You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Onye nọ dịka onyeisiala mba Bolivia ebutela ọrịa coronavirus

    Onye nọ dịka onyeisiala mba Bolivia bụ Jeanine Anez ebutela ọrịa coronavirus.

    Anez kwuru na ahụ siri ya ike ma na edopụla onwe ya iche ebe ọ ga-anọ izuụka abụọ.

    Gọọmentị Bolivia ekwuola na ihe ruru ndị minista asaa bu ya bụ ọrịa na mba ha.

    dịka ọ dị ugbu a, mmadụ puku iri anọ na abụọ bu coronavirus na mba ahụ ebe mmadụ otu buku na narị ise anwụọla na ya.

  2. Ị bọọla chi?

    Ụbọchị taa ga-efotere gị naanị ihe ọma na ọṅụ.

    Iseee!

    Nọnyere anyị taa ka anyị wetara gị akụkọ ndị dị mkpa gbasara mkpamkpa coronavirus.

  3. WHO chọrọ ka Afrịka tinye uchu na nnwale ọgwụ mgbochi Covid-19

    WHO akpọọla oku ka Afrịka sonye na nnwale(clinical trials) ọgwụ mgbochi Covid-19 dịka ndị ọkachamara na mba dị iche iche na-agba mbọ inweta ọgwụ mgbochi.

    N'ozi otu ahụike mba ụwa wepụtara ụbọchị Tọzde, otu ahụ ike ahụ nke mpaghara Afrịka na-ekwu na ọdị mkpa ịgba mbọ hụ na onye ọ bụla nwetara ọgwụ mgbochi zuru ya iji gbochie nje ahụ.

    Ha rụtụrụ aka mkpa ọ dị ịnwale ọgwụ mgbochi ọrịa coronavirus, iji mata ka o si arụ ọrụ.

    Dịka ụlọ mmụta " African Academy of Sciences" si kwuo, naanị pasent abụọ nnwale ọgwụ mgbochi coronavirus ihe e merela n'Afrịka.

    N'ụwa niile, e nwere ọgwụ 150 a na-atụle maka mgbochi ọrịa coronavirus, ma nwekwa nnwale dị iri na itoolu.

    Mba Saut Afrika bụ mba nwere pasent 43ndị buterela ọrịa coronavirus( ndị Saụt Afrịka dị 215,000 butere ọrịa ahụ) n'Afrịka bụ mba mbụ na-eme nnwale ọgwụ mgbochi na mpaghara Afrịka.

  4. Agụ ga-aghụ ndị mmadụ anya na ngwụcha afọ - Oxfam

    Ụlọorụ enyemaka bụ Oxfam Charity etiela mkpu sị na agụụ ọrịa coronavirus butere nwere ike igbu ndị mmadụ karịa ọrịa a n’onwe ya.

    Ha kwuru na tupu afọ a agwụ, mmadụ ruru puku iri na abụọ(12,000) nwereike ịnwụ kwa ụbọchị n’agụụ nke karịrị mmadụ puku iri na-anwụ ugbua kwa ụbọchị n'ihi ọrịa coronavirus.

    Oxfam si na coronavirus kposara oọrụ ubi, ibuga nri na-ebe di icheiche,nakwa ego si mba ndị ọzọ abata mba ndị dara ogbenye ọkachasị n'Afrịka.

  5. Ndị ọkaiwu Naịjirịa ji ebubo aghụghọ chọrọ ịnata ego - Chaịna

    Mba Chaịna akụchapụla ebubo 'aghụghọ' ndị ọkaiwu Naịjirịa mmadụ iri na otu boro ha na aka ha dị mfesasịọrịa coronavirus n’ụwa niile.

    Ndị ọkaiwu a sị na Chaịna emeghi ka ụlọahụike mbaụwa bụ WHO n'ịchafụ mata maka ọrịa a ọsịsọ.

