Gọọmentị Adamawa etinyela mmachi mkpagharị dịka ndị mmadụ wakporo ụlọ nchekwa nri

Akụkọ niile dị mkpa n'ọnwa Julaị

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Onyeisiala Senegla ekwuola na ọ gaghị azọ ọkwa ahụ nke ugboro atọ

    Macky Sall

    Ebe foto si, Reuters

    Macky Sall ekwupụtala na ọ gaghị azọ ọkwa onyeisiala mba Senegal n’afọ 2023 dịka ọtụtụ siri tụọ anya ya.

    O kwuru nke a n’ihe onyonyo gbara na igwe’ TV mba ahụ sị “Ọchịchị m malitere na 2019 bụ nke abụọ na nke ikpeazụ m”.

    Kepukepu malitere ịfesa na ọ ga-adọtikwuo ọchịchị ya emeela ka ọgbaghara dapụta na mba ahụ kemgbe 2021 dịka ọtụtụ nwụrụla n’ime ọgbaghara ndị a.

    Pati ndị na-anọghị n’ọchịchị malitere ịkpọ oku ka ndị nso nso ha mee ngagharịiwe ma ọ bụrụna onyeisiala Sall kpebia ịzọ ọkwa ahụ ọzọ.

    Ọtụtụ ndị ọkaibe n’ihe gbasara iwu kwuru na ọ bụrụ na ọ zọrọ ọkwa nke ahụ ọzọ, ọ kara ịda iwu.

    Sall kwuru: “Mkpebi m, nke chere echichi maka ya nke ọma... bụ na m agaghị ọzọ ọkwa ọzọ na ntuliaka na-abịa abịa”.

    “Mba Senegal bụ ihe ka m dị elu, e nwere ọtụtụ ndị ọchịchị aka siri ike nwereike ịkwalite ọdịmma mba a.”

    E nweela ọtụtụ ngagharịiwe na Senegal maka mkpebi ụlọikpe mere ka a tụọ onyeisi otu nwoke na-achị pati na-anọghị n’ọchịchị bụ Ousmane Sonko nga ruo afọ abụọ.

    E mere nke a n’okwu ịda iwu a kpọrọ “corrupting youth”.

    Ikpe mara Sanko dị afọ 48 maka ya na nwaada dị afọ 21 inwe ihe dịka mmekọ. E kwuru na aka ya dị ọcha n’okwu ịdịna ahụ n’ike.

    Puku kwuru puku ndị ngagharịiwe wụpụtara n’ama n’akụkụ mba ahụ dị iche iche n’okwu a dịka mmadụ 16 nwụrụ.

    Sonko kwuru na ọ nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere dịka ndị nso nso ya na-ekwu na ikpe ahụ bụ atụmatụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị iji kụchapụ ya ịzọ ọkwa onyeisiala.

    Sall malitere ịchị Senegal kemgbe afọ 2021.

    N’afọ 2016, o megharịrị iwu ka ndị na-achị mba ahụ nweeike ịchị naanị agba abụọ, mana ọtụtụ ndị nso nso ya kwuru na ọ nwereike ịdọtị ya bụ oge ruo agba atọ n’ihi ọchịchị nke mbụ ya malitere mgbe iwu ọhụrụ ahụ adịbeghị ire.

  2. Nnukwu ọrụ cheere unu n’ihu – Tinubu gwara ndịisi nchekwa

    Onyeisiala Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu

    Onyeisiala Bola Tinubu agwala ndịisi nchekwa e nyere ọrụ ọhụrụ na ha rụkọọ ọrụ ọnụ na nnukwu ọrụ cheere ha n’ihu.

    Tinubu kwuru nke a na Mọnde mgbe ya ndịisi ọrụ nchekwa Naịjirịa nwere ọgbakọ nke mbụ ha kamgbe e nyere ha ọkwa n’ụbọchị 19 Juun, 2023.

    Nuhu Ribadu bụ onyeisi ndụmọdụ nchekwa gwara ndị ntaakụkọ na Onyeisiala Tinubu kwere nkwa naọ ga-akwado ha n’ụzọ dị mma.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ndịisi ọrụ nchekwa ndị a kwere nkwa irubere Onyeisiala Tinubu isi ma gbaa mgbọ ịhụ na e kwekwara mba Naịjirịa.

    Ndị so n’ọgbakọ ahụ gụnyere onyeisi nchekwa bụ Musa C.G, onyeisi ndịagha ala bụ T.A Lagbaja, onyeisi ndịagha ụgbọmmiri bụ Admiral E.A Ogalla, nakwa onyeisi ndịagha ụgbọelu bụ H.B Abubakar.

  3. Igbo ndị ọma ndeewo nu

    Anyị na-ekele unu maka isonyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo n'ụtụtụ a. Bịa buru oche gere akụkọ ndị gbapụtara ihe taa.

  4. Ka chi fo

    Maka akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị, chọga anyị na bbcigbo.com

    Ma sonyekwara anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ Tuzde.

    Ka e mesịa.

  5. Etu onye rụrụ ọrụ ntaakụkọ ihe karịrị afọ 30 ji chie ụkọchukwu Katọlik na Ireland

    Shaun Doherty

    Shaun Doherty, nwa amadị bụbu onye ntaakụkọ Radio na mba Ireland, echiela ụkọchukwu n'ụka Katọlik.

