Gọọmentị Adamawa etinyela mmachi mkpagharị dịka ndị mmadụ wakporo ụlọ nchekwa nri

Akụkọ niile dị mkpa n'ọnwa Julaị

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Ụlọomeiwu Naịjirịa ga-enyocha ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa taa

    Ndị isi ọrụ nchekwa

    Ebe foto si, Nigerian military

    Ụlọọmeiwu Naịjirịa ga-enyocha ndị isi ọrụnchekwa Naịjirịa ọhụrụ taa bụ Mọnde abalị 17 nke ọnwa Jụlaị, 2023.

    A na-atụ anya na nnyocha ga-abụ ihe agaghị agba n’anwụ.

    Nnyocha ga-ada n’isi ndị ọrụ nchekwa ọhụrụ a onyeisiala Bola Ahmed Tinubu were họpụtara na nso nso a, ndị bụ:

    • Ọchịagha Taoreed Abiodun Lagbaja (onyeisi ndịagha ala)
    • Ọchịagha Christopher Gwabin Musa (Onyeisi nchekwa)
    • Ọchịagha Emmanuel Ikechukwu Ogalla (onyeisi ndịagha mmiri)
    • Ọchịagha Hassan Bala Abubakar (onyeisi ndịagha ụgbọelu)

    Nke a ga-eso nabata aha ndị ụlọomeiwu mere maka ndị a n’ụbọchị Tọọzde gara aga.

    Onyeisi ụlọọmeiwu Naịjirịa bụ Godswill Akpabio gbara ama na ndị isi ọrụ nchekwa a zara ajụjụ banyere ọrụ nchekwa nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa.

    Onyeisiala zigaara ndị ụlọomeiwu ozi n’ụbọchị Mọnde gara aga na-arịọ ka anabata ma binyeaka n’ọrụ ndị a.

    N’ụbọchị Tọọzde, ndị ụlọomeiwu ji nnyocha ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa malite ọrụ dịka ya bụ ndị a na-enyocha pụtara n’otu, n’otu kwuo etu ha ga-esi buso enweghi nchekwa agha na Naịjirịa.

    Nke a na-abịa n’oge ndakpọ ọnọdụ nchekwa Naịjirịa so n'ihe mbụ ga-echere ya aka mgba.

    Onyeisiala ọhụrụ Naijirịa ekweela nkwa ikwalite ọrụ nchekwa Naịjirịa site na iwe ọtụtụ ndịagha n’ọrụ, ịzụtara ndịagha ọtụtụ ngwa ọgụ ha ga-eji rụọ ọrụ nakwa ihe ndị ọzọ.

  2. Unu asaala chi?

    Ndị be anyị nọọnụ o!

    Ka taa mara anyị niile mma.

    Soro akụkọ niile dị mkpa ịkọ taa bụ ụbọchị 17 nke ọnwa Jụlaị, 2023.

  3. Ka chi fo

    Ka anyị wụsa ọwa ebe a taa.

    Echi bụ ụbọchị ọma ọzọ.

    Sonyere anyị n'elekere asatọ nke ụtụtụ.

    Ya gazie.

  4. Ndị uweojii Anambra anwụchiela nwaanyị tiri agadi nne ya eti eti

    Toochukwu Ikenga

    Ebe foto si, Anambra State Police Command

    Nkọwa foto, Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti bụ Toochukwu Ikenga ekwuola na ha anwụchiela otu nwaanyị aha ya bụ Ukamaka Udeugbo maka iti nne ya bụ agadi nwaanyị ihe.

    Onyonyo fesara na soshal midia n'ụbọchị Satọde na Sọnde gosiri ebe otu nwaanyị na-eti agadi nwaanyị ọzọ ihe, wụọ ya mmiri, gbaa ya ụkwụ, ma maa ya ụra ugboro ugboro.

    Ikenga kwuru na ndị uweojii hụrụ onyonyo ahụ na-efegharị wee malite ime nnyocha, ha wee chọpụta na ya bụ ihe mere n'obodo Umudunu, Abagana.

