Gịnị mere eji kwụsị dọkịta 58 ime njem mba Briten?
Ngalaba na-elekọta njem na Naịjirịa bụ Nigeria Immigration Service (NIS) na Bekee akwụsịla njem dọkịta ruru 58 kwesiri ime gaa mba Briten.
Ndị dọkịta a kwadoro ịme njem a site na ụgbọelu pụrụịche nke ha haziri n'ọdọụgbọelu Murtala Mohammed dị na Legọs.
Ọnụ na-ekwuchitere NIS bụ Sunday James kwuru na mmadụ iri ise na isii n'ime ndị ahụ na-akwado njem enweghi akwụkwọ ikike nke Bekee kpọrọ 'Visa'.
James kọwara na "ndị a mee njem a n'ejighi visa, a ga-achụghachi ha nke mere na ha ga-alachachite Naịjirịa"
BBC kpọtụrụ onyeisi otu NMA bụ nke na-achịkọta ndị dọkịta niile na Naijirịa ka ha tinye ọnụ n'okwu a.
Onyeisi ha bụ Innocent Ujah kwuru na o nweghi ihe ọ ma maka njem a ma kwukwa na ọ bụghị otu ha ka ọ dịrị ịnye ndị dọkịta ikike ịme njem.
O kwukwara na ọ dị mkpa ka mmadụ niile kpachara anya ịme njem ọkachasị ugbua ọrịa covid-19 na-akpa mkpa mkpa.