You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Naanị otu onye kwa ezinaụlọ ga na-apụta ezi na mba Madagascar

    Mba Madagascar emechiela isi obodo ha bụ Antananarivo ọzọ n’ihi mmụbanye ọrịa coronavirus n’ime ọnwa abụọ ha malitere imepe obodo.

    Naanị otu onye kwa ezinaụlọ ọbụla nwereike ịpụta ezi site n’elekere isii nke ụtụtụ ruo elekere iri na abụọ nke ehihie.

  2. Mmadụ 544 ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjiria

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na-efe efe bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na ha chọtara ọrịa coronavirus n'ahụ mmadụ narị ise na iri anọ na anọ ọhụrụ.

    N'ime mmadụ 544 ahụ, iri isii na ise (65) n'ime ha si Ebonyi steeti, ebe Abịa steeti ketara otu.

    Mana ka o sila dị, mmadụ 11,665 n'ime mmadụ 28,711 buterela ya bụ ọrịa na Naịjirịa agbakeela ma chịrị ute ọrịa ha laa.

    Ebe ọ tarala isi mmadụ 645.

  3. Ị bọọla chi?

    Bịa nọnyere anyị taa maka na anyị ga-ewetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị.

    Ụbọchị taa ga-agara gị sịrirị werere!

    Iseee!

    Nnọọ

  4. Ka chị foo nu ụmụigbo

    Ka anyị jiri ofu obi na-aga...rahụ nụ duuu.

  5. Mmadụ 212,326 butere ọrịa coronavirus n'ụwa niile n'ụbọchị Satụde - WHO

    Ngalaba ahụike mba ụwa niile bụ WHO ekwuola na mmadụ narị puku abụọ na iri na abụọ, na narị atọ iri abụọ na isii butere ọrịa coronavirus n'ụbọchị Satụde.

    Ụgbụ a, mmadụ 11,317,637 bụ ya bụ ọrịa n'ụwa niile ebe mmadụ 531,729 anwụọla n'aka ọrịa coronavirus n'ụwa niile.

  6. Gee akụkọ abalị taa n'otu nkeji

  7. Mmadụ 238 tọrọ atọ na Turkey alọghachila Naịjirịa

    Ụmụ Naịjirịa mmadụ 238 tọrọ atọ na mba Turkey n'ihi mmechi obodo maka ọrịa coronavirus, alọghachila.

    Abike Dabiri-Erewa, onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa nọ mba ofesi, depụtara nke a n'akara Twitter ya n'ehihie Sọnde.

    O kwukwara na ndị ahụ niile mechara nnyocha maka ọrịa Covid-19 mana ha ebughi nje ahụ, kama ha ga-ewepụkwa onwe ha iche ruo abalị iri na anọ dịka iwu si kwuo.

  8. Enwerike ibido mmachị ngagharị na Johannesburg ọzọ

    Ndị ọrụ gọọmentị mba Saụt Afrịka nke mpaghara Guateng na-ekwu ka gọọmentị wehachi mmachi maka coronavirus dịka ọnụ ọgụgụ ndị na-ebute ya bụ ọrịa na-ala elu.

    Ha bidoru ị ma ọkwa a dịka ọnụ ọgụgụ ndị bu ya bụ ọrịa na mpaghara ahụ agafeela puku iri ise nke na-egosi na oge na adịghị anya ọ nwereike ịgafee Western Cape ebe ya bụ ọrịa kacha njọ.

    Guateng gụnyere Johannesburg bụ ebe kacha amụtara gọomentị Saụt Afrịka ego nke bụ na emechie ya, ọ ga-emetụta akụnụba mba ahụ.

    Dịka ọ dị ugbu a, ha na-eche ka gọọmentị kwenyere n'ihe ha kwuru.

  9. Francis Tiafoe bụ ọpịa Tennis ebutela ọrịa coronavirus

    Ọpịa Tennis mba Amerịka bụ Frances Tiafoe ebutela ọrịa coronavirus.

    Frances nọ n'ọkwa 81 na mba ụwa niile kwuputara nke a dịka ọ kwụsịrị onwe ya asọmpị "All-American Team Cup" n'obodo Georgia.

    O meriri asọmpị nke ọ pịara n'ubochi ma kwupute n'ụbọchị satode na ọ ga-edopu onwe ya iche maka ọrịa a dịka usoro si kwuo.

  10. Mba Briten amalitela egwuregwu n'uju

    Mba Briten enyela ọtụtụ egwuregwụ nakwa ihe ndị na-akpa obi aṅụri ikike imalite ọzọ na mba ha.

    Egwuregwu ndị nwetara ikike a gụnyere: asọmpị bọọlụ, Formula 1, Golf nakwa snooker.

    Dịka asọmpị Premier League nakwa FA Cup malitere, ha ga na-aga ihu.

  11. Ị nụla akụkọ ndị wuru ewu n'ụtụtụ a?, Gee ya ebe n'otu nkeji

  12. Etu anụghị isi maọbụ ụtọ nwereike bụrụ ama coronavirus

  13. Ihe ụjọ ọrịa Coronavirus na-ebute

    Ndị mmadụ na soshal midia na-achị ọchị n'ihi ihe onyonyo na-efegharị gosiri ebe otu nwoke na-atụ ụjọ ịga ụlọọgwụ pụrụiche maka ọgwụgwọ coronavirus.

