Gọọmentị Adamawa etinyela mmachi mkpagharị dịka ndị mmadụ wakporo ụlọ nchekwa nri

Akụkọ niile dị mkpa n'ọnwa Julaị

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Ka chi fo

    Daalụ maka isonyere anyị taa.

    Ya gaziere gị.

    Ka anyị mekwa ya ọzọ, malite n'elekere asatọ nke ụtụ echi.

    Larụ jụụ.

  2. Oge eruola iji gbanwee akara nnụnnụ bụ njirimara Twitter - Elon Musk

    Elon Musk Twitter

    Ebe foto si, Getty Images

    Foto nnụnnụ dịka nwa nza, bụ akara e ji mara ọbaozi soshal midia Twitter, nwereike ịgbanwe n'oge adịghị anya, dịka ide ego bụ Elon Musk kwuru na ya ga-agbanwe ya.

    Kama o dochabeghị anya ma Musk a ga-agbanwe akara ahụ n'ezie maka na nwa amadị ahụ ekwuola ụfọdụ ihe n'ọdị nso a mana o meghị ha.

    Musk, onye zụụrụ Twitter n'ọnụego ijeri dọla 43 n'ọnwa Ọktoba afọ 2022, agbanweelarị aha azụmahịa ụlọọrụ ahụ ka ọ bụrụzie ',X Corp', mana ọ na-achọ ịgbanwa akara njirimara Twitter ma gbanwekwaa ọbaozi ahụ kpọzie ya X.

    Akụkọ kwuru na Musk chọrọ ikepụta ọbaozi ga-abụ ọkaibe nke ga-eyite ọbaozi 'WeChat' nke mba Chaịna.

    N'ụbọchị Sọnde, Musk dere na Twitter ya na "n'oge adịghị anya anyị ga-asị aha Twitter 'ka e mesịa', tinyekwara nnụnụ ya niile".

    O dekwara sị, "ọ bụrụ na anyị nweta akara X dị mma n'abalị a, anyị ga-ewepụta ya echi".

    E mechaa, n'otu ọgbakọ 'Space', oge a jụrụ ya ma ọ ga-agbanwe akara njirimara Twitter, ọ zara sị "Eh", ma gbakwụnye na "o teelarị e kwesịrị ịgbanwe ya".

    N'ọdị nso a Musk ewepụtala atụmatụ dị icheiche nke ndị mmadụ katọrọ gbasara Twitter.

    O tinyere ozi ole mmadụ nwereike ịhụ na Twitter kwa ụbọchị, nke mmadụ enweghị ike ịhụ karịa ọnụọgụgụ ozi ahụ.

    Nke a so mee ka ọtụtụ ndị mmadụ sonyere ọbaozi soshal midia ọhụrụ a kpọrọ 'Threads' nke onye nwe ya bụ Mark Zuckerburg, bụkwa onye nwe ọbaosi Facebook, Whatsapp, na Instagram.

    Kamgbe Elon Musk zụụrụ Twitter, ụlọọrụ ahụ achụọla ihe karịrị ọkara ndị ọrụ ha, ọtụtụ n'ime ha agbaala ya bụ ụlọọrụ akwụkwọ n'ụlọikpe maka ebubo ịchụ ha n'ọrụ n'ụzọ ekwesịghị ekwesị.

    Ha chọrọ ka Twitter kwụọ ha opekatampe nde dọla 500 iji tie ha aka n'obi.

  3. Russia atụọla ogbunigwe na nnukwu ụlọụka dịwara kamgbe gboo na Ukraine

    Ụlọụka na Ukraine

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ogbunigwe mba Russia gbariri nnukwu ụlọụka a dịrịla narị kwuru narị afọ na mpaghara Odesa nke mba Ukraine

    Opekata mpe otu onye nwụrụ ebe mmadụ 19 ọzọ merụrụ ahụ dịka mba Russia maka tụrụ ogbunigwe ma gbarie otu nnukwu ụlọụka ndị ụka Orthodox na mpaghara Odesa nke mba Ukraine.

    Ụlọụka a akpọrọ 'Transfiguration Cathedral' dịwara kamgbe gboo ma sorokwa n'ebe pụrụ iche nke Unesco kpọpụtara dịka ihe nlereanya pụrụ iche n'ụwa, a na-akpọ 'World Heritage Site' na bekee.

