A na-akpọ oku ka Saụt Afrịka mechikwaa obodo ọzọ

    Otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị na mba Saụt Afrịka a kpọrọ Economic Freedom Fighters party ekwuola sị ka gọọmentị weghachite mmachi obodo ha wepụrụ.

    Ha kwuru sị na naanị ụzọ e nwereike isi gbochie mfesa ọrịa a bụ ime ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ, ebe gọọmentị ga-etinyekwa mmachi ndị ọzọ ha tinyeburu.

    N'ozi ha zipuru, ha kwuru na iyi mkpuchi imi, ịnọsapụ anọsapụ nakwa ịkwọ aka oge ọbụla agaghị akwụsịlata etu ndị mmadụ si ebute ọrịa a aghara aghara nakwa etu ndị mmadụ si anwụ.

    Ha kwuru na naanị ihe ga-akwụsị etu ndị mmadụ si anwụ bụ ịnọ n'ụlọ, n'ihi na ọnọdụ ahụike mba ahụ agaghị emenwu ihe dị na ya ma ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa a ka na-arị elu.

    Mara na mmadụ 151,209 ebutela ọrịa a na mba ahụ, ebe o gburula mmadụ 2,657.

  11. Ihe karịrị mmadụ 100 ebutela ọrịa coronavirus n'agbamakwụkwọ

    Mmadụ 111 gara agbamakwụkwọ na steeti Bihar dị na mba India eburula ọrịa Covid-19 dịka NDTV si kwuo.

    Nwoke ha bịara agbamakwụkwọ ya nwụrụ ka chi ụbọchị ọ gbara akwụkwọ fochara, mana a maghị ma ọ bụ ya bụ ọrịa gburu ya n'ihi na enyochaghị ya tupu ọ nwụọ.

    Ihe karịrị mmadụ 350 bịara ya bụ agbamakwụkwọ e mere n'ụbọchị 15 nke ọnwa Juun.

    A malitela ịchọ ndị bịara agbamakwụkwọ ahụ ma na-etinyekwa ha na ndopu; dịka a na-eme nnyocha ịma ihe mere ihe karịrị mmadụ 50 (bụ iwu e tinyere n'ihi mfesa ọrịa coronavirus) ji gaa ya bụ agbamakwụkwọ.

    Ihe karịrị mmadụ 9,500 ebutela ọrịa a na steeti Bihar, ebe ọ tarala isi mmadụ 60.

  12. Gọvanọ Delta steeti ebutela coronavirus

    Ifeanyi Okowa bụ aka na-achị Delta steeti na nwunye ya eburula ọrịa coronavirus dịka o si kwuo.

    O kwuru na ha nọ na ndopu ebe ha na-anatakwa ọgwụgwọ.

    O kelekwara ndị mmadụ maka ekpere ha na-ekpe n'isi ha na nwa ya nwaanyị bukwa ya bụ ọrịa

  13. Mba Amerịka 'azụkọrọchaala' ọgwụ remdesivir e ji agwọ Covid-19

    Ọ fọrọ obere ka onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump zụkọrọchaa ọgwụ remdesivir a na-emepụta na mbaụwa.

    Ọgwụ ahụ bụ nke ụlọọrụ Gilead Sciences dị na mba Amerịka na-arụpụta, so n'ọgwụ ndị mbụ ndị ọrụ ahụike mba Amerịka binyere aka na a ga-ejinwu agwọ ọrịa Covid-19.

    Nke a na-abịa dịka a chọpụtara na ọgwụ a ejirila buso ọrịa Ebola agha, na-enyere ndị bu ọrịa a aka ịgbake ọsịsọ karịa.

    Ngalaba na-ahụ maka ahụike na mba ahụ kwuru na Trump na Gilead kwekọrịtara na ha ga-ebunye Amerịka ọgwụ puku narị ise (500,000), nke bụ ihe niile Gilead ga-arụpụta n'ọnwa Julaị, pasentị 90 nke ha ga-arụpụta n'ọnwa Ọgọst nakwa pasentị 90 nke Sepụtemba.

  14. Mba Czech Republik efeerela coronavirus aka

    Ụfọdụ ndị bi n'obodo Prague bụ isiobodo mba Czech Repọblik emeela emume iji fere ọrịa coronavirus aka.

    Nke a na-abịa n’agbanyeghi na ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) kwuru na ọrịa a alawabeghi maọlị.

    Ihe ruru mmadụ puku kwuru puku gbakọrọ n'otu ogologo tebulu n'elu akwammiri Charles dị n'obodo Prague, ebe ha ji nri ha butere mee oriri na ọṅụṅụ.

