You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Election Result 2019: Mba Briten akwadola mmeri Buhari

Ihe na-eme na Naijiria, ọkachasị n'Ọwụwa-Anyanwụ dịka Naijiria na-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu etiti.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimamaka Ihenacho and Uche Akolisa

  1. Ndị nchekwa kwụsịrị ọgbaghara dapụtara n'Oshodi

    BBC Igbo kpọrọ otu onye bụ Emeka na-azụ ahịa n'akụkụ ebe ndị omekome nọ na-enye nsogbu, ka ọ kọwaa ihe ha na ije gara.

    O kwuru sị na ndị agboro wakporo ha n'ezie, mana ndị agha bịara nwụchie ụfọdụ ndị ma mee ka udo dị.

    O kwukwara na ha alaghachịla meghe ụlọorụ ha.

  2. Nwa Rochas Okorocha nwere okwu gbasara mmeri nna ya, Nwa Rochas nke bụ nwunye Uche Nwosu, kelere nna ya maka mmeri ya.

  3. Ngụkọ mpụtara ka na-aga ihu n'Abuja

    FCT

    AAC - 583

    ACPN - 48

    ANN - 652

    APC - 152, 224

    PDP - 259, 997

    YPP - 1,083

    _________________________

    Kwara

    AAC -

    ANN -

    APC - 308,984

    PDP - 138,184

    YPP - 140

    Ndị denyere aha: 1,401,895

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 489,482

  4. Sonye ebe a ịhụ mpụtara vootu niile a tụru maka ọkwa onyeisiala na Naịjirịa

  5. Akpọpụtawala vootu a tụtara n'Anambara

    Onitsha Nọt:

    APC: 1,220

    PDP: 33,597

    APGA: 559

    YPP: 48

    Vootu a tụrụ dị mma: 35,951

    Vootu a gụpụrụ: 982

    Vootu niile a tụrụ: 36,933

    ____________________________

    Aguata

    APC:1,955

    APGA:1,202

    PDP: 32,328

    YPP: 524

    Vootu a tụrụ dị mma: 36,963

    Vootu a gụpụrụ: 1,156

    Vootu niile a tụrụ: 38,119

    ____________________________

    Ekwusigo

    APC: 906

    APGA:816

    PDP: 23,194

    YPP: 448

    Vootu a tụrụ dị mma: 26,046

    Vootu akagburu: 750

    Vootu niile a tụrụ: 26,796

    _______________________________

    Idemmili Saụt

    APC: 2,220

    APGA: 876

    PDP: 17,039

    YPP: 35

    Vootu a tụrụ dị mma: 21,010

    Vootu akagburu: 813

    Vootu niile a tụrụ: 21,823

    _______________________________

    Ọgbarụ

    APC:1,044

    APGA:1,383

    PDP: 22,084

    YPP: 22

    Vootu a tụrụ dị mma: 25,500

    Vootu akagburu: 1,045

    _______________________________

    Orumba Nọt

    APC: 652

    PDP: 19,883

    APGA: 547

    YPP: 179

    Vootu a tụrụ dị mma: 21,706

    Vootu akagburu: 595

    Vootu niile a tụrụ: 22,301

  6. Ifeanyi Ubah anapụla Andy Ubah oche sineti, Ndị zọtara oche ụlọomeiwu ukwu n'Anambara

    N'oche ụlọomeiwu ukwu dị n'Anambara steeti, Uche Lilian Ekwunife na-azọ n'okpuru PDP meriri Victor Umeh na-azọ n'okpuru APGA n'Anambara Sentralụ.

    Stella Odua nke PDP zọtara oche ọ nọbu na ya n'Anambara Nọt, ebe Ifeanyi Ubah nke YPP meriri Andy Ubah nke APC iji zọta oche Anambara Saụt.

