You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Nke a bụ mbụ Onyeisiala Buhari na-eyi mkpuchi imi

    Onyeisiala Muhammadu Buhari yi mkpuchi imi pụọ ezi n'ihe bụ mbụ a na-ahụ ya ka ọ na-ekpuchi imi ya kemgbe ọrịa coronavirus tiwapụtara na Naịjirịa.

    Buhari kpuchiri imi ya dịka o si Naịjirịa fega mba Mali, maka nzukọ ya na ndị isi mba ndị nọ n'okpuru Economic Community of West African States (Ecowas) nwere maka ikpe udo n'ụbọchị 23 nke ọnwa Julaị.

  2. NCDC agbapeela ụlọ nyocha ọhụrụ ise

    Ngalaba nwe ọrụ ịgbochi ọrịa na-efe efe bụ NCDC n’ịchafụ ekwuola na ha agbapeela ụlọ nyocha ise maka nyocha coronavirus.

    Nke a ga-eme ya ụlọ nyocha iri ise na asatọ ehibere iji nyocha ọrịa a na Naịjirịa niile.

    Ebe e hibere ụlọ nyocha ndị a bụ:

    •Edo Specialist Hospital dị na Benin

    •ATBU teaching hospital dị na Bauchi

    •Rivers Indorama Company Molecular Lab

    •State specialist Hospital, Amachara, Abia steet

    •University of Abuja, Gwagwalada GX Lab

    Ha kọwara na ha hibere nke a iji mezu nkwa ha kwere ị nyocha mmadụ nde abụọ n’ime ọnwa atọ.

  3. Coronavirus egbuola mmadụ 572 n'otu ụbọchị na Saụt Afrịka

    Mba Saụt Afrịka edekọọla ọnụọgụgụ ndị kachasị nwụ n’ọria coronavirus n’otu ụbọchị.

    Mmadụ 572 bụ ọnụọgụgụ kachasị kemgbe ọrịa coronavirus batara mba Saụt Afrịka anwụọla.

    Nke a ga-eme ọnụọgụgụ ndị niile nwụrụla site n’ọrịa puku ise na narị itoolu na iri anọ na mba ahụ.

    Ihe ruru ọkara ọnwụ ndị a si na mpaghara ebe a an-akpọ Western Cape Province apụta.

    N’otu aka ahụ ọnụọgụgụ ndị kachasị bute ọrịa a bụ na mpaghara Guateng province ka ha nọ.

    Dịka ọ dị ugbua, ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a nọzi na puku narị atọ na iri itoolu na anọ na Saụt Afrịka niile.

  4. Mmadụ 543 ọhụrụ nwere coronavirus na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ nke Bekee kpọrọ NCDC n'ịchafụ ekwuola na mmadụ 543 ọhụrụ esorola n'ime ndị ahụrụ coronavirus n'ahụ ha na mba ahụ.

    Nke wetere ndi gọọmnetị hụtarala ọrịa ahụ n'ahụ ha mmadu 38344, nke mmadụ 813 n'ime ha anwụọla.

    Ndi gbakere ma laa be ha bụ mmadụ 15815.

  5. Unu asaala chi?

    Ebe a ka anyị ga-esi wetere unu akụkọ niile maka coronavirus taa.

    Nnọọ nụ!

  6. Ndị bu ọrịa coronavirus akarịala anyị ahụ - Ndị ọrụ ahụike Madagascar

    Ndị ọrụ ahụike nọ n' isiobodo mba Madagascar adọọla aka na ntị na ụlọọgwụ akarịala ohere ha nwere dỊka ọnụọgụgụ ndỊ butere ỌrỊa ahụ na-arị elu na mba ahụ.

    Otu onyeisi n'ụlọọgwỤ gọọmenti dị n' Antananarivo, kwuru na ha nwere mmadụ iri anọ na isiii bu ọrịa coronavirus, ebe naanị ọnọdụ anọ fọrọ n'ụlọọgwụ ahụ.

    N'ụlọọgwụ ọzọ, onyeiei ha kwuru na ndỊ ha na-eleta akarịala.

    Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na mba ahụ edepụtala akwụkwọ ozi n'ọha na-arịọ ndị otu ọrụ ebere enyemaka akọrọngwa e ji alụ ọgụ coronavirus dịka igbe e ji eme nnyocha, akwa iyichi ahụ na injini e ji eku ume.

