You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Election Result 2019: Mba Briten akwadola mmeri Buhari

Ihe na-eme na Naijiria, ọkachasị n'Ọwụwa-Anyanwụ dịka Naijiria na-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu etiti.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimamaka Ihenacho and Uche Akolisa

  1. Gbadokwa anya!, Mara nke bụ nke tupu i kwenye na mpụtara a na-akpọ aha.

    Gbadokwa anya ma chere mgbe ngalaba Inec gụpụtara mpụtara (result) ihe a tụtara na vootu tupu i kwuwe onye meriri na ntuliaka, makana mpụtara adịgboroja na-efegharị.

    N'otu aka ahụ, BBC Igbo ga-agbalị iwetara gị nke ndị ntaakụkọ anyị nọ ebe a gụpụtara ma hụ n'anya.

  2. Unu abọọla chi, anyị awụchiela ọzọ

    Dịka e mechara ntuliaka ụnyaahụ, onye ọbụla na-eche aka ịghọrọ ihe ga-eme taa.

    A ga-akpọpụta mpụtara taa ka ọ bụ na agaghị akpọpụta ya? Chere aka ghọrọ ihe ga-eme taa, ebe a.

  3. Anyị emechiela taa.

    Daalụ nụ maka etu unu siri sonye anyị taa.

    Anyị ga-amalite ọzọ echi dịka mpụtara dị icheiche na ntuliaka a ga-ebido ịpụta.

    Kachifo!

  4. Buhari emeriela Atiku n'ọgbọ ntuliaka ya n'Adamawa

    Dịka agụkọchara vootu, ihe pụtara bụ na Buhari nazọ ọkwa n'okpuru APC meriri Atiku n'azọ n'okpuru PDP n'ọgbọ ntuliaka Atiku nke dị n'Adamawa.

    Ọ pụtara

    APC - 186

    PDP -167

  5. Ngụkọ vootu na-eme n'Akwakụma n'Imo steeti

    Dịka ha tụnyechara vootu, ndị mmadụ chere ka ndị ọrụ ngalaba Inec kpọpụta ọnụọgụgụ vootu na otu ndọrọndọrọ meriri n'Akwakuma dị n'Owere.

  6. Ndị ọrụ ngo Inec na-enweta onwe ha n'Anambara, Igbo na-asị "ọ rụọ, o rie". Ya ka ndị ọrụ Inec a na-eme.

  7. Agụkọwala vootu n'Abịa steeti

    N'ọgbọ ntuliaka Aba Town hall wọọdụ 12 nke dị n'okpuruọchịchị Aba Saụt dị n'Abia Steeti, a gụkọwala ihe a tụtara.

  8. Ọ ka na-eme ụfọdụ ndị obi abụọ maka isonye na ntuliaka taa

  9. Nigeria Decides: A si anyị gaa n'obodo anyị gaa tụọ ntuliaka

    Ndị Igbo pụtara ịtu vootu na Legọs etiela mkpu mkpagbu na nchụpụ a chụrụ ha na Legọs.

  10. Ebidola ịgụ vootu n'Enugwu, Imo na Anambara

    Akụkọ na-apụta ugbua na-ekwu na amalitela ịgụ vootu na wọọdụ dị iche iche n'Enugwu, Imo na Anamabara.

  11. Ihe Nnamdi Kanu kwuru maka Ịtụ vootu taa, Kanu tinyere ọnụ ya na Twitter, ebe ọ gwara ndị na-akwado Biafra mkpa ọ dị na ha tụru vootu taa.

  12. Ken Erics, Chike Ukaegbu na ndị ọzọ atụọla vootu ha.

  13. Okota: A gbaala ngwa ntuliaka ọkụ na Legos

    Ndị mmadụ emeela ngagharịwe maka mmaja a majara ha n'itu vootu na mpaghara Okota na Aguda Legọs steeti; ebe a gbara ụfọdụ ngwa ntuliaka ọkụ.

  14. N'Ebonyi, ọgbọ ntuliaka ụfọdụ tọgbọ chakoo, N'ụzọ Gunning, dị n'Ebonyi, ndị ọụ Inec na-eche ka ndị mmadụ bata bịa tụọ vootu.

  15. Ahaziwela vootu a tụrụ n'Agulu, Anambara steeti

  16. Chike Ukaegbu atụbeghi vootu

    Chike Ukaegbu na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati AAP, ekwuola na ọ tụbeghi vootu makana ndị Inec abịaghị n'oge.

  17. Okota: Joe Igbokwe azarala ọnụ APC na Legọs

    Mgbe BBC Igbo gbara Igbokwe ajụjụ ọnụ gbasara ndị Igbo na-eti mkpu mmegide n'ọtụtụ ebe na Legos, O kwuru na ọ bụghị eziokwu.

    Igbokwe kwetara na ọ hụrụ ya bụ ihe na soshal midia mana kwuo na ndị mmadụ na-atụ asị.

  18. Ndị uweojii agbatarala ndị Aguda, Surulere ọsọ enyemaka

    Ndị uweojii eruola Aguda, Surulere Legọs ebe akụkọ na-ekwu na ndị omekome chụrụ ndị Igbo chọrọ ịtụ vootu ọsọ ụkwụ eruola.

    Ndị Igbo bi na mpaghara ebe ahụ batara soshal midia taa na-akwa arịrị na ndị omekome a chụrụ ha ọsọ makana ha chọrọ ibinyere pati ọzọ aka n'akwụkwọ ha.

  19. INEC adọtiala oge ịtụ vootu taa

    INEC ekwuola na ha ga-eji elekere ole mefuru were dọtị oge ndị mmadụ ga-eji tụ vootu ha taa ebe niile na Naịjirịa.

    Ọnụ na-ekwuchiri INEC bụ Festus Okoye kwụrụ na INEC kwetara na ọtụtụ nsogbu malitere na-ebe dị iche iche oge ntuliaka bidoro.

  20. Igwe mmadụ apụtala n'Ọka