    "Dịka anyị na-eme nnyocha anyị, anyị chọpụtara na nwaanyị ahụ aha ya bụ Ukamaka Udeugbo, ọ dị afọ 50, ma bụrụkwa nwa agadi nwaanyị ahụ mụrụ n'afọ ya," Ikenga kwuru.

    "Anyị jidere nwaanyị ahụ n'ụbọchị Satọde, dịka anyị ga-akpụpụ ya ụlọikpe n'oge adịghị anya."

    Ikenga kwuru na onyeisi ndị uweojii bụ Aderemi Adeoye enyela ikike ka a hafee agadi nwaanyị ahụ n'aka Mịnịstrị Anambra steeti na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị, nke onyeisi ya bụ Kọmishọna Ify Obinabo, maka nlekọta anya na ọgwụgwọ zuru oke.

  5. Ọkụ agbapịala ọtụtụ ụlọ na mpaghara Durban nke Saụt Afrịka

    Ogige gbara ọkụ na South Africa

    Ebe foto si, SIPHAMANDLA GOGE/ENCA

    Nkọwa foto, Ogige a bụ ebe ndị ụbịam bi.

    Narị kwuru narị ụlọ ndị mmadụ agbapịala n'ihe mberede ọkụ ọgbụgba mere n'ogbe ebe ndị ụbịam bi na mpaghara Durban nke mba Saụt Afrịka.

    Otu onye ka a ma nwụrụla n'ọdachi a bụ nke malitere n'ogbe ahụ dị na 'Kennedy Road' n'ụbọchị Sọnde, mana a na-eche na e nwereike ịhụ ozu ndị ọzọ.

    Ihe onyonyo gosiri etu ogige ahụ si enwu ọkụ dịka anwụrụ na-arị elu n'ike n'ike, a hụkwara ebe ụfọdụ ndị mmadụ na-agba mbọ ịzọpụta ụfọdụ ngwangwo ha ole ha nwere ike.

    Amabeghị ihe kpatara ọkụ ọgbụgba a, mana ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ kwuru na ọkụ ahụ malitere dịka mmadụ abụọ na-aṅụbu mmanya malitere ịba aba.

    Otu onye ọrụ enyemaka nke otu 'African Red Cross' bụ Siyabonga Hlatshwayo kwuru na nke a bụ nnukwu ọdachi maka na ihe karịrị ọnụụlọ 1000 lara n'iyi ebe ihe ruru mmadụ 3000 enwekwaghị ebe obibi.

    Hlatshwayo kwuru na ndị ọrụ ha na-ekesa nri, akwa ndina, na akwa ikpuchi ahụ nye ndị ọdachi a metụtara. Ọ kpọkwara oku ka ndị mmadụ gbata ọsọ enyemaka site n'izite ihe ndị ọzọ iji nyere ndị ọkụ ọgbụgba a metụtara aka.

  6. US heatwave: A na-atụ anya na mkpomọkụ kacha elu n’ụwa ga-akpa mkpa mkpa n’Amerịka taa

    Ndị mmadụ na-agbasi mbọ ike ịdajụ mkpomọkụ n'ahụ ha n'akụkụ Texas

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-agbasi mbọ ike ịdajụ mkpomọkụ n'ahụ ha n'akụkụ Texas

    Ozi si n’aka mba Amerịka na-ekwu na a na-atụ anya na mkpomọkụ ‘dị oke egwu’ nke nwereike ịbụ ihe atubeghi ga-eme n’akụkụ ụfọdụ ebe ahụ n’ụbọchị Sọnde a.

    Ihe ruru oke otu n’ime atọ mba bụ ebe nde ndị mmadụ 113 bi nọ n’ọnọdụ mkpomọkụ dị egwu ugbua malite na Flordia ruo California ma garuo Washington.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbanwe ihu eligwe mba a bụ National Weather Service (NWS) adọọla ọha aka na ntị ka ha hara ịleghara ozi maka egwu mkpmọkụ a sị nwereike igbu ndị mmadụ anya.

    N’ụbọchị Satọde, e deturu na mkpomọkụ n’akụkụ Phoenix nke Arizona ruru 48C.

