Governorship Election Results: E wepụla Rochas oche n'otele n'Imo steeti

Etu ntuliaka ọkwa gọvanọ na nke ụlọomeiwu nke steeti si aga n'Ọwụwa-Anyanwụ.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa and Chimamaka Ihenacho

  1. Ntuliaka ebidola n'Abia na Ebonyi steeti

    Ndị ọrụ INEC eruola Umuobiakwa wọd 7 n'Obingwa n'ime Abia Steeti.

    Ntuliaka ebidokwala n'Anike n'ime Onicha, Ebonyi steeti. Ntuliaka malitara n'elekere asatọ nke ụtụtụ.

    Ntuliaka n'ala Igbo
    Nkọwa foto, Anyị ahụbeghị igwe mmadụ na ntuliaka a
    Ntuliaka n'ala Igbo
    Nkọwa foto, Onweghị mgbagwoju anya na-erute anyị ntị ugbua a gbasara ntuliaka a
    Ntuliaka n'ala Igbo
    Nkọwa foto, Ndị mmadụ chọrọ ka onye masi ha pụta dịka onye mmeri
  2. Nwoke a na-eche ndịọrụ INEC n'Umuaka, Imo

    Sunny Emerenini bụ onye ọrụngo INEC bụkwa naanị onye pụtara ugbua na unit 006, wọọdụ 1 n'Umuaka, Imo steeti.

    Ebe a bụ ụlọakwụkwọ Premier nke dị n'Achalla.

    Ntuliaka n'Imo steeti
    Nkọwa foto, Ọtụtụ ebe n'ala Igbo anaghị ebido ntuliaka n'oge
  3. 'Aka m nọkwa n'ọsọ a' - Uche Nwosu

    Uche Nwosu na-azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti etiela mkpu arịrị maka ndị na-ebugharị akụkọ na o soghizi azọ ndọrọndọrọ ọchịchị.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. Ntuliaka ebidola n'Ado-Ekiti

    Ntuliaka ebidola ugbua n'Ado-Ekiti bụ isi obodo Ekiti steeti.

    Ndị ntaakụkọ BBC nọrọ ebe ahụ na-ekwu na ugbua onweghị mgbagwoju anya na-eme ugbua na-ebe ahụ.

    Ndị na-eme ntuliaka
    Nkọwa foto, Anaghị eme ntuliaka maka ịhọpụta gọvanọ n'Ekiti steeti
    Ndị na-eme ntuliaka
    Nkọwa foto, INEC ekwuola na ha dị njikere na ntuliaka ga-eme taa n'ọtụtụ steeti
    Ndị na-eme ntuliaka
    Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị Igbo bi n'Ado-Ekiti
  5. Ndị agha egbochiela ụzọ ndị ntaakụkọ ọzọ n'Ebọnyị

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo na-ekwu ugbua na ndị agha Naịjirịa egbochiela okporoụzọ na Nkwagu military cantonment n'ime Abakaliki.

    Cheta na ọ bụ ebe a ka ndị agha Naịjirịa gbochiri ụzọ ndị ntaakụkọ na ntuliaka ịhọpụta onyeisiala Naịjirịa nke ha mere n'ime izuuka abụọ gara aga.

    Okporouzọ na Nkwagu
    Nkọwa foto, Ndị agha na-ekwu na ha chọrọ ịchọpụta ndị ha bụ na-ezie
  6. Lee ka chi si hote n'Imo n'ụtụtụ a

    Ụfọdụ ụgbọala na-agba n'ụzọ okirikiri nke dị na Wetheral n'ụtụtụ a n'Owere.

    O nwekwara ndị ụgbọala na-agbakwa ugbua n'Owere.

    Mana n'ọtụtụ ebe uzọ tọgbọ chako!

    Okporouzo Wetheral
    Nkọwa foto, Imo so n'ọtụtụ steeti ndị Igbo chakwasị anya maka ntuliaka ga-eme taa
    Owere
    Nkọwa foto, Onye ga-amalite dịka gọvọnọ na steeti a?
  7. Anyị gwara gị na akụkọ niile si ọwụwa-anyanwụ ga-eru gị aka taa, ngwa lee ya

  8. Gere akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a n'otu nkeji

  9. Onye tara akara n'ụtụtụ a ọ tara ego nne ya?

    Otu nwaanyị na-eghe akara n'Abịa achọghị ịma na a na-eme ntuliaka taa.

