Gọọmentị Adamawa etinyela mmachi mkpagharị dịka ndị mmadụ wakporo ụlọ nchekwa nri

Akụkọ niile dị mkpa n'ọnwa Julaị

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Ọkpa ọchị, Cute Abiola abanyela na nsogbu maka ịkparị akwa ndị uweojii

    Cute Abiola

    Ebe foto si, Nigeria Police

    Ndị uweojii Naịjirịa ekwupụtala na ha na-enyocha ọkpa ọchị aha ya bụ Abdulgafar Abiola, onye e ji 'Cute Abiola' mara, maka "iji akwa ndị uweojii n'ụzọ mkparị na iji mee akaje".

    Nke a na-abịa dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Olumuyiwa Adejobi kwuru na Abiola emeela ihe ejije olemole ebe o yi aka ndị uweojii ma na-egosipụta ndị uweojii n'ụzọ nkatọ nakwa mkparị.

    "Iwu machiri mmadụ ọbụla, n'ụdị ọbụla, iji uweojii akpa ọchị maọbụ imetọ uwe njirimara ndị uweojii," Adejobi kwuru n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Tọzde.

    Cute Abiola

    Ebe foto si, Nigeria Police

    O nyere ọmụma atụ ejije abụọ ebe Cute Abiola gosipụtara ndị uweojii n'ụzọ iji mee akaje.

    Nke mbụ gosiri ebe onye uweojii na-arịọ otu onye ọkwọ ụgbọala ego iji gbanye mmanụ n'ụgbọala ndị uweojii mmanụ gwụrụ n'ime ya. Nke abụọ bụ ebe onye uwojii na-ana aka azụ.

    Adejobi dọrọ ndị niile na-eme ihe ejije ka ha kpachara anya etu ha si eji akwa ndị uweojii eme ejije, "maka na ndị uweojii ga-eji usoro niile iwu kwadoro iji chekwaa nkwanyeugwu nke ndị ọrụ ha na akụrụngwa ọrụ ha niile, nke gụnyere uwe ha."

    Cheta na Cute Abiola banyekwara na nsogbu n'afọ 2021 oge ọ bụ onye ọrụ 'navy' dịka e boro ya ebubo imegide iwu na-achịkọta ndị ọrụ 'navy' gbasara soshal midia.

    Mana n'afọ 2022, o kwuru na ya agbaala arụkwaghị m n'ọrụ 'navy' dịka o sonyeere ndị ọrụ gọọmentị Kwara steeti dịka otu n'ime ndị ọrụ ha.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  2. Doctors' strike: Ndị dọkita 'Park Lane Enugwu esonyela ndị otu ha

    Ụlọọgwụ ESUT Teaching Hospital, Parklane Enugwu

    Ndị dịjkkịta n’Enugwu ngalaba nke Park Lane Hospital ekwuola na ha esonyesiela ike n' abụbọọrụ ahụ ndị otu ha na Naijiria niile gbara ganye na Gọọmenti Etiti emere ha ihe ja na arịọ ha.

    Dọkita Chukwunanso Ofogele bụ onyeisi ha n'ụlọọgwu 'ParklaneHọspịtal Enugwu kwara arịrị na ụgwọ ọnwa ha pere mpe, anaghị enye ha ego 'hazard allowance' nwere isi tinyekwara na Gọọmenti Etiti emejuputaghi ihe ha na ha kwekọrptara na CONMESS ka mgbe afọ 1999.

    Ọtụtụ ha gwara BBC Igbo na nke kacha ewute ha bụ na ndị otu ha agbagachala obodo oyibo maka ugwọ ọmwa pere mpe. Nkea mere na ọrụ karịrị ndị dọkinta gọrọ afọ aka.

    Cheta na, n' abalị 26 nke ọnwa Julai,afọ 2023, ndị dọkịta Naịjirịa a kpọrọ ‘National Association of Resident Doctors’ malitere abụbụọrụ a na-amaghị mgbe ọ ga-ebi n'ihi ọnọdụ ọdịmma ha.