    Ugbua n’ime abalị 16, iri elu mkpomọkụ mba ka na-aga n’ihu dịka nọ n’ebe 43 kemgbe abalị ndị a nke na-achọzị ịbụ ihe na-emetubeghi mbụ ebe ahụ.

    Ehibela ụlọọgwụ gbata gbata nọ anọ n’ime ụgbọala bụ ndị na-akpagharị ma na-enye ndị enweghi ebe obibi ọgwụgwụ dịka mkpomọkụ na-emekpa ha ahụ.

    Death Valley dị na California – bụ otu n’ime ebe kacha dị ọkụ n’ụwa ahụla mkpomọkụ ruru 54C dịka ndepụta na-achụzị ndepụta kacha dị ọkụ n’ụwa ugbua.

    Ụlọọrụ NWS kwuru n’abalị Satọde na ndepụta akara mkpomọkụ kacha elu n’ụwa a nwereike ime n’akụkụ mpaghara Joaquin Valley, Mojave Desert, na Great Basin nke mba Amerịka n’ụbọchị ụka a.

    Ụlọọrụ ahụike mba Amerịka bụ Centers for Disease Control and Prevention (CDC) kwuru na a na-atụ anya na ihe ruru mmadụ 700 ga-anwụ site na mkpomọkụ na mba ahụ kwa afọ.

    Na mba agbataobi mba Amerịka bụ Canada, ndị ọchịchị na-ekwu na mkpomọkụ amalitela isunye oke ahịa ọkụ dịka ya bụ ihe agbaala ọtụtụ ọhịa ọkụ n’ihe ruru nde 10 hekta ala ndị mmadụ.

    Anwụrụ si n’ime ọkụ ndị a amalitela ifeba na mba Amerịka ma na-emetọ ihe eligwe ha.

    Akara kacha elu banyere etu ndị mmadụ si eji ọkụ latrịk etinye ntụoyi na be ha apụtala n'akụkụ Texas dịka ọtụtụ na-agba mbọ ịdajụ mkpomọkụ n'ahụ ha.

  7. Ihe mere Commonwealth games ji kagbuo ihe nrite ụmụnwaanyị ọsọ Naịjirịa ritere

    Ụmụnwaanyị ọsọ Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu na-elekọta asọmpị Commonwelth Games akagbuola ihe nrite ụmụnwaanyị egwuregwu ọsọ Naịjiirịa ritere n’asọmpị ọsọ “Women 4 x 100m relay” n’ihi na enyochapụtara ọgwụ amachiri amachị n’ahụ otu onye n’ime ha.

    Ọ bụ ụmụnwaanyị Naịjirịa anọ bụ Tobi Amusan, Favour Ofili, Rosemary Chukwuma na Grace Nwokocha ji aha Naịjirịa gbaa ya bụ ọzọ ma ritere Naịjriịa ihe nrite ọlaedo n’afọ gara aga.

    Otu nlekọta a kwuru na e nyochapụtara ya bụ ọgwụ n’ahụ nwaada Nzubechi Grace Nkwocha.

    Mpụtara nnyocha mamiri ya gosiri na ọgwụ ‘Ostarine, Dihydroxy-LGD-4033’ nakwa ụdịrị ọgwụ “Ligandrol” nọ ya n’ahụ mgbe a gbara ọsọ ahụ.

    Ọgwụ ndị so n’ime ọgwụ ndị otu amachiri amachị ndị egwuregwu ịṅụ n’usoro WADA 2022.

    E ji maka nnyocha kwuo na Nkwocha etozughizi oke ma kagbuo mmeri Naịjirịa na ya bụ asọmpị.

    Ozi ha dere “Ụlọikpe otu asọmpị a na-ekwu na Nwokocha etozughizi oke nke mere e ji akagbuo mmeri na ihe nrite niile so ọsọ ndị ọ gbara bụ ọsọ ‘Women 100m, Athletics – Women 200m, Athletics – Women 4x100m Relay’ nakwa ihe nrite ọlaedo o ritere”.

    Ha kwuru e bugarala otu AIU okwu ka lebeanya ma tinye usoro zuruoke maka ya.