    Ihe ọ ma bụ "ọkwa ndị ga-eme ntuliaka ga-ebu ụzọ tụnye ihe n'afọ?

    Nwaanyị na-eghe akara
  10. 'Achọrọ m ịbụ nwaanyị mbụ ga-atụ vootu taa'

    Hajara Sani gara na wọọdụ ya dị na Jọs Jarawa, ebe elekere anọ nke isi ụtụtụ, makana ọ chọrọ ịbụ nwaanyị mbụ ga-atụ vootu taa.

    Hajara Sani
  11. Na Akpọtụ Ugbu A, Ụlọorụ INEC na ọkụ enwere 'ọgbụgba ndụ'?, Ndị omekome gbara ụlọọrụ Inec dị n'Ebọnyị ọkụ.

    Akụkọ na-eru anyị ntị n'isi ụtụtụ a na-akọwa na ndị omekome bu egbe wakporo ụlọọrụ ebe ndị ọrụ Inec nọ na-eche imalite ọrụ ha taa.

    Ụlọọrụ Inec n'Ezza

    Dịka ozi si n'aka otu onye Inec rute anyị, ndị omekome a mụnyere ọgbọ ntuliaka Okposi Umuoghara (07) RAC dị n'ụlọakwụkwọ Community Secondary dị n'Ọkpọsị, dị n'okpuruọchịchị Ezza Nọt, ọkụ.

  12. Ụtụtụ ọma! Anyị awụchiela ọzọ

    Ụtụtụ ọma ndị nke anyị. Unu abọọla chi taa?

  13. Ụjọ atụla unu, anyị dị njikere - Uweojii Anambara steeti

    Ndị uweojii na Steeti Anambara ekwupụtala njikere ha dị inye nchekwa n'ụdị pụrụ iche maka ntuliaka ndị Ụlọomeiwu na Steeti Anambara.

    Na mkparịtaụka ekwentị ya na BBC News Igbo nwere n'Ọka, isiobodo Steeti ahụ, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mazi Haruna Mohammed, kwuru na ha dị njikere ugbua karịa ka ha dị n'oge ntuliaka onyeisiala.

    Dandaura Mustapha
    Nkọwa foto, Onyeisi ndị Uweojii n'Anambara steeti

    O kwuru na aka ndị uweojii Steeti Anambara akparala ndị ahụ niile ji akaike chọọ ka ha maburu igbe ntuliaka n'oge emere ntuliaka onyeisiala na Satọdee izuuka abụọ gara aga, gosi ha ọhaneze ma kpupukwa ha n'ụlọikpe.

    Ọ gwara ndị mmadụ ga-atụ vootu ka ha ghara ịtụ egwu kama ka ha pụta n'igwe tụọ vootu ha, gbakwunye na ndị uweojii Steeti Anambara na-atụ anya inweta ọtụtụ ọnụọgụgụ ndị uweojii na Steeti ndị gbara Steeti ahụ gburugburu, dịka ha ga-enwe ọtụtụ ndị nchekwa na ntuliaka nke a Karị ka ọ dị n'oge ntuliaka onyeisiala.

  14. Dike na dimkpa ndị ga-achịpụ ya n'Imo steeti echi

    Imo steeti so na steeti ndị azọm ọkwa gọvanọ ga-akpụ ọkụ n'ọnụ n'ihi ọtụtụ ihe gụnyere nnukwu mmọnwụ ndị anya ha dị n'oche ahụ.

    Ndị a gụnyere Ikedị Ohakim, Hope Uzodinma, Uche Nwosu,Ifeanyị Ararume nakwa Emeka Ihedịoha.

    Na ntụnye ya, onye e ji okwu ya agba izu bụ Chinedu Eze, kọwara ntụliaka ọkwa Gọvanọ nke steeti Imo dịka nke ga-akpụ ọkụ n'ọnụ, bụkwa nke ndị Naịjirịa niile na-ele anya mpụtara ya.

    Eze guputara ọnunu ọkụ ọ na-anụ mmadụ ise a ị bụ Gọvanọ dịka nke nwere ike ime ndị mmadụ ghara ịpụta n'igwe n'ihi ụjọ.

