You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Election Result 2019: Mba Briten akwadola mmeri Buhari

Ihe na-eme na Naijiria, ọkachasị n'Ọwụwa-Anyanwụ dịka Naijiria na-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu etiti.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimamaka Ihenacho and Uche Akolisa

  1. Okwu nnabata Buhari, Buhari kwuru okwu ka Inec kpọchara aha ya dịka onye meriri ntuliaka onyeisiala.

  2. Ude Buhari ga-ede na Naijiria afo anọ ọzọ

    Ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naijiria bụ Inec n'aha ịchafụ ekwuola na ọ bụ onyeisiala Muhammadu Buhari meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala maka afọ 2019.

    Buhari nke APC nwere vootu kachasị dịka o ji vootu dị 15,191,847 tipụ Atiku nke PDP onye nwetara vootu dị 11,262,978 anyammiri n'anya.

    Ndị niile denyere aha: 82,344,107

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 29,364,209

    Vootu niile a tụrụ: 28,614,190

    Vootu niile dị mma: 27,324583

  3. Tinubu azọziela isoro onyeisiala Muhammadu Buhari chịa

    Dịka Inec na-akpọpụtaa mpụtara ntuliaka onyeisiala e mere n'ụbọchị Satode, onye ndu pati ha bụ Bola Tinubu agala obi gọọmenti etiti isoro ya nụrịa.

  4. Mana ndị PDP anaghị achịkwa

    Mana ọ bụghị mmadụ niile na-enwe obi aṅụrị gbasara mpụtara a.

    Peter Obi kwuru na ụfọdụ ndị mmadụ enweghi ohere mee ntuliaka n'ụbọchị Satọde n'ihi nsogbu 'card reader.'

    PDP kwusiri ike na ọ bụghị vootu atụkọtara ka a kpọpụtara.

  5. E mebeghị eme, ndị APC aṅụrịwala

    Inec akpọbeghị onye meriri mana ndị otu APC na ndị na-akwado ebidola na-enwe anụrị.

    N'Ugwu Naijiria dịka abuja, Kano, Suleja nakwa Pọtakọt agba egwu na-eme mkpọtụ ọnụ.

    Ka ọ dị ugbua, Muhammadu Buhari nke APC nwere vootu kachasị na ntuliaka ebe o nwere vootu dị 15,191,847 ebe Atiku Abubakar nke PDP nwetara vootu dị 11,262,978.https://twitter.com/ayumen3k/status/1100567837394067456

  6. A na-agbagha mpụtara Rivers

    Ndị o metụtara na-agbagha mpụtara si Rivas steeti.

    APC: 150,710

    PDP 473,971

    Onye 'collation officer' nke steeti ahụ kwuru na e gbochiri ụfọdụ ndị ọrụ atụmvootu (electoral officers) ibuga ngwaọrụ ntuliaka na wọọdụ. O kwuru na ọgbaghara butere ogbochi n'ebe ụfọdụ. O kwukwara na n'okpuru Ọchịchị Emoha, na ndị 'electoral officers sị na o nweghị mpụtara ha nyere onye collation officer'. Ọ kọwara na ndị 'collation officer' detara mkpesa.

    A kagburu ntuliaka n' okpuru ọchịchị isii, ebe a chịkọtara mpụtara nke e mere n'okpuru ọchịchị asaa.

    Ọnọdụ atụmvootu o metụtara dị 151,ebe vootu o metụtara dị 942,368.

    Festus Keyamo bụ ọnụ na-ekwuru ndị mgbasaozi achụmta vootu APC kpọrọ oku ka elebanye anya na vootu akagbulu n'ihi na ọ bụ vootu a tụrụ ndị APC ka ọ metụtakarịrị.

    Onye nnochite PCP kpọrọ oku ka akagbuo ntuliaka e mere na Rivas n'ihi na ihe karịrị otu nde bụ ndị anapụrụ ikike itụ vootu dịka iwu siri dị.