    E chiri Doherty ụkọchukwu n'ụlọụka Eugene dị asọ n'obodo Londonderry n'ụbọchị Sọnde.

    Nwa amadị a rụrụ ọrụ ihe karịrị afọ 30 dịka onye ntaakụkọ redio a ma ama na mba Ireland niile, mana ọ gbara arụkwaghị m afọ isii gara aga iji malite ọzụzụ maka ịbụ ụkọchukwu.

    E chiri ya 'deacon' na Basilica nke Paul dị asọ na Rome n'afọ gara aga, mana ọ bụ ya bụ ụkọchukwu nke atọ a na-echi n'obodo Derry, Ireland, n'afọ 2023.

    "Enwere m mmasị ịnọ n'etiti ndị mmadụ ndị nọ n'ihi isi ike, ndị na-achọ ịdachapụ. Ọtụtụ nsogbu jupụtara ebe niile taa, ọtụtụ enwekwaghị olileanya," Doherty kwuru.

    "Ana m atụ anya na akụkọ m ga-abụ ihe agbamume na njalite mmụọ nye ọtụtụ mmadụ iji gwa ha na olileanya ka dị n'ihi ịdị mma nke Chineke. Ịhụnanya ya na obi ọma ya enweghị njedebe."

    N'emume ofufe iji chie ya ụkọchukwu, Bishọp nke Derry bụ Donal McKeown kwuru na Doherty na-abanye n'ọkwa ụkọchukwu n'oge ụka Katọlik na-agabiga nsogbu dị icheiche.

    "Taa, e nwere ọtụtụ nrụrịtaụka gbasara ọnọdụ ụka Katọlik na Ireland. Ọ na-anwụ anwụ? Ọ nwụọla? Oge ya agafeela?, McKeown kwuru.

    "Shaun, dịka ị na-abịa taa ka e chie gị ụkọchukwu, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na o nwereike isi adịchaghị gị mma. Ekwenyeere n ha. Isi adịghị gị mma.

    "I nwere ọtụtụ ụzọ ka mfe ị gaara ahọrọ maka agba ọhụrụ a na ndụ gị, mana I kwenyesiri ike na Chineke kpọrọ gị oku n'oge dị otu a nakwa n'ebe a."

    Ọrụ Doherty dịka onye ntaakụkọ

    Shaun Doherty

    Ebe foto si, Highland Radio

    Shaun Doherty rụrụ ọrụ n'ụlọọrụ 'Highland Radio' ebe ọ nọrọ n'isi ọtụtụ mgbasaozi nke sitere n'ụlọọrụ ahụ kamgbe ha malitere n'ọnwa Maachị afọ 1990.

    Otu emume nke ọ bụ onyeisi mgbasaozi ya nwetara nturuugo PP! Radio Award nke afọ 2001.

    A họpụtakwara ya n'ime ndị so zọọ nturuugo "onye mgbasaozi kacha mma' nke mba Ireland n'afọ 2006.

    O mechara rụọ ọrụ dịka onyeisi ngalaba azụmahịa (Sales & Marketing Manager) nke ụlọọrụ ahụ, nakwa onyeisi ngalaba nkwalite ha (promotions Manager).

    Ọ bụ onye obodo Stoke-on-Trent, ma dịrịkwa afọ 58.

    Fr Doherty ga-aka Mass nke mbụ ya n'ụlọụka St Columb’s na Derry n'elekere asaa na ọkara nke uhuruchi ụbọchị Mọnde, Julaị 3 2023.

  6. Steven Gerrard esorola ndị ọgba bọọlụ a ma ama gafere mba Saudi Arabia

    Steven Gerrard

    Ebe foto si, BBC Sport

    Steven Gerrard bụbu ọgba bọọlụ nke mba England na Liverpool esonyerela otu Al-Ettifaq nke mba Saudi Arabia dịka onye nkuzi bọọlụ ha.

    Gerrard malitere ọrụ nkuzi bọọlụ dịka ọ lara ezumike n'ịgba bọọlụ n'afọ 2016. Kamgbe ahụ ọ rụọla ọrụ dịka onye nkuzi bọọlụ n'otu Rangers nke mba Scotland, na otu Aston Villa nke England.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    O dochabeghị anya ugbua afọ ole Gerrard na ndị Al-Ettifaq kwekọrịtara, maọbụ ego ole a ga na-akwụ ya kwa afọ.

    N'ọdị nso a, ọtụtụ ndị ọgba bọọlụ a ma ama agafeela mba Saudi Arabia ịgba bọọlụ, dịka mba ahụ ji ike akwalite egwuregwu bọọlụ na mba ha.

    Ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ a gụnyere Cristiano Ronaldo, Karim Benzema, Ngolo Kante, Kalidou Koulibaly, Edouard Mendy na Ruben Neves.

