Ụtụtụ ọma
Ụnụ asaala chi, ụmụ Igbo.
Ka anyị malite mgbasaozi nke taa.
Daalụ maka isonyere anyị.
Akụkọ niile dị mkpa n'ọnwa Julaị
Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi
Ụnụ asaala chi, ụmụ Igbo.
Ka anyị malite mgbasaozi nke taa.
Daalụ maka isonyere anyị.

Ebe foto si, Nigerian Army
Onyeisi ndịagha ọhụrụ Naịjirịa bụ Ọchịagha Taoreed Lagbaja enyela “ndịagha nke ngalaba 82 Division iwu ka ha ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ rụkọọ ọrụ iji kwalite ngagharị ndị ọrụ nchekwa nakwa ịwụchi n’ime okporo niile iji bulie nchekwa ndị mmadụ ịme mkpagharị nakwa azụmahịa ha” na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa bụ Onyema Nwachukwu gbara nke a n’anwụ na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ The Punch nwere na nso nso a.
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ akụkọ putara n'izuụka gara aga gbasara etu ndị ekperima na-amanye iwu onye nọrọ n’ụlọ (sit at home) si wakpo akụkụ dị icheiche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Iwu ịnọ n’ụlọ a so oku ọhụrụ onyeisi otu alaaka Indigenous People of Biafra (Ipob) nke ‘Autopilot’ bụ Simon Ekpa na-akpọ n’akụkụ mpaghara ahụ.
Ekpa kwuru na nke a bụ iji kpọọ oku ka gọọmentị Naịjirịa tọhapụ Nnamdi Kanu bụ onyendu Ipob.
Nwachukwu kwukara na “ọ bụ ihe ịtụ n’anya na Simon Ekpa sị na ọ bụ onyeisi Ipob na ezịnaụlọ ya nọ na Finland na-ebi ndụ ha mana ọ nọọrọ ebe ahụ na-akpọ oku ka ndị mmadụ kwụsị ịga mkpa na-enye ha ego site n’ịnọ n’ụlọ”.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
N’otu aka, onye zọọrọ Labour Party ọkwa onyeisiala 2023 bụ Peter Obi zipụtakwara ozi banyere Ipob na iwu ‘sit at home’ ọhụrụ a na-efegharị na mpaghara ahụ sị:
“Ihe ọzọ dị egwu bụ mgbochi ndị mmadụ ịga mkpa ha n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa n’aha ndị sị na ha bụ ndị otu Indigenous Peoples of Biafra (Ipob) mana otu a ekwuola n’ihu ọha na ha abụghị ndị na-akpọ oku a ịnọ n'ụlọ a”
“Ihe na-eme na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụ mkpa mkpa n’aka ndị ekperima nke e kwesịrị ịchabi n’oge site na mmadụ niile ịjịkọọ aka ọnụ na ya bụ ọrụ gụnyere ndị ọrụ nchekwa na ndị bi ebe ahụ”.
Ọ gara n’ihu too ndị gọvanọ mpaghara a maka etu ha siri gbakọta ọnụ na-achọ ibuso atụmatụ ‘sit at home’ agha nakwa etu ha sị achọ ụzọ ọhụrụ iji adaju tigbuo zọgbuo na-ada na mpaghara ahụ.
Cheta na na ngwụcha izuụka gara, ndị gọvanọ ise na-achị n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nakwa ndị ọchịchị ndị ọzọ na mpaghara ahụ nwere ọgbakọ pụrụiche maka ọnọdụ nchekwa mpaghara ahụ nke onyeisi ndị gọvanọ mpaghara ahụ Gọvanọ Hope Uzodinma duru.
Onyeisiala Bola Tinubu kwuru na mgbasaozi mbụ ya n’ụbọchị e duru ya iyi ọrụ, o kwuru na ọchịchị ya ga-ahụ na a kwalitere ọrụ ndị nchekwa nke ga-ememina enweghi nchekwa na Naịjirịa.
Unu asaala chi?
Nnọọ n'ọbaozi anyị
Soro akụkọ niile dị mkpa ịkọ taa niile ebe a.