    Lee dịke ise a na-azọ ọkwa Gọvanọ; ebe ha nwere ike nakwa ebe ha gbara ọnyụpa:

    1. EMEKA IHEDIOHA

    Nwamamadị a ji aha otu Pati PDP azọ ọkwa Gọvanọ.

    O jikwa aha otu pati a ma zokwaa ọkwa Gọvanọ n'afọ 2015, bụ nke Rochas Okorocha meriri. Ọ bụ onye Mbutu dị na kansulu Aboh Mbaise.

    Emeka Ihedioha

    Ebe foto si, Facebook/Ihedioha

    2. IFEANYI ARARAUME:

    Onye a bụbu onye nnọchiteanya Okigwe n'ụlọ nzukọ Sineti, site n'afọ 1999-2007. Ọ zọọla ọkwa Gọvanọ site n'afọ 2007 rue n'afọ a n'otu pati dị iche iche.

    Nwaamadị a si Isiebu nke kansulu Isiala Mbano a gbaala mbọ ịbụ Gọvanọ steeti Imo mana ọ nweghị isi.

    Ifeanyi Araraume

    Ebe foto si, Facebook/Araraume

    O ji otu pati APGA azọ ọkwa Gọvanọ ka a na-ele anya na ọ ga-agbali na ntụliaka a, ọ kachasị na mpaghara ọgbọ nta vootu Okigwe bụ nke gụnyere, Isiala Mbano, EHIME MBANO, Okigwe, Onuimo, Ihitte-Uboma nakwa OBOWO.

    3. IKEDI OHAKIM:

    Onye a ji aha otu pati Accord azọ ọkwa Gọvanọ ma bụrụkwa Gọvanọ chịrị steeti Imo site n'afọ 2007 - 2011, a gbalịsiala ike iloghachita n'ọkwa Gọvanọ ichipu afọ anọ ọzọ kamgbe Rochas Okorocha Merichara ya.

    Ọ ga-abụ ọgụ na mgba nye ya na nwanne ya bụ Ifeanyi Araraume nke APGA na mpaghara Okigwe bụ ebe ha ga-achipu ya.

    Ohakim

    Ihe mkpobi ụkwụ ọ ga-enweta gụnyere na ndị mmadụ a matachabeghi otu pati ahụ, ya nakwa ndị nkwado ya ụfọdụ na-esoghị ya banye na pati ọhụrụ a.

    Ka osila dị, a na-ele anya na nwaamadi a nwekwara ohere inweta vootu n'ihi na akara pati a bụ nke mbụ n'akwụkwọ ntụliaka.

    4. HOPE UZODIMMA

    Hope ji aha otu pati APC azọ ọkwa Gọvanọ. Ọ bụ onye Ọmụma nke kansulu Oru East dị na mpaghara Ọlụ zone bụ nke kansulu iri na abụọ mejupụtara.

    Hope Uzodinma

    Ka ọ dị ugbu a, ọ bụ ya na-ọnọchita anya Ọlụ na Sineti. Ihe mkpobi ụkwụ ọ ga-enweta gụnyere ọgbaghara dị n'otu pati ya na steeti Imo, bụ nke mere onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari jiri gwa ndị steeti Imo oge ọ bịara achụmnta vootu n'ọnwa Febrụwarị ka ha tụnyere onye ọbụla obi ha nabatara na pati niile vootu maka ọkwa Gọvanọ. Ọ ga-enweta nsogbu ọzọ n'ihi ọgbaghara dị n'etiti ya Gọvanọ Okorocha bụkwa onye sikwa na ọgbọ nta vootu Ọlụ. Ka osila dị, a na-ele anya na ọ ga-enweta mmeri na kansulu Oru East.

    5. UCHE NWOSU

    Nwaamadi a ji aha Action Alliance, AA azọ ọkwa Gọvanọ bụ Ọgọ mbụ Gọvanọ Rochas nwere. Ọ bụ onye Eziama Obaire dị na Nkwerre, bụkwa nke dị n'ọgbọ nta vootu Ọlụ.