  7. Ndị ekperima na-amanye 'sit-at-home' agbaala ụgbọala ọkụ n'Aba

    Aba
    Nkọwa foto, Foto a gosiri ebe ndị ekperima a nọrọ gbaa otu 'Keke' ọkụ, mana ndị ọrụ nchekwa mechara kpochapụ ya

    Ndị ntorobịa na-amanye ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ taa bụ Mọnde, agbaala ụfọdụ ụgbọala ọkụ n'Aba, Abia steeti.

    Nke a na-abịa dịka ngalaba otu 'Indigenous People of Biafra' nke onyeisi ha bụ Mazi Simon Ekpa, tiri iwu ka ndị mmadụ ghara ịpụta ezi na mpaghara ala Igbo niile malite n'ụbọchị Mọnde, Julaị 3 ruo otu izuụka.

    Ndị ekperima kpara arụ a malitere n'elekere ise nke isi ụtụtụ wakpowe ndị mmadụ na-agara mkpa ha na mpaghara okpuru ọchịchị Aba South na Aba North.

    Ha mere mwakpo a na mpaghara dị icheiche ebe okporoụzọ jọrọ njọ bụ ebe ụgbọala ndị mmadụ enweghịike ịgba ọsọ.

    Otu onye gwara onye ntaakụkọ anyị okwu, aha ya bụ Gilbert, kwuru na ọ hụrụ ka ndị ekperima a gbara otu ụgbọala ọkụ na 'Ngwa Road', n'ebe njikọ ụzọ 'Port Harcourt Road, Ngwa Road, Asa Road na Cemetery road', n'elekere ise na ọkara nke ụtụtụ.

    Gilbert kwuru na ndị mmadụ pụtara n'isi ụtụtụ ahụ ịga ebe dị ha mkpa gbalagara ọsọ dịka ụmụ okorobịa ndị ahụ yicha akwa ojii wakporo ha.

    "Ụmụ okorobịa ahụ rutere wụọ mmanụ ụgbọala n'elu ụgbọala ahụ ma tinye ya ọkụ," Gilbert kwuru.

    N'otu aka hụ kwa, na mpaghara Uratta dị n'Aba, ndị ekperima ahụ gbara ụgbọala abụọ ọkụ, otu bụ nke na-ebu achịcha nke ọzọ bu ihe nri, nakwa otu ọgbatumtum ụkwụ atọ a na-akpọ Keke.

    Akụkọ ọzọ kwukwara na ndị ekperima ahụ gbara otu nnukwu ụgbọala bu okwute ọkụ, mana onye ntaakụkọ anyị amataghị ma akụkọ nke a ọ bụ eziokwu.

    Ndị agha si na ngalaba 144 Battalion malitere ịgagharị n'ogbe dị icheiche nke mere ndị ekperima ahụ ji gbaa ọsọ.

    Mgbe onye ntaakụkọ anyị kpagharịrị n'ebe dị icheiche n'Aba, ọ chọpụtara na ụfọdụ ndị mmadụ pụtara na-aga mkpa ha, ụfọdụ mepere ụlọahịa ha n'ebe ụfọdụ, mana ahịa niile a ma ama n'Aba enweghị nke mepere emepe taa.

    Ụfọdụ na-ekwu na ndị ekperima ahụ merụrụ ụfọdụ mmadụ ahụ ebe akụkọ ndị ọzọ na-ekwu na e nwere onye nwụrụ dịka ndị ọrụ nchekwa busoro ha agha, mana otu onye ọrụ nchekwa welitere isi gwara onye ntaakụkọ anyị na nke ahụ abụghị eziokwu.

    O kwuru na onweghị mgbe ha na ndị ekperima ahụ zutere ihu na ihu, kama na ha gbaliri egbe elu iji yie ha egwu nke mere ka ha gbaa ọsọ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia Steeti bụ Maureen Chinaka gwara BBC na ya ga-ezighachitere anyị ozi gbasara akụkọ a, ma ya mechaa nchọpụta ya.

    Onye ntaakụkọ anyị chọpụtakwara na ndị agha na-akpagharị ebe niile iji hụ na udo lọghachiri.

    N'aka nke ọzọ, ọnụ na-ekwuru otu Ipob bụ Emma Powerful ekwuola na otu Ipob enyeghị iwu ọbụla ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ ruo otu izuụka.

    O kwuru na iwu ahụ nke Simon Ekpa na ndị otu ya tinyere enweghị isi maka na ha (Ekpa na ndị otu ya) abụghị onye Ipob kama ha bụ ndị iro nke Mazi Nnamdi Kanu.

  8. Kirie ihe onyonyo etu nwoke si lụọ Agụiyi dị ka nwunye

    Aha onyonyo, Watch: Mexican mayor weds crocodile in harvest ritual

    Otu onyeisi obodo na mba Mexico alụọla otu Agụiyi bụ usoro omenala na-ahụ maka mmụba.

    A hụrụ n’ihe onyonyo so emume a ebe o susuru Agụiyi ahụ ọnụ dịka e ji agbụ kechie ọnụ ya bụ anụmanụ.

    Agụiyi a nke dị afọ asaa bụ nke a a kpọrọ ‘nwaada eze’ bụ ihe ndị a na-eche bụ arụsị na-ahụ maka ụwa na okike ya.

    Alụmdinanwunye ya na nwoke onyeisi obodo a bụ ihe ngosi na ndị mmadụ na ndị ala mmụọ ejikọọla aka ọnụ.