    Otu mba ụwa dị icheiche tinyere otu Unesco katọrọ ihe mba Russia mere ma kpọọ oku ka ha kwụsị ịtụ ogbunigwe n'Odesa bụ ebe e nwere ọtụtụ ebe nlere anya dịwara mgbe gboo.

    Mana Russia kwuru na ọ bụ ndị agha mba Ukraine ka a ga-ata ụta maka ya bụ ihe.

    Oleh Kipah bụ gọvanọ na-achị mpaghara Odesa kwuru na ndị merụrụ ahụ na mwakpo ahụ gụnyere ụmụaka anọ bụ ndị e bugarala n'ụlọọgwụ ugbua maka ịnata ọgwụgwọ.

    Mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta mba Ukraine na mba ndị ọzọ depụtara n'akara twitter ha na ihe a Russia mere bụ "Mpụ agha nke agaghị agbaghara maọbụ chefuo".

    Onyeisiala Ukraine bụ Volodomyr Zelensky ṅụkwara iyi na ha ga-abọ ọbọ maka ihe a Russia mere.

    Lee foto etu ụlọụka ahụ si gbarie dịka ogbunigwe dara ebe ahụ:

    Ụlọụka na Ukraine

    Ebe foto si, EPA

    Ụlọụka na Ukraine
  4. Shettima agaala ịnọchi anya Tinubu n'ọgbakọ abụọ na Rome, Russia

    Kashim Shettima

    Ebe foto si, Presidency

    Nkọwa foto, Osote onyeisiala Kashimm Shettima hapụrụ Abuja taa bụ Sọnde gawa Italy

    Osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima meela njem n'ụbọchị Sọnde gawa mba ofesi ebe ọ ga-anọchite anya Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu na nnukwu ọgbakọ abụọ a ga-enwe n'izu a.

    Nke a bụ njem ofesi mbụ Shettima na-eme dịka osote onyeisiala Naịjirịa kamgbe e duchara ya n'iyi ọrụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2023.

    Olusola Abiola bụ ọnụ na-ekwuru Shettima kwuru na osote onyeisiala ga-esonye n'ọgbakọ 'United Nations Food Systems Summit' nke a ga-enwe na Rome, mba Italy, malite n'ụbọchị Mọnde bụ ụbọchị 24 nke ọnwa Julaị ruo ụbochị 26 nke ọnwa Julaị afọ 2023.

    Ọ ga-esi ebe ahụ gawa obodo St Petersburg nke mba Russia ebe a ga-enwe ọgbakọ 'Russia-African Summit' n'ụbọchị 26 nke ọnwa Julaị 2023.

    Abiola kwuru na Shettima na ndị isi ọchịchị mba Russia ga-enwekwa ọgbakọ ndị ọzọ iji kpaa maka nkwalite mmekọrịta Naịjirịa na Russia.

    Ọ ga-alọghachi na ngwụcha izuụka a, Abiola kwuru.

  5. A bọpụtala ahụ ụmụaka abụọ n'ụlọ dara na Legọs

    Ebe ụlọ dara tigbuọ ụmụnne abụọ n'Ikorodu Legọs

    Ebe foto si, NEMA

    Ụmụaka abụọ bụ ụmụnne anwụọla n'ụlọ dara n'n'Ikorodu, Legọs n'ụtụtụ Satode.

    A bọpụtara ahụ Mujib Atolagbe gbara afọ itoolu na Rakib Atolagbe gbara afọ asaa na'okpuru ụlọ dara na Nọ 25, Ajao street CWC, Isawo n'Ikorodu.

    Onye nchịkọta otu gbagbata 'National Emergency Management Agency' (NEMA), nke mpaghara Ọdịọda Anyanwụ bụ Ibrahim Farinloye, bụ onye gbara ama n'ozi o wepụtatara kwuru sị, “Ụmụaka dị afọ itoolu na afọ asatọ tọrọ n'ụlọ dara dịak ajanguru dakwasara ụlọ oge oke mmiri na-ezo taa."

    Ụlọ dara ada

    Ebe foto si, NEMA

    Farinloye , onye tụrụ arịrị n'ihi ọdachị ahụ rụtụrụ aka na e tị mkpu gbagbata nye ndị ọbụ ọrụ kara azọpụta ụmụaka ahụ na ndị maọbụrụ na ozi rutere ha aka n'oge.

