Ihe mberede ataala isi mmadụ 15 n'okporoụzọ Legọs - FRSC

Ebe foto si, FRSC Lagos
Ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ nke Naịjirịa bụ 'Federal Road Safety Corps' ekwuola na ihe mberede mere n'okporoụzọ si Badagry gawa Ijanikin, na Legọs Steeti, egbuola mmadụ 15.
Olabisi Sonusi bụ ọnụ na-ekwuru ndị FRSC nke Legọs kwuru na ihe mberede a mere n'ebe elekere asaa na ọkara nke ụtụtụ ụbọchị Sọnde, bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Julaị 2023.
O kwuru na ọ bụ ụgbọala abụọ - otu nnukwu ụgbọala na otu bọọsụ - takọtara isi. Ọnụọgụgụ ndị mmadụ nọ n'ime ụgbọala abụọ dị 24, mana mmadụ 15 nwụrụ anwụ ebe mmadụ itoolu nwetara ihe mmerụ ahụ dị icheiche.
Ndị nwụrụ anwụ gụnyere ụmụ nwoke itoolu, ụmụ nwaanyị ise, na otu nwata nwaanyị, ebe ndị merụrụ ahụ bụ ụmụ nwoke ise na ụmụ nwaanyị anọ.
Dịka ndị ozi ahụ si n'aka ndị FRSC si kwuo, e bugara ozu ndị ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ ozu dị n'ụlọọgwụ ọha nke Badagry, ebe ndị merụrụ ahụ nọkwa n'otu ụlọọgwụ ahụ anata ọgwụgwọ.
Onyeisi ụlọọrụ FRSC nke Legọs bụ Babatunde Farinloye kwuru na ihe mberede a agaraghị eme ma ọ bụrụ na ndị ọkwọ ụgbọala abụọ a kpachapụrụ anya n'etu ha si anya ụgbọala ha.
Dịka o si kwuo, ihe kpatara ya bụ ihe mberede bụ ịgba oke ọsọ dịka otu ụgbọala chọrọ ịgbafere nke ọzọ n'agbanyeghị na nnukwu mmiri na-ezo.
Farinloye dọrọ ndị ọkwọụgbọala aka na ntị ka ha kpachapụ anya ma kwụsị ị na-agba oke ọsọ n'okporoụzọ, ma na-erubekwa isi n'iwu okporoụzọ niile, ọ kacha oge ugbua bụ oge udummiri.




