    Omenala a bụ ihe a na-eche a malitere ime kemgbe afọ 100 kwuru 100 gara aga bụ oge ndị “Oaxaca state's Chontal” nakwa ndị “Huave indigenous communities”.

    Victor Hugo Sosa bụ onyeisi obodo ahụ mere agbamakwụkwọ a gwara ndị ntaakụkọ na nke a bụ njịkọ omenala abụọ bụ omenala ndị “Huaves” nakwa omenala ndị “Chontales”.

  9. Anyị ga-ata Mmesoma Ejikeme ahụhụ maka ịkpụgharị mpụtara ule ya - JAMB

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ule e ji abanyela Mahadum

    Ebe foto si, JAMB

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ule e ji abanye na mahadum bụ Joint Admission and Matriculation Board (JAMB) ekwuola na ha ga-ata nwada Mmesoma Ejikeme ahụhụ maka igosi mpụtara ule nke adịgboroja n’ule nke afọ 2023.

    Site n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ a bụ Fabian Benjamin wepụtara, ha boro Mmesoma ebubu ịkpụgharị mpụtara o nwetere n’ule ahụ bụ nke o jiri nata onyinye agụmaakwụkwọ n’efu site n’aka ụlọọrụ Innoson na-arụ ụgbọala.

    “Nwada Ejikeme Joy Mmesoma nwetere akara 249 ọ bụghị akara 362 dịka o siri kwuo.

    “Ọ kpụgharịrị mpụtara ule UTME ya iji ghọgbuo ọha maka inwete nrite nturuugo nakwa ịgbọpụta ihe.”

    JAMB gara n’ihu sị na ha ga-ewezuga ezi mpụtara Mmesoma nwetere n’ule ahụ, ma kwuo na ọtụtụ ụmụakwụkwọ ji mpụtara nke adịgboroja na-akpagharị nke ha ji ụfọdụ akụrụngwa ‘software’ rụọ.

    Ụlọọrụ na-emepụta ụgbọala na Nnewi bụ Innoson Motors enyela nwada a ego agụmaakwụkwọ dị nde naịra atọ (N3m).

    Ha gara n’ihu kelee ụlọọrụ Innoson maka onyinye a ma gwaa ndị ọzọ ka ha adala mba n’ihi agwa a nwada a kpara.

    “Mmesoma zitere anyị ozi na ọ chọrọ ịhụ akara mpụtara ule ya mana tupu e wepụta ya, ọ gara kpụọ nke adịgboroja ma were ya dochie n’ihu akwụkwọ mpụtara ahụ nke afọ 2022, na-amaghị na anyị agbanweela etu ihu akwụkwọ mpụtara ahụ na-adị n’afọ 2023.

    JAMB kọwara na ihe mere ha jiri chọpụta bụ mgbe onye ọrụ gọomentị Anambra Steeti kpọrọ ha n’ekwentị na-ajụ ma ọ bụ eziokwu na Mmesoma nwetere akara 362 n’ule UTME nke afọ 2023. Ha mere nyocha ma chọpụta na ọ bụ akara 249 ka o nwetere.

    “Akara o nwetere bụ 249 o nweghi ihe ga-agbanwe ya. Site n’agwa Mmesoma kpara anyị ga-ewezuga mpụtara ule ya ma taa ya ahụhụ.

    Cheta na nwada a wuru ewu n'izuụka ole na ole gara maka akara o nwetere n'ule JAMB nke mere ụlọọrụ Innoson jiri nye ya ego nrite nde naịra atọ (N3m).

  10. Unu abọọla chi eeee!

    Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ, anyị ekelee ma na-anabata unu n'ọgbakọ anyị taa.

    Buru oche bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa niile gbaa gburu gburu.

  11. Echi ga-aka mma

    Daalụ maka isonyere anyị taa.

    Ka anyị mekwaa ya ọzọ, malite n'elekere asatọ nke ụtụtụ echi.

    Ya gazie.

  12. Anyị anabataghị okwu otu EU kwuru gbasara nrụrụaka na ntuliaka 2023 – Gọọmentị etiti

    Bola Ahmed Tinubu

    Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu/Twitter

    Ụlọọrụ Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu akatọọla mkpebi nke ndị otu 'European Union' kpebiri dịka ha wepụtara mpụtara nnyocha ha gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke 2023.

    Nke a dị n’akwụkwọ ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru onyeisiala Tinubu bụ Dele Alake n’ụbọchị Sọnde.

    N'izuụka gara aga ka otu a kpọrọ 'European Union Election Observation Mission' wepụtara mpụtara ha dịka ha so na ndị lekọtara etu ntuliaka Naịjirịa nke 2023 siri gaa.

    Onyeisi otu ahụ bụ Barry Andrews kwuru na "Inec mebiri ntụkwasịobi ndị mmadụ na Naịjirịa nwere n'ebe ha nọ n'ihi ụfọdụ iha ha mere nke na-edoghị anya".

    mana n'akwụkwọ ozi ya, Alake kwuru na “Anyị jụrụ okwu maọbụ echiche ọbụla nke si n’aka otu maọbụ mmadụ ọbụla, nke na-arụtụ aka na e nwere nrụrụaka na ntuliaka 2023”.