    Ka ọ dị ugbua, Madagascar enweela mmadụ puku asaa na nari ise (7,500) butere ọrịa coronavirus nke ihe ruru pasent 80 bụ ndị a hụrụ nje n'ahụ ha n'ọnwa gara aga.

    Mana onyeisiala mba ahụ bụ Andry Rajoelina ka na-esi ọnwụ na ala ha na-emeri n'ọgụ coronavirus dịka dịka ọ gara n'ihu na-agbasa ozi maka ọgwụ mgbọrọgwụ o kwuru e ji egbochi ọrịa coronavirus.

  7. Gọvanọ Kayode Fayemi nke Ekiti ebutela coronavirus

    Akụkọ na-apụta ugbua na-ekwu na onye na-achị Ekiti steeti ebutela ọrịa coronavirus.

    O kwuputara nke a n'akara Twitter ma kwuo na ọ bụ nyocha ọrịa a nke atọ ya ka nke a bụ.

    O nyefere ọchịchi n'aka osote ya ma kwuo na ọ ga-esi n'ụlọ na-arụ ọrụ ndị ọzọ dị mkpa

  8. Covid akarịala Madagascar kwuru na ha mepụtara ọgwụ ya?

    Mba Madagascar ezipụla ozi gbata gbata nye ndị ngalaba ahụike di iche iche ka ha gbatara ha ọsọ enye maka makana ndị bu ọrịa covid na-abawanye ebe ahụ.

    E nwetala akụkọ na ụlọọgwụ ndị dị na mba ahụ ejula na-anabata naanị ndị ọria a jisike na njọ.

    Ka ọ dị ugbua mmadụ puku asaa ka achọpụtarala covid 19 n’ahụ ha na mba ahụ.

    Cheta na onyeisiala Andry Rajoelina wepụtara ọgwụ igbo nwereike ịgwọ coronavirus, ma resi ya mba dị n’Afịrịka dị iche iche.

    Mana ndị ọrụ ahụike nọ na mba dịka Naịjirịa na DR Congo kwuru na ọgwụ ahụ adịghị ire ka ha mechara nyocha ya.

  9. Trump ekwetala na coronavirus na-akawanye njọ n'Amerịka

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump agwaala ndị mba ya ha kpuchie ihu ha iji gosi na ha kwụsị ike na nkwado mba ahụ n'oge coronavirus a.

    Ọ nabatakwara na ọrịa ahụ abụghị akụko ifo dịka ọnụọgụgụ ndị butere ya nakwa ndị nwụrụla site na ya na-arị elu dị egwu.

    Trump eyighị nkpuchi imi mgbe ọ na-ekwu nke a n'ọgbakọ ebe o na-ekwupute maka ọrịa a kwa ụbọchị.

  10. Okezie Ikpeazu ekeelela ndị kwadoro ya na ndị gwọrọ ya

    Aka na-achị Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu ekeleela ndị niile kwadoro mgbe ọ na-agabịga ije ya n'aka ọrịa coronavirus.

    O kwuru na obi dị ya mma maka etu ndị mmadụ si gbaa ya okirikiri n'ọnwụnwa a.

    Ihe ndị a niile dị n'ihe onyonyo o wepụtara n'akara Twitter ya.

    O jikwa ohere ahụ kelee ndị ọrụ ahụike ndị o kwuru 'na-echekwa anyị n'aka orịa a' ma gwakwa ndị mmadụ ha chekwaa onwe ha.

  11. Mmadụ 576 ọzọ ebutela ọrịa a n'otu ụbọchị

    Ọnụọgụgụ ndị NCDC weputara ọhụrụ na-akowa na mmadụ 576 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus.

    N'ime ọnụọgụgụ ndị a, mmadu iri abụọ na asatọ butere ya n'Enugwu, mmadụ iri abụọ na Ebonyi, mmadụ itoolu na Delta steeti nakwa mmadụ abụọ n'Imo steeti.

    Cheta na ọ bụ n'ụbọchị iTuzde ka aka na-achị Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu si n'ọrịa ahụ gbakee ma tụọ mmamma kelee Chineke maka nke a.

    Dave Umahi nke Ebonyi steeti bụ Gọvanọ ọzọ butere ọrịa a n'ọwụwa anyanwụ ka na-anata ọgwụgwọ.

  12. Nnọọnụ na peeji anyị

    Pasanụ apasa ebe a maka akụkọ dị ọkụ gbasara coronavirus.

    Ndewo.

