Onyeisiala Donald Trump akagbuola ọgbakọ ukwu patị Repụbịkan chọrọ ime n'obodo Florida.
Trump sị na ọ bụ maka "mbawanye" coronavirus kpatara ntụgharị uche a.
Trump sị: "Ọ bụghị oge dị mma ime ya."
Ọ sịkwa na ya ga-akwu okwu okwesiri ikwu n'ọgbakọ n'ụzọ ọzọ.
Nke a na-abịa dịka ọnụ ọgụgụ ndị bu coronavirus gafere nde anọ.
Otu ihe kwesiri ime na ọgbakọ bụ ibunye Trump ọkọrọtọ patị Repụblịkan ọ ga-eji zọọ ọkwa onyeisiala.
Ọ bụ n'ebe ekwesiriburu ime ya bụ obodo Charlotte ka a ka ga-anọ mee ihe yiri ọgbakọ. Mana ọ gaghị agafee ọkara ụbọchị.
Trump wepụbụrụ ọgbakọ gawa obodo Jacksonville, na Florida dịka aka na-achị Nọt Karolina - bu onye patị Demokrat - siri ọnwụ na-aga achabi ndị ga-abịs ọgbakọ a maka iwu etinyere banyere ọgbakọ ndị mmadụ n'ihe coronavirus.