You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Election Result 2019: Mba Briten akwadola mmeri Buhari

Ihe na-eme na Naijiria, ọkachasị n'Ọwụwa-Anyanwụ dịka Naijiria na-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu etiti.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimamaka Ihenacho and Uche Akolisa

  1. Mpụtara ntuliaka n'Enugwu

    Okpuru Ọchịchị Oji River

    APC: 1487

    ANDP: 1

    APGA: 315

    PDP: 14893

    YPP: 19

    Vootu niile a tụrụ: 18815

    ______________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Igbo-Etiti

    APC: 3045

    APDA: 29

    APGA: 121

    PDP: 23941

    DPP : 13

    GDPN : 62

    YPP: 19

    Ngụkọ vootu a tụrụ dị mma: 24569

    Vootu a gụpụrụ: 1339

    ____________________________________________________

    Enugwu-North

    PDP: 24921

    APC: 1825

    AAC: 18

    ACPN: 26

    ANN: 49

    APA 211

    APGA 33

    Vootu niile a tụrụ: 187974

    ___________________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Ezeagu

    PDP: 15526

    APC: 3103

    APGA: 166

    Vootu niile a tụrụ : 19909

    Vootu niile a tụrụ dị mma: 19031

    ___________________________________________

    Ngụkọ vootu Enugwu-South

    Vootu niile a tụrụ:30494

    Ngụkọ vootu dị mma: 28856

    Vootu a gụpụrụ: 1638

    _____________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Anịnri

    PDP : 19062

    APC : 1462

    PPA : 30

    AAP: 02

    SDP: 01

    Vootu niile a tụrụ: 21973

    Ngụkọ vootu dị mma: 21109

    Vootu a gụpụrụ: 864

    Okpuru ọchịchị Igboeze North

    APC – 4931

    Apga 17

    PDP- 16481

    PPA - 47

    YPP – 13

    Vootu a tụrụ dị mma -21935

    Vootu ndị a kagburu – 3979

    Vootu niile - 25914

    Okpuru ọchịchị Enugu East

    APC – 3291

    Apga 20

    PCP 205

    PDP- 22946

    Vootu ndị dị mma -26929

    Vootu ndị a kagburu –1947

    Vootu niile a tụrụ - 28876

    Okpuru ọchịchị Uzo Uwani

    APC: 4868

    APGA: 30

    PDP: 13850

    Ypp:5

    Vootu ndị dị mma - 19017

    Vootu ndị a kagburu – 1185

    Vootu niile a tụrụ - 20202

  2. Ntuliaka gara nke ọma - Yakubu, onyeisi Inec

    Onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu ekwuola na ntuliaka e mere ụbọchị SatỌde gara nke ọma.

    O kwuru na Inec enyochala otu ihe siri gaa na nsogbu e nwere were gbanwe oge ntuliaka ebe ndị e nwegara nsogbu.

    O kwuru na n'ezie e nwere ebe e nwere nsogbu n'igwe 'card reader' na steeti ụfọdụ na amanyeghị mbọ ịhazi ya.

    O kwukwara na ebe ụfọdụ na ndị ọrụ Inec abịaghị n'oge.

    O kwukwara na o nwere ebe ndị e nweghị atụmvootu n'ihi nsogbu igwe e ji atụ vootu maọbụ ọgbaghara.

    O gara n'ihu kwuo na nke a mere na steeti ndị a : Abia, Bayelsa, Benue, Zamfara, Plateau, Sokoto, FCT, Rivers, Imo nakwa Legọs.

  3. Mpụtara ntuliaka n'Imo, Imo steeti ga-alaghachịta n'elekere itoolu nke ụtụtụ Monde.

    Lee ihe na-eme n'ime dịka o si aga n'ebe a:

    Mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala dịka Inec siri kpọpụta:

    Ehime Mbano

    AA : 384

    ACPN : 08

    APC : 7, 784

    APGA : 455

    PDP : 14, 669

    YPP : 11

    Ndị denyere aha: 74, 329

    Ndị a nabatara ịtụ vootu : 26, 314

    Vootu niile a tụrụ dị mma: 24, 289

    Vootu niile a tụrụ : 23, 523

    Vootu a gụpụrụ : 1, 234

    __________________________________________________________

    Ọkpụrụ Ọchịchị Aboh-Mbaise

    AA : 52

    ACPN : 05

    APC : 5, 789

    APA: 266

    APGA : 283

    PDP : 33, 476

    YPP : 15

    Ndị denyere aha: 98, 017

    Ndị a nabatara ịtụ vootu : 46, 085

    Vootu niile a tụrụ dị mma: 44, 052

    Vootu niile a tụrụ : 45, 508

    Vootu a gụpụrụ : 1, 456

    ________________________________________________________________

    Ọkpụrụ Ọchịchị Owerri-West

    AA : 77

    ACPN : 06

    APC : 3, 173

    APGA : 232

    PDP : 16, 002

    YPP : 78

    Ndị denyere aha : 91, 069

    Ndị a nabatara ịtụ vootu :21, 865

    Vootu niile a tụrụ : 21, 404

    Vootu niile a tụrụ dị mma: 20, 279

    Vootu a gụpụrụ : 1, 125

    ___________________________________________________________

    Ọkpụrụ Ọchịchị Orlu

    AA : 89

    ACPN : 24

    APC : 5, 875

    APGA : 358

    PDP : 11, 292

    YPP: 21

    Ndị denyere aha : 91, 438

    Ndị a nabatara ịtụ vootu : 38, 636

    Vootu niile a tụrụ : 20, 059

    Vootu niile a tụrụ dị mma: 18, 639

    Vootu a gụpụrụ : 1, 419

    Ngọr/Okpala

    AA : 31

    ACPN : 03

    APC : 4, 058

    APGA : 237

    PDP : 13, 412

    YPP : 08

    Vootu niile a tụrụ: 19, 358 Vootu niile a tụrụ:

    Vootu a tụrụ dị mma: : 18, 118

    Vootu a gụpụrụ : 1, 240

    Ndị denyere aha: 70, 116

    Ndị a nabatara ịtụ vootu : 19, 561

    ________________________________________________________

    Ahịazụ-Mbaise

    ACPN: 02

    ANRP : 43

    APGA : 328

    APC : 2, 727

    PDP : 18, 866

    YPP: 14

    Ndị denyere aha: 92, 326

    Ndị a nabatara ịtụ vootu : 27, 319

    _________________________________________________________

    Ehime Mbano

    AA - 384

    ACPN - 08

    APC - 7,784

    APGA - 455

    PDP - 14,669

    YPP - 11

    Owerri-Municipal

    APC : 1, 397

    APGA : 478

    PDP : 12, 528

    Ndị denyere aha : 117, 060

    Ndị a nabatara ịtụ vootu : 15, 548

    ________________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Nkwerre

    APC : 6,161

    PDP : 5,819

    PCP : 58

    Vootu niile a tụrụ: 13255

    Vootu a tụrụ dị mma: 12519

    Vootu a gụpụrụ: 736

    _____________________________________________________

    Isialangwa-South

    AA : 2

    APC: 3161

    APGA: 823

    PDP: 12467

    SDP: 33

    YPP: 25

    ______________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Umuahia-South

    PDP: 9539

    APC: 5831

    ______________________________________________________

    Ezinihitte Mbaise

    PDP : 21605

    APGA: 3185

    SDP: 63

    APC: 02

    ______________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Nwangele

    APC : 4,233

    APGA: 352

    PDP: 7,803

    ______________________________________________________

    Oru-East

    APC: 10,383,

    PDP: 6407

    PCP: 64

    AA: 56

    ______________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Isu

    PDP : 8673

    APC: 6487

    APGA: 240

    YPP: 14

    AA: 16

    Vootu niile a tụrụ: 15737

    Vootu a gụpụrụ: 1093

    Vootu niile dị mma: 16827

    ________________________________________________________

    Okpuru Ọchịchị Oguta

    Ka ọ dị ugbua, onye nnọchịte APC na-eme mkpọtụ. Ọ chọrọ ịma ihe mere e jiri kagbu mpụtara si wọọdụ abụọ.

    A gwara ya chere ka a kpọpụcha cha ihe mere.

    PDP: 2996

    APC: 2296.

    APGA: 76

    AA : 72

  4. N'Abia, onwebeghị ihe na-eme n'Inec

      • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
      • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist BBC News Igbo

    Mana a chịkọtawala makwa na-agụkọ vootu atụrụ na Ndume Ward 3 PU21 and PU22 n'Okpuru Ọchịchị Umuahia-North, Abia steeti bụ ebe e mere ntuliaka n'ụtụtụ a.

  5. E mechabeghị nchịkọta mpụtara ntuliaka n'Enugwu

      • Onye dere ya, Ebere Ekeopara

    INEC amalitebeghị nchịkọba ikpeazụ nke votu atụrụ ụnyịahụ, february 23 Ebe edobere maka ya bụ mmemme ka tọgbọọ chakoo.

    Onye na-ekwuchitere INEC ọnụ ha n'Enugwu bụ mazị Pius Eze gwara BBC n' ekwe ntị na e nwebeghị Collation Officer nke ọkpụrụ ọchịchị a hụrụ. Ihe ọpụtara bụ na rule mgbe ndị isi collation officers na Local Gọmenti jiri rute na ụlọ ọrụ INEC ka a ga-agụpụta ya. Ọtụtụ ndị nta akụkọ dị iche iche wụsara na eche .

  6. Soro anyị 'live' na Facebook

    Maka ịwetara gị ihe na-eme na mpaghara dị iche iche n'ọnụ Ndị ntakụkọ anyị nakwa nkọwa ndị ọnụ na-eru n'okwu, soro anyị na Facebook ebe a:

  7. E gburu mmadụ atọ n'Ebọnyị ụnyaahụ

    A ka na-eche mpụtara ntuliaka e mere n'Ebọnyị steeti n'isi obodo ha bụ Abakaliki.

    Mana ozi onye ntakụkọ BBC Igbo bụ Chris Okereke wetara anyị na-ekwu na e gburu mmadụ atọ ụnyahụ n'ime ọgbaghara so ntuliaka.

    Ndị uweojii na steeti ahụ kwuru n'ezie na nke mere ma kwụkwa na ha gbara mmadụ abụọ a na-enyọ enyo na ha so na ndị omekeome mere nke a.

    Na Kogi, nddị uweojii kwuru na e gbukwara mmadụ atọ.

    Ọ nụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ William Aya kwuru na e gburu mmadụ abụọ n' obodo Anyigba nakwa Odolu ụbọchị ntuliaka, ebe ndị bu egbe gbagburu onye uweojii na-echekwa onye nnyemaka ugwu Gọvanọ Kohgi n'Okene n'abalị foro ụbọchị ntuliaka.

  8. "Mr Demola" anwụghị na Legọs, ọ na-anata ọgwụgwọ

    Otu nwoke kepu kepu kwuru ụnyaahụ na e gburu n' ọgbaghara dapụtara na ntuliaka e mere n'Agọ ,Ọkọta na Legọs anwụghị.

    Nwoke ahụ a kpọrọ 'Mr Demola' nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ ugbua.

    Kepu kepu anyị nụrụ bụ na ọ bụ ndị Igbo kpọgara ya ụlọọgwụ.

    Okwu ọnwụ ya kpalitere mmụọ ụfọdụ ndị Yoroba kwuru na ha ga-abọ ọbọ megide Ndigbo bi na Legọs ọkachasị ndị bi na mpaghara Okota, Aguda, Oshodi, Amuwo nakwa Ajegunle.

  9. Gịnị na-ese n'ụlọọrụ Inec n'Abịa?

    Dịka onye ntaakụkọ BBC si hụta, nwoke a yi akwa ọbara ọbara hụrụ ebe a na-edehie ihe n'ụlọ ebe a na-achịkọta mpụtara ihe a tụtara na ntuliaka nke ndị ụlọomeiwu ukwu na nta, wee kwulite okwu maka ya.

    Ihe o kwuru mere ka ha wee iwe ma jụọ ya ihe ọ na-eme n'ime ebe ahụ.

    Iwe ahụ ka ha ji dọrọ ya, dọpụ ya ezi.

    Gee nti nụrụ ihe ha na-ekwu:

  10. Ndị Imo na-eche nchịkọta mpụtara

    Foto Chiagozie Nwonwu bụ onye ntaakụkọ BBC nọ n'Imo steeti zitere na-egosi ebe a ga-anọ achịkọta ihe a tụtara na vootu n'Imo steeti.

  11. Amalitela ntuliaka n'Abịa steeti

    Foto Ikechukwu Kalu - onye ntaakụkọ BBC nọ n'Abịa steeti setere foto na-egosi ka ndị mmadụ na-atụ vootu na Ndume wọọdụ 3 U22 nakwa U21 n'Ụmụahịa Nọt.

  12. A na-emebi akwụkwọ ntuliaka n'Imo steeti

    Foto Paul Chukwu na-enyere BBC Igbo aka setere, gosiri ka ndị ụlọorụ Inec na-emebi akwụkwọ ntuliaka a na-ejighi mee ntuliaka ụnyaahụ, n'okpuruọchịchị Owerri municipal.

  13. Ebe a ga-anọ kpọpụta mpụtara n'Anambara na Enugwu steeti

      • Onye dere ya, Chioma Obianinwa
      • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ n'isi ụlọọrụ ndị Inec na-eche ka a kpọpụta ihe a tụtara n'Anambara steeti.

    Ebere Ekeopara, Onye ntaakụkọ BBC Igbo nke nọ n'Enugwu steeti zitekwara foto ebe a ga-anọ agụkọ nke steeti ahụ.

  14. Ndị Ebonyi ka na-agụkọ mpụtara nke ha

    Foto a si n'aka Chris Okereke nke BBC Igbo, na-egosi ka ndị ọrụ Inec na-agbakọ ihe ndị mmadụ tụtara na vootu ụnyaahụ.

  15. Mana na Borno, akwakọchaala ngwaọrụ Inec

    Ebe ụfọdụ ebe n'Abịa steeti na-akwado ime ntuliaka taa, ndị Borno steeti emechaala, kwakọrọ akpa ha na-achọ ịla.

    Foto a si n'aka Abdou Halilou nke BBC Hausa.

  16. A ga-emegharị ntuliaka n'Ụmụahịa Nọt taa

    Onyeisi ụlọọrụ Inec n'Ụmụahịa Nọt bụ Ezinne Chiebonam gwara Ikechukwu Kalu nke BBC Igbo na ebugharịrị ntuliaka e kwesịrị ime na wọọdụ 3 nke Ndume .

    O kwuru na ebufetere ya taa makana akwụkwọ mpụtara nke ndị ụlọomeiwu ezughi ezu.

    Dịka onye ntaakụkọ BBC si kwuo, ndị na-anọchitere ndị pati ọzọ kwenyere n'ọnọdụ a, mana ndị nke APC na-ekwu ka e higharịa ya ma tụọ ya n'ụbọchị Mọnde bụ Febrụwarị 25 maọbụ Tuuzde bụ 26.

  17. Ụlọọrụ Inec ọzọ agbaala ọkụ, ndị NYSC merụrụ ahụ, Ọshụn steeti esonyela na steeti atọ ndị ọzọ gbara ọkụ

    Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị omekome bu egbe wakporo ụlọọrụ ndị Inec dị n'Ijebu-Jesha dị n'okpuruọchịchị Oriade dị n'Ọshụn steeti.

    Akụkọ kwuru na ndị omekome ahụ nọ na-agbali egbe n'ikuku batara n'isi ụtụtụ taa, gbaa igwe na-enye ọkụ latrik abụọ ọkụ nakwa ngwongwo e ji mee ntuliaka.

    Agbaje gwara BBC na ndị na-efe ala nna na-arụrụ ha ọrụ ngo labara n'ụlọọrụ ha n'Oriade, mgbe ndị omekome hụrụ ha, malite gbawa ha egbe.

    Kọmishọna uweojii na steeti ahụ bụ Abiodun Ige, gwakwara BBC na ihe a nụrụ mere na Ijebu-Jesha bụ ihe mere eme.

  18. Maka ndị merụrụ ahụ maọbụ nwụọ maka ntuliaka ụnyaahụ

    Fela Durotoye na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati AAN, na-akwa arịrị maka ndị ihe ọjọọ metụtara ka a na-eme ntuliaka n'ụbọchị Febrụwarị 23, 2019.

  19. Gere akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa n'otu nkeji

  20. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia, "#Atikuiswinning", "#Buhariiswinning"

    Ndị na-akwado mmadụ abụ a na-ekwu na ndị nke ha na-emeri, n'agbanyeghi na ụlọọrụ Inec akpọpụtabeghi mpụtara e kpokọtara.

    Ndị dị ka @IamJibbish kwuru sị ndị ọzọ chere afọ anọ ọzọ na-abịa tupu ha anwaa ọzọ.

    Ndị nke na-akwado Atiku dị ka @JetNigeria kwuru sị na Buhari merie ọzọ, na ọ gaghị agbatara ndị arịrịọ ọsọ enyemaka ruo mgbe afọ anọ gachara.

    Ebe ụfọdụ dị ka @Osifo_legit na-ekwu na n'agbanyeghi onye na-emeri, ọ bụ ihe mwute na Naịjirịa erubeghi ogo ime ntuliaka ga-aga sịrịrị werere.

    Mana @Belshagy sị ndị mmadụ chere ka Inec kpọpụta mpụtara tupu ha ekwuwe ndị meriri.