  3. Women World Cup:Nigeria agbaala Australia alaba aghara

    Super Falcon

    Ebe foto si, Super Falcon/Facebook

    Otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naijiria bụ 'Super Falcons' egosila ụwa na ha anaghị eti mmanwụ a na-akwa aka n’asọmpị iko mbaụwa Fifa nke ụmụnwaanyị 2023 na-aga n'ihu ugbua dịka ha ji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie ndị Austrialia.

    Uchenna Kanu, Osinachi Ohale na Asisat Oshoala nyeere Naịjirịa otu goolu otu goolu dịka Emily Van Egmond na Alanna Kennedy nyeere mba Australia otu goolu otu goolu.

    Site na mmeri a, Naijiria na Kanada nọzị na nhatanha dịka Naijiria nwetara akara anọ(4 points).

    Naijiria tozukwara isonye na-agba nke abụọ n'asọmpi iko mba ụwa nke ụmụnwaanyị.

  4. A gbagbuola otu onye n'Anambra steeti

    Onye ji egbe

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndịuweojii Anambra steeti ekwuola na ha na-enyocha tigbuo-zogbu tara isi otu onye n'Akwa Isi obodo nambra steeti n'ụbọchị Wenezde.

    A gbagburu otu nwoke a kpọrọ Igwe Omeli n'ihe ndị uweojii kwurụ na ha na-enyo na ọ bụ ọgụ ndị otu nzuzo na-azọ onye ga-abụ ndị eze ahịa n'ahịa Eke Ọka n'ụtụtụ Wenezde.

    Ọgụ ahụ butere iyi egwu nke mere ka ụfọdụ ndị ahịa gbawa ọsọ.

    Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga si kwuo,

  5. Ecowas agaghi anabata ịkwatu ọchịchị na Nijie- Onyeisioche

    Tinubu na

    Ebe foto si, Bola Tinubu Mohammed Bazoum

    Otu jịkọrọ mba ndị ndị n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ 'Economic Community of West African States' (ECOWAS), President Bola Tinubu, ekwuola na ha agaghị anabata ihe na-eme na mba Nijie.

    Ndịagha mba ahụ obi adịghị mma gbachiri okporoụzọ e si abanye obi onyeisiala mba ahụ n'ụtụtụ Wenezde dịka a na-ebioo ebubo na ha chọrọ ịkwatu onyeisiala mba ahụ bụ Mohamed Bazoum n'ọkwa bụ onye a họpụtara na ntuliaka e mere n'afọ 2021.

    Mana Onyeisioche Ecowas bụ Bola Tinubu kwuru n'ozi o wepụtara n'ehihe Wenezde na "Ndị ndu ECOWAS mna ndị nile hụụ ọchịchị onyekwuouche ya na ha agaghị anabata ọnọdụ ọbụla ga-ekposa ọchịchị onye kwuouche ya nke mba ahụ."

    Nijie bụ mba nkwatu ọchịchị na-emekarị. Kemgbe afọ 1960 ha nwere nnwereonwe, e nweeela mweghara ọchịchị n'ike ụgbọrọ anaọ.

  6. Ndịagha agbachiela ụzọ e si abanye obi Onyeisiala mba Nijie

    Onyeisiala  Mohamed Bazoum nke Nijie

    Ebe foto si, AFP

    Ndịagha mba Nijie agbachiela obi onyeisiala mba Nijie bụ Mohamed Bazoum na Niamey, isiobodo mba ahụ.

    A nụghị ụda egbe ọbụla mana o doghị anya ma e nwwrere ndị chọrọ iwehghara ọchịchị n'ike na mba ahụ.

    Ụlọọrụ onyeisiala kwuru n'ozi ha wepụtara na Twitter na ndị nche na-eche onyeisiala gbaliri inweta nkwado ndịagha na mbọị ha ịgba ọchịchị onye kwuouche ya mgba okpuru mana na o nweghị isi.

    Ụlọntaakụkọ AFP kwuru na Onyeisiala Mohamed Bazoum na ezinaụlọ ya nọ n'ụlọ ha.

    Otu onye a kpọghị aha ya gwakwara ụlọ ntaakụkọ ahụ na ihe mere bụ 'iwe kpusuru ndị agha. maka na a na-akpa ya bụ ihe.