Ebe foto si, Chiamaka Udeh
Nwaafọ Naijiria nwetara nturuugo onwaakwụkwọ kachasị mee ọfụma na ndị gụụ akwụkwọ maka ịbụ dọkịta Bekee na mahadum na Roshia egosipụtala afọ ojuju ya na nturuugo ahụ.
Chiamaka Udeh nwetara 'First Class' na agụm akwụkwọ ịbụ dọkịta Bekee na mahadum 'Stavropol State Medical University' dị na Rọshịa.
Nwaada Chiamaka gwara BBC igbo na mkparịtaụka n'ekwentị n'abalị Wenezde na , "Afọ juru na m emezuola nkwa m kwere nne m."
" E gwara m nne m nkwa na m ga-enweta 'First Class, e mezuola m ya. Obi dị m ụtọ na emela ezinaụlọ m ihe ha ga-eji ama atụ."

Ebe foto si, Chiamaka Udeh
Cheta na n'ọnwa July afọ 2021, Chiamaka Victoria Udeh wuru ewu na soshal midia maka ife ọkọlọtọ Naijiria ọbara gburu n'asọmpi nwaanyị kachasị mma n'etiti ụmụakwụkwọ na mahadum Roshia iji kwanyere ndị nwụụ na oge ndị agha Naijiria kwara ndị na-eme ngaghariiwe mgbọ na Toll Gate Lekki Legọs.

Ebe foto si, Alex Otti
Gọvanọ Abia steeti bụ Alex Otti etiela ndị ọkụ gbara ọdọahịa ha na ngwahịa ha n'ahị Arịarịa Aba aka n'obi.
Ngwahịa ruru nde kwuru nde Naijiria gbara ọkụ n’ọgbọ akpụkpọụkwu n’ahịa Arịarịa Aba, n’Abịa steeti n'abalị Satode.
N'ozi o wepụtara ụbọchị Wenezde, Otti kwuru na ya natara ozi ihe mere n’obi mwute.
O kwuru na ya enyela kọmishọna na-ahụ maka azụmahia na steetio ahụ bụ Uche Ukeje ntuziaka ka ọ ga mata ka ihe sịrị kwụ n'ebe ọdachi ahụ mere iji mata etu a ga-esi tie ndị ahịa o metụtara aka n’obi ma chọpụta ụzọ igbochie ụdị ọdachi a ime n’ọdịniru.
Otti gara n’ihu sị,” Ọrụ anyị bụ ichekwa ndụ na akụnaụba ndị be anyị “

Ebe foto si, Alex Otti

Ebe foto si, Abakaliki Diocese
Akụkọ na-eru anyị ndị na-ekwu na a tọhapụla ụkọchukwu ụka Katolik bụ Fada Joseph Azubuike bụ onye ndị ntọ tọọro na nsonso a.
Joseph Azubuike bụ ụkọchukwu na-elekọta ụlọụka 'St Charles' dị na Mgbalaeze Isu dị n'okpuru ọchịchị Ọnịcha, n'Ebonyi Steeti, na mmadụ anọ ndị ọzọ dịka ndị ojiegbe wakporo obodo ahụ n' abalị iri nke ọnwa Julaị afọ 2023.
Ndị uweojii Steeti ahụ bụ ndị gbaara BBC Igbo ama a kwuru na a tọhapụrụ Fada Azubuike bụ onye pụtara n’enweghị ọkọ ọbụla kọrọ ya n’ebe Elekere isii nke mgbede Tuzde site na mbọ ndị ọrụ ha.
Ha kwukwara na na-achụ ndị omekome kpara mkpamkpa ahụ bu ndị gbara ọsọ oge ndị uweojii gara ịzọpụta ụkọchukwu ahụ ebe ha ji ya.
Ka ọ dị ugbua, Fada Azubuike agaala ụlọogwu ugbua maka nnyocha ahụ.
Ntọrị, ogbugbu mmadụ na tigbuo-zogbuo ndị ọzọ na-arị ibe ya elu n'Ọwụwa Anyanwụ dịka nchekwa kpụrụ afọ ala malite n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021.
Gọọmentị Etiti na ndị ọrụ nchekwa boro otu nwere onwe Ipob na alaka ọgụ ha bụ Eastern Security Network ebubo na ọ bụ ha bu ihe na-ebe.
Mana Ipob agọọla ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.