    Ọ gara n'ihu gbaa ama na ụlọọrụ Lagos State Building Control Agency (LASBCA) awụchiela ebe ahụ ịnyocha ka ihe sịrị kwụrụ.

  6. Ụmụaka abụọ atọọla n'ụlọ daara na Legọs

    Ndị ọrụ gbatagbata na-agba mbọ ịzọputa ụmụaka abụọ a sị tọọrọ n'okpuru ụlọ dara na n'Ikorodu, Legọs ụbọchị Satọde.

    Ndị nọ nso ebe ihe mere kwuru na aja ngwuru dakwasara n'ụlọ na mpaghara ime ọnụụlọ9room) ebe ụmụaka ahụ dịna oge mmiri na-ezo n'ụtụtụ Satode, oge ya bụ ihe mere.

    Ndị ọrụ gbatagbata

    Ebe foto si, Screengrab

  7. Ihe anyị hụrụ dịka anyị wakporo ogige ndị Ipob/ESN n'Asaba - Ndị agha Naịjirịa

    Ihe ndị agha hụrụ n'ogige ndị Ipob/ESN

    Ebe foto si, Nigeria Army

    Ndị agha Naịjirịa ekwuola etu ha si wakpo ogige ndị otu 'Indigenous People of Biafra' Ipob na ndị ọgụ ha bụ 'Eastern Security Network' n'Asaba, isi obodo Delta Steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị agha bụ Ọchịagha Onyema Nwachukwu kwuru na ọ bụ site n'ama ndị mmadụ gbara ka ndị agha ji wakpo ogige ahụ "nke dị n'ime oke ọhịa n'isi ụtụtụ ụbọchị Satọde, Julaị 22, 2023".

    "Ndị ekperima ahụ lụsoro ndị agha ọgụ site n'ịkwa ha mgbọ, mana ike nke ndị agha karịrị nke ha, mere ka ha gbahapụ ọtụtụ ngwaọgụ ha ma gbalaga ọsọ," Nwachukwu kwuru.

    "Ndị agha jidere otu onye n'ime ndị ekperima ahụ ma jichikwaa ngwaọgụ niile dị ebe ahụ nke gụnyere: egbe AK47 ise, egbe pump action atọ, otu egbe G3, na otu egbe 'single barrel'."

    "Ihe ndị ọzọ gụnyere ọtụtụ mgbọ egbe, otu 'saw' latrik e ji achabi ihe, ọtụtụ nnukwu mma oge, otu anyụike, na otu ọkọlọtọ Ipob."

    Nwachukwu kwuru na ndị agha kuriri ogige ahụ ma na-agakwa n'ihu ịchọ ndị ekperima ahụ gbara ọsọ.

    O kwuru na onyeisi ndị agha bụ Taoreed Lagbaja kelere ndị agha ahụ maka ike ha na-akpa ma na-ajakwa ha ka ha jisi ike n'ọrụ ruo mgbe ha chụpụrụ ndị ekperima niile ma mee ka udo laghachi na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

  8. Ụlọikpe enyela iwu ka a napụ James Ibori nde paụnd 101.5 a sị na o zuru n'ohi

    James Ibori

    Ebe foto si, Reuters

    Otu ọkaikpe na Londo mba UK enyela iwu ka a napụ James Ibori, bụbu gọvanọ Delta Steeti, Naịjirịa, ego dị nde paụnd 101.5, bụ nke ụlọikpe ahụ kpebiri na o nwetara site n'ụzọ na-ezighi ezi.

    Ọkaikpe David Tomlinson nke ụlọikpe 'Southwark Crown Court' kwuru na Ibori ga-akwụ ụgwọ ahụ na-egbughị oge maọbụ ọ gaa mkpọrọ afọ asatọ.

    Mana Ibori, onye na Naịjirịa ugbua kwuru na ya ga-agbagha mkpebi ahụ n'ụlọikpe kachasị nke mba UK.

    Cheta na amaburu Ibori ikpe n'afọ 2011 na UK maka ebubo ibupụ ego Delta Steeti n'ụzọ ezighi ezi oge ọ bụ gọvanọ.

    A tụrụ ya mkpọrọ afọ iri na atọ mana ọ nọrọ na mkpọrọ ihe karịrị afọ ise tupu e mechaa tọhapụ ya n'ọnwa Disemba 2016, ma kpọlata ya na Naịjirịa na mbido afọ 201.