    " Onyeisiala na ezinaụlọ ya nọ ọfụma. Ndịagha na ndị nche Onyeisiala dị njikere iwakpo ndị aka ha dị n'ihe na-eme," dịka ụlọọrụ onyeisiala si kwuo.

    Akụkọ kwuru na aka chịrị mba ahụ pụrụ n'oche na nsonso a bụ Mohammed Issoufu na ndị onyeisial gara aga nakpa etu a ga-esi ahụ na okwu ahụ aghaghị n'ihu.

    Nijie so na mba dị n'ọdịọ̄a Anyanwụ Afrịka a na[p-akwatukarị gọọmentị n'ọkwa n'ike.

    Kemgbe afọ 1960, e nweela nkwatu ọchịchị ugboro anọ ma nwekwa ọtụtụ mgbe a nwalere ime nke a.

    Okporoụzọ bara obi Onyeisiala Nijie
  7. Ọkụ na-agba n’ọzara agbagbuola ihe karịrị mmadụ 40 n’Algeria

    Ọkụ

    Ebe foto si, Reuters

    Ihe karịrị mmadụ 40 anwụola dịka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị mba Algeria ọkụ na-agba n’ọzara gbagburu ma na-emekpa ahụ n’ọtụtụ obodo nakwa n’ebe ezumike ọtụtụ.

    Puku kwuru puku ndị mmadụ agbapụla ebe ahụ ugbua.

    Mba Greece na-agba mbọ iji ụgbọelu ibupụ ọtụtụ ndị nke ha site n’akụkụ Rhodes dịka ọkụ na-agbarị mpaghara islands of Corfu nakwa Evia.

    Mkpomọkụ riri elu ekwebeghi gbadata dịka a na-atụ anya na ọ ga-arị elu gafee 44C n’akụkụ Greece ụfọdụ.

    Ọkụ ọgbụgba a na-efesa na Sicily emeela ka mba Italy gbachie ọdọ ụgbọelu ha nke Palermo nwamgbe nta.

    Oke ikuku nakwa ịkpọnwụ ahịahịa emeela ka ọrụ mmenyụ ọkụ bụrụ ihe na-adịghị mfe ugbua.

    Ebe ọkụ ọgbụgba a kacha bute ọnwụ ugbua bụ na mba Algeria ebe mmadụ 34 nwụrụ gụnyere ndịagha 10 ọkụ gbagburu ebe ha nọ na-agba mbọ ibupụ ndị mmadụ n’akụkụ mpaghara Bejaia nke mpaghara Ọdịda Anyanwụ Algiers. Ụlọ ntaakụkọ ndị mba ahụ na-ekwu na mpaghara Bejaia bụ ebe ihe kacha metụta dịka mmadụ 23 nwụrụ.

    Gọọmentị mba Algeria kwuru na ihe ruru pasentị 80 ebe ndị ọkụ a malitere na Sọnde gbara abụrụla ihe ndị e menyụrụ ugbua.

    Agbanyeghi nke a, a ka na-agba mbọ imenyụ ọkụ ndị a dịka nchịkọta ndị ọrụ nchekwwa, ndị ọrụ gbata gbata nakwa ndị ọrụ mmenyụ ọkụ ruru 8000 nọ n’ihu ọrụ a ugbua.

    Ọkụ a emetụtakwala mba agbataobi Tunisia dịka e bupụrụla mmadụ 300 site n’obodo Melloula pụọ.

  8. Ndị dọkịta na Naịjirịa agbaala abụbụọrụ a na-amaghị mgbe ọ ga-ebi

    Ndị dọkịta na Naịjirịa

    Ebe foto si, NARD

    Ndị dọkịta ahụike na Naịjirịa kwuru na ha amalitela abụbụọrụ ọrụ na-amaghị mgbe ọ ga-ebi maka na Gọọmenti etiti ekweghi eme ihe ndị ha chọrọ.

    Nke a na-abịa dịka ha gbara abụbụọrụ otu izuụka iji dọọ aka na ntị n’ọnwa abụọ gara aga.

    Onyeisi otu ‘National Association of Resident Doctors’ bụ Emeka Orji Innocent kwuru na ndị ọtu ha agaghị aga ọrụ malite na Wenezde 26 Julaị, 2023 ruo mgbe gọọmentị ga-eme ihe ndị ha chọrọ banyere ụgwọọnwa na ọdịmma ha.