Ebe foto si, AFP
Otu ụlọọrụ ọkaibe n’ihe gbasara nchekwa nakwa amamihe na nchekwa bụ Beacon Consulting kwuru nke a ma kọwa na ha nnyochapụtara ozi mwakpo 460 ebe ha chọpụtara maka akụkọ ntọrọ ruru 239.
Mwakpo ndị a dịka ha siri kwuo mere n’okpuruọchịchị 234 dị n’ime Naịjirịa gburugburu gụnyere Abuja.
Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu kwere nkwa ịhụ na ikwalite nchekwa ga-eso n’isi sekpụ ntị ọrụ ya mana n’ọnwa nke mbụ ọrụ ya malitere, ọtụtụ akụkọ mwakpo adapụtala n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche.
Agbanyeghi na ọchịchị ya eweela ndị isi ọrụ nchekwa ọhụrụ n’ọrụ, a ka na-achọ ụzọ iji dajụọ mwakpo n’aka ndịagha nnupụisi ụka alakụba, ndị ekperima ‘bandits’ nakwa ọtụtụ ndị omekome na ndị ojiegbe ndị ọzọ na Naịjịrịa.
N’ụbọchị Satọdee nke izuụka gara aga, e gburu ihe ruru mmadụ 40 n’akụkụ mpaghara etiti Naịjirịa gụnyere ọtụtụ obodo na Benue nakwa Plateau steeti.
Ndị uweojii Benue steeti gwara BBC na a ka na-achọpụta ozu ndị mmadụ nwụrụ na mwakpo ndị a ruo ugbua.
Nnọọ n'ọbaozi anyị taa bụ ụbọchị 12 nke ọnwa Jụlaị, 2023.
Soro akụkọ niile dị mkpa ịkọ taa niile ebe a.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ohi ezurula ọkụ e tinyere n'okporo ụgbọelu nke ọdọụgbọelu Murtala Muhammed dị na Legọs, dịka ndị na-elekọta ọdọụgbọelu ahụ si gwa BBC.
Yakubu Funtua bụ ọnụ na-ekwuru ngalaba 'Federal Airports Authority' nke Naịjirịa (FAAN) kwuru na ha amalitela nnyocha iji chọpụta ndị zuru ohi a, napụta ha ihe ha zuuru ma nye ha ntaramahụhụ kwesịrị ha.
O dochabeghị anya kpọmkwem mgbe e ji zupu ọkụ a n'ọdọụgbọelu ahụ, bụ nke e tinyere naanị n'ọnwa Nọvemba gara aga.
Ọ bụ ọkụ a na-enyere ụgbọelu aka ịda n'ọdọụgbọelu ahụ n'abalị. Tupu e tinye ya bụ ọkụ, ụgbọelu anaghị enweike ịda na mpaghara okporoụgbọelu nke ndị si Naịjirịa, kama ha na-ada na mpaghara ebe ụgbọelu ndị si mba ofesi na-ada, bịa gbazie ihe karịrị kilomita anọ n'ala iji rute ebe ha kesịrị ịkwụsị, nke a kpatara ụfọdụ ihe nhịahụ n'ụgbọelu ida n'ọdọụgbọelu Legọs n'oge gara aga.
Fubtua gwara BBC na e mechiburu mpaghara okporo ụgbọelu ahụ ihe ruru ọnwa olemole iji rụọ ọrụ na ya, mana ndị ekperima ji ohere ahụ gaa zupu ọkụ e tinyere ebe ahụ.
Mana o kwere nkwa na ha ga-akpachi ohere niile ndị ekperima ahụ ji zuo ohi a iji gbochie ụdị ihe dị etu a imekwa ọzọ n'ọdịnihu.
O kwuru na ọ bụ ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ n'ọdọ ụgbọelu ahụ na ụfọdụ ndị ekperima si n'iro jikọrọ aka ọnụ iji zuo ohi a.