    Cheta na n’asọmpị Common Wealth games a a gbara na Birmingham, Naịjirịa ritere ihe nrite 35 gụnyere ọlaedo 12, ọlaọcha itoolu na ọlanchara 14 dịka Naịjirịa nọọrọ n’ọkwa asaa na tebulu asọmpị ahụ na ngwụcha ya.

  8. Nnọọ n'ọbaozi anyị

    Unu asaala chi ndị be anyị.

    Soro akụkọ niile dị mkpa ịkọ taa nille ebe a.

  9. Uzodimma ebuliela ụgwọọnwa o pekata mpe ndị ọrụ gaa N40,000

    Hope Uzodimma

    Ebe foto si, Imo Government

    Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma ewelitela ụgwọọnwa opekata mpe ndị ọrụ Bekee na steeti ahụ ruo puku naira iri anọ(N40,000 site na puku iri naira atọ.

    N' ozi ụlọọrụ gọọmentị steeti ahụ wepụtara na mgbede Satode n'ọbaozi Facebook, Uzodimma kwuru na nke bụ ụzọ iji belata ahụ ụfụ so mwepụ ego mbelata ọnụahịa mmanụ ụgbọala(fuel subsidy).

    Uzodimma gbagbara ama na ndị ọrụ oyibo steeti ahụ ga na-enweta ohere iri nri otu ugboro kwa ụbọchị nakwa ohere nleta ahụike n'efu.

    "Ndị ọrụ Bekee ga-eenweta otu ugboro nri kwa ụbọchị na nleta ahụike n'efu dịka ụfọdụ ihe gọọmentị na-eme iji belata ihe isi ike.""Nke a bụ ihe anyị na-agbakwụnye na ịgba ụgbọala n'efu anyị malitere kemgbe afọ 2020."

    Kemgbe Gọọmentị Etiti wepụrụ ego mkwụbilita ego mmanụ ụgbọala na Naijria, ọnụ ahịa ọtụtụ ihe gụnyere ihe oriri na njem ụgbọala arịala elu ọjị.

  10. Tinubu azọpụla njem gaa Kenya maka ọgbakọ 'African Union'

    Bola Tinubu

    Ebe foto si, DOlusegun/Twitter

    Onyeisiala Bola Tinubu azọpụla njem taa bụ Satode gaa Nairobi, isiobodo Kenya, maka ọgbakọ ọkara afọ nke otu 'African Union'.

    Tinubu onye ya na Onyeisi ọrụ ya bụ Femi Gbajabiamila na onyendụmọdụ pụrụ iche n'okwu mgbasaozi bụ Dele Alake si ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe International Airport fepụ , na aga ọgbakọ ahụ dịka onyeisiala Naijiria nakwa onyeisioche otu ECOWAS.

    Dịka akwụkwọ mgbasaozi nke Alake binyere aka ma wepụta gbara ama na Tinubu ga-ewepụta n'ọgbakọ ahụ ozi banyere ebe ECowas kwụ na mbọ ijikọta mpaghara ahụ ọnụ ma hụ na mba ndị nọ n'ya nwere ohere ịkpaghari na-enweghị mgbochi ọbụla.

    Ozi mgbasaozi si n'aka Dele Alake

    Ebe foto si, The Presidency

  11. Ọdachi ideimmiri egbuola ihe karịrị mmadụ 20 na South Korea

    Nsogbu ideimmiri

    Ebe foto si, Reuters

    Opekatampe mmadụ 20 anwụọla n'ọdachi ideimmiri mere na mba South Korea, dịka nnukwu mmiri ozuzo zoro na mpaghara dị icheiche.

    Mmiri a zoro ụbọchị atọ akwụsịghị akwụsị gbajuru mmiri n'ogige nchekwa mmiri dị na mpaghara Chungcheong nke dị na mpaghara Ugwu mba ahụ.

    Ideimmiri a buuru ụgbọala ma mebikwaa okporoụzọ na okporo ụgbọ oloko.

    Mmadụ iri ọzọ ka a na-achọ achọ n'ọdachi a ebe puku kwuru puku ndị ọzọ agbapụla n'ụlọ ha iji zọọ ndụ ha.

