You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Coronavirus nwereike isite n'ikuku efesa - WHO

    N'ime ọnwa ole na ole gara aga ka ngalaba Ahụike mba niile bụ WHO kwuru na nje na-ebute ọrịa coronavirus anaghị esi n'ikuku efesa kama dịka ọ dị ugbu a, ha na-akọwa na ọnwerike isi n'ikuku ekesa.

    Ndị nyocha sayensi 239 si mba 39 dị iche oche kwuburu na ya bụ ọrịa nwereike i sị n'ikuku fesa ọkache ebe mechiri emechi na ebe igwe mmadụ nọ.

    Kama WHO sị na ha ka na-eme nyocha ha iji hụta maọbụ ezie.

  2. Njem ọdọụgbọelu amalitela na Naịjiria

    Taa bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa Julai ka e mepere ọdọụgbọelu ka ndị mmadụ nwee ike imalite mewe njem site na steeti fere na steeti na Naịjirịa.

    Ka ọ dị ugbua, njem amalitela site n'ọdọụgbọelu Abuja nakwa nke Legọs.

    Lee etu o si aga n'elu Facebook BBC Igbo ebe a:

  3. Mmadụ 280 ọhụrụ esila n'ute ọrịa coronavirus gbakee na Naịjiria

    Ngalaba Nigeria Centre for Disease Control (NCDC), edepụtala n'akara Twitter ha na mmadụ narị ise na atọ (503) ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa ebe iri atọ na asaa (37) n'ime ha si Enugwu steeti.

    Ọnụọgụgụ ha gosikwara na mmadụ iri na ise (15) nwụrụ n'aka ya bụ ọrịa ebe mmadụ narị abụọ na iri asatọ (280) agbakeela site na ya bụ ọrịa.

  4. Unu abọọla chi?

    Igbo na-ekwu na onye kwe Chi ya ekwe.

    Ya mere, ụbọchị taa maara gị mma, Iseee!

    Bịa nọnyere anyị taa ka ị nwee ike gụọ akụkọ dị mkpa taa.

  5. Covid-19 egbuola onyeisi ndị ọrụ Kwara steeti bụ Aminu Adisa

    Onyeisi ndị ọrụ nke Kwara steeti bụ Aminu Adisa abụrụla onye ọzọ nwụrụ site n'ọrịa coronavirus.

    Ọ nwụrụ na mgbede ụbọchị Tuzde dịka mpụtara nyocha covid-19 ya pụtara ihe.

    Tupu ọ nwụọ, ọ bụ ya na-achịkọta ndị ọrụ gọvanọ na-achị Kwara steeti bụ Abdulrahman Abdulrazaq.

  6. Lee akụkọ wuru na mgbede taa

  7. Onyeisiala Brazil bụ Jair Bolsonaro ebutela ọrịa coronavirus

    Onyeisiala mba Brazil bụ Jair Bolsonario ebutela ọrịa coronavirus.

    Bolsanario bụ onye a ma ama maka nkwenye ya na ọrịa coronavirus anaghị emesi ike mana Brazil bụ mba abụọ kachasị nwe ndị bu ọrịa n’ụwa niile.

    Nke a pụtara ihe mgbe o mere nyocha dika ọ malitere ịnwe ụfọdụ njirimara ọrịa ahụ n'ahụ ya.

    N'agbanyeghi nke a, Bolsonaro na-ekwusike ka ndị gọvanọ dị icheiche mepee obodo ha n'ihi na "mmechi obodo ka emebi ihe karịa coronavirus"

  8. Coronavirus emeela m ihe ọkụ ji nti oke eme - Onye nkuzi ụlọakwụkwọ nọrọ onwe ya

  9. Naịjiria amachiela ndị otimkpu ndị isi a hụrụ kwaba okpu iso ha abanye ọdọụgbọelu

    Dịka a na-akwado imalitekwa njem ụgbọelu ọzọ, Naịjiria amachiela ndị otimkpu na ndị enyemaka ndị isi a hụrụ kwaba okpu iso ha abata n'ime ọdọụgbọelu, ma ọ bụghị ma ha eso eme ya bụ njem.

    Hadi Sirika bụ minista na-ahụ maka njem ụgbọelu ekwuola na otu n'ime usoro ha tinyere iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus bụ ibelata mmadụ ole na-anọ n'ime ọdọụgbọelu.

    O kwuru na ọ bụ naanị ndị na-eme njem ka a ga-ahapụ ka ha bata.

    N'olu ya, ọ sị "Site ugbua gawa n'ihu, agaghị ahapụzị ka ndị na-enyere ndị isi a hụrụ kwaba okpu aka bata n'ime ọdọụgbọelu. Nke a kacha gbasa ndị gọvanọ, ndị minista, ndị omeiwu, ndị ọkaikpe nakwa ndị agha."

    Mara na a ga-amalite ime njem ụgbọelu site n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja na Legọs n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Julaị, tupu ndị ọzọ amalite mgbe e mechara.

