'Card reader' na-emezi 'vum-vam' na Bayelsa, Ụlọọrụ INEC kwuru na "card reader" 22 fuburu na Bayelsa apụtakwala ọzọ.
Ụlọorụ Inec dị na Bayelsa steeti kwuru na ha chọtara igwe "card reader" 22 n'ime 69 furu ka e mechara ntuliaka ọkwa onyeisiala na steeti ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Monday Udoh Tom bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ a na-akpọ "Resident electoral commissioner" na Bekee, gwara ndị ntaakụkọ na ha gwara ndị nnọchiteanya ndị pati nọ na mpaghara ebe igwe ndị a furu, na ha na-ekwe ha nkwa ịgbaghara onye ọbụla weghachịtara nke ya.
O kwuru sị "nke a mere ka ndị mmadụ bido iweghachị igwe ndị ahụ. Anyị wetara 14 na Nembe, atọ na Sagbama, abụọ na mpaghara Southern Ijaw na atọ si na Yenegoa".
N'agbanyeghi na a gaghị eme ntuliaka gọvanọ na steeti ahụ ruo ọnwa Disemba, a ga-eme nke ndị ụlọomeiwu nke steeti echi bụ Maachị 9, n'ime okpuruọchịchị asatọ.



















