Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ka o si merie:
APC: 215,938
PDP: 925,274
SDP: 1,136
AAC: 914
Ndị debanyere aha ha: 2,831,205
Ndị anabatara ịtụ vootu: 1,188784
Vootu niile a tụrụ: 1,178,335
Vootu niile a tụrụ dị mma: 1,154,188
Vootu a jụrụ ajụ: 24,147
'Enweghi mgbe anyi ji nwụchi osote gọvanọ Kano steeti, anyị na ya nọkọ' - Ndị uweojii
Ebe akụkọ a si
Onye dere ya, Mansur Abubakar
Ndị mere akụkọ a, BBC Pidgin, Kano
Ndị uweojii Kano kwuru sị na enweghi mgbe ha ji nwụchie osote Yusuf Gawuna bụ osote gọvanọ ndị Kano steeti, maka nrụrụaka ntuliaka.
Cheta na akụkọ pụtaburu na ha nwụchiri Gawuna maka ebubo na ọ kwasasịrị otu ebe a na-anọ agụpụta mpụtara.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii kwuru sị na ọ bụghị nwuchi ka ha nwụchiri ya, na ha na ya nọkọ.
N'otu aka ahụ, Kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Muhammad Wakil, na ndị Inec emeela nzukọ ebe ha na-akwado imalite mkpọpụta mpụtara ntuliaka.
A ka na-agụpụta mpụtara Imo steeti, Sonye ya ebe a kọ dị ọkụ.
Mmehie ya bụ na ọ kpọrọ mpụtara na-adabaghị adaba.
E mechara gụpụ vootu karịrị puku atọ n'ime ihe karịri puku iri abụọ ọ gụpụtara dịka ihe pati AA nwetara.
Ndị Rivers steeti na-achịlizi aka elu, Ihe ndapụta so ntuliaka e mere na Rivas steeti n'ụbọchị 9 nke ọnwa Maachị, na-ebutezi "chịlie aka gị elu".
Ebe akụkọ a si
Onye dere ya, Karina Igonikon
Ndị mere akụkọ a, BBC Pidgin, Lagos
Anaghịzị aga ụzọ Aba Road dị na Pọt Hakọt aga ugbua maka etu ndị nchekwa si nọchichaa ụzọ bido na Waterlines ruo GRA.
O mere ka ụzọ kpachichaa, ebe ndị nchekwa a mere ka ndị mmaọ̄ụ chilie aka ha elu tupu ha agafee.
N'ụzọ a ka ụlọorụ ndị Inec nọ, bụ ebe ọgbaghara dapụtara ka ndị uweojii na ndị agha na-azọ onye nọ n'isi nchekwa.
Chetakwa na Inec mechara kwụsị mpụtara ntuliaka Rivers steeti n'ike.
Amaneghi ihe ga-eme ya ugbua.
Mpụtara ntuliaka apụtawala ọzọ n'Imo steeti
Ihe a tụtara n'ụfọdụ okpuruọchịchị apụtawala ọzọ:
ORU WEST
AA: 5,016
Accord: 258
APC: 6,435
APGA: 5,764
PDP: 4,393
Ndị debanyere aha ha: 70,220
Ndị anabatara ịtụ vootu: 23,348
Vootu niile a tụrụ: 23,150
Vootu niile a tụrụ dị mma: 22,375
Vootu a jụrụ ajụ: 775
_________________________________________
ISU
Accord: 146
AA: 7, 695
APC: 2, 423
APGA: 2, 873
PDP: 3, 235
Ndị debanyere aha ha: 53, 956
Ndị anabatara ịtụ vootu: 17, 626
Vootu niile a tụrụ:
Vootu niile a tụrụ dị mma: 17, 626
Vootu a jụrụ ajụ: 534
______________________________________
ORU EAST
Accord: 77
AA: 4, 531
APC: 24, 257
APGA: 1, 524
PDP: 4, 806
Ndị debanyere aha ha: 83, 600
Ndị anabatara ịtụ vootu: 38, 455
Vootu niile a tụrụ:
Vootu niile a tụrụ dị mma: 37, 746
Vootu a jụrụ ajụ:
____________________________________
OBOWO
Accord: 182
AA: 4, 929
APC: 1, 389
APGA: 5, 385
PDP : 6, 198
Ndị debanyere aha ha: 62, 836
Ndị anabatara ịtụ vootu: 20, 404
Vootu niile a tụrụ: 19, 040
Vootu niile a tụrụ dị mma: 18, 609
Vootu a jụrụ ajụ: 431
_____________________________________
Aka akparala onye dọkara akwụkwọ mpụtara n'Imo steeti, Onyeisi ụlọorụ INEC n'Imo steeti kwuru na ha nwere akwụkwọ mpụtara ọzọ ha ga-eji kpọrọ mpụtara na-aga n'ihu.
Dịka a na-achọ imalite mkpọpụta mpụtara ọzọ n'Imo steeti, kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ arịọla ka udo chịa n'ihe a na-eme.
Maka ndị dọkara akwụkwọ bụ Pascal Onwukaike nke RP na Uche Onyeaguocha nke PDP, o kwuru na iwu obodo ga-eso ha maka arụ ha kpara.
