Aka na-achị steeti Ebonyi bụ David Umahi esorola n'ime ndị ahụru ọrịa coronavirus n'ahụ ha.
Gọvanọ Umahi gbara ama a site na akwụkwọ mgbasaozi o binyere aka na ya n'ụbọchị Satọde.
Umahi gbaburu ama na ya na-eche nchọpụta nyocha o mere banyere ọrịa coronavirus dịka ụfọdụ ndị ya na ya na-arụ ọrụ butere ọrịa ahụ.
Ọ sị na ya nọzị ich dịka nagalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) siri kwuo.
Gọvanọ Umahi sịkwa na ya ewerela ọchịchị yanye n'aka osote ya bụ Kelechi Igwe.
O ji kwa ohere ahụ dụọ ndị steeti ya ọdụ maka ịkpachara anya dịka ọrịa covid-19 ka na-akpa ike.
Umahi sonyere gọvanọ ndị butere coronavirus kemgbe o batala Naịjirịa.