You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Tata ka e niela Zindi, nwa Nelson Mandela

    Taa ka e mere akwamozu Zindi Mandela,nwa Nelson Mandela onye nwụrụ ụbọchị Monde ka ọ gbachara afọ 59.

    Ndị enyi na ndị ezinaụlọ ya gbakọrọ n'akwamozu nke e mere na Johannesburg.

    Ndị ezinaụlọ ya nwa Winnie ahụ e liri n'akụkụ ili nne ya kwuru na ọ bụ coronavirus gburu nne ha.

    Cyril Ramaphosa, onyeisiala mba Saụt-Afrika toro ezinaụlọ ahụ maka ịgba ama ihe gburu nwa ha si na ' nje a na-emetụta onye ọbụla, e kwesịghị ị na-akpasa onye bu ya oke".

  2. Coronavirus ataala isi ụkọchukwu Katọlik n'Enugwu Diayọsis

    Coronavirus atụọla ka egbe buru ụkọchukwu mbụ ya n'Enugwu steeti.

    Otu ụkọchukwu Katọlik n'Enugwu Diayọsis bụ Fada Joachim Cabanyes nwụrụ n’aka ọrịa coronavirus n’Enugwun’ogige nnopu coronavirus dị na UNTH Enugwu n’ụtụtụ taa bụ Fraide.

    Odeakwụkwọ Bishop Enugwu bụ Fada Nkemjika Igweshi si kwuo n'ozi o wepụtara, e liela Cabanyes dịka ntuziaka NCDC si kwuo .

    Ọ kọwara Fada Cabanyes dịka "onye naghị achọ nsogbu, onye ekpere nakwa ụkọchukwu na-etinye uchu n'ọrụ."

    Igweshi, onye gbara ama na e liela Cabanyes dịka ntuziaka NCDC si kwuo, rịọrọ ụmụ Naijiria ka were ihe ndị ịdọaka na ntị maka ahụike si n'aka NCDC kpọrọ ihe n'ihi Coronavirus dị n'ezie.

    Fada Cabanyes, onye mba Spen anọọla na Naijiria ọtụtụ afọ dịka rụrụ ọrụ dịka fada ndị 'Opus Dei' afọ iri abụọ na asatọ (28 ) tupu ọ laa mụọ.

  3. Anyị na WAEC enweela nkwekọrịta ihighari ule- Minista Agumakwụkwọ

    Gọọmenti etiti na ụlọọrụ na-ahazi ule Waec bụ West African Examination Council ekwekọrịtala higharị ule ahụ site n'abali ọnwa Ọgọstụ ga Septemba abali, 2020.

    Minista nke nta na na-ahụ maka agụmakwụkwo bụ Emeka Nwajiuba bụ onye gbara ama ụbọchị Fraide n'Abuja.

    O gara n'ihu kwụọ na Naijiria na Waec na mba anọ ndị ọzọ o metụtara akpa maka ya .

    Nwajiuba kwuru na gọọmenti enyeela ndị nwe ụlọakwụkwọ ntuziaka tutu rue Julai 29, ihazi ihe ndị ha kwesiri iji gbochie nkesa ọrịa coronavirus tupu ụlọakwụkwọ emepee.

  4. Ụmụaka dị nde iri na ise ga-arịa ọrịa erighị ezigbo nri

    Otu Unicef ekwuola na a ga-enwe nsogbu ụmụaka ịrịa ọrịa erighi ezigbo nri nke Bekeee kpọrọ 'acute malnutrition' ga-emetuta ụmụaka akarịbeghị afọ ise n Odida-Anyanwụ na Etiti Afrịka n'afọ 2020.

    N'akwụkwọ mgbasaozi nke Unicef na World Food Programme(WFP) wepụtara ụbọchị Fraide, ha kwuru na nke a bụ n'ihi ụkọ nri nakwa nsogbu coronavirus.

    Ha kwuru na ogbaghara na oke ogbugbu mmadu achụọla ọtụtụ mmadụ na be ha nke butere nsogbu inweta ihe e ji enyere ndu aka.

  5. Rọshịa na-achọ izu mpụta ọgwụ mgbochi coronavirus - Briten

    Ndị ụlọ ọrụ nchekwa dị iche iche ekwuola na ndị nchekwa nzuzo mba Rọshịa na-achọ izụ mpụta nyocha ụlọọrụ ndị nọ na mba Briten, Amerịka na Kanada bụ ndị na-agba mbọ ịchọpụta ọgwụ mgbochi maka ọrịa coronavirus.

    Ndị ngalaba na-ahụ maka igbochi mwakpo na Intanetị nke mba Briten bụ National Cyber Secirity Centre kwuru na ndị a ji ịntanetị ezu ọhị ga-abụrịrị ndị otu uweojii nzuzo ndị mba Rọshịa.

    Mba Rọshịa ekwuola na aka ha na ụkwụ ha adịghị n’ebubo a a na-ebo ha.

