Akụkọ na-ewu ugbua bụ na mba Rọshịa sị na anwelechala ọgwụ
coronavirus n'ahụ mmadụ ma chọpụta na ọ na-eme ọfụma.
Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Forbes si depụta na websaịt ha na Rọshịa
abụrụla ndị mbụ nwalechara ọgwụ coronavirus n'ahụ mmadụ.
Elena Smolyarchuk, bụ onyeisi nyocha n'ụlọọgwụ nyocha dị na
mahadum Sechenov dị na Rọshịa gwara ndị ntaakụkọ TSS newswire nke a n'ụbọchị
Sọnde.
Smolyarchuk sị na ha anwalechaala ọgwụ a n'ahụ mmadụ na ndị ahụ
e nyere ya agbakeela na ha ga-ahapụ ụlọọgwụ n'oge na-adịghị anya.
"A nwalechala ọgwụ a ma gosi na ọ dị
mma mmadụ ịṅụ. Ndị wepụtara onwe ha ga-ahapụ ụlọọgwụ n'ụbọchị iri na isee na
iri abụọ ọnwa Julaị," a sị na Smolyarchuks kwuru.
Mana o nweghi ozi ọbụla o nyere banyere
mgbe a ga-ewepụta ọgwụ a n'ahịa.
Rọshịa malitere ime nyocha ọgwụ abụọ, otu
bụ n'ụlọọgwụ ndịagha ọzọ a bụrụ na mahadum Sechenov.
Mmadụ iri abụọ wepụtara onwe ha ka e were
ha mee nyocha ọgwụ a.
Mgbe e nyechara ha ọgwụ a, e dopuru ha iche
ruo ụbọchị iri abụọ na asatọ.
Mpụtara gosiri na ọtụtụ n'ime ndị e nyere
ọgwụ a na-egosi mgbochi nye ọrịa coronavirus.
Mana amabeghi ihe ọgwụ a bụ maọbụ ihe ndị
dị n'ime ya.