    “Anyị kwụdosiri ike n’ihe anyị kwuburu na ntuliaka 2023 bụ nke e jiri tekịnụzụ ọgbara ọhụrụ hazie, bụ ntuliaka kacha mma e merela na Naịjirịa kamgbe anyị laghachiri n’ọchịchị ndị nkịtị. Otu dị icheiche bịara lekọta ntuliaka ahụ dịka African Union, Ecowas, Commonwealth, na ‘Nigeria Bar Association’ gbakwara akaebe nke a,” Alake kwuru.

    Ọ kọwara na otu ndị EU bịara n’oge ntuliaka Naịjirịa erughịmmadụ 50, ha agaghịkwa n’ọtụtụ ebe dị icheiche a nọrọ tụọ vootu, kama ha nọdụrụ ala n’otu ebe ma jiri obere ọgbaghara mere n’ebe ụfọdụ dịka ihe akaebe ha ji kpebie na ntuliaka nwere nrụrụaka.

    “Otu NBA zipuru ihe karịrị mmadụ 1000 ka ha kpagharịa n’ọtụtụ ebe a tụrụ vootu na steeti niile na Naịjirịa n’ụbọchị ntuliaka, mana mpụtara ha nyere ntuliaka ahụ bụ pasentị 91.8. Ntuliaka ọbụla nwetara akara gafere pasentị 90 bụ ntuliaka kwụ ọtọ ma bụrụkwa nke a na-eto eto n’ụwa niile,” Alake kwuru.

    “Ọ bụkwa ihe ọma na ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye apụtala kwuo na ntuliaka ahụ gara nke ọma, ma jụkwa ịnabata nkatọ niile nke otu EU katọrọ.”

    “Dịka otu obodo, anyị ewefeela ihe mere n’oge ntuliaka n’akụkụ. Onyeisiala Tinubu na-aga n’ihu n’ọrụ iwulite obodo Naịjirịa nke bụ ọrụ siri ike nke ukwuu; ebe ndị sị na ntuliaka ahụ ejughị ha afọ nọkwa n’ụlọikpe na-eme mkpesa ha.”

    “N’ime otu ọnwa, ọ pụtara ihe na ụmụ Naịjirịa nwere afọ ojuju n’ọchịchị Onyeisiala Tinubu nakwa etu o si aghazigharị Naịjirịa n’ụzọ ọganihu na mwulite akụnụba.”

    “Anyị na-agwa ndị EU nakwa ndị mba ofesi ndị ọzọ ka ha na-akpachapụ anya n’etu ha si ekwu okwu gbasara ihe na-eme n’ime obodo Naịjirịa. Ha hapụ Naịjirịa ka o kute ume.”

  13. Etu ndị ojiegbe si wakpo ụlọụka RCCG, gbuo ụkọchukwu, tọrọ ọtụtụ ndị ọzọ

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị uweojii kwuru na ha gburu otu n'ime ndị ekperima so mee mwakpo ahụ.

    Ndị ojiegbe amabeghị ndị ha bụ wakporo otu ụlọụka 'Redeemed Christian Church of God' nke dị n'obodo Omun Pepe n'okpuru ọchịchị Obafemi Owode nke Ogun Steeti, gbuo otu onye ụkọchukwu ma tọrọ ọtụtụ ndị ụka ndị ọzọ.

    Omolola Odutola bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii nke Ogun Steeti kwuru na mwakpo a mere n'ụbọchị Satọde, bụ ụbọchịmbụ nke ọnwa Julaị 2023.

    Odutola kwuru na ndị ụka ahụ nọ ọgbakọ ekpere ogologo abalị Fraịde niile wee pụta n'ụtụtụ Satọde oge ndị ojiegbe ahụ wakporo ya.

    "N'ebe elekere anọ na ọkara nke ụtụtụ Satọde (Julaị 1) ka ụkọchukwu Adesina Oyesegun nke ụka RCCG Omun Pepe bịara n'ụlọọrụ anyị bịa nye mkpesa na ndị ekperima bu egbe na mma na ngwa ọgụ ndị ọzọ wakporo ha n'ebe elekere atọ n'ọkara nke ụtụtụ ịbịa tọrọ ndị otu anyị," Odutola kwuru.

    "Ụfọdụ ndị nche na ndị obodo kpọrọ ndị agbatobi nakwa ndị nche obodo gbara gburugburu ha wee buso ndị ntọrị ahụ agha. Ndị uweojii gbatakwara n'oge bịa soro n'ibuso ndị ntọ ahụ agha

    "Otu onye ekperima nwaụrụ n'ịkwa mgbọ a, anyị ebugala ozu ya n'ụlọ ozu dị n'ụlọọgwụ ọha nke Egan."

    Odutola kwuru na ụfọdụ ndị ekperima ahụ kpụ ụfọdụ ndị ụka RCCG ahụ gbabaa n'ime ọhịa, ma kwukwaa na otu onye ụkọchukwu RCCG aha ya bụ Kayode Oluwakemi, onye dị afọ 56, nwụrụ na ya bụ mwakpo.

