Aka na-achị Ebonyi steeti atụọla vootu ya.

Etu ntuliaka ọkwa gọvanọ na nke ụlọomeiwu nke steeti si aga n'Ọwụwa-Anyanwụ.
Uche Akolisa and Chimamaka Ihenacho

Hope Uzodinma na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti n'okpuru patị APC atụọla vootu nke ya.
Uzodinma na Nwosu bụ mmadụ abụọ ndị mmadụ na-atụ anya ka ha ma onye ga-enwe mmeri na ntuliaka a.

Oluremi Tinubu bụ omeiwu nakwa nwunye isi a hụrụ kwaba okpu ndị APC bụ Bola Ahmed Tinubu, kwuru na "ha" enweghị ntụkwasị obi ebe ndị Igbo nọ.
O kwuru nke a ka ọ na-agwa otu onye bịara ịtụ vootu okwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
O mechara kwuo maka ndị a ga-enye ego maka ịtụ vootu.
Lee ya n'ihe nkiri a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Sinetọ Ayogu Eze bụ onye na-achọ ọkwa gọvanọ n'okpuru patị APC ekwuola na onweghị ntuliaka ziri ezi mere taa n'Enugwu steeti.
Ọ gwara ndị ntaakuko na ọ gwala ndị otu ya ka ha sepụ aka na ntuliaka a, makana aha ya adịghị n'akwụkwọ ibinye aka nke INEC.

O kwuru na n'agbanyeghi na ụlọikpe kpebiri ka e tinye aha ya na y bụ akwụkwọ, na Inec gbara isi akwara jụ ime ya.
O kwuru na ọ dị ka Inec anarala aka azụ, ma kwuo ka a kagbuo ntuliaka a.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Ọtụtụ Ndigbo bị na Legọs apụtaghị
Ọdọ atụmvootu n' otụtụ mpaghara ebe Ndịgbo bịjuru dịka Oshodi, Okota,Surulere, Orile,Ajegunle,Amukoko dị na Legọs dị ka ebe udele nwụrụ n'ihi na ha apụtaghị tụọ vootu.
Ụfọdụ ndị kara obi pụtara Legọs kọwara na ọ bụ egwu ọgbaghara ime dịka o siri mee na nke ọkwa onyeisiala nakwa wuruwuru ha sị na e mere na ntuliaka ahụ mere ha jiri hara ịnọ n'ụlọ.

Ndị agboro abatala otu ebe a na-eme ntuliaka n'Ilorin, Kwara steeti, kupuo isi ndị na-anọchịte patị nọ n'ebe ahụ.
Onweghi onye ma ndị otu ndị agboro a bụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ nnukwu ahụ na mkpamkpa a.
Ndị enyemaka eburula ndị merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ.

Onye chibụru dịka onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan na nwunye ya bụ Patience atụọla vootu ha Otuoke n'ime Bayelsa steeti.

EFCC edeela n'akara Twitter ha na ha nwụchiri otu nwoke fọnyere nnukwu ego n'ime akpa na Benue steeti taa.
Ha dere na nwoke a kwuru na ego a bụ maka ikesa dịka ego a ga-ejizụọ vootu ndị mmadụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mana tupu ha ga-ejide nwoke a nke ọma, ndị omekome batara ebe ahụchụsasịa ọnyeọbụla nọebe ahụ.
Ha ekwughi ebe ego ahụ dị ugbua na ngwụcha mkpamkpa a.
Ifeanyi Okowa na-achị Delta steeti atụọla vootu ya.
Ọ na-ele anya ịzọta oche ya maka ịchị agba nke abụọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Segun Adewale bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị ama ama na Legos dịka “Aeroland” amaala onye ntaakụkọ BBC akanti makana o setere ya na foto mgbe ọ na-ekesa ego oji ego vootu n'ebea na-eme ntuliaka na Legọs taa.
Adewale na-ekesa otu puku naira dịka ego nrụrụaka. Ndị agboro so Adewale n’azụ napụrụ onye ntaakụkọ BBC n’ekwentị ya na mkpamkpa a.
Ndị uweojii napụtaralaya ekwentị ya n'aka ndị agboro ahụ.
Ka gọvanọ Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi, tụchara vootu, anyị jụrụ ya ihe o bu n'obi maka mmeri ya.
O kwuru na o kpeela ekpere maka ya, ma gosi anyị 'chaplet' o ji mee ya bụ ekpere.
BBC gara ebe ọzọ a na-akpọ Obodoezi Square one, n’Amikwo Ọka n’Anambara Steeti.
Ebe a ka Emeka Igwe bụ onye na-azọ ọkwa nnọchiteanya Ọka Saụt 1 n'ụlọomeiwu Steeti Anambara, na-atụ vootu ya taa.
Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ ngo INEC nọ na-ahazi ebe ha ga-arụ ọrụ.
Ndi ga-atụ vootu nọ n’akụkụ na-eche ka ntuliaka malite n'uju.

Uche Nwosu bụ ọgọ Rochas Okorocha ebinyela aka n'akwụkwọ nke ya n'Eziama Obire na Nkwerre n'Imo steeti.
Uche gwara ndị ntaakụkọ na obi ya kwụsịrị ike na ọ ga-enwe mmeri.

Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia steeti na nwunye ya bụ Nkechi Ikpeazu eruola Umuobiakwa n'Obingwa n'ime Abia State maka ibinye aka n'akwụkwọ.
O kwuru na nnukwu ọrụ dị n'aka ndị uweojii makana akụkọ na-ekwu na o nwere ndị na-eme wuruwuru ịzụ vootu ugbua.

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
N'akụkụ ebe a na-atụ vootu n'Anike n'ime Onicha, Ebonyi steeti, o nwekwara ndị na-akpụ blọk eji arụ ụlọ nọ nso ebe ahu.
Anyi gbakwara ha ajụjụ ọnụ. Otu n'ime ha si na ndi na-eme ya bụ ndorondoro ochichi amaghi ndi ha bu.

Otu Nwaanyị a aha ya bụ Onyedikachi Chidi na nwa ya gara ugbo n'ụtụtụ a.
Chidi bụ nwaafọ Mbubo Isiala Ngwa Nọt n'Abia steeti kwuru na ọ ga-aga ibinya aka n'akụkwọ ma ya rụcha ọrụ ya n'ụgbo.