    Ya mere ka Chaịna kwụọ ụmụafọ Naịjirịa ego dị ijeri narị dọla abụọ ($200bn) maka ịla azụmaahịa, akụnaụba nakwa ndụ ha n'iyi.

    Mana ụlọọrụ mba Chaịna dị n’Abuja sị na ebubo a achịtaghị aja n’ihu iwu na-achịkwa mbaụwa bụ 'international law'.

    Mba Chaịna sị na ọrịa coronavirus dakwasịrị ụwa niile na mberede. Na o metụtara mba ha dịka o si metụta ndị ọzọ.

    Na ha mekwara ihe ha kwesịrị ime site n'ịbụ ndị mbụ mere ka WHO mata maka ọrịa a ma depụta ihe gbasara ya nke ha mekwara ka ụwa niile mara.

  6. Ụmụ Naịjirịa 15 tọrọ na Yurope nọ n'ụzọ nlọta ugbua

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi n’ofesi sị na ụmụafọ Naịjirịa dị iri na ise tọrọ na Fransị, Jamini na Nedaland n’ihi coronavirus alọtawala Naịjirịa.

    Ndị a hapụrụ ọdọụgbọelu Fransị n’elekere iri na otu nke ụtụtụ Tọzde ebe ha ga-awuchi n’ọdọụgbọelu nke Legọs.

    Nke a dị ozi si n'akara twitter ha wepụtara n'ụbọchị Tọzde.

  7. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji, Akụkọ ndị ga-amasị gị ige, kọọ ma kesaa

  8. Gọomentị Imo steeti ekwuputela atụmatụ ha tupu ha emepee ụlọakwụkwọ

    Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma, ekwuola sị na ha amalitela itinye otu ihe maọbụ abụọ ga-ewere ọnọdụ tupu ụlọakwụkwọ emepee na steeti ahụ.

    Uzodimma kwuru na ha na ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara agụmakwụkwọ, gụnyere ndị nne na nna nakwa ndị isi ụlọakwụkwọ, ga-etikọ isi onụ iji mara usoro ga-adị mma maka mmepe ụlọakwụkwọ.

  9. Chaịna akụpụla akwụkwọ Naịjirịa gbara ha n'ụlọikpe

    Chaịna akụpụla akwụkwọ ụfọdụ ndị ọkaiwu Naịjirịa gbara ha dịka ha kwuru na ha kwesịrị ịza ajụjụ maka etu ha si mee ka ọrịa Covid-19 kpaa mkpamkpa.

    Ụlọnnọchiteanya ndị Chaịna dị n'Abuja kwuru sị na akwụkwọ a agbara ha enweghi isi ma a bịa n'ihe gbasara iwu mba ofesi.

    N'ozi ha tinyere na Twitter ha, Chaịna kwuru na ọrịa a nyụkwara ha anya, ma kwuo na ha sitere na mbido na-eme ihe ha kwesịrị ime iji chekwa ahụike ndị mmadụ.

    Mara na ndị ọkaiwu 11 gbara Chaịna akwụkwọ n'ụlọikpe ebe ha kwuru na ha agwaghị ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) ọsịsọ maka ihe ma gbasara ọrịa Covid-19.

  10. Agụụ nwereike igbu ndị mmadụ karịa ọrịa Covid-19 - Oxfam

    Otu na-alụ ọgụ megide ụbịam bụ Oxfam ekwuola na agụrụ nwereike igbu ndị mmadụ karịa ọrịa coronavirus dịka ya bụ ọrịa wakporo ọrụ ugbo na nkesa ego na mba ndị na enweghị etu ọha ha.

    Otu a kwukwara na mba dịka Saụt Afrịka, Ịndịa na Brazil ka nsogbu a kacha metụta.

    Ọnụ ọgụgụ na-egosi na mmadụ 500,000 anwụọla n'aka ọrịa coronavirus ebe mmadụ nde iri na abụọ ebutela ya bụ ọrịa.

