Ndị dọkịta na Krọs Rivas steeti amalitela abụbụọrụ n'ihi etu gọọmentị ha si eme maka ọrịa coronavirus.
Nke a na-abịa dịka Dkt Ikpeme Ikpeme bụ onyeisi University of Calabar Teaching Hospital, kwuputara na mmadụ ise butere ọrịa Covid-19 n'ụlọogwụ ahụ.
N'akwụkwọ ozi ndị dọkịta degaara minịstrị ahụike steeti ahụ, ha kwuru na etu e si eme gbasara ndị a na-enyo na ha bu ọrịa a na steeti ahụ na-ewute ha.
Dkt Ikpeme kwuru na e nyochaala mmadụ ise, mana ngalaba na-ahụ maka ahụike na-akọwa na ebiputabeghi mpụtara ha.
Iwe ndị dọkịta steeti ahụ bụ na ha na-atụ ụjọ maka ndụ ha na ihe so coronavirus, dịka ha ka na-arụ ọrụ etu ha si arụbu.
Dkt Agam Ayuk bụ onyeisioche otu ndị dọkịta na steeti ahụ, kwuru sị na ndị otu ya agaghị arụzị ọrụ ruo mgbe gọọmentị steeti ahụ ga-etinye anya n'ihe gbasara mfesa ọrịa a na steeti ahụ.
N'itinye ọnụ n'ihe gbasara abụbụọrụ a, Dkt Betta Edu bụ kọmishọna ahụike na steeti ahụ kwuru na omume ndị dọkịta a ga-etinye ndụ nde kwuru nde na steeti ahụ n'ọnọdụ ize ndụ.
Mara na mgbe ndị ụlọọgwụ a tiri mkpu n'izu abụọ gara aga gbasara onye ha sị butere ọrịa coronavirus a, gọọmentị steeti ahụ katọrọ ya.