Ebe foto si, Abakiliki Cath. Diocese
Ndị ojiegbe awakpola obodo Isu nke dị n'okpuru ọchịchị Ọnịcha, n'Ebonyi Steeti, tọrọ mmadụ anọ, otu n'ime ha bụ ụkọchukwu Katọlik aha ya bụ Joseph Azubuike.
Akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ụka Katọlik, dayọsis nke Abakiliki, bụ Fr Uzoma Opoke, kwuru na mwakpo a mere n'ụbọchị Mọnde, Julaị 10.
Joseph Azubuike bụ ụkọchukwu na-elekọta ụlọụka 'St Charles' dị na Mgbalaeze Isu. Ndị ntọ a jidere ya dịka ọ na-alaghachi n'ụlọụka ya ma kpụrụ ya na mmadụ atọ ọzọ tinye isi n'ọhịa.
"Ndị ntọ ahụ ekwuola ego ole ha chọrọ ka a kwụọ ha, mana site n'enyemaka ekpere nke ọha mmadụ, anyị nwere olileanya na a ga-atọhapụ ya na-anaghị ihe ọbụla, Fr Opoke kwuru n'akwụkwọ ozi ya.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi steeti bụ Onome Onovwakpoyeya gwara onye ntaakụkọ anyị na ha enwetabeghị ozi gbasara mwakpo a merenụ.
Mana ọ kọrọ etu ndị uweojii si buso ụfọdụ ndị ekperima na-eyi ndị mmadụ egwu n'Ebonyi steeti agha, ma gbuo otu n'ime ha.
O kwuru na ọ bụ na mpaghara Okposi ka ndị ekperima ahụ bu uzo wakpo ndị mmadụ tupu ha emechaa banye obodo Uburu ebe ha mekwara mwakpo ọzọ n'ụbọchị Mọnde.
"Oge ndị uweojii nwetara ozi a, ha gbagara n'obodo ebe mwakpo ahụ mere wee buso ndị ekperima ahụ agha, otu onye n'ime ndị ojiegbe ahụ nwụrụ dịka ha na ndị uweojii na-akwarịta mgbọ, ebe ndị ọzọ bu mgbọ egbe tụrụ ha gbaa ọsọ," Onovwakpoyeya kwuru.
Mwakpo a na-abịa dịka abalị olemole gachara ndị uweojii sị na ha ejichiela ndị ekperima 15 bụ ndị so eyi ndị mmadụ egwu n'Ebonyi ma na-amanyekwa iwu 'sit-at-home'.
Mwakpo ndị ojiegbe dị ka ọ na-akawanye njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, bụ nke ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na ọ bụ ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra, a na-akpọ Ipob n'ịchafụ, na-akpata ya.
Mana Ipob agọọla ugboro ugboro na ọ bụghị ha.

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook
Ọtụtụ ndị ọchịchị na ndị nwere agba n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa gbakọrọ na nso nso a maka ọnọdụ nchekwa mpaghara nke danyere n’ọnọdọ dị aṅaa kemgbe afọ olemole gara aga.
Onyeisi otu ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ọhụrụ bụ Hope Uzodinma nke Imo steeti zipụtara ozi banyere ọgbakọ a ma kọwa na ụfọdụ ndị sonyere na ha gụnyere ndị isi otu Ohaneze ndigbo, ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, ndị ụlọomeiwu si mpaghara nakwa ndị ọzọ ọnụ ruru n’okwu.
O kwuru na dịka onyeisi ndị gọvanọ na “a kọwaara ndị a otu n’ime ụzọ ndị gọvanọ mpaghara si na-achọ buso enweghi nchekwa agha, nke gụnyere iga hụ onyeisiala Naịjirịa”.
O gara n’ihu kwuo:
“Dịka anyị na-eto gọọmentị gara aga maka ọrụha, anyị nwere ọtụtụ olileanya maka ọchịchị Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu dịka anyị ma na anyị ga-enweta ọtụtụ enyemaka ga-ebelata ihe ọjọọ a na-eme.”
N’ozi Onyeisiala Tinubu kwuru na mgbasaozi mbụ ya n’ụbọchị e duru ya iyi ọrụ, o kwuru na ọchịchị ya ga-ahụ na-ewekwuru ndị ọrụ nchekwa ọrụ karịa na so n’atụmatụ ya ịdajụ nsogbu enweghi nchekwa riri elu na Naịjirịa n’afọ olemole gara aga, nke gụnyere mwakpo ndị mmadụ ịtọrọ mmadụ maka ihe mgbapụta, mmaja n’aka ọtụtụ ndị ojiegbe nakwa ihe ndị ọzọ.