    Mpaghara Gyengsang bụ ebe ọdachi a kacha metụta n'ihi mbuze nke mere n'ebe dị icheiche dịka ugwu gbara mpaghara ahụ gburugburu.

    Praịm Mịnịsta mba ahụ bụ Han Duck-soo enyela ndị agha mba ahụ iwu ka ha sonye n'ọrụ ịọpụta ndị mmadụ na inyere ndị a zọpụtara aka.

    Ndị ọchịchị na-ekwu na mmiri tojuru okporoụzọ imeala (tunnel) nke dị na Chungchong, ụgbọala ruru 19 tọrọ atọ n'okporoụzọ imeala ahụ, nke mere e ji eche na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ọdachi a nwereike ịgbali elu.

    Oke mmiri ozuzo, ideimmiri na mbuze na-enye ọtụtụ mba na mpaghara Asia nnukwu nsogbu ugbua.

    Mba ndị nwerela ọdachi dị otu a gụnyere India, China na Japan, na Philippines, ndị ọkachamara a maala ọkwa na oke ifufe 'cyclone' nwereike ịdakwasa mba ahụ.

  12. Gọvanọ Ebonyi Steeti etinyela N10,000 n'ụgwọ ọnwa ndị ọrụ gọọmentị

    Francis Nwifuru

    Ebe foto si, Francis Nwifuru

    Gọọmentị Ebonyi Steeti agbakwụnyela puku naịra iri n'ụgwọ ọnwa ndị ọrụ gọọmentị niile na steeti ahụ, dịka ihe inye aka maka ihe isi ike so mwepụ 'subsidy'.

    Kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Jude Okpor kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Fraịde, Julaị 14.

    Okpor kwuru na ha nwere mkpebi a n'ọgbakọ 'Statet Executive Council' bụ ebe Gọvanọ Francis Nwifuru nọrọ kwuputa mkpebi ya ime ka ihe dịwanyere ndị steeti ahụ mfe.

    O kwukwara na Gọvanọ Nwifuru enyela nkwado iwere mmadụ 1,454 ọhụrụ n'ọrụ gọọmentị iji nọchie ohere dị icheiche e nwere na ngalaba gọọmentị dị icheiche.

    Cheta na gọọmentị etiti kwere nkwa itinye atụmatụ enyemaka dị icheiche iji wetulata ihe nhịahụ ndị mmadụ na-agabiga dịka gọọmentị kwụsịrị ịkwụ ụgwọ ha na-akwụbu iji butuo ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

    Kamgbe gọọmentị kwụsịrị ịkwụ ụgwọ a, ọnụahịa mmanụ ụgbọala arịala elu nke ukwuu, nke mekwara ka ọnụahịa ihe dị icheiche, ọ kacha ngwa nri, rịkwaa elu n'ahịa.

    Otu n'ime atụmatụ enyemaka ahụ bụ nkwa Onyeisiala Tinubu kwere ịkwụ ezinụlọ nde iri na abụọ ndị kacha nọrọ n'ụbịam puku naịra asatọ kwa ọnwa ruo ọnwa isii iji nyere ha aka.

  13. Etu ụgbọelu ndị agha elu Naịjirịa si kpọkasịa na Benue Steeti

    Ndị agha elu Naịjirịa ekwupụtala na otu ụgbọelu ha ji eme ọzụzụ kpọkasịrị na Makurdi, Benue Steeti, n'ụbọchị Fraịde, bụ ụbọchị 15 nke ọnwa Julaị 2023.

    Ọnụ na-ekwuru ndị agha elu bụ Edward Gabkwet kwuru na ụgbọelu ahụ bụ nke e ji enye ndị agha ọzụzụ oge ọ kpọkasịrị.

    "Mana ndị ọkwọ ụgbọelu abụọ nọ n'ime ụgbọelu ahụ lanarịrị ihe mberede a dịka ha fepụrụ onwe ha n'ime ya bụ ụgbọelu tupu ọ kpọkasịa," Gabkwet kwuru.