  10. Ndị dọkịta amalitela ịgba abụbụọrụ na steeti Krọs Riva

    Ndị dọkịta na Krọs Rivas steeti amalitela abụbụọrụ n'ihi etu gọọmentị ha si eme maka ọrịa coronavirus.

    Nke a na-abịa dịka Dkt Ikpeme Ikpeme bụ onyeisi University of Calabar Teaching Hospital, kwuputara na mmadụ ise butere ọrịa Covid-19 n'ụlọogwụ ahụ.

    N'akwụkwọ ozi ndị dọkịta degaara minịstrị ahụike steeti ahụ, ha kwuru na etu e si eme gbasara ndị a na-enyo na ha bu ọrịa a na steeti ahụ na-ewute ha.

    Dkt Ikpeme kwuru na e nyochaala mmadụ ise, mana ngalaba na-ahụ maka ahụike na-akọwa na ebiputabeghi mpụtara ha.

    Iwe ndị dọkịta steeti ahụ bụ na ha na-atụ ụjọ maka ndụ ha na ihe so coronavirus, dịka ha ka na-arụ ọrụ etu ha si arụbu.

    Dkt Agam Ayuk bụ onyeisioche otu ndị dọkịta na steeti ahụ, kwuru sị na ndị otu ya agaghị arụzị ọrụ ruo mgbe gọọmentị steeti ahụ ga-etinye anya n'ihe gbasara mfesa ọrịa a na steeti ahụ.

    N'itinye ọnụ n'ihe gbasara abụbụọrụ a, Dkt Betta Edu bụ kọmishọna ahụike na steeti ahụ kwuru na omume ndị dọkịta a ga-etinye ndụ nde kwuru nde na steeti ahụ n'ọnọdụ ize ndụ.

    Mara na mgbe ndị ụlọọgwụ a tiri mkpu n'izu abụọ gara aga gbasara onye ha sị butere ọrịa coronavirus a, gọọmentị steeti ahụ katọrọ ya.

  11. Mmadụ 575 ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjirịa

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC), sị na ha chọpụtara mmadụ narị ise, iri asaa na ise (575) ọhụrụ bu coronavirus.

    Legọs na Abuja kacha nweta ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa a ọhụrụ dịka ha nwetara 123 na 100.

    Ebe Delta steeti so ha n'azụ nwetara 58.

    Na steeti ndị si mpaghara ọwụwa-anyanwụ, Enugwu ketara itoolu ebe Abia ketara isii.

    Ka ọ dị ugbua, mmadụ karịrị puku iri na otu agbakeela ebe mmadụ narị isii, iri ise na anọ anwụọla site n’ọrịa a.

  12. Ị bọọla chi?

    Ị ga-amụke ka anyanwụ ụtụtụ taa.

    Bịa nọnyere anyị ka anyị wetara gị akụkọ dị mkpa maka ọrịa coronavirus.

    Ndeewo!

  13. NCDC ebipụtala usoro a ga-eji mee ntuliaka n'oge covid-19

    Ngalaba na-ahụ maka ọrịa na-efe efe ebiputala usoro ndị dị icheiche ga-eso n'ime ntụliaka nke ga-ahụ na ọrịa covid-19 efesaghi.

    Ndị ebipụtaara usoro a gụnyere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ga-atụnye vootu, ndị na-ele ma na-edekọ etu o si aga, ndị ụlọọrụ ntuliaka bụ Inec.

    Ha kewara usoro a n'ụzọ atọ kpuchiri etu a ga-esi mee:

    - Tupu amalite njem ịchụnta vootu

    - Mgbe a na-achụ nta vootu

    - Mgbe a ga-atụ vootu.

    NCDC kwuru na "naanị ụzọ a ga-esi mee ntuliaka n'emeghi ka ọrịa a fesaa bụ site n'idebe iwu niile kpuchiri ọrịa coronavirus mgbe ọbụla.

    Iwu ndị a gụnyere:

    • Ịbelata ọgbakọ ndị mmadụ
    • Ịnye ndị mmadụ efe ruru 2 mita mgbe ị nọ n'ọha
    • Ịdebe aka gị ọcha mgbe niile site n'ịkwọ aka.
    • Ịkpuchi ihu gị (ọfụma etu ndị ọkachamara si kwuo) mgbe niile.

    Chọta akwụkwọ ozi bu usoro ahụ n'uju dị ebe a.

  14. Etu Coronavirus si kwụrụ n'Afrịka

    Lee ihe mba dị icheiche n'Afrịka na-eme maka ọrịa coronavirus.