  7. Kebbi na Zamfara ekwuola uche ha

    Steeti abụọ ndị a dị na mpaghara ugwu Naịjirịa ahọrọla APC dịka otu ndọrondọrọ masịrị ha

    na Kebbi

    APC- 581,552

    PDP - 154,282

    YPP - 276

    AAC - 130

    ACP - 99

    na Zamfara

    APC: 438,682

    PDP: 125,423

    AAC: 186

    ADC: 186

    ADP: 102

  8. A kagburu ụfọdụ ebe na Sokoto maka na vootu karịrị ndị denyere aha.

    Onye ọrụ Inec na-achịkọta vootu na Sokoto kwuru na ọkpụrụọchịchị Sokoto-South e nweghị isi n'ihi na mgbe a na-eme mgbakọ, a chọpụtara na ọnụọgụgụ vootu karịrị ndị denyere aha ịtụ vootu nke Bekee kpọrọ "over-voting"

    N'agbanyeghị mkpesa a, APC jiri ihe karịrị otu puku narị vootu gafe PDP iji zọta steeti ahụ.

    APC: 490,333

    PDP: 361,604

  9. Bayelsa na Delta kwụ gịdigba n'azụ PDP

    Bayelsa na Delta bụ steeti abụọ gbara onwe ha gbataobi hara PDP na ntuliaka ọkwa onyeisiala.

    Ọ dị ka ha enwere otu obi dịka ha si họrọ otu PDP na ntulika e mere

    Lee ọnụgụgụ ntuliaka ha ebe a

    Delta

    APC: 221,292

    PDP: 594,068

    Bayelsa:

    APC: 118 821

    PDP: 197933

    Ndị denyere aha ha: 923,182

    Vootu niile a tụrụ: 344,237

    E nwere nsogbu n' ọnọdụ atụm vootu ise. Ndị o metụtara dị 3369.

  10. Na Borno, APC nwe isioche.

    Borno bụ steeti ama ama na-enwe nsogbu Boko Haram mana ha pụtara họrọ Muhammadu Buhari dịka onye ha chọrọ n'agba anọ n'abịa.

    Lee ihe ọnụọgụgụ na-ekwu

    AAC: 269

    ADC: 301

    ADP: 75

    APC: 836,496

    PDP: 71,788

    SDP: 322

  11. Cross River na Akwa Ibom jisiri Atiku ike

    Na Cross River, dịka onye 'collation officer ha siri kwuo, atụghị vootu n’ọnọdụ atụmvootu iri abụọ na isii.

    Na Bakassi, ndị mmadụ ekweghị ka e were card reader mee ntuliaka.

    Ndị nke a metụtara dị 132,189. E nweghi ntuliaka na ọgbọ iri abụọ n'isii na Krọs Riva

    Ihe ruru mmadụ puku ise enweghi ike ịme ntuliaka.

    Lee ọnụọgụgụ ya ebe a:

    PDP: 295,737APC:117,302

    Akwa Ibom Steeti

    N'agbanyeghị nsogbu dapụtara n' Akwa Ibom ebe anwụchiri otu onye ọru Inec tie ya ihe, PDP ka meriri ebe ahụ site n'ọnụọgụgụ a:

    PDP 395832APC 175,429

  12. Ndị agha Naijiria ghara ụgha - Wike

    Gọvanọ Nyesom Wike nke Rịvas agọọla ebubo ndị agha Naijiria boro ya na ya mere wuruwuru na ntukliaka e mere na Febụwarị 23, na steeti ahụ.

    Wike kwukwara na ebubo na ya nyere ndị agha aka azụ iji gbuchie ha ọnụ banyere ndị Inec adigboroja ha na-ekwu na ha nwụchiri bụ asị kpụ ọkụ n'ọnụ.

    Ọ siri na ebubo niile ahụ bụ iji maja ha maka ntuliaka gọvanọ ka na-abịa abịa.