    "Onweghịonye nwụrụ n'ihe mberede a, onwegkwaghị ihe ọbụla mebiri n'ebe ụgbọelu ahụ kpọkasịrị.

    "Ndị ọkwọ ụgbọelu abụọ ahụ nọ ugbua n'ụlọọgwụ ndị agha dị na Makurdi, dịka onyeisi ndị agha elu bụ Hasan Abubakar ehibela kọmiti ga-enyocha ihe kpatara ihe mberede a."

    Ihe mberede a na-abịa dịka afọ abụọ gafechara onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Ibrahim Attahiru nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu nke mere n'ọnwa Mee 2021.

  14. Ụnụ asaala chi

    Ụtụtụ ọma o ụmụ Igbo.

    Ya gaziere gị taa dịka ị na-esonyere anyị.

  15. Rape allegations: Ụlọikpe asịla Benjamin Mandy lawa na ikpe amaghị ya

    Benjamin Mendy

    Ebe foto si, Reuters

    Ụlọikpe mba Briten asịla onye na-agbaburu Manchester City bọọlụ ya lawa n'ikpe amaghị ya n'ebubo idina nwaanyị n'ike.

    A kpụpụụ Benjamin Mendy gbara afọ 28 ụlọikpe maka ebubo iwakpo nwaanyị gbara afọ 24 n'ụlọ ya dị na Mottram St Andrew, Cheshire n'Oktoba afọ 2020.

    E boburu ya ebubo ịgbali ịwakpo nwaanyị ọzọ gbara afọ 29 afọ abụọị o gara aga nke mere ya ebubo mwakpo isi kemgbe ikpe ya malitere n'ọnwa Jenụwarị.

    Nwa amadi ahụ tiwapụrụ akwa n'ụlọikpe ngwangwa e kwupụtara n'ụlọikpe na ikpe amaghị ya.

    Ọkaikpe Steven Everett sịrị: "Maazị Mendy lawa ,nikpe amaghị gị."

    Oge ọgbaboolu na otu egwu bọọlụ Man City ga-ebi n'ọnwa.

    A kagbuburu ebubo ịwakpo ụmụnwaanyị anọ eboro ya.

  16. Etu aka si kpara nwoke rere ụmụ ya atọ

    Nwoke a na-ebo ebubo ire ụmụ ya atọ

    Ebe foto si, Rivers State Police Command

    Ndị uweojii Rivas steeti anwụchiela otu nwoke na maka ebubo ire ụmụ ya atọ otu nde naira na ọkara.\

    Ha nwuchikwara otu mmadụ asaa na-agba mgbere ụmụaka bụ ndị ha na nwoke ahụ kpara arụ ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Grace Iringe-Koko gwara ndị ntaakụkọ na ha nwuchiri nwoke ahụ na mgbede Satode, abalị asatọ nke ọnwa Julai ,afọ 2023.

    Iringe-Koko gbara ama na nwoke ahụ rere ụmụ atọ gbara afọ ise, afọ abụọ na otu abalị ego dị puku narị naira asaa(700,000), puku nari naira ise(N500,000 na puku nari naira atọ na iri ise(N350,000.)

    Nwoke ahụ , onye nwuye ya bụ ogbi nakwa onye anaghị anụ ihe kwuru na ọ bụ ihe isi ike nke mere na ya enweghịli ike ilekọta ụmụ tinyere ya n'ọnwụnwa ahụ.

    Mana ọgọ ya nwaanyị kwuru na nwoke ahụ gwara ya na ụmụụmụ ya nwụrụ ka a mụchara ha.

    Ọ ntụụ arịị na ọgọ ya nwoke ji maka na nwaanyị nwaanyị ọ na-alụ nwere ọlusi na-eme ihe masịị ya.

    Otu mmadụ asaa na-agba mgbere nwa

    Ebe foto si, Rivers State Police Command

    She tell Tori pipo say di suspect take advantage of her daughter disabilities to carry out di act of selling di children.

    "Kwa ụbọchị, ọ sị m na nwa ya anwụọla.."

    "Nke mbụ nwụụ, nke abụọ nwụrụ, nke a nwụkwa, ọ bụ gịnị na-emezi?"