    Ha chọrọ ka a kwụọ ha ụgwọ niile e ji ha n’oge gara aga nakwa ụgwọ ihe izendụ a kpọrọ ‘hazard allowance’ nakwa ụgwọ ọzụzụ a kpọrọ ‘medical residency training fund’ na ihe ndị ọzọ.

    Ndị dọkịta kwuru na eziokwu adịghị gọọmentị n’ọnụ n’imezu ekwerikọta ha nwere banyere ihe ndị ha chọrọ n’oge gara aga.

    Enweela ọtụtụ nghọtahie n’etiti gọọmentị na ndị dọkịta nke mere ọtụtụ ndị dọkịta na ndị ọrụ ahụike ndị ọzọ jiri hapụ Naịjirịa gawa mba ofesi ịchụrụ akaraka ha.

    Akụkọ kwuru na ndị dọkịta karịrị 33,000 ahapụla Naịjirịa n’ime afọ atọ gara aga.

  9. Ọtụtụ ọma nụ ooo

    Anyị na-abata gị n'oge a n'ọgbakọ BBC Igbo.

    Bia nụrụ nke na-eme na Naịjirịa nakwa mba ofesi ndị ọzọ.

  10. Daalụ maka isonyere anyị taa

    Igbo ndị ọma, chi jiri eji ga-efo efo.

    Sonyere anyị ọzọ n'ụtụtụ echi.

    Ka ọ dịnụ.

  11. Etu ndị ojiegbe si gbuo ndị uweojii abụọ n'Aba, gbaa ụgbọala ha ọkụ

    Onye uweojii

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ihe a bụ foto e tinyere iji kọwaa akụkọ

    Ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ wakporo ndị uweojii n'Aba, Abia steeti n'ehihie ụbọchị Tuzde, bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Julaị, 2023, gbuo mmadụ abụọ n'ime ha ma gbaa ụgbọala ha ọkụ.

    Akụkọ kwuru na ya bụ ihe mere n'ebe elekere ise nke mgbede, na mpaghara a na-akpọ 'Sameck Junction, nke dị nso n'okporoụzọ 'Old Express na ahịa Arịarịa Aba.

    Ndị nọ nso ebe ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị uweojii ahụ bụ ndị na-echekwa otu onye ọrụ gọọmentị bịara na mpaghara ahụ tupu ndị ojiegbe ahụ awakpo ha.

    Ụda egbe nke ndị ekperima ahụ gbara aghara aghara mere ka ndị mmadụ si n'ahịa ala gbalaga ọsọ, ma nyekwa ndị ojiegbe ahụ ohere ha si laa dịka ha kpachara arụ ahụ.

    Ndị hụrụ ihe merenụ kwuru na ndị ojiegbe ahụ bukọọrọ egbe ndị uweojii ahụ ha gburu gbaa ọsọ.

    Akụkọ kwuru na ọ bụ n'otu mpaghara ahụ ka ndị ekperima nọ wakpokwa ma gbuo ndị mmadụ anọ so n'otu ọtawaisi nke gọọmentị Abia hibere, ihe dịka ọnwa anọ gara aga.

    Ka ọ dị ugbua, ndị bi na gburugburu ebe mwakpo a mere na-ekwu na ndị agha, ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa dị icheiche na-akpagharị na mpaghara ahụ iji mee ka udo dị, "mana etu ha si jupụta n'okirikiri a emeela ka ụjọ na-atụ ndị mmadụ karịa," otu onye na-achọghị ka anyị kpọọ aha ya gwara onyentaakụkọ anyị.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia Steeti bụ Maureen Chinaka azabeghị oku nakwa ozi ekwentị anyị zigaara ya gbasara akụkọ.

  12. Ka e mee nyocha chọpụta ndị bụ ozu 103 ahụ - Amnesty International

    Otu Amnesty International

    Otu na-ahụ maka ikike dịịrị onye bụ Amnesty International ngalaba Naịjirịa ekwuola ka e mee nyocha ma chọpụta ndị bụ ozu mmadụ 103 ahụ nwụrụ n’oge ngagharịiwe EndSARS nke gọọmentị Legọs steeti kwuru na ha na-akwado ili.

    Ha kwuru ka gọọmentị Legọs steeti kwụsịgodu atụmatụ ahụ ruo mgbe e mechara nyocha ma chọpụta kpọmkwem ndị ahụ nwụrụ anwụ.

    Onyeisi otu a bụ Isa Sanusi n’ozi o wepụtara na Mọnde kwuru na “Ndị ọchịchị Naịjirịa kwesiri ịkagbu atụmatụ ilikọta ozu ndị a ọnụ ma mee ezigbo nyocha banyere ogbugbu ndị mmadụ n’oge ngagharịiwe EndSARS ma hụụ na a tara ndị aka ha dị na ya ahụhụ.”

    Ha gara n’ihu kwuo na gọọmenti ga-emekwa ozu mmadụ 103 ahụ nyocha ma bipụta akwụkwọ ga-egosi ndị ha bụ nakwa ihe gburu ha.

    Sanusi kwuru “Ọ bụ ihe ọjọọ na gọọmentị Legọs kpachiri ozu mmadụ 103 nwụrụ n’oge ngagharịiwe EndSARS na-ekwughi maka ya kamgbe ọnwa Ọktoba 2020.

    “Ndị niile a nwụchiri n’ihi ngagharịiwe a kwesiri ka a tọhapụ ha na-egbughi oge. Ha kwesiri iti ezinaụlọ ndị nke a metụtara aka n’obi.”

    Nke a na-abịa dịka gọọmenti Legọs kwuru na ha amawapụtala ego karịrị nde naịra iri isii na otu iji lie ozu mmadụ 103 nwụrụ n’oge ngagharịiwe EndSARS n’afọ 2020.

    Kepukepu a gbara pụtara mgbe a gbara otu akwụkwọ gọọmentị Legọs steeti dere banyere atụmatụ a n’anwụ n’ụbọchị Sọnde 23 Julaị 2023.

  13. Igbo ndị ọma daalụkwa nụ

    Obiọma ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ anyị nke taa.

    Biko buru oche gị bịa n'ọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe na Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

  14. Ka chi fonu

    Ụmụnna, ebe chi jiri, ka a wụsa ọwa.

    Echi ga-aka mma.

    Elekere asatọ nke ụtụ bụ oge anyị ga-amalitekwa ọzọ.

    Rahụ jụụ.

  15. Ndị agha ejichiela ndị ha sị bụ ndị Ipob/ESN itoolu n'Oroma, Mmiata Anam, Anambra Steeti

    Ndị agha Naịjirịa kwuru na ha wakporo ogige ndị Ipob/ESN

    Ebe foto si, Nigeria Army

    Ndị agha Naịjirịa ekwuola na ha wakporo ogige ndị Ipob/ESN abụọ, n'ụbọchị Sọnde, bụ ụbọchị 23 nke ọnwa Julaị 2023, ma jide mmadụ itoolu n'ime ndị ọgụ nnupuisi ahụ.

    Nke a si n'ọnụ Ọchịagha Onyema Nwachukwu, bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha, dịka o kwuru na ndị agha gbukwara otu n'ime ndị ekperima ahụ dịka ha na ha na-akwarịta mgbọ.

    "N'ụbọchị Sọnde, abalị 23 nke ọnwa Julaị 2023, ndị agha Naịjirịa wakporo ogige ndị 'Indigenous People of Biafra na ndị ọgụ ha bụ 'Eastern Security Network' nke dị n'obodo Oroma na Umuewelum Ana, n'okpuru ọchịchị Anambra West," Nwachukwu dere.

    "Ndị agha ahụ jidere mmadụ asatọ n'ime ndị ekperima ahụ, napụta otu egbe AK47, otu egbe AKMS, ụgbọala Lexus atọ na ọgbatumtum abụọ.

    "Ndị agha wakpokwara ogige ndị Ipob/ESN ọzọ dị n'obodo Mmiata Anam, dịkwa n'Anambra West, bụ ebe ụfọdụ ndị ọgụ Ipob malitere ịkwa ndị agha mgbọ.

    "Ka ọgụ egbe ahụ na-aga n'ihu, ndị agha gbagburu otu onye Ipob ma jidekwa otu onye ọzọ na ndụ."