    Ugbua, ọkaikpe na-ekwu na ọ bụrụ na Ibori akwụchaghị ụgwọ ahụ ụlọikpe sị ya kwụọ, a ga-ejide ya ka ọ nọchapụ afọ ndị ọ nọghị na mkpọrọ.

  9. Gọọmenti ebuliela ụgwọakwụkwọ sekọndịrị ruo N100,000

    Ụmụakwụkwọ

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmentị etiti ebuliela ụgwọakwụkwọ ụmụakwụkwọ na-agụ n'ụlọ akwụkwọ sekọndịrị nke gọọmentị etiti nwe site na puku naịra iri anọ na ise (N45,000) ruo otu narị puku naịra (N100,000).

    Nke a bụ ozi si n'aka ngalaba na-ahụ agụmakwụkwọ na Naịjirịa bụ nke ha wepụtara n'ụbọchị 25 nke ọnwa Mee 2023, mana ozi ahụ pụtara ihe na nsonso a.

    Akwụkwọ ozi ahụ nke Binta Abdulkadir, bụ odeakwụkwọ na-elekọta agụmakwụkwọ Sekọndịrị na Mịnịstrị agụmakwụkwọ, binyere aka na ya, gosiri na mbuli ụgwọ akwụkwọ ahụ metụtara ngalaba agụmakwụkwọ niile dịka, ụlọ obibi ụmụ akwụkwọ, akwa akwụkwọ, akwụkwọ ọgụgụ na akwụkwọ e ji ede ihe, na ndị ọzọ.

    Mana n'ụbọchị 11 nke ọnwa Julaị, ụlọ omeiwu nta nke Naịjirịa rịọrọ gọọmentị etiti ka ha weghachi ụgwọ akwụkwọ ahụ etu ọ dịbu mbụ, maka na ihe isi ike karịrị n'obodo.

    Ọ bụ ndị omeiwu abụọ - Saidu Abdullahi nke Niger steeti na Kama Nkemkanma nke Ebonyi Steeti welitere okwu ahụ n'ụlọ omeiwu.

  10. Ụtụtụ ọma

    Igbo bụ Igbo mmamma nụ o.

    Ụnụ asaala chi.

    Ka anyị malite mgbasaozi nke taa.

  11. Ọrịa diphtheria egbuola mmadụ 29 na Yobe steeti

    Aka ji ntụtụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọrịa diphtheria ebuola mmadụ 26 na Yobe steeti, ebe mmadụ 21 na-anata nlekọta, dịka gọọmentị steeti ahụ siri kwuo.

    Onye enyemaka Gọvanọ steeti ahụ bụ Lawan Gana kkwuru sị,

    “Ka ọdị n'abalị 17 nke ọnwa Julai, anyị nwere mmadụ 21 ọrịa diphtheria ji aka ugbua, mmadụ 26 anwụọla, ebe mmadụ 289 bụ ndị a sịrị ha lawa na ha agbakela.

    " Malite n'afọ 2022 rue 2023, anyị enwela mmadụ 336 nwere ọrịa."

  12. Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ agaghị eto ma ewepụ Anambra - Alex Otti

    Chukwuma Soludo na Alex Otti

    Ebe foto si, Anambra State New media

    Gọvanọ Abia Steeti bụ Alex Otti esorola kpọọ oku ka ndị Igbo bụ ndị oji ego achụ ego hibe ụlọọrụ nakwa ụlọ ahịa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa iji kwalite ọnọdụ akụnụba mpaghara ahụ.

    Otti kwuru nke a dịka o sonyere n'ọgbakọ nke ndị Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo kpọrọ maka ndị Anambra Steeti niile bi n'Abuja.

    Soludo kpọrọ ọgbakọ a iji kọwaara ndị steeti ya nọ n'Abuja achụ ego maka atụmatụ niile nke ọchịchị ya na-etinye iji kwalite ọnọdụ akụnụba n'Anambra Steeti.

    Gọvanọ Otti sonyere n'ọgbakọ a dịka otu n'ime ndị gọvanọ steeti ise mebere mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, nakwa onye so agba mbọ ịkwalite ọnọdụ akụnụba na mwulite mpaghara ahụ.

    "Ihe m ji bịa n'ọgbakọ a bụ iji kwadoo ihe Gọvanọ Soludo na-eme. Anyị niile bụ otu ndị. Ọ dị mkpa ka anyị mezie mpaghara Ọwụwa Anyanwụ; Ọwụwa Anyanwụ agaghị eto ma ewepụ Anambra Steeti. Anyị ga-eme ihe niile anyị nwereike iji mee ka akụnụba lọtaruo ụlọ," Otti kwuru.

    Anyị nwere ala maka ndị chọrọ iwu ụlọọrụ - Soludo

    Chukwuma Soludo

    Ebe foto si, Anambra State New Media

    N'ọgbakọ ahụ nke ọtụtụ ndị ọchịchị si Anambra Steeti sonyere na ya, Soludo kwere nkwa na gọọmentị ga-enye ndị ọbụla chọrọ ihibe atụmatụ ịchụta ego n'Anambra steeti nkwado niile ha chọrọ.

    "Anyị nwere atụmatụ iji hụ na onye ọbụla chọrọ ihibe ụlọọrụ n'Anambra Steeti ga-enweta ala iji mee nke a na-enweghị nsogbu ọbụla," ka o kwere nkwa.

    "Anyị na ụlọọrụ 'Enugu Electricity Distribution Company' (EEDC) na-arụkọ ọrụ iji hụ na ọkụ latrik anaghị anyụ anyụ ọ bụlagodu n'obodo anọ mepere n'Anambra bụ Ọka, Ọnịcha, Nnewi na Ekwulọbịa."

    Soludo kwukwara na ọchịchị ya na-agba mbọ iwulite Ọnịcha ka ọ bụrụkwa obodo a na-akwanyere ugwu dịka ọ dịbu n'oge mbụ.

    O kwukwara na ha na-agba mbọ ijikwa mbuze na-enye nsogbu na mpaghara dị icheiche na steeti ahụ dịka Oko, Nanka, Ekwulobia, Oba, na ndị ọzọ.

  13. Gọọmentị Akwa Ibom na 'Innoson' ejikọọla aka iji nye 'palliative' maka mwepụ 'subsidy'

    Umo Eno na Innocent Chukwuma

    Ebe foto si, @PastorUmoEno/Twitter

    Gọvanọ Akwaibom Steeti bụ Umo Eno na ụlọọrụ Innoson, bụ ndị na-arụpụta ụgbọala, ejikọọla aka iji belata nhịahụ ndị mmadụ na-agabiga na steeti ahụ n'ihi mgbali elu ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

    N'ụbọchị Tọzde, Gọvanọ Eno kwuru na gọọmentị Akwa Ibom na ụlọọrụ Innoson ga-ejikọ aka iji belata ahụhụ ndị mmadụ na-ata gbasara ime njem oke ọnụ ugbua.

    Ụlọọrụ Innoson na-arụpụta nnukwu ụgbọala 'bus' bụ nke na-eji ikuku gaasị pụrụ ije a kpọrọ 'Compressed Natural Gas' agba, kama mmanụ ụgbọala bụ fuel.

    Ndị ọkachamara na-ekwu na CNG ka mma maka ịdị ọcha gburugburu karịa 'petrol', ma dịkwa ọnụala karịa ya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Nke a na-abịa dịka ndị ọ kacha mara na ekwu ka gọọmentị etiti na nke steeti dị icheiche wepụta atụmatụ njem okporoụzọ nke ndị mmadụ agaghị na-akwụ nnukwu ụgwọ iji mee njem.

    Mgbalielu ọnụahịa mmanụ ụgbọala na-abịa dịka gọọmentị etiti kwụsịrị ịkwụ ụgwọ ha na-akwụbu iji butuo ọnụahịa ya, bụ nke a kpọrọ 'fuel subsidy' na bekee.

    Nke a mere ka ọnụahịa njem ụgbọala nakwa ihe ndị ọzọ niile rịa oke elu nke butere nnukwu nhịahụ.

    Gọọmentị etiti wepụtaburu atụmatụ ikesa ezinụlọ ruru nde 12 bụ ndị dara oke ụbịam ego dị puku naịra asatọ kwa ọnwa ruo ọnwa isii, dịka ihe enyemaka.

    Mana ha mechara kagbuo atụmatụ ahụ dịka ọtụtụ katọrọ ya, ma kwuo na ọ ka mma itinye usoro ga-ebelata ego ndị mmadụ na-emefu n'ime njem, karịa inye ndị mmadụ ego bụ nke na-enwghị ihe ọbụla ọ ga-ezu iji mee.