    N'ime ihe onyonyo ahụ, nwoke ahụ na-eti mkpu ebe ndị ọrụ ahụike abụọ na-agba mbọ ịdọpụta ya tinye ya n'ime ụgbọala ha bu bịa.

    "Hapụ m aka" "onweghi ebe m na-aga" "Mirabel ogun ga-egbu gị" bụ ihe ndị ọ na-eti mgbe e bu ya aga n'ụgbọala.

  14. Ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa Covid-19 agafeela 28,000 na Naịjirịa

    Dịka ọnụọgụgụ NCDC si kwuo ọ bụ ọnụọgụgụ ndị a buterela ọrịa Covid-19 na Naịjirịa kemgbe ọnwa Febụwarị.

    Lee mgbakọ si kwụrụ ugbua nakwa ebe kachasị nwe ndị bu ya

  15. Nnọọ nụ na peeji anyị taa

    Coronavirus ka na-akpa mkpa mkpa dị egwu, chekwaa onwe gị na ezinaụlọ gị site n'ụzọ niile gụnyere:

    -Ịkpuchi ihu

    -Ịkwọ aka

    -Ịnye ndị mmadụ efe mgbe ị nọ n'ọha.

    Soro anyị maka akụkọ ndị dị mkpa pụtara taa.

    Yagazie!

  16. Gọvanọ Okezie Ikpeazụ ebughizị ọrịa coronavirus

    Ọ bụ Kọmịshọna na-ahụ maka mghbasa ozi bụ John Okiyi Kalu depụtara nke a n’akwụkwọ ozi ọ dere n’ụbọchị Satụde.

    Ọ kọwara na ọ bụ n'ụbọchị Tụzde ka ezigara nyocha ya nke pụtara n'ụbọchị Frịde were gbaa ama na Ikpeazu ebughịzị Coronavirus.

  17. Gee akụkọ abalị taa n'otu Nkeji

  18. Ụlọoriri na ebe a na-eme isi emepeela na mba Briten taa

    Nke bụ oge mbụ n'ime ọnwa atọ ebe a na-eme isi, ụlooriri na ọṅụṅụ na ebe a na-ele ihe nkriri bekee kpọro Cinema ga-emepe na mba Briten.

    Nke a nyere ohere ka ọtụtụ ndị mmadụ pụta ma mee onwe ha obi aṅụrị.

    Dịka ewepụrụ mmachi a ka onyeisiala mba Briten bụ Boris Johnson dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha rubere atụmatụ gọọmentị wepụtara maka nchekwa coronavirus isi.

    Onye na-ahụ maka ahụ ike na Briten bụ Matt Hancock gwara ndị mmadụ na onye kpara agwa na ezighị ezi ka aga nga.

    Dịka ọ dị ugbu a, mmadụ otu narị na iri atọ na asaa ọzọ anwụọla site n'ọrịa coronavirus nke mere ka ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụla bụrụ puku iri anọ na anọ, otu narị na iri atọ na otu.

  19. Dave Umahi ebutela coronavirus

    Aka na-achị steeti Ebonyi bụ David Umahi esorola n'ime ndị ahụru ọrịa coronavirus n'ahụ ha.

    Gọvanọ Umahi gbara ama a site na akwụkwọ mgbasaozi o binyere aka na ya n'ụbọchị Satọde.

    Umahi gbaburu ama na ya na-eche nchọpụta nyocha o mere banyere ọrịa coronavirus dịka ụfọdụ ndị ya na ya na-arụ ọrụ butere ọrịa ahụ.

    Ọ sị na ya nọzị ich dịka nagalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) siri kwuo.

    Gọvanọ Umahi sịkwa na ya ewerela ọchịchị yanye n'aka osote ya bụ Kelechi Igwe.

    O ji kwa ohere ahụ dụọ ndị steeti ya ọdụ maka ịkpachara anya dịka ọrịa covid-19 ka na-akpa ike.

    Umahi sonyere gọvanọ ndị butere coronavirus kemgbe o batala Naịjirịa.

  20. Spen agbachiela Catalonia ọzọ maka mbawanye coronavirus

    Ndị na-achị mpaghara Catalonia dị na ugwu Spen a etinyela mmadụ 200,000 na mmachị ngagharị ọzọ dịka coronavirus malitere mbawanye ọzọ n'ebe ahụ.

    Ndị mmadụ agaghị enwe ohere ịbata maọbụ ịpụ Segrià - mpaghara dị n'ọdịdọa anyanwụ Bacelona - ma ya bụrụ na ha enweghị ikike.

    Obodo Lleida dị na mpaghara ahụ.

    A ga-eji ndị uweojii ga-anọchị ụzọ manye ndị mmadụ isonye n'iwu ọhụrụ a.

    Ndị mmadụ ga-enwe ohere ịgbakọ n'ime ụlọ maọbụ n'ezi ma ya bụrụ na ha akarịghị mmadụ iri.

    Catalonia so na mpaghara Spen coronavirus kpara ike karịa.