    • Naanị mmadụ otu narị sonyere n'idu iyi ọrụ nke onyeisiala ọhụrụ mba Malawi bụ Lazarus Chakwera n'ihi ụjọ mfesa ọrịa coronavirus
    • Na mba Saụt Afrịka, gọọmentị jisike agbape ụlọakwụkwọ dị icheiche n'agbanyeghị na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa shụ na-arị elu dị egwu. Ụmụaka nọ n'afọ ikpeazụ n'ụlọakwụkwọ pramarị nakwa sekọndịrị bụ ndị na-alaghachi akwụkwọ.
    • Agbachiela ụlọọgwụ pụrụiche na-agwọ coronavirus ruru 74 na mba Tanzania. Amabeghi ezi ọnụgụgụ ndị bu ọrịa ahụ, ndị o gburu nakwa ndị gbakere n'ihi na o teela aka gọọmentị kwụsịrị ịwepụta ozi gbasara ya
    • Ebe mba Kenya wepuru iwu machiri njem steeti gaa steeti ọzọ, njem ụgbọelụ ime obodo ma na-akwado ibido njem ụgbọelụ ofesi n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọgọst. Onyeisiala Uhuru Kenyatta kwukwara na "a ga-amachi obodo ma ndị bu ọrịa ahụ karịa ọzọ"
  15. Ule Waec ga-amalite n'ọnwa Ọgọst

    Ule Waec nke afọ 2020 ga-amalite n'ụbọchị anọ nke ọnwa Ọgọst ruo ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Sepụtemba.

    Mịnịsta nta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Chukwuemeka Nwajiuba kwupụtara nke a ụbọchị Mọnde n'ọgbakọ ndị ntaakụkọ e nwere n'Abuja.

    Nwajiuba gwara ndị nne na nna ka ha malite n'oge kwadowe ụmụ ha maka ya bụ ule.

    O kwukwara na ngwa ngwa ule Waec gwụrụ, ule 'National Exacmination Council' (NECO) nakwa nke 'National Business Technical and Examination Board' (NABTEB) ga-amalite.

  16. Akeredolu agbakeela n'ọrịa Coronavirus

    Gọvanọ Ondo steeti bụ Rotimi Akeredolu agbakeela n'ọrịa coronavirus.

    O depụtara nke a n'akara Twitter ya ma kelee ndị niile tinyere ya n'ekpere oge ọ nọ n'ọrịa.

    Cheta na ọ bụ n'ụbọchị 30 nke ọnwa June ka Akeredolu kwupụtara na ya ebutela nje Covid-19.

  17. Mba Izrel emechiela obodo ọzọ dịka ọnụọgụgụ coronavirus na-arị elu ọzọ

    Onyeisiala mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu enyela iwu ka emechie obodo ọzọ dịka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a malitere ịgbali ọzọ.

    Ebe dị ịcheiche gụnyere ụlọ oriri. ụlọ mmegharị ahụ nakwa ụlọ mgbakọọha ga-emechi n'iwu ọhụrụ a.

    Ọzọ bụkwa na a ga-ebelata mmadụ ole ga-aga n'ụlọ oriri nakwa ụlọ ekpere ka ọ dị ala na mba ahụ.

    Ọnụọgụgụ ahụ si na ole na ole ruo puku kwuru puku kwa ụbọchị nke mere eji tinye iwu ngwa ngwa a.

  18. Osote onyeisiala Malawi na nwunye ya ebutela ọrịa covid-19

    Saulos Chilima na nwunye ya Mary butere ọrịa ahụ dịka onye odeeakwụkwọ ya nwụchara site n'ọrịa ahụ kwa.

    O kwuputara nke a dịka a na-edu onyeisiala Lazarus Chjakwera batara ọhụrụ n'iyi ọrụ n'isiobodo Lilongwe.

    Ọ dụrụ ndị mmadụ ndụmọdụ ha mee nyocha ma na-ekwu na ya na nwunye ya ga-enyocha onwe ha ọzọ n'izuụka abụọ.

  19. Coronavirus: Mba Kenya akụwụsịla mmachi njem

    Mba Kenya akwụsịla mmachị njem site steeti rue steeti nke ha tinyeburu iji gbochi mfesa ọrịa coronavirus.

    Onyeisiala mba ha bụ Uhuru Kenyatta kwuru nke a na mgbasaozi o nyere maka mmepe obodo nwayọ nwayọ.

    Nairobi, Mombasa nakwa Mandera so na obodo ndị nwere ọnụọgụgụ kachasị n'ọrịa ahụ sokwa na ndị ga-emepe dịka e si kwuo.

    Kenyatta kwukwara na a ga-amachikwa obodo maọbụrụ na ọnụọgụgụ ọrịa ahụ jisike na-arị elu.

  20. Coronavirus egbuola ọkammụta Godwin Achinge

    Coronavirus ataala isi onye a ma ama ọzọ dịka o gburu osote onyeisi Mahadum Benue Steeti bụ Godwin Achinge.

    Tupu ọ nwụọ, Achinge bụkwa osote onyeisioche otu e hiwere maka ibu agha megide coronavirus na steetị ahụ.

    Dịka ọ dị ugbua ọtụtụ mmadụ apụtala ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ na soshal midia.