  14. Ụlọikpe mba UK na-atụle ịnapụ James Ibori £100m ọzọ nyeghachi ya Naịjirịa

    James Ibori

    Ebe foto si, Reuters

    Otu ụlọikpe na London, mba UK, na-atule inye iwu ka e jichie ego karịrị otu narị nde paunds n'aka aka chịburu Delta Steeti bụ James Ibori, ma weghachite ya na Naịjirịa.

    Cheta na a maburu Ibori ikpe ma tụọ ya mkpọrọ na mba UK dịka ụlọikpe kpebiri na o zuru ego Delta Steeti.

    Ọ bụ na Dubai ka a nọ nwuchie Ibori n'oge ahụ, n'afọ 2011 ma kpụga ya London bụ ebe a nọrọ kpee ya ikpe ma tụọ ya mkpọrọ nke ọ nọrọ afọ ise.

    Mana n'agbanyeghị na Ibori apụtala na mkpọrọ ma lọghachi Naịjirịa, ndị ọkaiwu na London ka na-agba mbọ ịnara ya ọtụtụ akụnụba ya bụ nke ha kwuru na ọ bụ ego o zuru oge ọ nọ na gọọmentị ka o ji nweta akụnụba ndị ahụ.

    N'ụbọchị Tọzde, otu ọkaikpe aha ya bụ David Tomlinson nke ụlọikpe 'Southwark Crown Court' kwuru na ya na-eme nnyocha gbasara akụnụba James Ibori iji kpebie ole n'ime ha nwereike ịbụ nke o zuru ezu.

    Otu onye ọkaiwu ji okwu ahụ, bụ Jonathan Kinnear, gwara ụlọikpe na ego ahụ ga-eru nde paụnd 101.5 - nke karịrị ijeri naịra 100 -, ma kwukwaa na ọ bụrụ na Ibori ewetaghị ego ahụ, o nwereike ịga mkpọrọ ihe dịka afọ ise ruo afọ iri.

    Ibori agaghị ikpe ahụ n'ụbọchị Tọzde, mana ọ gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters n'ozi ekwentị na ya ga-etinye akwụkwọ mkpegharị maka ebubo ndị ahụ.

    N'afọ 2021, gọọmentị Briten nyeghachiri Naịjirịa nde paụnd anọ na ụma abụọ bụ nke ha kwuru na ha napụtara James Ibori, mana gọọmentị Delta Steeti kwuru na ọ bụ ha ka e kwesịrị inye ego ahụ n'ihi na ọ bụ n'akpa steeti ahụ ka Ibori si wepụ ya bụ ego, ọ bụghị n'akpa gọọmentị etiti.

    N'ọdịnso a, Onyeisiala Bola Tinubu na James Ibori enweela ọgbakọ ugboro abụọ n'obi gọọmentị n'Abuja, ya na ndị bụbu gọvanọ na 1999 oge Tinubu bụ gọvanọ Legọs.

  15. Stella Oduah abịala n'ụlọikpe ịzara ọnụ ya maka ebubo nrụrụaka EFCC na-ebo ya

    Stella Oduah

    Ebe foto si, Stella Oduah

    Stella Oduah, bụbu Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naịjirịa, bịara n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja taa bụ Fraịde, Julaị 21 2023, ịzara ọnụ ya maka ebubo nrụrụaka nke ngalaba EFCC na-ebo ya.

    EFCC boro ebubo na Oduah na mmadụ asatọ ọzọ mere nrụrụaka n'ego gọọmentị ruru ijeri naịra ise (N5b) oge ọ bụ Mịnịsta.

    Oduah na ndị ọzọ e boro ebubo ahụ bịara n'ihu ọkaikpe Inyang Ekwo ma kwuo na ebubo ahụ abụghị eziokwu.

    Mmadụ asatọ ndị ọzọ EFCC boro ebubo a gụnyere Gloria Odita, Nwosu Emmanuel Nnamdi, na Chukwuma Irene Chinyere.

    Ndị ọzọ bụ ụlọọrụ 'Global Offshore and Marine Ltd'; 'Tip Top Global Resources Ltd'; 'Crystal Television Ltd'; 'Sobora International Ltd'; na 'China Civil Engineering Construction Corporation' (CCECC) Nigeria Ltd.

    EFCC gbara ha akwụkwọ kamgbe afọ 2020, akara ikpe ahụ bụ 'FHC/ABJ/CR/316/2020', mana ikpe ahụ amaliteghị ruo ugbua, dịka afọ atọ gachara.

    Stella Oduah rụkwara ọrụ dịka Sinetọ nọchitere anya mpaghara Anambra North n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa.

    N'ọnwa Eprel 2018, Mịnịsta mgbasaozi Naịjirịa n'oge ahụ bụ Lai Mohammed, wepụtara aha ndị gọọmentị boro ebubo nrụrụaka nakwa izu ego gọọmentị.

    Aha Stella Oduah bụ nke itoolu n'akwụkwọ ahụ dịka gọọmentị boro ya ebubo nrụrụaka ego ruru ijeri naịra itoolu na ụma asatọ (N9.8b).

  16. Gịnị kpatara ihe gbara ka ogbunigwe nekgbariri okporoụzọ na Saụt Afrịka?

    Ọdachi ihe gbara ka ogbunigwe na Johannesburg, Saụt Afrịka

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị ọchịchị mpaghara Hohannesburg nke mba Saụt Afrịka ka na-eme nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ihe ọdachi mere na mpaghara ahụ n'ụbọchị Wenezde dịka ihe dara ka ogbunigwe gbara ebe ahụ.

    Otu onye nwụrụ na ya bụ ọdachi ebe ihe ruru mmadụ 48 bụ ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua.

    Ndị ọchịchị obodo amatabeghị kpọmkwem ihe kpatara ọgbụgba ihe a dịka ogbunigwe, mana ha na-eche na ọ bụ gaasị dị n'ime ala gbara.

    E nyela ndị mmadụ ndụmọdụ ka si na mpaghara ndị ahụ pụọ dịka a na-eche na ọzọ nwereike ịgba. Ndị ọrụ gbatagbata ka nọ n'okirikiri ebe ahụ iji kee nkwụcha.

    Panyaza Lesufi, bụ onye ọchịchị mpaghara Gauteng, nke bụ ebe Johannesburg dị, gwara ndị ntaakụkọ na nnyocha mbụ ha mere egosighi kpọmkwem ihe kpatara odachi ahụ, mana nnyocha ja na-aga nihu.

    Ụlọọrụ na-ekesa ikuku gaasị na mpaghara ahụ bụ 'Egoli Gas' kwuru na ha chọpụtara ntakịrị ohere ebe gaasị si ekupu n'okporo gaasị ha, mana nke ahụ ekwesịghị ibute ụdị ihe ọgbụgba ahụ.

    Mana gọọmentị agwala ụlọọrụ ahụ ka ha nyochakwaa okporo gaasị ha ọzọ iji mara ma enwere ebe ọ na-ehi ehi.

  17. Ụnụ abọọla chi

    Igbo ndị ọma, kedụ ka ụnụ dị n'ụtụtụ a?

    Ekele dịrị onye ukwu na onye nta.

    Mgbasaozi anyị nke taa amalitela.

    Gaa n'ihu na-esonyere anyị.

    Maka akụkọ ndị mere n'ụbọchị ndị ọzọ nke ọnwa Julaị, gụrụ gbadawa.

  18. New Zealand: A gbagbuola mmadụ abụọ n'Auckland dịka iko mbaụwa ụmụnwaanyị na-achọ imalite

    New Zealand shooting

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba New Zealand nọ n’arịrị dịka a gbugburu mmadụ abụọ awa olemole ka emume mmepe iko mbaụwa FIFA nke ụmụnwaanyị 2023 na-achọ imalite ebe ahụ.

    Mmadụ isii ndị ọzọ gụnyere ndị uweojii merụrụ ahụ na mwakpo a dịka otu onye ojiegbe mere mwakpo abụrụla onye nwụrụ anwụ ugbua.

    Ihe mere n’elekere asaa na nkeji 22 nke mgbede a n’akụkụ ebe a na-arụ ụlọ na mpaghara etiti Auckland.

    Praịm minista ebe ahụ bụ Chris Hipkins kwuru na mwakpo a abụghị atụmatụ iyi ndụ egwu.

    O kwukwara na asọmpị ahụ ga-amalite ma gaa n’ihu dịka etu e siri hibe ya.