  13. Ka chi foo nụ

  14. Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia steeti agbakeela malite ọrụ

    Gọvanọ Okezie Ikpeazụ nke Abia Steetị amalitela ọrụ dịka ọ rịachara ma gbakee site n’ọrịa coronavirus

    n’ihe karịrị otu ọnwa.

    Ọ tukwara mmamma n'ụka taa ikele Chineke maka mgbake ọ gbakere.

    N’ọnwa gara aga ka gọvanọ kwupụtara na o butere ọrịa coronavirus ma dopu onwe ya

    iche maka ịnata ọgwụgwọ. Tupu Ikpeazu a hapụ ụlọọrụ ya, o nyefere ọchịchị Abia Steetị n’aka osote ya bụ

    Ude Oko Chukwu. Ihe onyonyo mechara pụta na-efegharị na soshal midia ebe gọvanọ Ikpeazu na onye

    dọkịta ya na-akụ tennis, iji gosi na ọ gbakeela. Kọmishọna mgbasa ozi bụ John Okiyi sị na ọ gbakeela ma

    dịkwa njikere ịrụ ọrụ iji gboo mkpa dị na Steetị. Okiyi kwupụtakwara obi aṅụrị o nwere maka mgbake na

    mmalite n’ọrụ gọvanọ Ikpeazu.

  15. Gọọmentị etiti ewetakwuola mbata na ọpụpụ ụgbọelu njem ofesi aka ruo ọktoba abalị 5

    Ụlọọrụ Nigeria Civil Aviation Authority bụ NCAA n'aha ịchafụ ekwuola na ụgbụelụ njem mba ofesi agaghị abata maọbụ fepụ na Naịjirịa ruo abalị iri na ise nke ọnwa ọktoba afọ 2020.

    N'akwụkwọ ha degaara ndị ọrụ ụgbọelu kpọrọ onwe ha NOTAM n'ịchafụ ha sị ụgbụelụ mba ofesi agaghịzị amalite n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa ọgụst dịka e kwuru na mbụ.

    Nke a pụtara na ọ bụ naanị ụgbọelu dị oke mkpa nakwa ndị nke bu ndị isiọrụ mba ọzọ ka ga na-abata ruo mgbe ahụ.

  16. Abịa steeti amalitela atụmatụ imee nnyocha coronavirus ụlọ n'ụlọ, "Anyị na-atụ anya inyocha mmadụ 10,000 n’ime otu ọnwa'

    Dkt. Jonathan Osuji bụ Kọmishọna ahụike na steeti ahụ gwara BBC Igbo na bido n’ụbọchị 20 nke ọnwa Julaị, ka ha malitere ịga n’ụlọ n’ụlọ maka ime nnyocha a.

    Osuji kwuru na ha bidoro n’Ụmụahịa Nọt, Ụmụahịa Saụt nakwa Isiala Ngwa Nọt, ma na-atụ anya ịgazu steeti ahụ gburugburu n’ime otu ọnwa maọbụ gafee.

    O kwuru na ha na-atụ anya iji ụbọchị atọ eme nnyocha n’ime okpuruọchịchị atọ kwa mgbe, tupu ha agafee okpuruọchịchị atọ ọzọ, ruo mgbe ha ga-agazu okpuruọchịchị 17 dị na steeti ahụ.

    Ọ gwakwara BBC Igbo na ọtụtụ ndị mmadụ (gụnyere ndị ọrụ gbatagbata, na ndị ọrụ ahụike nke ime obodo) bịara sonye ha n’efu, iji nyere ha aka hụ na e mere nnyocha a ọfụma.

    Maka ime ka nnyocha a rute mmadụ niile aka, Osuji kwuru sị “Ọ ga-agazu ndị o kwesịrị ịgazu, anyị na-atụ anya inyocha mmadụ 10,000 n’ime otu ọnwa. Anyị ka malitere amalite.”

    “Ọ bụghị onye ọbụla ị hụrụ ị kpọrọ ya gaa nyochaa ya, n’ihi na ụfọdụ ihe ndị e ji eme nnyocha a dị oke ọnụ, ọ bụghịdị oge niile ka ngalaba NCDC na-enwe kemịkal ahụ e ji eme nnyocha a.

    “Enweghikwanu mgbe ọ ga-abụ mmadụ niile ka aka anyị ga-eru.”

    Maka ebe ha nwereike itinye ndị ha nwereike ịchọta ọrịa a n’ahụ ha, Osuji kwuru sị na ha nwere ebe ga-aba ndị mmadụ, ọkachasị ndị ọrịa coronavirus a jisi ike.