    N'ehihie taa bụ Tuzde, ndị agha Naijiria ngalaba nke 6 Division kwuru na ha nwuchiri ndị sị na ha bụ ndị Inec adgboroja ka ha bu akwụkwọ ntuliaka ọkwa onyeisiala na Pọtakọt.

  13. Ụmụ Naijiria jụnụ mpụtara Inec kpọpụtara ma ha ewepụta ngụkọ nke card reader - PDP

    Otu PDP akpọọla oku ka-eme nyocha banyere ihe wuruwuru mere na ntuliaka ụbọchị satode.

    Ha kwuru na ha ji ihe akaebe igosi na ndị APC mere nrụrụaka dị iche iche na ntuliaka a nke gụnyere ịkagbu vootu PDP, emeghi ntuliaka ma nwee ọnụọgụgụ, ọnụọgụgụ ndị mere ntuliaka karịrị ndị debanyere aha na ndị ọzọ.

    Ha kwuru na ihe ndị a metụtara gụnyere Zamfara, Borno, Platu, Nassarawa nakwa na Kebbi.

    Otu PDP na-ekwu na ha chọrọ mmegharị ntuliaka ọzọ n'ụzọ ziri ezi.

  14. PDP kwechiri aka na Taraba

    Dịka ohere dị n'etiti PDP na APC na-agbalite, PDP emeriela na Taraba iji mechinata ohere ahụ.

    AAC - 116

    ANN - 35

    APC - 324,906

    PDP - 374,743

    YPP - 80

    Ndị denyere aha - 1,777,105

    Ndị tozuru ịtụ vootu - 756,111

  15. APC echiela PDP ọnụ n'ala na Kano na Katsina

    Lee ihe ọnụọgụgụ na-egosi na Kano

    APC - 1,464,768

    PDP - 391,593

    YPP - 200

    Nke Katsina

    APC - 1,232,133

    PDP - 308,056

    YPP - 61

  16. Platu aharala otu PDP

    Na Platu steeti ndị pụtara ịtụ vootu egosila na ha kwụ chịm n'azụ Atiku.

    Lee ihe mpụtara si ebe ahụ na-egosi.

    AAC - 268

    ANN - 796

    APC - 468,555

    PDP - 578,665

    Ndị denyere aha 2,423,381

    Ndị tozuru ịtụ vootu 1,074,042

  17. Ndị Benue siri Buhari na o zuola

    Na Benue steeti ,Ndi ala ahụ jiri vootu ha kwuo na ha achọzịghị Buhari dịka Atiku nke PDP jiri vootu 9,149 merie Buhari.

    APC: 347,668

    PDP: 356,817

    Ndị denyere aha 2,391,276

    Vootu niile a tụrụ: 34,960

    Vootu a tụrụ dị mma : 728,912

    Vootu a kagburu : 763,872 172

  18. Ndịagha Naijiria na-ebo Wike ebubo wuruwuru na Rivas steeti

    Ndịagha Naijiria ngalaba nke '6 Division Nigeria Army dị na Pọthakọt ebola Gọvanọ Nyesom Wike nke Rịvas ebubo iji ndị Inec adịgboroja arụ ọrụ na ntuliaka 2019.

    Nke a mere oge ha kpọrọ ndị ntaakụkọ ọgbakọ n'ogige ha dị na Pọtakọt nke ha gosiri ụbọchị Tuzde n'ihe onyonyo televishọn dịka ọ na-eme.

  19. Buhari meriri n'Ogun ebe Atiku meriri n'Edo

    Ogun steeti

    AAC - 3,196

    ANN - 1,509

    ACPN - 914

    APC - 281,762

    PDP - 194,655

    Ndị denyere aha: 613,397

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 564,256

    Edo steeti

    AAC - 3,106

    ANN - 273

    APC - 267,842

    PDP - 275,691

    YPP - 531

    Ndị denyere aha - 604,915

    Ndị a nabatara ịtụ vootu - 560,711

  20. Inec agụwala vootu ọzọ