    Dịka achọpụtabeghi na ebumnobi mwakpo bụ nke iyi ndụ egwụ, nke echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị maọbụ nke okpukperechi, ndị uweoji mba a agbagbuola onye mere ihe ma maa ọkwa nye ọha na udo na-achị ebe ahụ dịka Praịm Minista siri kwuo.

    E kwuru na nwaamadị mere ihe a nke aha ya bụ Matu Tangi Matua Reid wụbatara n’ime ebe ahụ a na-arụ ụlọ ma buru egbe pump-action bụ onye ndị uweojii mba a ma ama ma bụrụ onye ha natarala ozi na ọ na-akpa ike n’ezinaụlọ ya.

    E kwukwara na ahụike echiche ya ezuchaghị oke.

    Maazị Hipkins kwukwara na n’ihe onyonyo o wepụtara sị ndị ezinaụlọ nwaamadị a “mba anyị niile so unu eru uju”

    Ndị uweojii na-eme nnyocha ima etu nwaamadị a siri nwata egbe a dịka iwu inweta egbe na ngwa ọgụ na mba ahụ tara ezigbo akpụ.

    Ozi si n’aka ndị ọrụ na mba a agbaala ama na ndị ọru Fifa niile nakwa ndị otu bọọlụ batarala n’ọnọdụ nchekwa dịka ọkọ akọghị onye ọbụla n’ime ha.

  19. Regina Daniels abụrụla 'social secretary' otu jịkọrọ nwunye ndị senetọ

    Regina Daniels

    Ebe foto si, Regina Daniels

    A họpụtala onye ihe ejije Nollywood a ma ama bụ Regina Daniels dịka odeakwụkwọ mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke otu jịkọrọ nwunye ndị Omeiwu Ukwu Naijiria ụnyahụ bụ Tuzde. Daniels bụ nwunye Ned Nwoko bụ Senetọ na-anọchite Delta-North n'Ụlọọmeiwu Ukwu Naijria. Daniels bụ onye gbara ama n'ụbọchị Wenezde n'akara ya n'ọbaozi Facebook kwuru ihe ha kpara na ya bụ ọgbakọ ha mbụ nke nwunye onyeisi ulọomeiwu Ukwu bụ Ekaette Akpabio kpọrọ bụ iji etu ha ga-esi akwado ndị di ha n'ọrụ ịkwalite ala Naijiria.

    Ndị nwunye ndị Ụlọomemiwu Ukwu Naijiria

    Ebe foto si, Regina Daniels

  20. Gịnị mere e ji kwụsị ọgbaọsọ Tobi Amusan ọrụ n'ike?

    Tobi Amusan

    Ọkaibe n'ịgbaọsọ n'ụwa bụ Tobi Amusan aṅụọla iyi na ya agbara aha ya n'ebubo metụtara ịṅụ ọgwụike.

    Ụbọchị Wenezde, ngalaba nhazi ọsọ na egwuregwu ndị ọzọ n'ụwa bụ 'Athletics Integrity Unit 'mara ọkwa na ha akwụsịla Amusan ịgba ọsọ nwa mgbe nta maka ịgbahapụ ugboro atọ ime n'afọ ime nnyocha ma ọgwụike a dị ya n' ahụ nke iwu ha kwuru na o kwesịrị.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Iwu otu 'World Athletics' megide ịṅụ ọgwụike na-ekwu na onye egwuregwu ọbụla emeghị nnyocha ahụ maka ọgwụike ugboro atọ n'ọnwa 12 etozughị ịsonye n'asọmpi afọ abụọ, mana e nwere ike iwetu ya rue otu afọ ma e nyocha ndahie ahụ.

    Ihe nkwụsị ọrụ n'ike pụtara bụ na Amusan onye gbara afọ 26 agaghị esonye n'asọmpi 'World Athletics Championships' nke a ga-eme na mba Budapest n'Ọnwa Ọgọstụ ma ọ bụru na 'Athletics Integrity Unit' gbaa isi akwara na nkwụsị ọsọ ha kwụsịrị ya.

    Nwaafọ Naijiria riterela mmerị dịka ọkaibe n'ọsọ na asọmpi Commonwealth agọọla na ya anụghị ọgwụike ọbụla.

    Ozi Tobi Amusan

    Ebe foto si, Tobi Amusan/Instagram