  11. Gere akụkọ ga-amasị gị n'otu nkeji

  12. Ọkaikpe kachasị nke mba Ghana abanyela na ndopu

    Kwasi Anin Yeboah bụ ọkaikpe kachasị nke mba Ghana abanyela na ndopu dịka akụkọ pụtachara na ụfọdụ ndị ọkaikpe butere coronavirus na mba ahụ.

    Ọkaikpe Yeboah malitere nnọsapụ a ọ ga-anọ ruo izu abụọ, dika odeakwụkwọ ya si kwuo.

    Ozi ahụ kwuru na Yeboah ga-esi n'ụlọ ya na-arụ ọrụ.

    Marakwa na Nana Akufo-Addo bụ onyeisiala mba ahụ si n'ụlọ arụ ọrụ kemgbe ya na onye a chọtara ọrịa n'ahụ ya nwere mmekọ.

    Ka ọ dị ugbua, mmadụ 21,968 ebutela ọrịa coronavirus na mba ahụ, ebe mmadụ 129 nwụrụla.

  13. Ndị chọrọ isi Naịjirịa gaa Dubai ga-enwerịrị asambodo gosiri na ha ebughi coronavirus

    Ụlọọrụ ụgbọelu akpọrọ Emirates ekwuola na ndị mmadụ si mba 11 na ụfọdụ mpaghara mba Amerịka ga-enweriri asambodo ga-egosi na ha ebughi coronavirus tupu ha eburu ha.

    Ha sị na ndị a ga-anata asambodo ahụ n'aka ụlọọrụ nnyocha ahụike na mba ha si amalite njem.

    Ha sịkwa na ndị a ga-anata asambodo a abalị anọ tupu ha amalite njem.

    Mba ndị a bụ:

    • Afghanistan
    • Bangladesh
    • Egypt
    • India
    • Iran
    • Nigeria
    • Pakistan
    • Philippines
    • Russian Federation
    • Sudan
    • Tanzania
    • Nke ga-emetụta USA bu ndị si Dallas Fort Worth (DFW), Houston (IAH), Los Angeles (LAX), San Francisco (SFO), Fort Lauderdale (FLL) na Orlando (MCO), nke gunyere ndị si California, Florida na Texas malite njem.
  14. Mmadụ 460 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus ebe iri abụọ n'ime ha si Anambra steeti.

    Mmadụ narị anọ na iri isii ọzo ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.

    Ọ bụ ngalaba NCDC depụtara nke a n'akara Twitter ha.

    Ọnụ ọgụgụ ha gosiri na mmadụ iri ato na asatọ si Delta, iri abụọ si Anambra steeti ebe iri na atọ si Enugwu.

    Dịka ọ dị ugbu a, mmadụ iri na ise ọzọ anụọla site na ya bụ ọrịa ebe mmadụ narị abụọ na iri isii na ise esila na ya bụ ọrịa gbakee.

  15. Unu abọọla chi?

    Ị rahụkwara ọfụma?

    Ka chi taa fotere gị naanị ihe ọma.

    Iseee!

  16. Ka ọ dịnụ echi

    N'ebe a ka anyị ga-eweta mgbasaozi nke taa n'isi njdedbe.

    Onye a hụrụ taa, sị hụkwa ya echi.

    Ka ọ dị nụ.

  17. Ụlọakwụkwọ gọọmentị agaghị eso lee ule Waec afọ a

    Mmepe akwụkwọ maka ndị na-akwado ule Waec nke ukwu na nke nta na Naịjirịa agaghị enwezi isi.

    Nke a bụ makana Mịnịsta agụmakwụkwọ bụ Adamu Adamu ekwuola na ụlọakwụkwọ gọọmentị nke a kpọrọ 'Unity Schools' na Bekee agaghị emepe ruo mgbe o doro anya na ọnọdụ adịla mma imepe.