    Uche Nwosu

    Ihe niile dịka ọ na-agara ya were were n'ihi oké nkwado ọgọ ya bụ Rochas na-enye ya. A na-ele anya na ọ ga enweta mmeri na Nkwerre, nakwa kansulu ndị ọzọ dị iche iche n'ihi mbọ otu pati ya gbara site n'enyemaka ọgọ ya nwoke. O nwere ike inweta mmeri na NJABA, Nwangele, Ideato North, Ideato South nakwa OHAJI EGBEMA. Ihe mkpobi ụkwụ o nwere gụnyere oku a na-akpọ ka e nwetu mpaghara Owerri ka ha weghara ọkwa Gọvanọ, nakwa nhuta ụfọdụ na-ahụta ya dịka mbiaghachi ọchịchị nke ugboro atọ nke Rochas Okorocha. A na-ele anya na ọ gaghị adị chara ya mfe n'ihi na ya na Hope Uzodimma ga-alụ ya ị ji mara mbe abụọ nke bụ oke.

  15. Akpabio akwụsịla okwu gbasara 'oche ụlọomeiwu' ya n'ụlọikpe

    Aka chịburu Akwa Ibom steeti ma bụrụ onye omeiwu n'ụlọomeiwu ukwu bụ Godswill Akpabio, ewepụla akwụkwọ o tinyeburu n'ụlọikpe banyere ịgbagha azọtaghị oche na ntuliaka gara aga.

    Akpabio gwara ndị ntaakụkọ Channels TV nke a, kwuru na mwepụ a bụ ka ọ ghara imebi usoro ụlọikpe.

    Ọkaikpe Valentine Ashi nke ụlọikpe ukwu nke Abụja, kwukwara na o wepụrụ ya bụ akwụkwọ.

    Akpabio

    Ebe foto si, Facebook/Akpabio

  16. EFCC anwụchiela onye na-ejikọta akpa ego Imo steeti

    Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka na Naịjirịa bụ EFCC, nwụchiri Uzoho Casmir bụ onye na-ejikọta akpa ego Imo steeti na mgbede a.

    Ebubo ha boro ya bụ na o nyerela Rochas Okorocha bụ gọvanọ Imo steeti aka izuputa naịra otu ijeri na nde ise (N1.05bn), maka ntuliaka ọkwa gọvanọ a ga-eme echi.

    Dịka ụlọntaakụkọ Punch si kwuo, ndị EFCC akpachiela akpa ego ebe e tinyere ego ndị ahụ.

    Rochas

    Ebe foto si, Rochas

    Ka BBC Igbo kpọtụrụ Ebere Nzewuji bụ ọnụ na-ekwuchitere Okorocha n'ekwentị gbasara akụkọ a, o kwuru na ọ nụbeghi maka ya.

    Ọ gwakwara onye ntaakụkọ anyị na ọ ga-ebu ụzọ n'ọnụ onye e boro ebubo, tupu o kwuo ihe ọbụla maka ya.

    BBC Igbo kpọkukwara Tony Orilade, ọnụ na-ekwuchitere EFCC, o kwukwara na ọ bụ eziokwu na ndị otu ya nwụchiri Uzoho.

  17. Gere akụkọ ga-amasị gị taa n'otu nkeji

  18. Sonye BBC Igbo ebe a ịmata ka e si akwado ntuliaka na mpaghara ọwụwa-anyanwụ

  19. Họpụtanụ naanị ndị APC n'ọrụ ọkwa ọchịchị - Aisha Buhari

    Aisha Buhari

    Ebe foto si, APC

    Nkọwa foto, Aisha Buhari bụ nwunye onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari anaghị atụ egwu ikwu uche ya

    Nwunye onyeisiala Naijiria bụ Aisha Buhari adụọla di ya bụ Muhammadu Buhari na ndị APC ọdụ ka ha họpụta ndị bụ ndị patị ahụ n'ọrụ ọkwa ọchịchị.

    Aisha kwuru nke a ụbọchị Tọọzde n'ọgbakọ ọ kpọrọ iji kelee ndị tụnyere ha vootu n' amaegwuregwu Daura Staduim.

    O kwuru na iwu APC kwuru sị a na-eke ọrụ, ka e nye ndị doro anya na ha bụ ndị otu pati ha ọrụ.

    O kelere ndị ụmụnwaanyị nakwa ndị ntorobịa maka vootu ha tụnyere Buhari ma kwe ha nkwa na ọ ga aga n'ihu idozi Naijiria.

  20. Gọvanọ Edo steeti ekwela ndị Igbo bi na steeti ya oke nkwa, Gọvanọ Godwin Obaseki zutere ndị Igbo na-azụ ahịa na steeti ya igosi ọṅụ ya maka nkwado ha na-enye ya.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

    Skip X post, 4
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 4