  6. Mba Amerịka achopụtala mmadụ 74,500 ọhụrụ bu coronavirus n'otu ụbọchị

    Mba Amerịka ekwuola na ha nwetere mmadụ 74,500 ọhụrụ bu ọrịa coronavirus.

    Ha kwuru nke a n'ụbọchị Thursday ma kwuo na ọ bụ ọnụ ọgụgụ kachasị ha nwetere kemgbe ọrịa malitere ịkpa ike.

    Ihe butere ọnụ ọgụgụ ndị ọrịa fesarala na mba ahụ 3,570,000, dịka mahadum Johns Hopkins jiri kwuo.

    Ọrịa na-abawanye na steeti 30 n'Amerịka.

    N'ime chi jiri bọọ, ọrịa egbuola mmadụ 1,000, nke butere ndị o gburu na mba ahụ ịgafee 138,000.

  7. Coronavirus egbuola mmadụ itoolu ọzọ na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ nke Bekee kpọrọ Nigeria Cnetre for Disease Control (NCDC) ekwuola na mmadụ 595 ọhụrụ ebutela coronavirus na mba ahụ.

    Ọnụ ọgụgụ butere ndị gọọmentị Naịjirịa sị na ahụrụ ọrịa a n'ahụ 34854.

    N'ime ndị mmadụ 769 anwụọla ebe mmadụ 14292 agbakeela ma laa be ha.

    NCDC kwukara na mmadụ itoolu ọhụrụ nwụrụ site na ọrịa coronavirus sokwa n'ọnụ ọgụgụ a ha wepụtara.

  8. "'Hand sanitizer' Pasenti iri isii dị n'ahịa ugbua bụ adịgboroja"

    Otu ọtawa ike Onyeisiala Buhari hiwere n'ibuagha megide coronavirus sị na 'hand sanitizer' pasentị iri isii dị n'ahịa Abụja ugbua bụ adịgboroja.

    Onyeisi otu a bụ Boss Mustagha kwuru nke a na mgbasa ozi ha nyere maka etu eke si anya anwụ n'ọrịa coronavirus na Naịjirịa.

    Ha kwuru nke a site na nyocha ha mere naanị n'Abuja ma sị na onwereike ịdị etu a na mpaghara Naịjirịa ndị ọzọ.

    Ọ sị na-agbanyeghi na ọ dị mma ka ndị Naịjirịa na-arụpụta nke ha ugbua 'hand sanitizer' dị ụkọ mana ọ bụghịzi ịrụ nke ga-emerụ mmadụ ahụ.

    Ọ dọrọ aka na ntị ka ndị na-eme nke a wepu aka enwe n'ofe tupu ọ họọ aka mmadụ.

  9. 'Welitekwuo nụ aka n'ime nyocha ahụ maka coronavirus n'Afrịka'

    Otu World Health Organisation (WHO) akpọọla oku ka e welite aka n’ime nyocha ahụ maka coronavirus n’etiti ndị bi na mpaghara Afrịka ebe e nwere ọgbaghara.

    Ha sị na e mechiri ọtụtụ ụlọọgwụ dị mpaghara ‘Sub Sahara’ nke Afrịka n’ihi ọgbaghara na-eme ebe ndị ahụ.

    Na nke mere ọnọdụ ahụike ji dị ọjọọ na mba ndị a ọkachasị n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ, tinyekwuoro ọrịa coronavirus na-echi mbaụwa ọnụ n’ala ugbua.

    Mpaghara Afrịka ihe ndị a metụtara gụnyere Burkina Faso, Central African Republic, Chad, DR Congo, Ethiopia, Mali, Niger na South Sudan bụ ebe WHO sị ka e welite aka na nyocha Coronavirus a na-eme.

  10. Mba Rwanda ewepụla mmachi ofufe n'ụlọụka

    Mba Rwanda agbapeela ụloụka ofufe kraist kamgbe ọnwa anọ ha mechiri ha maka ọrịa coronavirus.

    Gọọmentị mba RWanda ewepụtala atụmatu na usoro ụloụka ndị a ga-esi eme ọfụfe, ha gụnyere -

    1) Ndị niile biara ụka ga-edebanye aha ha n'akwụkwọ

    2) Mmadụ niile ga-eyi mkpụchị imi na nye onwe ha ohere 1.5m

    3) Agaghị eji ego n'aka enye onyinye

    4) ụmụaka na erubeghị afọ iri na abụọ agaghị abata ụka.

  11. Zindzi Mandela butere coronavirus tupu ọ nwụọ

    Akụkọ na-apụta n'ụtụtụ a na-ekwu na Zindzi Mandela bụ nwa Nelson Mandela nwụrụ n'izuụka gara aga butere ọrịa coronavirus tupu ọ nwụọ.

    Nwa ya nwoke bụ Zondwa bụ onye gwara otu ụlọ mgbasaozi na mba Sawụt Afrịka nke a na mkparịtaụka.