    Nwachukwu kwuru na ha nwetara otu egbe AK47, otu egbe ntụ, na ọtụtụ akwa ndị uweojii n'ebe ahụ.

    Nke a na-abịa naanị ka ụbọchị olemole gachara ndị agha kwuru na ha wakporo ogige ndị Ipob/ESN n'Asaba Delta Steeti, jide ọtụtụ ndị ekperima ahụ, ma napụtakwa ha ngwaọgụ dị icheiche.

    Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ekwu na ọ bụ ndị ọgụ Ipob/ESN na-akpata ọnọdụ enweghị nchekwa na mpaghara ọwụwa anyanwụ, dịka ha na-ewe iwe maka njide gọọmentị jidere onyeisi ha bụ Mazi Nnamdi Kanu ma tinye ya na mkpọrọ n'Abuja.

    Mana ndị isi Ipob agọọla ugboro ugboro na ndị ekperima ahụ na-enye nsogbu abụghị ndị otu ha.

  16. Ụlọ dara ada etigbuola mmadụ 33 na Douala, Cameroon

    Ụlọ dara na Cameroon

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ gbatagbata na-agba mbọ ịzọpụta ndị tọrọ n'lọelu ogogo anọ a dara na Douala, Cameroon n'ụbọchị Sọnde

    Mmadụ 33 alaala mmụọ dịka ụlọ ogogo anọ dara ada n'obodo Douala nke Cameroun, dịka ndịọrụ gbatagbata na mba ahụ si kwuo.

    ụlọ a dara n'ụtụtụ ụbọchị Sọnde, dakwasa n'elu ụlọ ọzọ nọdebere ya n'akụkụ na mpaghara a kpọrọ 'Angel Raphael', mana amatabeghị ihe kpatara ụlọ ahụ ji daa.

    Opekatampe mmadụ 21 merụkwara ahụ n'ọdachi ahụ ma na-anata ọgwụgwọ ugbua n'ụlọọgwụ Laquintinie.

    Otu nwatakịrị nwaanyị dị afọ atọ merụrụ ahụ n'ọdachi ahụ mechara nwụọ n'ụlọọgwụ n'ụbọchị Sọnde

    ndị ọrụ gbatagbata ka na-agba mbọ ịma ma e nwere ndị ka tọrọ atọ n'ime ala iji zọpụta ha.

    Otu onye welitere isi na gọọmentị na Douala gwara BBC na ọdachia wutere ha nke ukwuu n'ihi na ha na-agbasi mbọ ike igbochi ụlọ ọdịda na mba ha kamgbe e nwechara ụdị ọdachi ahụ na Douala n'afọ 2016.

    "Anyị na-enwebu aṅụrị na ụdị ọdachi a emebeghị na mba anyị - ọ kacha na Douala bụ ebe Mayor na-agbasi mbọ ike ime ka ihe niile na-aga n'anya ya, mana nke a wutere anyị rinne," Kizito Ngoa, bụ onyeisi otu jikọrọ ndị Injinia na-arụ ụlọ na Cameroun, kwuru

    Kamgbe 2016, ndị ọrụ gọọmentị na-agagharị na-akụtu ụlọ ndị na-esighi ike maọbụ ndị na-achọ ịda ada, mana nke a dara ugbua tụrụ onye ọbụla n'anya n'ihi na o soghị n'ụlọ gọọmentị kara akara maka ikutu ya.

  17. Ụlọikpe achụpụla Ngozi Okolie nke LP dịka omeiwu Aniocha/Oshimili, tinye Elumelu

    Ngozi Okolie na Ndudi Elumelu

    Ebe foto si, Ngozi Okolie/Ndudi Elumelu

    Ụlọikpe ntuliaka nke Delta Steeti achụpụla Ngozi Okolie nke Labour Party n'ọkwa onye omeiwu na-anọchite anya mpaghara Aniocha/Oshimili n'ụlọ omeiwu 'House of Reps' n'Abuja.

    Mkpebi a bịara n'ụbọchị Mọnde, n'Asaba, isi obodo Delta Steeti, dịka ndị ọkaikpe kwuru na Mazị Ngozi Okolie abụghị onye otu 'Labour Party' n'oge pati ahụ mere ntuliaka imeụlọ iji họpụta onye ga-azọ ntuliaka ahụ.