Ebe foto si, PA Media
Ụlọọrụ mmanụ agbidi Naịjirịa bụ NNPC n’ịchafụ ejichiela ụgbọmmiri ukwuu bu mmanụ agbidi Naịjirịa ruru lita 800,000 bụ nke ezufuru ezufu aga mba Cameroon.
A na-ekwu na e zufuru mmanụ agbidi a n’akụkụ Ondo steeti.
N’ozi NNPC zipụtara n’ụbọchị Mọnde, ha kwuru na ụgbọmmiri ahụ a kpọrọ MT- TURA II Vesselbụ nke ụlọọrụ Holab Maritime Services Ltd nwe arụọla ọrụ nzuzu na Naịjirịa kemgbe afọ 12 dịka ha kwuru ha a ga-ebibi ya bụ ụgbọmmiri iji dọọ ndị ọzọ na-eme ihe dị etu a aka na ntị.
Ozi ha kwuru: “Ibibi ụgbọmmiri ndị na-ezufu mmanụ agbidi dị mkpa n’atụmatụ ịdọ ndị ọzọ na-eme ihe dị etu a aka na ntị”.
Kemgbe afọ olemole mmepụta mmanụ agbidi Naịjirịa abụrụla ihe ọtụtụ nrụrụaka, nzufu mmanụ nakwa atụmatụ ọrụ ndị gọọmentị ebinyeghiaka na-echere aka mgba ọkachasị na mpaghara Niger-Delta.
N’afọ 2022, gọọmentị Naịjirịa kwuru na nzufu mmanụ ndị a na-efu Naịjirịa ihe ruru udu mmanụ 470,000 kwa ụbọchị.
N’ọnwa Ọgọstụ 2022, mmepụta mmanụ agbidi Naịjirịa daturu rupo otu nde udu ‘barrel’ kwa ụbọchị nke bụ nke kacha datụọ adatụ n’ihe karịrị afọ 30.
NNPC kwukwara na ha enyochapụtala ọrụ ndị na-emepụta mmanụ agbidi nke gọọmentị enyeghi aka ruru 64 ebe ha nyọchapụtara ụlọọrụ ha ruru 77 ma bibie ha n’ime izuụka gara aga.
Onyeisiala Bola Tinubu aṅụọla iyi ibuso nzufu mmanụ agbidi Naịjirịa agha n’ụzọ pụrụiche bụ nke ọ kọwara na-efu Naịjirịa ọtụtụ oru.
Ndị be anyị unu asaala chi taa bụ ụbọchị Tuzde, 11 Jụlaị, 2023?
Soro akụkọ niile dị mkpa ịkọ taa niile ebe a.
Daalụkwanụ!