    Cheta na Mịnịsta nta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Chukwuemeka Nwajiuba kwuburu na ụmụakwụkwọ nọ na elementịrị nke isii, sekọndịrị nke atọ nakwa sekọndịrị nke isii ga-amalite akwụkwọ ma ọnwa Ọgọst afọ 2020 gaa abalị anọ.

    O kwuru na nke a bụ iji nye ha ohere ka ha malite nkwado maka ule ha ga-eji agafe n'ogo nke ọzọ.

    Mana Adamu Adamu kwuru na mgbede Wenezde, na atụmatụ ahụ agaghị enwezi isi maka na ọrịa Coronavirus ka na-agbali elu na Naịjirịa.

    Adamu kwuru nke a oge e mechara ọgbakọ 'Federal Executive Council' bụ nke e mere n'igwe onyoonyoo n'Abụja.

    Ọ gwakwara steeti dị iche iche bụ ndị na-ekwu na ha ga-amalite agụmakwụkwọ ka ha chegharịa ya bụ echiche ka ha ghara itinye ndụ ụmụakwụkwọ ha n'iri mperi.

    Na nkọwa ya, Adamu kwuru na ọ ga-akara ya mma ma ụmụakwụkwọ tufuo otu afọ n'agụmakwụkwọ ha karịa na ha tufuru ndụ ha n'ihi ọrịa coronavirus.

    Mana ọ rịọrọ ndị nchịkọta ule Waec ka ha yigharịa ule nke afọ n'ihi ọnọdụ coronavirus tinyere mba dị iche iche.

  18. Ụlọakwụkwọ ndị mba Kenya ga-akwụghachị ụgwọ akwụkwọ a kwụrụ ha

    Mịnịstri agụmaakwụkwọ nke mba Kenya agwala ụlọakwụkwọ ka ha kwụ ghachị ndị nne na nna ụgwọ akwụkwọ ha kwụrụ n’afọ a maọbụ bufee ya afọ ọzọ.

    Nke a na-abịa dịka mịnịsta George Magoha kagbuchara mmepe ụlọakwụkwọ parịmarị na sekọndịrị na mba ahụ ruo afọ 2021 n'ihi coronavirus.

    O kwuru nke a na nzaaghachị mkpesa ndị nne na nna nyere mgba o kwupụtachara maka nkagbu agụmaakwụkwọ nke afọ a.

    Mịnịstrị a sị na ụmụakwụkwọ niile ga-agụgharị klaasị ha n'afọ ọzọ dịka ụlọakwụkwọ mechiri n'ime ọnwa atọ o mepere.

    A kagbukwara ule ndị nke nọ na klassị mpụtan'otu aka ahụ.

  19. Gere akụkọ ga-amasị gị ịkọ n'otu nkeji

  20. Coronavirus nwerike ibutere ndị Afrịka nde 49 ụbịam

    Ụlọakụ African Development Bank bụ AfDB n'ịchafụ ekwuola na mmadụ nde iri anọ na itoolu (49m) n'Afrịka ga-abanye n'ụbịam maka mkpamkpa ọrịa coronavirus.

    AfDB kwuru nke a n'ụbọchị Tuzde bụ ụbọchị asaa n'ọnwa Julaị, ma sịkwa na ọ bụ mpaghara ọdịda anyanwụ na etiti Afrịka ka ụbịam a ga-akacha emetụta.

    Ha kọwara na Naijirịa, Saụt Afrịka, Angola na Ọlgerịa bụ ndị na-amịpụta mmanụ agbidi, ka nke a ga-akacha metụta.

    Ọ bụ mmachi ngagharị bụ ihe mere ka akụnụba ọtụtụ mba n'ụwa kụọ afọ n'ala.

    Mara na mgbe BBC Igbo na Ngozi Okonjo-Iweala bụ ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba nwere mkparịtaụka, ọ kọwara ihe Naịjirịa nwereike ime iji kwalite akụnaụba ha.

    Gere ya n'uju ebe a: