Ọkpa ọchị, Cute Abiola abanyela na nsogbu maka ịkparị akwa ndị uweojii

Ebe foto si, Nigeria Police
Ndị uweojii Naịjirịa ekwupụtala na ha na-enyocha ọkpa ọchị aha ya bụ Abdulgafar Abiola, onye e ji 'Cute Abiola' mara, maka "iji akwa ndị uweojii n'ụzọ mkparị na iji mee akaje".
Nke a na-abịa dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Olumuyiwa Adejobi kwuru na Abiola emeela ihe ejije olemole ebe o yi aka ndị uweojii ma na-egosipụta ndị uweojii n'ụzọ nkatọ nakwa mkparị.
"Iwu machiri mmadụ ọbụla, n'ụdị ọbụla, iji uweojii akpa ọchị maọbụ imetọ uwe njirimara ndị uweojii," Adejobi kwuru n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Tọzde.

Ebe foto si, Nigeria Police
O nyere ọmụma atụ ejije abụọ ebe Cute Abiola gosipụtara ndị uweojii n'ụzọ iji mee akaje.
Nke mbụ gosiri ebe onye uweojii na-arịọ otu onye ọkwọ ụgbọala ego iji gbanye mmanụ n'ụgbọala ndị uweojii mmanụ gwụrụ n'ime ya. Nke abụọ bụ ebe onye uwojii na-ana aka azụ.
Adejobi dọrọ ndị niile na-eme ihe ejije ka ha kpachara anya etu ha si eji akwa ndị uweojii eme ejije, "maka na ndị uweojii ga-eji usoro niile iwu kwadoro iji chekwaa nkwanyeugwu nke ndị ọrụ ha na akụrụngwa ọrụ ha niile, nke gụnyere uwe ha."
Cheta na Cute Abiola banyekwara na nsogbu n'afọ 2021 oge ọ bụ onye ọrụ 'navy' dịka e boro ya ebubo imegide iwu na-achịkọta ndị ọrụ 'navy' gbasara soshal midia.
Mana n'afọ 2022, o kwuru na ya agbaala arụkwaghị m n'ọrụ 'navy' dịka o sonyeere ndị ọrụ gọọmentị Kwara steeti dịka otu n'ime ndị ọrụ ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
