  14. Ịtọhapụ Nnamdi Kanu ga-ewetara Tinubu nkwanye ugwu n'ala Igbo - Iwuanyanwu

    Emmanuel Iwuanyanwu

    Ebe foto si, Ohaneze Ndigbo

    Onyeisi otu Ohaneze Ndigbo, bụ Emmanuel Iwuanyanwu ekwuola na onyeisiala Bola Tinubu ga-enwe nnukwu nkwanye ugwu n'ala Igbo nakwa Naịjirịa niile ma ọ bụrụ na ọ tọhapụ Nnamdi Kanu na mkpọrọ.

    Iwuanyanwu kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Punch dịka o kwuru na ntọhapụ Nnamdi Kanu bụ ihe dị nnukwu mkpa nye ndị Igbo nakwa mpaghara Ọwụwa Anyanwụ niile.

    "Ọ bụrụ na Tinubu tọhapụ Nnamdi Kanu, ọ ga-ewetara ya nnukwu nkwanye ugwu n'ala Igbo nakwa na Naịjirịa niile," Iwuanyanwu kwuru.

    "Onweghị onye ọbụla o (Kanu) gburu. Onweghịkwanụ ebubo igbu ọchụ e boro ya. O teelarị e kwesịrị ịtọhapụ Kanu, ma ya bụrụkwa ugbua ọ nọ n'ọrịa."

    "Ndị ezinụlọ ya nakwa ndị ọkaiwu ya etiela mkpu ugboro ugboro ka a tọhapụ ya.

    "Ana m arịọ Tinubu ka o nyere ndị Igbo aka tọhapụ Nnamdi Kanu. Ya egela onye ọbụla ntị, naanị ya meere anyị otu ihe a, maka na Kanu emeghị nnukwu ihe ọjọọ ọbụla."

    Iwuanyanwu kwuru na ndị ntorobịa n'ala Igbo na-ahụta na ọchịchị Naịjirịa anaghị emeta ha nke ọma, ọ bụ ya mere ha ji malite ịkpa aghara.

    "Ndị ntorobịa a na-ahụta Nnamdi Kanu dịka onye ndu ha nakwa dike maka na ha kwetara na ọ na-alụ ọgụ maka nnwereonwe ha, mana anyị bụ ndị okenye na-arịọ Tinubu ka o mee ihe kwesịrị ekwesị," Iwuanyanwu kwuru.

    "Ama m na ọ malitela ọchịchị ya nke ọma maka na o kwubeghị ihe ọbụla (gbasara Kanu). Ihe bụ mkpa ya (Tinubu) ugbua bụ ijikọta Naịjirịa ọnụ."

    "Anyị anaghị ekwu na ọ bụrụ na anyị nweta onye Igbo bụ onyeisiala na ihe niile ga-adịrị anyị ụtọ. Eziokwu bụ na onyeisiala na-abụghị onye Igbo nwere ike ime nke ọma karịa onyeisiala bụ onye Igbo."

  15. Mmadụ abụọ anwụọla, 28 merụrụ ahụ na mwakpo mere na Baltimore - Ndị Uweojii

    Baltimore

    Ebe foto si, CBS

    Otu onye ojiegbe wakporo otu ọgbakọ n'obodo Baltimore nke mba Amerịka malite ịkwa mgbọ nke gburu mmadụ abụọ ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.

    Otu onye na-ekwuchitere ndị uweojii kwuru na mmadụ 28 merụrụ ahụ na mwakpo ahụ, atọ n'ime ha nọ n'ọnọdụ ọjọọ.

    Mwakpo a mere na mpaghara a na-akpọ 'Brooklyn Homes' na Maryland, dịka ndị mmadụ gbakọrọ maka emume a na-akpọ "Brooklyn Day".

    Ụlọntaakụkọ 'Fox News' kwuau na ha nụrụ ụda egbe ruru 20 maọbụ 30. O dobeghị anya onye ojiegbe mere mwakpo a.

    Mwakpo egbe na mba Amerịka bụ ihe a na-ahụ ugboro ugboro.

    Naanị n'afọ 2023, ụdị mwakpo a emeela ihe karịrị ugboro narị abụọ na iri isii mpaghara dị icheiche n'Amerịka.

  16. Otu nwoke anwụọla, mmadụ 12 merụọ ahụ n'Ihe mberede okporoụzọ n'Anambara steeti

    Ihe mberede okporoụzọ Odumodu Junction, Umunya

    Ebe foto si, FRSC

    Otu onye nwụrụ, ebe mmadụ 12 merụrụ ahụ n’ihe mberede ọkpọrọụzọ kụkọtara ụgbọala ise n 'Odumodu Junction' dị n' Umunya n’okporoụzọ si Ọnicha gawa Enugwu n’ụbọchị Satode.

    Ndị nọ ebe ihe mberede ahụ mere kwuru na ọ bụ ụgbọala ngwongoro bụ mmanụ ụgbọala kọrọpụrụ n’aka ọkwọụgbọala kwọ ya ga suo ụgbọala anọ ndị ọzọ.