Ebe foto si, SALVAMENTO MARITIMO/FACEBOOK
Ndị ọrụ gbatagbata nke mba Spen na-achọ n'ime ala osimiri Canary ịma ma a ga-achọta otu ụgbọmmiri nke bu ndị njem si Afrịka ọnụọgụgụ ha ruru opekatampe 200, bụ nke a malitere ịchọ achọ kamgbe otu izuụka gara aga.
Otu enyemaka a na-akpọ 'Walking Borders' kwuru na ụgbọmmiri ahụ e ji akụ azụ hapụrụ Kafountine nke dị na mba Senegal nke dị kilomita 1700 tupu e ruo Tenerife.
Ụlọ ntaakụkọ Efe nke mba Spen kwuru na a na-eche na ọtụtụ ụmụaka juru n'ime ụgbọmmiri ahụ.
A na-ekwukwa na ụgbọmmiri abụọ dịka nke ahụ a na-achọ achọ, bụ nke bukwa ọtụtụ ndị njem, na-efukwa efu.
Ndị ọrụ gbatagbata nke mba Spen kwuru na ha ewerela ụgbọelu helịkọpta wee na-achọ ụgbọmmiri ndị ahụ.
Amatachabeghị ozi zuru oke maka ụgbọmmiri abụọ ndị ọzọ ahụ a na-achọkwa achọ, mana ụlọ ntaakụkọ Reuters na-ekwu na ọnụ na-ekwuru otu 'Walking Borders' bụ Helena Maleno kwuru na otu n'ime ụgbọmmiri ahụ bu mmadụ 65, ebe nke ọzọ bu mmadụ 60.
Nke a pụtara na mkpokọta ọnụọgụgụ ndị a na-achọ achọ n'ụgbọmmiri atọ ahụ gafere 300.
Akụkọ a na-abịa izuụka olemole kamgbe e nwechara otu n'ime ihe mberede kacha njọ n'osimiri Mediterranean nke metụtara otu ụgbọ mmiri na mpaghara mba Greece.
Opekatampe, mmadụ 78 bụ ndị a ma nwụrụ n'ihe mberede ahụ, mana otu 'United Nations' kwuru na ndị a ka na-achọ achọ karịrị mmadụ 500.

Ebe foto si, Reuters
Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden na Eze Charles III nke mba England enweela ọgbakọ pụrụ iche n'obi eze 'Windsor Castle' taa bụ Mọnde, ụbọchị nke iri nke ọnwa Julaị 2023.
Nke a bụ nke mbụ Biden na Eze Charles III na-ezute ihu na ihu kamgbe e kpunyere Charles okpu eze n'emume pụrụ iche n'ụbọchị isii nke ọnwa Mee 2023.
Otu isiokwu gbara ọkpụrụkpụ ndị ọchịchị abụọ a kpara maka ya bụ gbasara mgbanwe ihu eligwe bụ nke Eze Charles so na ndị a ma ama n'ụwa na-agba mbọ maka ya kamgbe ihe ruru afọ 50 gara aga.
Biden, Eze Charles III, nakwa ndị ide ego ndị ọzọ nwere ntakịrị ọgbakọ na 'Windsor Castle' maka etu a ga-esi kwalite nkwado na mbọ a na-agba ibelata mgbanwe ihu eligwe.
Ka ọgbakọ ahụ bịara na njedebe, Biden hapụrụ Uk gawa mba Lituania ebe ọ ga-esonye n'ọgbakọ nke otu Nato.
Tupu ọgbakọ a, Biden na Praịm Mịnịsta mba UK bụ Rishi Sunak nwere ọgbakọ n'ụlọọrụ Sunak dị na '10 Downing Street', ebe ha nọ kpaa ihe dị icheiche gbasara mmekọrịta mba UK na Amerịka, nchekwa mpaghara Europe, nakwa gbasara ma UK ọ ga-enye nkwado ka mba Ukraine sonyere otu Nato.
Lee foto ụfọdụ si na njem a nke Biden mere na mba UK pụta:

