A na-emegide ndị Igbo na Legọs?
Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị amabeghị ndị ha bụ na-achụgharị ndị mmadụ na mpaghara Aguda dị na Legọs.
Ha kwuru na a na-achụpụ ndị Igbo makana ụjọ na-atụ ha na ha agaghị atụnyere APC.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe na-eme na Naijiria, ọkachasị n'Ọwụwa-Anyanwụ dịka Naijiria na-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu etiti.
Chimamaka Ihenacho and Uche Akolisa
Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị amabeghị ndị ha bụ na-achụgharị ndị mmadụ na mpaghara Aguda dị na Legọs.
Ha kwuru na a na-achụpụ ndị Igbo makana ụjọ na-atụ ha na ha agaghị atụnyere APC.
Kingsley Moghalu na-azọ ọkwa Onyeisiala emechaala tụọ vootu.
Mana Sinetọ Mao Ohuabunwa na-anọchite anya ndị Abịa Nọt n'ụlọomeiwu ukwu, ekwuola na ọ tụbeghi vootu.
Ohuabunwa kwuru na ebutebeghi ngwaọrụ e ji atụ vootu n'ọgbọ ntuliaka ya n'Arọchukwu.
Babatunde Fashola chịburu Legọs steeti ma bụrụkwa mịnịsta na-ahụ maka ọkụ ugbua, na nwunye ya bụ Abimbola bịara tụọ vootu na wọọdụ ya bụ G3, Unit E002, na 'State Junior Grammar School" nke dị n'ltolo dị na Surulere na Legọs.
Aka chịburu Abịa steeti na onye na-azọ oche n'ụlọomeiwu ukwu bụ T.A Orji, rutere ebe o kwesịrị ịtụ vootu mana isi apụtaghị.
Ndị ọrụ Inec ebutebeghi ngwaọrụ a ga-eji tụọ vootu.
Osote onyeisiala Naijiria bụ Yemi Osinbajo na nwunye ya bụ Dolapo atụọla vootu ha na Legọs.
O kwuru na ọ ma na ndị Naijiria ga-enye Buhari ikike ịchị ọzọ.
Gọvanọ Rochas Okorocha nke Imo steeti atụọla vootu na wọodụ ya bụ Ekenta "polling unit 2" n'obodo ya bụ Ogboko.
O kwuru na obi kwụsịrịya ike na ọ ga-emeri na ntuliaka a.
N'ebe ehihie, ndị agboro bidoro ọgbaghara n'ebe ụfọdụ Ndigbo bị na Legọs dịka Alafia Street dị n'Orile-Iganmu, baba-Ewe dị n'Ọkọta, ebe ha chụsasịrị ndị mmadụ buru igbe vootu a tụrụ atụ wụnye n'ọwa mmiri, ebe ha suru ụfọdụ ọkụ.
Nwa afọ Igbo bụ Rita Orji onye banyere n’afọ 2015 ịnọchite Ajeromi-Ifelodun n’Ụlọomeiwu Nta meriri na ward ya na 3 Swamp Street dị n’Ajegunle.
Kingsley Moghalu na-azọ ọkwa onyeisiala atụbeghi vootu makana ọ sị na ndị Inec abịaghị n'oge.
O dere na Twitter na ọ tụbeghi vootu na wọọdụ ya dị na Nnewi Nọt makana igwe e ji eme ntuliaka bụ "card reader", anaghị arụ ọrụ.
Onye ọzọ nọ n'Abagana dịkwa n'Anambara steeti, kwuru na a gwara ha na igwe ntuliaka anaghị arụ ọrụ.
O kwuru na ihe a akpasuola ndị pụtara isonye na ntuliaka iwe.
Atiku Abubakar ebinyela aka n'akwukwọ n'Ajiya n'ime Yola Nọt.
O kwuru na ọ ga-anabata onyeọbụla nwere mmeri na ntuliaka a; ma ọ bụ ya ma ọ bụghị ya.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo na-ekwu ugbua na ndị uweojii na ndị agha Naịjịrịa egbochiela ụzọ ndị ntaakụkọ na-arụ ọrụ n'Uburu dị n'Abakaliki.
Ndị nche a na-ekwu na onweghị onye ọbụla n'ime ha ga-arụ ọrụ ebe ahụ makana ha chọrọ ịma n'ezie ma ha bụ ndị ntaakụkọ INEC nyere ikike ịrụ ọrụ n'ebe ahụ n'ezie.
Ha na-ekwu nke a n'agbanyeghị na onye ntaakụkọ BBC gosiri ha akwụkwọ ikike ya dịka onye ọrụ ntaakụkọ.
Sonye anyị na Facebook anyị bụ BBC News Igbo.
Ntụliaka a nwere ike ịbụ nke mbụ ị na-esonye maọbụ ọ bụrụ na i meela ya ugboro ugboro, mana ị ma ihe ndị nwere ike ibutere gị nsogbu ebe ahụ?
Gbanarị ihe ise a:
1) Aghọgbula onye ọbụla na ị bụ onye ụlọọrụ Inec: Marakwa na aka kpara gị ka ị na-aghọgbu ndị mmadụ n'ụzọ a, ị ga-akwụ iwu otu nde naịra (N1m) maọbụ ị gaa mkpọrọ otu afọ.
2) Iji akwụkwọ mbinyeaka: E jide gị ka i ji akwụkwọ mbinye aka (ballot paper) nke ị na-enweghị ikike ijide, ị mara na ị nọ n'ezigbo ofe dị ọkụ.
3) Iji ngwaagha bịa: ị kwesịghị iji ngwa-agha maọbụ ihe nwere ike imerụ mmadụ ahụ bịa.
4) Inye onye ọzọ akwụkwọ ikike ntụliaka gị: Ị daala iwu ma inye onye ọzọ akwụkwọ ikike ntuliaka gị nke a na-akpọ "PVC" ka o were mee ntuliaka.
5) Iburu ngwaọrụ e ji eme ntụliaka: E jide gị ebe ị pụnarịrị ngwa ọrụ e kwesịrị iji eme ntuliaka, ị dabanyela n'ezigbo nsogbu.
Goodluck Jonathan bụ onye chịburu dịka onyeisiala Naijiria atụọla vootu nke ya n'Otuoke, Bayelsa steeti.
Jonathan kwuru na obi adighị ya ụtọ ka ntuliaka si aga.
O kwukwara na Naijiria kwesịrị igba mbọ hụ na a turu vootu n'ụdọ, nke ga-eme ka uwa nabata onye ọbụla ga-enwe mmeri na ntuliaka a.
Ka ọ dị ugbua, onweghị ndị ọrụ INEC ruterela na wọodụ 1 dị n'Ibeku East, n'okpuruọchịchị Umuahia Nọt nke Abia Steeti, ndị mmadụ apụtala ịtụ vootu kemgbe elekere asaa nke ụtụtụ, mana enwebeghi onye ọrụ Inec ọbụla a hụrụ anya.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo na-ekwu na obi agbawaala ọtụtụ ndị mmadụ pụtara n'ụtụtụ a na-eche ndị ọrụ INEC.