    Mana o kwukwara na ha ga-ahụ na ụfọdụ ndị ọzọ e nwereike ịchọta ya n’ahụ ha ga-anọsapụ n’ụlọ ha.

  17. Coronavirus curfew: A daala senetọ nha maka ịgagharị n'oge mmachi abali

    A daala Senetọ mba Kenya bụ Johnson Sakaja nha ego ruru dọla $150 maọbụ mkpọrọ ọnwa atọ maka ịnọ n'iro oge mmachi ngagharị n'abali e tinyere iji belata nkesa coronavirus na mba ahụ.

    A nwụchiri Sakaja n'ime abali Satọde ebe ọ nọ n'aṅụ mmanya n'ọdọmmanya ka ọ gafechara elekere Itoolu nke abalị bụ oge mmachi ngagharị abalị ka dị ire.

    Senetọ arịọla ndị Kenya mgbaghara ma tinye akwụkwọ arụkwaghịm dịka otu onye n'ime otu mba ahụ hiwere maka agha megide nkesa coronavirus.

  18. Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na coronavirus na Brazil akarịala 80,000

    Ka ọdị n'abali iri abụọ na otu nke ọnwa Julai, afọ 2020, mba Brazil enweela mmadụ puku iri asatọ, otu narị na abụọ(80,120) nwụrụ n'ọrịa coronavirus, dịka mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na mba si were kwuo.

    Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na coronavirus na Brazil akarịala 80,000

    Ndị ọrụ gọọmentị na-ekwu na oke ọnwụ mmadụ nwere ike ibute ụkọ igbe ozu dịka ụbịam na emeghị nnyocha dịka o kwesiri mere ọtụtụ ji anwụ n'ọrịa ọjọọ ahụ.

    Brazil bụ mba nke abụọ ọrịa coronavirus kachasị gbuo mmadụ nyụghụnyụ na mba ụwa, ebe mba America bụ ebe coronavirus kachasị gbuo mmadụ nwere mmadụ 143,864 nwụrụla site n'ọrịa.

    Mmadụ 2,121645 ebutela ọrịa coronavirus na mba Brazil,ebe mmadụ 1409,202

    Na nsonso, Brazil nwere mmadụ otu puku nwụrụ n'otu ụbọchi site n'ọrịa coronavirus.

    Onyeisiala Brazil bụ Jair Bolsonaro, onye buterela ọria coronavirus na-ekpu afọ ime aka dịka ọ na-agwa ndị gọvanọ ka emepe obodo, na-agbanyeghị aka na ntị nke ndị ọkachamara ahụike na-adọ.

  19. E bugala minista mba Saụt Afrịka ụlọọgwụ maka coronavirus.

    E bugala Gwede Mantashe bụ minista na-ahụ maka ihe akụ ọnatarachi na mba Saụt Afrịka ụlọọgwụ dịka a chọtachara ọrịa coronavirus n’ahụ ya.

    Gọọmentị mba ahụ kwuputara nke a, dịka ha kwukwara na nwunye ya nọ na nnọsapụ n’ụlọ.

    Ha kwukwara na “dọkịta ha dụrụ ọdụ sị ka e buga Mantashe ụlọogwụ ebe a ga-enwe ike ilekọta ya anya ọfụma.”

    Mara na a chọtara ọrịa coronavirus n’ahụ ha n’ụbọchị Tuzde nke izuụka gara aga.

    Marakwa naọ bụ Saụt Afrịka ka ndị mmadụ kacha nwee ọrịa coronavirus na mpaghara Afrịka, ma bụrụkwa ndị nke ise kacha n’ụwa.

    Ihe ruru mmadụ 360,000 ebutela ya ebe ọ tarala isi ihe ruru mmadụ 5,000

  20. Mmadụ 562 ọzọ ebutela ọrịa covid-19

    Mmadụ iri anọ na asaa si Abịa steeti so n’ime mmadụ narị ise na iri isii na abụọ ọhụrụ ngalaba NCDC kwuru na ha chọtara ọrịa coronavirus n’ahụ ha.

    Ha kwukwara na mmadụ narị abụọ na iri abụọ na asatọ ọzọ agbakekwuola ma laa be ha.

    Dịka ọ dị ugbua ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa a na Naịjirịa kemgbe amalitere ịme ngụkọ agafeela puku iri atọ na asaa.