Ebe foto si, PA Media

Ebe foto si, PA Media

Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, PA Media

Ebe foto si, PA Media

Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọrụ ahụike na South Africa na-adọ ndị bi na mpaghara Gauteng aka na ntị ka ha kpachapụ anya maka mmiri ha na-aṅụ dịka ọnụọgụgụ ndị nwụrụla site n’ọrịa otoro na-agbasa ebe ahụ ariela elu na-achọ iru 50.
Ndị otu ndị obodo ịd iche iche arịọla ka gọọmentị tinyekwuo aka iji kwalite ịnwe mmiri ebe ahụ.
Ọtụtụ n'ime ndị nwụrụ n’aka ọrịa a n'ime izu isii gara aga nwụrụ na mpaghara Hammanskraal, ebe ndị bi ebe ahụ na-ekwu na enweghị mmiri dị ọcha bụ ihe ha na-agabiga kemgbe izu olemole mana enwekwaala akụkọ otoro ndị ọzọ dapụtara ebe ndị ọzọ.
N'ọtụtụ ebe, mmiri pọmpụ anaghị adị ọcha dịka ndị mmadụ na-adabere na mmiri gọọmentị na-eji udu ebubata.
Ọrịa otoro bụ nke nri na mmiri meruru emeru na-ebutekarị na-akpatara ọtụtụ oke afọ ọsịsa na ịgbọ agbọ dịka ya bụ ihe nwereike egbukwa ndị ọ na-arịa n'ime awa olemole ma ọ bụrụ na o bu ya anaghị ọgwụgwọ ngwa ngwa.

Ebe foto si, Reuters
Mmadụ asaa anwụọla nke gụnyere ụmụaka anwụọla n’ụlọakwụkwọ ọtaakara ebe a sụrụ ndị mmadụ mma n’akụkụ ndịda China bụ mpaghara Guangdong.
Ndị uweojii na-ekwu na ha anwụchila otu nwoke dị afọ 25 nke aha nna ya bụ Wu n’obodo Lianjiang.
Ndị ọzọ a zụgburu n’ụlọakwụk,wọ a gụnyere otu onye nkuzi, na nne na nna abụọ dịka ụlọ ntaakụkọ AFP siri kwuo dịka ha kọwara na ọ bụ otu onye ọchịchị mba ahụ gbara ama nke a.
E kwukwara na otu onye merụrụ ahụ na mwakpo a.
Ndị uweojii kọwara na ihe bụ mwakpo “a ma ụma mee” mana ha akọwabeghi kpọm kwem ebumnobi onye mere ya bụ mwakpo.
Mwakpo a mere n’isi ụtụtụ Mọnde a n’ebe elekere asaa na nkeji 40 nke ụtụtụ dịka ndị nne na nna nọ na-ebubu ụmụ ha n’ime ụlọakwụkwọ. A nwụchiri ya bụ nwoke a na-enyo n’okwu a n’ebe elekere asatọ nke ụtụtụ a.
Ndị bi n’obodo Lianjiang ruru otu nde na ụma.
Dịka ihe onyonyo banyere mwakpo a na-efesa na soshal midia China, ọtụtụ egosila iwe ha ebe ndị ọzọ na-ama jijiji.
Nke a so ụdịrị mwakpo malitere iri elu na nso nso na mba a bụ mwakpo ịsụ mma dịka a machiri ndị nkiti ibu egbe na mba ahụ.
Chetakwa na nso nso a, otu onye wakporo otu ụlọakwụkwọ ma gbaa ụmụakwụkwọ ruru 50 tụsa tụsa kemịkal nke merụrụ ha ahụ.
Ngụkọ BBC egosila na mwakpo e ji mma mee ruru 17 emeela n’ọtụtụ ụlọakwụkwọ prịmarị, sekọndịrị nakwa mahadum malite n’afọ 2010 ruo ugbua na mba ahụ.
Iri n’ime ha mere n’agbata afọ 2018 ruo 2023.
Ndị ọchịchị China na-agbasi mbọ ike ichekwa gburugburu ụlọakwụkwọ ha kemgbe 2010. N'afọ ahụ, Ministri nchekwa obodo gbara ndị ọchịchị obodo ume ka ha "kwụsie ike na mbuso agha" nye ndị na-eme mwakpo a iji hụ na e chekwara ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ.
Mgbe mwakpo Eprel 2021 gasịrị, ministri agụmakwụkwọ mba ahụ nyekwara iwu ka amalite ime ọzụzụ maka usoro mbupụ ụmụakwụkwọị n'ụlọ akwụkwọ ma ihe mberede mee.
N'ịtụ egwu na mwakpo mpaghara ndị ọzọ ga-amụta agwa mwakpo a, mba China anaghị ekwe ka ụlọọrụ mgbasaozi ha bipụta akụkọ nkọwa zuruoke maka mwakpo Mọnde a mere n’ụlọakwụkwọ ọtaakara a