    Dịka ọnụ na-ekwuru ngalaba na-ahụ maka njem okporoụzọ bụ FRSC bụ Magaret Onabe si kwuo n’ozi o nyere BBC Igbo n'ekwentị, “Otu nwoke a mabeghị aha ya nwụrụ, n’ihe mberede ahụ metụtara mmadụ 20, ebe mmadụ 12 merụrụ ahụ."

    Onabe,onye rụtụrụ aka n'ihe butere ọdachi ahụ bụ n'ụgbọala 'truck' ahụ na-agba oke ọsọ, gara n’ihu gbaa ama na ndị ọrụ há na na ndị uweojii bugara ndị merụrụ ahụ n’ụlọọgwụ Boromi Onicha nakwa Divine Favour Hospital, dị n’Umunya.

    Ihe mberede okporoụzọ Odumodu Junction, Umunya

    Ebe foto si, FRSC

    Ihe mberede okporoụzọ Odumodu Junction, Umunya

    Ebe foto si, FRSC

  17. Onyinye Omenugha, nwaada Anambara eritela nturuugo ‘Diana Award ‘

    Onyinye Omenugha

    Ebe foto si, Onyinye Omenugha

    Onyinye Omenugha, nwaada Anambara eritela nturuugo ‘Diana Award ‘

    Nwagbọghọ na-agụ iwu n’ụlọakwụkwọ iwu ‘Nigerian Law School’ eritela nturuugo Diana Award”.

    Onyinye, gbara afọ 24, onye Nnobi dị n’Okpuru Ọchịchị Idemili,Anambara steeti, ritere nturuugo a ụbọchị Fraide maka ọrụ o ji otu o hiwerea kpọrọ ‘Lawsanaid bụ otu ọrụ ebere na-enyere ụmụakwụkwọ nwere ọlụsị na-agụ iwu n’ụlọakwụkwọ akan’agụmakwụkwọ ha.

    Nturuugo ‘Diana Award’ bụ nzere nke Gordon Brown bụbụ Praim Minista mba Briten hiwere n’afọ 1999 iji kwanyere Princess Diana lara mmụọ ugwu.

  18. Nwoke agwala ụlọikpe na ya edinala ụmụnwaanyị 10,000

    Benjamin Mendy

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Benjamin Mendy na-agbara otu egwu bọọlụ Manchester City bọọlụ

    Ụlọikpe anụla na otu nwoke gbara afọ 28 a na-ekpe ikpe maka ebubo idina nwaanyị n’ike edinala ụmụnwaanyị puku iri.

    A na-ebo Benjamin Mendy bụ onye na-agbara otu egwu bọọlụ Manchester City bọọlụ ebubo idịna nwaanyị gbara afọ 24 n’ike n’ụlọ ya dị na Mottram St Andrew, Cheshire, London.

    A na-ebokwa ya ebubo na ọ gbalịrị idinakwa nwanyị ọzọ gbara afọ 29 oge nwaanyị ahụ bịara be ya n’ọnwa Oktoba 2020.

    Mana Mendy agọọla sị na ebubo ahụ bụ ụgha.

    Ọkaikpe bụ Benjamin Aina KC na mmalite kwuru sị, "Benjamin Mendybụ ọgbabọọl u nọ ọrụ ngọ n’aka out egwu bọọlụ, Manchester City FC.

    "Ọ na-enwe ọgbakọ oriri na nkwarị nke nwoke nama nwaanyị na-abịa

    “Ugboro abụọ, Mendy wakporo ndị ọbịa ụmụnwaanyị abụọ.”

    "Nke mbụ, ọ nwalere idina otu nwaanyị a ga-akpọ ‘A’ “

    "Oge ọzọ, o dinara nwaanyị bịara ọbịa n’ụlọ ya n’ike n’ime ụlọ ndịna ya”.

    " Nke nwaanyị na ndị enyị nọ n’ụlọ mmanya enweta onwe ha oge a kpọrọ ha bịa n’ụlọ Mendy.

    Mendy napụrụ ya ekwentị ya nke foto dị aghaa dị n’ime, ma sị ya bịa n’ime ụlọ ndịna ya bịa werekwa ya. Oge o rutere, ya a tụnye ekwentị ahụ n’elu akwa.”

    Mgbe nwatanwaanyị ahụ chọọrọ iwere ekwenti ahụ ya ejide ya n’azụ ma dina ya n’ike na-agbannyeghị na ọ na-akwa ya kemela ihe ọ chọrọ ime.”

    “ Ka o mechara nke a, Mendy dụrụ azụ ma sị, “I na-eme ihere nke ukwuu.”

    “Edinala m ụmụnwaanyị dị 10,000.”

  19. Ọnụahịa mmanụ ụgboala ga-agbali elu n'ọnwa Julaị - IPMAN

    Mmanụ ụgbọala

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu jikọrọ ndị na-ere mmanụ ụgbọala na Naịjirịa a kpọrọ 'Independent Petroleum Marketers Association of Nigeria' (IPMAN), ekwuola na ọnụahịa mmanụ ụgbọala ga-arị elu n'ọnwa Julaị.

    Ha kwuru na nke a bụ maka na mmanụ ụgbọala nke ụlọọrụ 'Nigeria National Petroleum Company Limited' bubatara agwụla, na ha onwe ha ga-amalite ibubata mmanụ ọhụrụ n'ọnụego dọla ọhụrụ dịzi ugbua.

