Governorship Election Results: E wepụla Rochas oche n'otele n'Imo steeti

Etu ntuliaka ọkwa gọvanọ na nke ụlọomeiwu nke steeti si aga n'Ọwụwa-Anyanwụ.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa and Chimamaka Ihenacho

  1. A gbara igbe ntuliaka ọkụ na Ngọ Ọkpaala ka ọ bụ agbaghị?, Akụkọ si Ngọ Ọkpaala na-eru anyị ntị na-akọwa na a gbara igbe ntuliaka ọkụ maka 'wuru wuru'.

    Akụkọ ahụ kwuru sị na ndị ntoroọbịa Ngọ Ọkpaala ji iwe ọkụ gbaa otụtụ igbe ntuliaka ọkụ makana ha nụrụ kepu kepu na wuru wuru banyere na ntuliaka emere na mpaghara dị iche iche n’obodo ha.

    Igbe ntuliaka a gbara ọkụ

    Ebe foto si, Sunny Ndukwu

  2. APC na APGA gịnị na-ewe unu n'Abịa?, Ndị na-anọchite anya ndị APC na APGA ji iwe apụ n'ebe a na-eme mkpọpụta mpụtara n'Abịa steeti ugbua.

      • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
      • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist BBC News Igbo

    Ha kwuru na ha agaghị anabata mpụtara.

    Ndị Abịa na-aba mba
  3. Ndị Legọs amalitela ịkpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ, Onye ga-emeri na Legọs mgbe a ga-akpọcha?

  4. Ndị Abịa amalitela ịkpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ

    Okpuru Ọchịchị Bende

    APC :12171

    APGA 4238,

    PDP 7265

    _____________________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Umuahia-South

    APC 7606

    APGA 4502

    PDP 8257

    _____________________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Ukwa East

    : APC: 1447,

    APGA: 1935

    PDP: 3819

    ______________________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Ukwa West

    APC: 3140

    APGA :2270

    PDP: 11602

    ___________________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Umunneochi

    APC 7238

    APGA 3190

    PDP 7004

    __________________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Ugwunagbo

    APC: 1865

    APGA: 1054

    PDP: 22084

    ___________________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Osisioma

    APC: 1981

    APGA :2298

    PDP: 19835

    ___________________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Isiala-Ngwa North

    APC: 2404

    APGA: 2084

    PDP: 19209

    _________________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Arochukwu

    APC 3819

    APGA 8924

    PDP 5070

    __________________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Isiala-Ngwa South

    APC :1569

    APGA: 5129

    PDP : 19672

    __________________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Obingwa

    APC: 3390

    APGA: 2679

    PDP: 78803

    ________________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Ikwuano

    APC :683

    APGA :301

    PDP: 564

    _________________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Isiukwuato

    APC :14146

    APGA:1696

    PDP: 3564

  5. Nkịta nọkwa nche n'Imo steeti, N'ebe a ga-anọ agụpụta mpụtara ntuliaka n'Imo steeti, nkịta ha kpọtara nkịta mkpọnimi ka ọ nọrọ nche.

    Nkịta nọ nche
  6. Ndị Enugwu amalitela usoro ngụpụta mpụtara ntuliaka, Lee ka e si akpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ n'Enugwu steeti

      • Onye dere ya, Ebere Ekeopara
  7. 'Anyị agaghị ekwe' - Ụmụnwaanyị Rivas steeti na-eme ngagharịiwe maka 'ndị agha'

    BBC nwetara ihe onyonyo na-egosi ka ụmụnwaanyị nọ na Rivas steeti si mee ngagharịiwe ikwu na ha achọghị wayo.

    Ụmụnwaanyị a si obodo Ogu/Bolo nọ na-eti "anyị agaghị ekwe", kwuru sị na ha achọghị ka aka enwe banye n'ofe gbasara ọgụgụ ntuliaka.

    Aha onyonyo, Governorship election results: Ụmụnwaanyị Rivers state achọghị wayo na mpụtara ntuliaka
  8. N'Abịa steeti, otu okwu ahụ ka a kpụkwa n'ọnụ

      • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
      • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist BBC News Igbo

    Onye ntaakụkọ BBC, nọ ebe a ga-anọ agụpụta mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ nke ndị Abịa steeti.

    Ndị ga-agụpụta ya bụ mpụtara abịarutebeghi.

    Abia collation center
    Abia collation center
  9. Ndị Enugwu na-echekwa ndị nke ha, Ndị Enugwu steeti na-eche ka ụlọọrụ Inec malite ịkpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ.

      • Onye dere ya, Ebere Ekeopara

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo kwụ chịm na-eche ka ọ malite

    Ndị na-eche mpụtara n'Enugwu
    Ebe a ga-anọ kpọpụta mpụtara
    Ndị na-eche mpụtara n'Enugwu
  10. Onye ga-emeri na Kwara? Chọpụta ebe a.

  11. Ndị Imo na-eche mpụtara ntuliaka, gịnị ji nkịta ọnwụ?, Imo steeti ebidobeghi ọnụọgụgụ vootu:

    Ugbua, onye ntaakụkọ BBC nọ n'ụlọọrụ Inec n’Owere na-eche ka e bido ịgụ vootu.