    Anambra Saụt:

    YPP: 87,081 (Ifeanyi Ubah)

    PDP: 52,462 (Chris Ubah)

    APC: 13,245 (Andy Ubah)

    APGA: 51,269 (Nicholas Ukachukwu)

    Anambra Nọt

    PDP: 113,989 (Stella Odua)

    APGA: 59,937

    APC: 11,995

    YPP: 1,024

  7. Amalitela ngụkọta mpụtara nke onyeisiala, Mpụtara vootu niile a tụrụ na gburugburu Naịjirịa

    EKITI STEETI

    ANN - 88

    APC - 219,231

    ACPN - 99

    PDP - 154,032

    YPP - 68

    Ndị denyere aha - 899,919

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 395,741

    _________________________________

    OSUN STEETI

    ACPN - 297

    ANN - 268

    APC - 347,634

    PDP - 337,377

    YPP - 189

    Ndị denyere aha - 1,674,729

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 732,984

    ________________________________

  8. Lee nwaanyị ugwu awụsa mbụ na-azọta oche ụlọomeiwu ukwu na ntuliaka 2019 a

    Aishatu Dahiru Ahmed (Binani) abụrụla nwaanyị mbụ si ugwu na-azọta oche ụlọomeiwu ukwu na ntuliaka afọ a.

    Ọ zọrọ n'okpuruọchịchị Adamawa Sentralụ.

    APC - 188,526

    PDP - 96,530

    ADC - 36,030

  9. Ihe a na-agụta n'Imo steeti

    IKEDURU

    AA: 102

    APC: 4708

    PDP: 20302

    YPP: 33

    Ndị denyere aha: 100,000

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 28,978

    Vootu niile a tụrụ: 27,180

    Vootu a tụrụ dị mma: 25,984

    Vootu a gụpụrụ: 1196

    ________________________________

    MBAITOLI

    AA: 31

    APC: 5,382

    APGA: 291

    PDP: 18,344

    YPP: 49

    Ndị denyere aha: 140, 361

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 27,802

    Vootu niile a tụrụ: 26459

    Vootu niile a tụrụ dị mma: 25,041

    Vootu a gụpụrụ: 1,418

    _______________________________

    ISIALA MBANO

    AA: 1,034

    APC: 3,965

    APGA: 2,036

    PDP: 11,804

    YPP: 9

    Ndị denyere aha: 95,104

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 21,265

    Vootu niile a tụrụ dị mma: 19,512

    Vootu a gụpụrụ: 1,753

    Vootu niile a tụrụ: 21, 265

    _____________________________

    ORSU

    APC: 1,143

    APGA: 669

    PDP: 8,913

    YPP : 08

    Ndị denyere aha: 49,259

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 15,330

    Vootu niile a tụrụ dị mma: 14,079

    Vootu a gụpụrụ: 1,144

    Vootu niile a tụrụ: 15, 330

    _____________________________

    E mechaala gụta vootu ndị Nkwerre dị ka:

    PDP: 5819

    APC: 5161

    _____________________________

  10. Saraki achọghị ịtụpụrụ onye APC napụrụ ya oche ọnụ

    N'akwụkwọ si n'aka Yusuph Olaniyonu bụ onye ndụmọdụ n'ihe gbasara mgbasaozi nye onyeisi ụlọomeiwu ukwu, Bukola Saraki ekwubeghi ihe ọbụla gbasara mmeri APC.

    O kwuru sị ndị mmadụ ewela akụkọ na-efegharị na Whatsapp na-ekwu na PDP na Saraki ebunyela ndị APC ụkpa ekele mmaka mmeri ha meriri.

    O kwukwara na a ga-emecha nụ olu Saraki taa.

  11. Rochas Okorocha abụrụla onye omeiwu

    Okorocha nwetara vootu 97,762 iji zọta oche n'ụlọomeiwu ukwu iji bụrụ onye ga-anọchite anya ndị Imo West.

    APC: 97, 762

    PDP: 63, 117

    APGA: 30, 932

  12. Ụlọọrụ Inec nke ise agbaala ọkụ, Nke gbara ọkụ n'Imo steeti emeela ya nke ise kemgbe a malitere ntuliaka 2019 a.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Orlando Ikeokwu, gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ụlọorụ Inec dị n'Isiala Mbano gbara ọkụ n'ezie, kama na ha amabeghị ndị mụnyere ya.