    Otu n'ime ndị isi IPMAN aha ya bụ Mike Osatuyi, gwara BBC Pidgin na ọnụahịa mmanụ ụgbọala n'ọnwa Julaị ga-eru narị naịra asaa.

    "Dịka gọọmentị etiti emeela ka ọnụahịa dọla bụrụ otu n'ebe niile, a na-ere otu dọla ugbua N770, nke pụtara na onye ọbụla ga-enweta dọla n'ọnụ N770, tinyekwara NNPC," Osatuyi kwuru.

    "Chetakwa na mmanụ ụgbọala niile a na-ere na Naịjirịa ugbua bụ nke a zụtara tupu onyeisiala ekwuo na gọọmentị akwụsịla ịkwụ 'subsidy'.

    "N'ebe izuụka atọ nke ọnwa Julaị ka mmanụ ụgbọala ọhụrụ ga-amalite ịbata na Naịjirịa, oge ahụ ka anyị ga-ahụzi nke bụ ezi ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

    "Na Legọs, enwereike ị na-ere ya ihe dịka N610 maka otu lita, mana n'ebe ndị ọzọ tere aka dịka Borno Steeti, ọnụahịa mmanụ ụgbọala nwereike iru N700."

    Cheta na tupu ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụ bido na naịra 195 ruo naịra 280.

    Mana dịka Onyeisiala Bola Ahmaed Tinubu kwuchara na gọọmentị akwụsịla ịkwụ 'subsidy', ọnụahịa mmanụ ụgbọala gbaliri n'otu ntabi anya ruo ihe dịka N450 ruo N600 n'ebe ụfọdụ.

    'Subsidy' bụ ego gọọmentị etiti na-akwụbu iji butuo ọnụahịa mmanụ ụgbọala ma belata nhịahụ n'ebe ọha obodo nọ.

    Ugbua, ndị IPMAN na-ekwu na ọ ka ga-arị elu.

  20. Ọgbaaghara na mba Fransị abanyela ụbọchị nke anọ, dịka a na-akwado ili nwa ndị uweojii gburu

    Fransị

    Ebe foto si, EPA

    Ọgbaaghara dara na mba Fransị kamgbe ụbọchị Tuzde ka na-aga n'ihu ruo ụtụtụ Satọde a, dịka ndị mmadụ ka na-emebi ọtụtụ ihe na mpaghara Nanterres, Marseille nakwa ebe ndị ọzọ.

    Ndị uweojii kwuru na jidere ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha fọdụrụ ntakịrị ka o ruo otu puku naanị n'abalị ụbọchị Fraịde.

    Nsogbu a malitere n'ihi ogbugbu otu nwata nwoke aha ya bụ Nahel, onye ndị uweojii gbagburu n'ụbọchị Tuzde dịka ọ jụrụ ịkwụsị ụgbọala ya oge ndị uweojii na-akwụsị ya.

    Ngagharịiwe na Fransị

    Ebe foto si, EPA

    Nahel, onye dị naanị afọ 17 n'oge ọnwụ ya, etorubeghị inwe ikike ịnya ụgbọala na mba Fransị.

    Gọọmentị Fransị nakwa nke mpaghara Nanterre akatọọla ogbugbu a, mana ọtụtụ na-ekwu na ọgbaaghara a agafeela naanị maka ngosipụta iwe maka ọnwụ Nahel.

    Onye uweojii gbagburu Nahel arịọla ezinụlọ ya mgbaghara dịka a kpụpụkwara ya ụlọikpe maka ebubo igbu ọchụ.

    N'abalị Fraịde, ndị ntorobịa na-eme ngagharị iwe na ndị uweojii takọtara isi na mpaghara dị icheiche, dịka ndị na-eme ngagharịiwe na-atụ ndị uweojii ọkụ na-ada ka ogbunigwe, ebe ndị uweojii ji ikuku ose na-achụ ha.

    Onyeisiala Macron arịọla ndị ntorobịa na-eme ngagharịiwe ka iwe ha dajụọ, n'otu aka ahụ kwa, ndị otu bọọlụ mba Fransị arịọkwaala ka ndị na-eme ngagharịiwe wetuo obi ha ma kwụsị imebi ihe dịịrị onye ọbụla, mana arịrịọ ndị a emebeghị ka udo laghachi.

    A ga-eli Nahel n'ehihie Satọde

    Ngagharịiwe Fransị

    Ebe foto si, EPA

    Mmemme olili nwata nwoke a ndị uweojii gburu ga-adị n'ehihie ụbọchị Satọde, dịka ndị ọkaiwu nke ezinụlọ ya si kwuo.

    Ha gwara ndị ntaakụkọ ka ha ghara ịbịa n'olili ahụ, maka na ọ ga-abụ oge iji kwanyere nwata ahụ lara mmụọ ugwu.

    N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ, Mayor nke obodo Nanterre bụ Patrick Jarry kwuru na sonyeere ezinụlọ Nahel nakwa igwe mmadụ niile na-akpọ oku maka ikpe ziri ezi.

    Ọ gara n'ihu kwuo na ha ga na-enye nne Nahel nkwado niile dị ya mkpa.