    Zindzi nwụrụ n'ụlọọgwụ dị na mpaghara Gauteng dị na mba Sawụt Afrịka mana o dobeghi anya ma ọ bụ ọrịa gburu ya.

  12. Mmadụ 643 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa

    Ngalaba gọọmentị na-ahu maka mgbasa ozi edepụtala na mmadụ narị isii na iri anọ na atọ ebutela ọrịa coronavirus.

    Ha depụtara nke a n'akara Twitter ha n'ụbọchị Wenesde.

    Legọs bụ kwa ebe ọnụ ọgụgu a kachasị dịka mmadụ narị abụọ na iri atọ butere ya bụ ọrịa,

    N'ime ọnu ọgụgu a, Ebonyi steet nwere mmadụ iri atọ, mmadụ iri na isii si Enugwu ebe iri si Imo steeti.

  13. Ụnụ asaala chi ndị ọma

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  14. E bughariala asọmpi Olimpik ntorobia gawa afọ 2026 n'ihi coronavirus

    Mba Senegal na otu 'International Oympic Commitee' ekwekọrịtala ibufe asọmpi egwuregwu Olympic ndị ntorobịa site afó 2022 gawa 2026. Ha sị na nke a ga-enyere ha ohere ịkwado nke ọma maka dịka ebugharịchara ọtụtụ egwuregwu na mbaụwa nke gụnyere Tokyo Olympics.

  15. Minịsta akụ ọnatarachị mba Saụt Afrịka ebutela coronavirus

    Mịnịsta akụ ọnatarachi mba Saụt Afrịka bụ Gwese Mantashe na nwunye ya ebutela ọrịa coronavirus.

    Dịka ọ dị ugbu a, ha edopụla onwe ya iche ebe Mantashe ga-esi n'ụlọ arụ ọrụ ya.

    Ihe dịka mmadụ 287,000 ebutela ọrịa coronavirus dịka ngalaba WHO siri kwuo na ọ bụ mba ahụ kacha nwee ndị bu ya bụ ọrịa n'Afrịka.

  16. 'Biko unu agbazila ọtọ ma anyị bia n'ụlọ gị' - Ndị uweojii Ọstrelịa

    Ndị uweojii pụrụiche na-arụ ọrụ maka iluso ọrịa coronavirus ọgụ ekwuola ka ndị mmadụ gbalia yiri uwe mgbe ọ bụla ndị uweojii biara ileta etu ha si erubere iwu gọọmentị isi maka ọrịa coronavirus.

    Nke a na-eme dịka ụfọdụ mmadụ na-agba ọtọ emepe ụzọ ha mgbe ọbụla ndị uweojii biara nleta n'ụlọ ha.

    Otu onye uweojii bụ Jason Kennedy ekwuola si " Eeee, ekwesiri ịchetara ụfọdụ ndị mmadụ ka ha yiri uwe ha mgbe ndị uweojii biara nleta n'ụlo ha".

    O kwuru si "ụfọdụ mgbe, anyị na-ahụju anya".

  17. Mmadụ 463 ọzọ ebutela ọria coronavirus na Naijirịa

    Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ narị anọ na iri isii na atọ ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.

    Ọnụ ọgụgụ ha gosiri na mmadụ iri atọ na itolu ọzọ ebutela ọrịa coronavirus n'Enugw, iri atọ na atọ si Delta steeti ebe mmadụ asatọ si Abia steeti.

    Dịka o si dị, mmadụ iri ọzo anwụola ebe 121 agbakeela n'ute ya bụ ọrịa.

  18. Ụnụ asaala chi ndị ọma

    Ka anyị were ifunanya na-aga mgbe niile...chere aka họrọ akuko ga-amasị gị taa niile.

  19. E bulatala ụmụ Naijiria 261 tọrọ na mba Briten

    Ụmụ Naijiria dị narị abụọ, iri isii na otu tọrọ na mba Briten alọtala.

    Ọ bụ Ụgbọelu Airpeace nke ụlọrụ Wamos Air Partners Uk fere bulatara ụmụ afọ ndị a n'abalị Tuzde n'ọdọụgbọleu Nnamdi Azikiwe International Airport dị n'Abuja dịka ụlọrụ na-ahụ maka ndị Naijiria nọ na mba ọzọ bụ Nigeria in Diaspora Commission(NIDCOM) si gbaa n'ama n'akara Twitter ha.

  20. Ndị ọrụ ahụike 41 ebutela ọrịa coronavirus n'otu ụlọọgwụ na Kenya

    Ndị ọrụ ahuike mmadụ 41 na-arụ n'otu nnukwu ụlọọgwụ ebe a na-amụ nwa na mba Kenya ebutela ọrịa coronavirus.

    Onye na-arụ dịka onyeiisi ngalaba ahụike na mba ahụ bụ Dkta. Patrick Amoth kwuru na a hụrụ ndị a dịka e mere ndị na-arụ n'ụlọọgwụ ahụ nnyocha ahụ.