    O kwuru na Kọmishọna uweojii bụ Dasuki Galadanchi, enyela iwu ka e nyochaa ihe mere ma nwụta onye ọbụla ha chọpụtara mere ya.

    O kwukwara na ebupula ngwaọrụ e ji tụọ vootu n'ụlọorụ ahụ tupu ọ bara ọkụ.

    Enwekwaghị onye nwụrụ.

  13. A ka na-akpọpụta mpụtara n'Ebọnyị

    Onye ntaakụkọ BBC bụ Chris Okereke chọpụtara na a kpọpụtakwuru mpụtara si n'okpuruọchịchị abụọ ka a sị ụfọdụ ndị laa n'abalị.

    Ọ fọrọ okpuruọchịchị atọ ka a kpọzuo.

    ____________________________________

    Izzi

    APC: 9885

    PDP: 23760

    Ndị denyere aha: 149196

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 36933

    ____________________________________

    Abakiliki

    APC: 8202

    PDP: 18410

    Ndị denyere aha: 147440

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 30592

    Vootu niile a tụrụ: 29466

    Vootu a tụrụ dị mma: 27530

    Vootu a gụpụrụ: 1936

    __________________________________

    Ikwo

    APC: 20768

    PDP: 16267

    Ndị denyere aha: 118117

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 43944

  14. Ndị Ebọnyị na-akpọpụtakwa mpụtara ha n'ụtụtụ a

  15. PDP emeriela APC n'Enugwu

    Nchịkọta vootu niile a tụtara n'Enugwu steeti:

    PDP: 355,553

    APC: 54,423

    APGA: 1618

    YPP: 1379

    Mmadụ niile debara aha: 1,935,168

    Mmadụ niile a nabatara ịtụ vootu: 452765

    Nkanu West,

    APC: 5500

    APGA: 18

    PDP: 16982

    YPP: 47

    Ndị denyere aha: 95046

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 24111

    Vootu niile a tụrụ: 24111

    Vootu a tụrụ dị mma: 22894

    Vootu a gụpụrụ: 1217

    _____________________________

    Udi

    APC: 2871

    APGA: 164

    PDP:24544

    YPP: 190

    Ndị denyere aha: 137237

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 31618

    Vootu niile a tụrụ: 31618

    Vootu a tụrụ dị mma: 28631

    Vootu a gụpụrụ: 2987

    ______________________________________

    Nsukka

    APC: 2922

    APGA:32

    PDP: 46265

    YPP: 210

    Ndị denyere aha: 187628

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 53769

    Vootu niile a tụrụ: 53769

    Vootu a tụrụ dị mma: 50547

    Vootu a gụpụrụ: 3222

    ____________________________________

    Udenu

    APC: 1601

    APGA: 7

    PDP: 27938

    YPP: 40

    Ndị denyere aha: 125184

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 31764

    Vootu niile a tụrụ: 31764

    Vootu a tụrụ dị mma: 30056

    Vootu a gụpụrụ: 1708

    ____________________________________

    Igboeze Nọt

    APC:1983

    APGA: 7

    PDP: 21693

    YPP: 50

    Ndị denyere aha: 196637

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 25743

    Vootu a tụrụ dị mma: 24083

    Vootu a gụpụrụ: 1660

    Vootu niile a tụrụ: 25743

  16. Enugu amalitela ngụpụta mpụtara n'ụtụtụ a

    Chimaroke Nnamani zọtakwara oche nke ya n'ụlọomeiwu ukwu.

  17. Ndị mba Amerịka etinyela ọnụ na ntuliaka Naịjiria, Chris Smith na-anọchite anya New Jersey n'ụlọomeiwu mba Amerịka tinyere ọnụ.

  18. Ekweremadu na-ekele ndị tụnyeere ya vootu o ji merie

    Mmeri Ike Ekweremadu meriri emeela ka ọ bụrụ onye mbụ si ọwụwa-anyanwụ ga-azọta oche n'ụlọomeiwu ugboro ise na-espụghị aka.

  19. Kingsley Moghalu na-ekele unu ndị na-akwado ya

    O kelekwara ndị so rụọ ọrụ Inec nakwa ndị ọzọ.

  20. Gere akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa n'otu nkeji