    Mara na ọrịa a ataala isi ihe ruru mmadụ narị atọ na iri ise (350) n’ime ihe na-erughi puku iri na abụọ buterela ya na mba ahụ.

    Chetakwa na mba a ji ọsịsọ tinye mmachi ngagharị oge ọrịa a malitere ifesasị, nke mere na ọrịa a enyechaghị ha oke nsogbu.

    N'izu gara aga, gọọmentị kwenyere ka ihe ruru mmadụ otu puku nwee ike ịgbakọ, ebe ihe ndị dịka ọdọ ụmụanụmanụ, ebe a na-egwu mmiri, nakwa ụlọ ndebe ihe ochie nwere ike imepe.

  15. A hụla coronavirus n'ahụ mmadụ 561 ọhụrụ ọzọ ụnyaahụ bụ Tuzde na Naịjirịa

    Ụlọọrụ na ahụ maka igbochi nje na ọrịa mbute bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ahụla nje coronavirus n'ahụ mmadụ dị narị ise, iri isii na otu (561) ọhụrụ ọzọ na Naịjrịa ụnyaahụ bụ Tuzde.

    Nke a wetere ọnụọgụgụ ndị bu ya bụ nje na Naịjirịa taa ruo puku iri abụọ na ise, narị isii, iri itoolu na anọ (25,694). N'ime ha, mmadụ puku itoolu, narị asaa, iri anọ na isii agbakeela, ebe ya bụ nje ataalarị isi mmadụ narị ise, na iri itoolu.

    N'ime ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa a ọhụrụ a, Imo steeti chitara mmadụ iri na anọ, ebe Abia nwetara asatọ.

  16. Igbo ndị ọma, unụ abọọlachi e.

    Taa ga-adịrị anyị mma.

    Iseee!

    Daalụ maka isonye anyị ma chebiri akụkọ ndị dị mkpa anyị ga-ewetara unu.

  17. Ụlọọrụ Airbus na-akwado ịchụ mmadụ 15,000 maka coronavirus

    Ụlọọrụ Airbus ekwuola na ha ga-achụ mmadụ puku iri na ise n'ọrụ maka ọrịa coronavirus.

    Ha kwuru na ọ bụ oge udu mmiri nke afọ 2021 ka ha ga-achụ ndị a.

    Dịka ọ dị ugbu a, ha na ndị otu ndị ọrụ ka na-enwe mkparita ụka.

    Airbus kwuru na ga-achụ mmadị otu puku na narị asaa na mba Briten, ma chụkwa ọtụtu mmadụ na mba Jamanị, Spen na ebe ndị ọzọ.

  18. Gee akụkọ abalị taa n'otu nkeji

  19. Nke na-eme Ugbua: Gọvanọ Ondo steeti ebutela coronavirus

    Akụkọ na-erụ anyị ndị ugbua bụ na Gọvanọ Ondo steeti bụ Rotimi Akeredolu ebutela ọrịa coronavirus.

    Akeredolu bụ onye kwupụtara nke a n'akara Facebook ya n'ehihie Tuzde kwuru na ya yaburu ịba, sị na ọ bụ otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị ibe ya tụnyere ya alo gaa mee nnyocha, n'ụfọdụ ịba na-eme ugbua bụ coronavirus.

    " Emere m nnyocha, mpụtara ya nke pụtara taa gosisi na ebu m ọrịa coronavirus."

    Ọ gara n'ihu rịọ ndị mmadụ onye nwee ọrịa yiri ịba, ya gaa leezi ọfụma mara ma ọ bụ coronavirus.

    Cheta na izu ole na ole gara aga, Akeredolu gara ọịgbakọ ndị otu pati ya

    ụfọdụ ndị Gọvanọ buterela coronavirus gunyere Nasir el Rufai nke Kaduna steeti na Seyi Makinde nke Ọyo steeti.

  20. Ije ka dị anya n'ọgụ megide coronavirus- WHO

    Otu ahụike mbaụwa bụ WHO nọrọ ụbọchị Monde ekwuola na ije ka dị anya ọgụ imeri ọrịa coronavirus n'ụwa dum.

    Okwu a na abịa dịka ndị nwụrụla n'ọrịa ọjọọ kafere ọkara nde na Mpaghara Saụt Amerịka na Nọt Amerika.

    Ndị buterela ọrịa n'ụwa niile eruola nde iri.

    Onyeisi WHO bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus sị, " Anyị niile chọrọ ka ihe a bie. Anyị niile chọrọ ka onye ọbụla bidokwa ndụ ya.

    "Mana nke bụ eziokwu bụ na ije ka dị anya. Na-agbanyeghị na ọtụtụ mba na-agbalị, ọrịa coronavirus ka na-ekesa n'ike n'ike."