A na-akwado imalite ngụpụta mpụtara ọzọ n'Imo steeti, INEC na-akwado ngụpụta ka a dọkachara ụfọdụ akwụkwọ mpụtara.
Ndị uweojii anwụchiela osote gọvanọ Kano?
Akụkọ anyị na-anụ na-ekwu na ndị uweojii anwụchịela osote gọvanọ Kano steeti maka ebubo ikposa ntuliaka e mere na Okpuru Ọchịchị Nasarawa dị na steeti ahụ.
Nkọwa foto, Nasiru Gawuna n'etiti ndị uweojii
Akụkọ kwukwara na Nasiru Gawuna dọkara mpụtara ntuliaka e mere n'ọdọ nchịkọta vootu dị n'Okpuru Ọchịchị ahụ dịka a na-akpọpụta ya.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ otu PDP na-emeri nke kusuru Gawuna nakwa Kọmịshọna na-ahụ maka okpuru Ọchịchị na steeti ahụ bụ Murtala Sule Garo.
Gere ihe Uche Nwosu gwara BBC Igbo ebe a
Ị nụrụ ihe mere n'Imo nakwa ihe Inec kwuru maka ụfọdụ steeti ndị ọzọ?, Gere akụkọ ga-amasị gị n'otu nkeji.
Okezie Ikpeazu na-agba egwu mmeri
Aka na-achị Abia steeti azọtala agba nke abụọ nke mere na ọ malitere ịnwe aṅụrị site n'ịgba egwu na ịbụ abụ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Lee ka ọgụ siri malite na mkpọpụta mpụtara ntuliaka n'Imo
Ebe akụkọ a si
Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu
Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Owerri
Aha onyonyo, Imo Election Result: Ndị Imo na-adọka onwe ha maka mpụtara ntuliaka
A dokala akwụkwọ mpụtara Imo
A dọrịela akwụkwọ mpụtara ntuliaka Imo steeti n'ebe a na-akpọpụta mpụtara Imo steeti n'isi ụtụtụ a ebe elekere Ise .
Nke a na-eme ka a gụpụtachara mpụtara Okpuru Ọchịchị Okigwe.
Otu nnochite pati bụ Uche Onyeago boro ebubo na a chụpụrụ ndị nnọchịte otu pati oge a na-achịkọta vootu.
O kwuru ka a ghara ịgụpụta mpụtara okpuru ọchịchị. Mana onye ọzọ kwuru ka a ghara ige ntị na mkpesa ya.
Ndọrịtaụka banyere n'ọgụ ha were dọrịe akwụkwọ mpụtara niile e ji eme mkpọpụta .
Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ Inec agbaala ọsọ ndụ gbapụ n'ebe a na-akpọpụta mpụtara ntuliaka e mere.
Imo Result: A napụrụ ndị ọrụ Inec igbe vootu, tie ha ihe n'Okpuru Ọchịchị - Onyeisi Inec Orlu
Onyeisi Inec na Okpuru Ọchịchị Orlu kwụrụ na a kagburu ntuliaka n' ebe ụfọdụ n'ihe na a napụrụ ndị ọrụ ha igbe vootu, tie ha ihe , ebe ụfọdụ tụrụ vootu na ejighị 'card reader.'
Aka chiburu Ekiti steeti bụ Ayo Fayose ekelela Gọvanọ Ibikunle Amosun nke Ogun steeti dịka onye ọ na-akwado ka ọ nọchie ọkwa ya pịara ukwu n'ala na ntuliaka ọkwa Gọvanọ e mere na Satode.
Dapo Abiodun nke APC meriri Adekunke Akinlade nke APM bụ onye Amosun na-akwado na ntuliaka gọvanọ.
Fayose kwuru na e jirila iko o ji manyere ya bụ Fayose oge e mere ntuliaka Ekiti manyere ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
A nwụchiri ndị a na-enyo maka mpụ metụtara ntuliaka
Ndị uweojii nwụchiri ọtụtụ a na-ebo ebubo na ha tinyere aka na mpụ nakwa kpa agwa megidere iwu ntulaiaka Naijiria.
Akụkọ ọgbaghara dị iche iche dịka ịlụ ọgụ, iti ndị ọrụ Inec ihe, ịnapụ igbe ntuliaka maọbụ akọrọngwa ntuliaka nakwa iji nwga ọgụ so ntuliaka e mere n'Imo steeti.
Ebe foto si, Orlando Ikeokwu
Nkọwa foto, Ndị a na-ebo ebubo ime mpụ gbasara ntuliaka
Gọvanọ Dave Umahi nke ekweela nkwa na ya ga-eji ike were rụọ ọrụ mmepe n' Ebonyi steeti.
Umahi nke PDP ji vootu dị 393 merie, ebe Sonni Ogbuji nke APC nwetara vootu dị 135903.
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Emmanuel Uzor binyere aka, Umahi kerere ndị Ebọnyị maka ịtụnyere ya ma kwe nkwa na ya chịchaa na ọchịchị ga-alọghachị mpaghara Abakaliki.
Lee ngụkọ mpụtara n'Enugwu steeti ebe a
Gụọ ọnụọgụgụ okpuruọchịchị niile dị n'Enuwgwu steeti ebe a: