Eze Ndígbo Oshodi-Isolo bụ Reuben Ibeakama, onye tinyere ọnụ n'iweta udo na mpaghara ahụ gwara BBC Igbo na ya na ndị ndú ndị Yoruba akpaala ha were kwe nkwa udo ma rịọ Ndígbo ka ha mepee ọdọahia ha.
Ọtụtụ n'ime ha emeela ahịa ha oge BBC Igbo rutere mana egwu ekweghị ụfọdụ mepee,ebe ụfọdụ na-arụkwa ihe ndị e mebiri.
Cheta na ọ bụ n'ụzọ ụtụtụ Monde ka ọgbaghara dapụtara n'ahia Oshodi dịka ndị agboro na ndị ntorobia e chere na ha bu ndị Yoroba ji mma na osisi wakpọ ma chụsasia Ndigbo na- azu na-ahịa.
Ọnụ na-ekwuru APC na Legọs bụ Joe Igbokwe gwara BBC Igbo na aka ndị ndu pati ha na Legọs adịghị na ọgbaghara ahụ.
Ọ sịrị, ”O nweghị ezigbo mmadụ ga-asị ha gaa mee ihe a ha na-eme.“
Ọ bụghị iwu na ị ga-atụ nyere otu pati. Ọ bụ ọchịchị onyekwuouche anyị ka a no na ya.”
mbọ BBC gbara inweta uche ndị uweojii Legọs amịtaghị mkpụrụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Chike Oti azaghị ekwentị ya nke ọ na-aza ozi anyị zigara ya n'ekwenti.