    N'ihi nke a, ụlọikpe ahụ kwuru na Okolie ekwesịghị iso zọọ ntuliaka ahụ nke pụtara na mmeri ya achịtaghị aja.

    Ha kwuru na onye gbara onye nke abụọ na ntuliaka ahụ, bụ Ndudi Elumelu nke otu 'Peoples Democratic Party' (PDP) bụzi onye meriri ya bụ ntuliaka.

    Mana Mazi Ngozi Okolie ekwuola na ya ga-agbagha mkpebi nke a ụlọikpe tribunal nyere n'ụlọikpe mkpegharị.

    Cheta na dịka e mechara ntuliaka maka ọkwa ụlọ omeiwu n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023, Inec kpọpụtara aha Ngozi Okolie dịka onye meriri ntuliaka ahụ dịka o nwetara vootu 53,879; ebe Ndudi Elumelu nke PDP nwetara vootu 33,456; Tony Nwaka nke 'All Progressives Congress (APC) nwetara vootu 11,712.

  18. Elon Musk: Twitter ekpuheela akara njirimara ọhụrụ nọchịrị nke nnụnụ ochie ha

    Akara njirmara ọhụrụ ụlọọrụ X

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Akara njirmara ọhụrụ ụlọọrụ X

    Onyeisi ụlọọrụ Twitter ewepụtala akara njirimara ọhụịrụ soshal midia ahụ nke gosiri akarea X n’elu ihe na-acha ojii ojii bụ nke a sị ga-anọchite akara njirimara nnụnụ e ji mara ya bụ soshal midia.

    N’ozi Linda Yaccarino zipụtara n’ụtụtụ Mọnde o kwuru “X abịala! Ka anyị malite ọrụ.”

    Elon Musk ekwuola na agaghị na-akpọ ozi ndị e zipụtara na Twitter “Tweets” kama a ga na-akpọzị ha “x’s”.

    Musk agbanweela foto njirimara akara Twitter nke ya ma tinye akara ọhụrụ x ahụ ma gbanwee websaịt ọbaozi ahụ ka ọ bụrụzie “x.com”

    O teela ọnwa olemole o kwuwere maka soshal midia ọhụrụ ọ chọrọ ime a kpọrọ “x”.

    Ozi o zipụtara n’ụbọchị Sọnde banyere okwu a dere:

    “n’oge adịghị, anyị ga-efere Twitterna njirimara ya aka nakwa nwayọ nwayọ nnụnụ ya niile”

    O mechara zipụta foto gosiri ebe e ji ọkụ chado ọkụ akara ‘X’ ahụ n’akụkụ ụlọọrụ Twitter nke dị na San Francisco.

    Musk onye gbanwere aha e ji hibe ụlọọrụ ahụ ugbua ka ọ bụrụzie ‘X Corp’ kwuru na “oteelarị a gaara ime ngwa ndị a”.

    Nwaada Yaccarino kwupụtara na Twitter ya na “Twitter gbanwere etu ụwa si agbasa ozi”

    “Ugbua, X ga-emewakwunye ya bụ ihe n’ụwa niile”.

    Nnụnụ njirimara Twitter ahụ a kpọrọ ‘Larry” bụ nke onye so hibe ụlọọrụ ahụ bụ Biz Stone kwuru na e ji ya cheta ọnwụ ọtụụ bọọlụ nkata Larry Bird ga-abụzị ihe a ga-eche n’okwu njirimara Twitter.

  19. Douala building collapse: Mmadụ 12 anwụọla n’ụlọ dara na Cameroon

    Mpaghara Douala

    Otu ụlọ adaala n’ime obodo kacha ibu na Cameroon bụ obodoDouala dịka opekatampe mmadụ 12 nwụrụ n’ihe ọdachị a ebe mmadụ ise merụrụ ahụ.

    O dochabeghi anya mmadụ ole nọ n’ime ụlọ ogogo anọ mgbe o dara dasa ụlọ ọzọ ebe ndị mmadụ bi n’ụtụtụ ụbọchị ụka.