    Dịka o si kwụrụ ugbua, ụfọdụ ndị nchịkọta vootu bụ ndị Bekee kpọrọ "Collation Officers" nọ n'ụlọọrụ Inec na-eche ka a malite.

    Ndị ụlọọrụ Inec emepebeghi ụlọọrụ ha

    Mana kepu kepu BBC Igbo na-anụ bụ na ọgbaghara dapụtara n’Isiala Mbanọ ọzọkwa.

    Cheta na ọ bụ na mpaghara ahụ ka a gbara ụlọọrụ Inec ọkụ mgbe e mere ntụliaka nke Onyeisiala.

    Ndị na-eche ndị ụlọọrụ Inec n'Imo
    Nkọwa foto, Ndị na-eche ndị ụlọọrụ Inec n'Imo

    Otu onye nọ Isiala Mbanọ gwara BBC na ọ bụ nsogbu a mere ka ndị nchịkọta nọ mpaghara ahụ ghara ịbata Owere ugbua.

    BBC amabeghi mgbe a ga-ebido ọrụ nchịkọta vootu a.

  12. Gere akụkọ ga-amasị gị n'ụtụtụ a n'otu nkeji

  13. Ndị Ọka Saụt akpọpụtala ndị mmeri ha

    Onye na-akpọpụta mpụtara ihe a tụtara na ntuliaka ụlọomeiwu nke steeti maka ndị na-anọchiteanya Ọka Saụt dị n'Anambara steeti bụ Ọkammụta Virginia Ebere Ejiofor, kpọpụtara ihe a tụtara na nke Ọka Saụt nke abụọ n'ụlọọrụ Inec ụnyaahụ.

    Ọ kpọpụtara aha Okoye Pius Chukwuma nke APGA dịka onye meriri.

    Mpụtara Ọka Saụt 2:

    APC - 271

    APGA - 12,222

    PDP - 4,088

    SDP - 425

    YPP - 143

    Mpụtara ntuliaka
    Ọkammụta Ifeoma B Enweani
    Nkọwa foto, Ọkammụta Ifeoma B Enweani kpọpụtara mpụtara nke ndị Ọka Saụt 1

    N'Ọka Saụt kọnstituensi nke mbụ,

    APC - 516

    APGA - 11,480

    PDP - 7,718

  14. Unu abọọla chi? Daalụ maka isonye anyị ọzọ n'ụtụtụ a

    Onye nwere ntị, na-eji ya egere ndụmọdụ.

    Ilu
  15. Ihe ndị ndọrọndọrọ ji ego vootu

    Lee foto BBC na-egosi ụfọdụ ihe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ji ego vootu ndị mmadụ na Katsina steeti taa.

    Ogugo vootu na Katsina
  16. E bidola ngụkọ n'isi ụlọọrụ Inec n'Ọka

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ ebe ahụ na-ekwu na ndịọrụ nchekwa dị icheiche kwụ chịm n'ebe ahụ

    O kwukwara na ọ bụ vootu ndị si n'Akwa South 1 nakwa Awka South 2 ka a na-agbakọ ewepụ ugbua.

    Ọ bụkwa iji kwado maka mkpọpụta ikpeazụ a na-akwado ịme ka eji eme nke a.

    Ngụkọ vootu
  17. Uche Ogah tụrụ vootu nke ya taa.

    Foto anyị wetara ugbua na-egosi onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'Abia steeti n'okpuru APC bụ Uche Ogah ebe ọ na-atụ vootu ya.

    Ọ bụ n'Onuaku, Uturu, n'okpuruọchịchị Isuikwuato Abia State ka ọ tụrụ vootu ya.

    Uche Ogah

    Ebe foto si, Chima Obiwuru

    Uche Ogah

    Ebe foto si, Chima Obiwuru

  18. Lee ihe ụmụnwaanyị a mere ndị na-ekesa ego n'Ebonyi

    Aha onyonyo, Ihe ụmụnwaanyị Ebonyi na-ekwu
  19. Na Akpọtụ Ugbu A, Agbagbughi onye bịara ịlebanye anya na ntuliaka n'Enugwu

    Ndị uweojii n'Enugwu steeti ekwuola na onweghi onye nlebanye anya ntuliaka nwụrụ n'Enuwgwu taa.

    Ha kwuru na ọ bụ otu onye na-akwado Ayogu Eze ka nwoke ahụ nwụrụ bụ.

    Ha nyere aha nwoke ahụ dịka OsondU Odoh dị ebe afọ iri atọ.

    Akụko kwuru na ọ nwụrụ mgbe mbọ tụrụ ya gburu ya.

    Akụkọ kwuru na ọ bụ mgbe ndị ntorobịa na-eme ngaghrịwe gbasara Ayogu Eze ka nke a mere.

    Ngagharịwe be Ayogu Eze
  20. Nwaanyị amụọla nwa dịka o mechara ntuliaka

    Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ọ bụ n'obodo Rivas steeti ka ihe ọṅụ a mere.

    Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri etu ndị ọrụ ahụike abụọ siri kuru nwa ọhụrụ ahụ mgbe a mụchara ya.

    Ndị malitere ịṅụ ọṅụ mgbe nwa ya pụtara.