Ebe foto si, Screengrab
Ndị ojiegbe wakporo obodo Umuawuchi-Owerre nke okpuruọchịchị Ehime Mbano n’Imo steeti n’abalị Sọnde foro chi ụbọchị Mọnde a.
A na-eche na ndị mere mwakpo a pụtara imanye iwu 'sit at home' na-aga n'ihu n'akụkụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kemgbe otu izuụka.
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ mwakpo mere n’akụkụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjịrịa dị iche iche n’izu gara aga gụnyere Abia, Ebonyi, na Enugwu dịka onyendu otu alaka 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) bụ Simon Ekpa pụtara n’etiti ọnwa Julaị 2023, tie iwu maka mmachi mkpagharị ndị mmadụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ruo otu izuụka, iji kpọọ oku ka a tọhapụ onyendu Ipob bụ Nnamdi Kanu.
N’ihe onyonyo BBC hụrụ nke na-efegharị na soshal midia ọtụtụ ọgba tum tum na-agba ọkụ dịka olu onye na-ekwu okwu kọwara na ya bụ ihe “mere na be Obi, agbaala ọtụtụ ọgba tum tum ruru asatọ”
Olu onye na-ekwu okwu n’ihe onyonyo ahụ kwukwara na ndị ojiegbe ahụ gbara ụgbọala ọhụrụ onye a a kpọrọ ‘Obi’ zutara ọkụ.
A kụsiri ime ụlọahịa ya bụ nwoke dịka ndị olu na-ada n'ime ihe onyonyo ahụ nọ na-akwa arịrị.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Henry Okoye gwara BBC Igbo na ọ ga-ezighachite ozi banyere akụkọ a mana anyị ka na-eche ịnụ olu ya ruo ugbua.
Ndị gọvanọ Steeti ise dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kwuru na ha amachiela ọnọdụ 'sit-at-home' na mpaghara ahụ, ma kwukwaa na ha ga-enye ntaramahụhụ siri ike maka onye ọbụla rubere isi n'iwu ahụ.
Kamgbe ahụ, ndị ekperima bucha egbe nọ na-akpagharị n'obodo dị icheiche, ma n'obodo ndị mepere emepe, ma n'ime obodo, na-awakpo ndị mmadụ pụtara ịgara mkpa ha.
Anyị abịala n'isi njedebe mgbasaozi nke taa.
Gụrụ gbadawa maka akụkọ niile dị mkpa maka ụbochị Sonde.
Maka akụkọ ndị ọzọ, gaa na bbcigbo.com.
Sonyekwara anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ Mọnde.
Ka chi fo.

Ọkụ agbapịala ụfọdụ ụlọahịa n'ahịa Arịarịa Aba, Abia Steeti, ebe ndị na-arụ akpụkpọ ụkwụ na-anọ, a na-akpọ 'G Power Line'.
Ya bụ ọkụ malitere ịgba n'ebe elekere iri nke abalị ụbọchị Satọde, bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa Maachị afọ 2023.
Dịka onye ntaakụkọ BBC gara ebe ọkụ a gbara si hụ, ya bụ ihe mberede metụtara ụlọahịa karịrị 22, nke ihe karịrị mmadụ 100 na-anọ na ya.
Ọtụtụ ndị ahịa ahụ gwara anyị na ngwaahịa ha lara n'iyi n'ọkụ ahụ karịrị nde kwuru nde naịra.
Ụfọdụ kwuru na ọkụ ahụ malitere oge e wetara ọkụ latrik mana o dobeghị anya kpọmkwem ihe kpatara ya.
Otu onye ahịa ahụ kwuru na kpọrọ ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ oge ọkụ ahụ malitere, mana ha enweghị ike ime ihe ọbụla n'ihi na okporoụzọ e si abanye n'ahịa ahụ jọrọ njọ nke ukwuu.
Gọọmentị Abia Steeti ekwubeghị ihe ọbụla gbasara ọdachi a.
Lee ụfọdụ foto si n'ahịa ahụ gbara ọkụ.