    Ndị ọrụ gbatagbata na-agba mbọ ịchọpụta ma gbapụta ndị nwereike ịnọ n’okpuru ụlọ a dara.

    Ndị agbataobi ụlọ a kọwara na ha nụrụ ebe ndị mmadụ na-eti mkpu n’okpuru ụlọ a dịka ha gbara mbọ ịgbapụta ụfọdụ.

    Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ, ndị ọrụ ahụike ‘Red Cross’ nakwa ndị ọrụ gbata gbata ndị ọzọ ka nọ ebe ahụ anwa ịgbapụta ndị mmadụ.

    Gọvanọ mpaghara ahụ bụ Samuel Dieudonné Ivaha Diboua gwara ọha ka ha nọrọ juu ma nwee ntụkwasịobi n’ọrụ ndị ọrụ gbatagbata na-arụ dịka o kwuru na e nweghi onye a ga-ahapụ n’okpuru ụlọ ahụ.

    Ụlọ ntaakụkọ AFP ekwuola na ụmụaka atọ na ndị okenya 10 nọ n’ọnọdụ gbatagbata na-anata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ Laquintinie Hospital nọ nso ebe ahụ ugbua.

    Ndị ọrụ ahụike ebe ahụ kwuru na e bubatara ozu nwata dị afọ atọ n’ụlọọgwụ ahụ.

    O dobeghi anya ihe mere ụlọ a nọ na mpaghara Ange Raphael adaa mana ndị bi nso ebe ahụ kwuru na ya bụ ụlọ dịka ihe nọ n’ọnọdụ mmebi dị ukwuu.

    Ndị ọrụ gọọmentị agbaala mbọ na-akutu ụlọ ndị nọ n’ụdị ọnọdụ a mana etinyeghi akara nkwatu n’elu ụlọ nke a dara ugbua.

  20. China: Elu ụlọ adagbuola mmadụ 11 ndị otu egwuregwu volibọọlụ n'ụlọakwụkwọ

    Ndị nne na nna na-arụ gọọmentị aka dịka ha chọrọ ozi zuruoke banyere ụmụ ha nakwa ihe mere

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị nne na nna na-arụ gọọmentị aka dịka ha chọrọ ozi zuruoke banyere ụmụ ha nakwa ihe mere

    Mmadụ 11 lara mmụọ dịka elu ụlọ nke ụlọ egwuregwụ n’otu ụlọakwụwkọ nọ n’akụkụ mpaghara ugwu China zere dagide ụmụnwaanyị otu egwuregwu voli bọọlụ nọ n’ime ya bụ ụlọ na-anata ọzụzụ.

    Nke a si n’akụkọ ụlọ ntaakụkọ ndị nọ na mba ha ahụ na-akọ ugbua.

    Ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ ihe a emee kwuru na ndị ya bụ ihe metụtara bụ ụmụaka mana gọọmentị mba ahụ agbabeghi ama nke a.

    Ụfọdụ ndị nne na nna ejiriela iwe wụba otu ụlọọgwụ n’ebe ahụ dịka ha na-achọ imeta ihe mere n’uju.

    Naanị mmadụ asatọ n’ime 19 ndị nọ n’ime ụlọ egwuregwu a nọ n’ime mpaghara Heilongjiang lara na nta.

    Nnyocha agba nke mbụ na-egosi na edobere ụdịrị ugegbe ‘perlite’ n’ụlọ ahụ bụ ihe iwu megidere.

    Mmiri banyere n’ime perlite ahụ mee ka o zeda elu ụlọ ahụ.

    Ihe mere n’ebe elekere asatọ.

    Ụlọntaakụkọ redio mba China kwuru na onye nlekọta otu egwuregwu ahụ nọ na-akpọpụta ha ndị mmadụ n’otu n’otu dịka ndị gbatagbata nọ na-agba mbọ ịgbapụta ndị nwereike ịtọ n’okpuru ya bụ ụlọ.

    Dịka a ka na-agba mbọ ịgbapụta ndị a ruo ụtụtụ Mọnde a, ndị nne na nna arụọla ụlọakwụkwọ a aka na-ekwu na ha anaghị ezipụta ozi zuru oke banyere ihe mere ebe ahụ nakwa ihe ha na-eme ugbua.