    "M were jide ya, sị ya bịa gosi m ebe o liri ụmụ m."

    " Ọ bụ maka na nwa m bụ ogbi ka o ji eme ya ụdị ihe."Becos my daughter no dey tok naim make e dey do her like dat?!

    Ọ bụ dịka nwaanyị ahụ tiwere mkpu ka ndị nche na-eche Omerelu,dị n'okpuru ọchịchị Ikwerre na Rivas steeti bịara nwuchiri nwoke ahụ ma nyefe ya n'aka ndị uweojii n'ogige ndị uweojii 'Elele Police Division'.

  17. Labour Party akpọọla oku ka a nwuchie onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu

    Abura, Mahmood, Obi

    Ebe foto si, LP/Getty

    Otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Labour Party akpọọla oku ka a chụọ onyeisi ngalaba 'Independent National Electoral Commission' (Inec), bụ Mahmood Yakubu, nakwa ọnụ na-ekwuru ngalaba ahụ bụ Festus Okoye, ma kpụpụ ha ụlọikpe "maka etu si metọọ ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa bụ nke e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023".

    Kenneth Okonkwo, bụ ọnụ na-ekwuru otu achụmnta vootu nke Peter Obi na Yusuf Baba-Ahmed - bụ ndị zọrọ ọkwa onyeisiala na osote onyeisiala na Labour Party - kwupụtara nke a site n'akara Twitter ya n'ụbọchị Tọzde.

    Okonkwo kwuru na LP gbakwasara ụkwụ na mpụtara nke otu dị icheiche so nyochaa ihe mere n'oge ntuliaka wepụtara gbasara etu ya bụ ntuliaka si rie mperi.

    "Labour Party na-akpọkwa oku ka e mee nnyocha miri emi etu Inec si jikwaa ego niile gọọmentị Naịjirịa nakwa gọọmentị mba ụwa dị icheiche nyere ha iji hazie ntuliaka," Okonkwo kwuru.

    "Anyị na-akpọkukwa mba ụwa dị icheiche ka ha nye ndị isi Inec ntaramahụhụ kwesịrị ekwesị maka etu ha si mara ama gbochie akụrụngwa dị icheiche e tinyere iji wepụ nrụrụaka na ntuliaka."

    "Ọ bụrụ na e nwereike ịkpụga REC nke Adamawa ụlọikpe, ntaramahụahụ Mahmood na Okoye kwesịrị ịkarị maka na ihe ha mere ka njọ."

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Cheta na ụfọdụ otu ndị so lekọta ihe mere n'ụbọchị ntuliaka wepụtara mpụtara nnyocha ha ma kwuo na ntuliaka nke ọkwa Onyeisiala riri mperi n'ụzọ dị icheiche, ọ kachasị gbasara nziga mpụtara ntuliaka gaa n'ọbaozi 'Inec Result Viewing portal (IrEV).

    Otu ndị a gụnyere otu 'European Union Election Observation Mission' (EU-EOM); otu 'Nigerian Civil Society Situation Room' - nke bụ otu jikọrọ otu dị icheich; otu 'Nigeria Bar Association', na ndị ọzọ.

    Ndị NBA wepụtara mpụtara nke ha kwuo na ọ bụ ezie na ntuliaka nwere ụfọdụ ihe iri mperi, mana o zughị iji kwuo na mpụtara ntuliaka ahụ niile enweghị isi.

    Dịka ha si kwuo, ntuliaka ahụ nwetara akara karịrị pasentị 90.

    N'aka nke ọzọ ndị EU-EOM wepụtara mpụtara nke ha ma kwuo na ntuliaka ahụ riri mperi maka na ntuliaka ahụ riri nnukwu mperi.

    Mana gọọmentị Naịjirịa wepụtara akwụkwọ ozi iji kwuo na ha anabataghị mpụtara ahụ nke otu EU-EOM wepụtara

    Festus Okoye, bụ ọnụ na-ekwuru Inec, pụtakwara kọwaa na ọba ozi Inec nwere nsogbu n'ụbọchị ntuliaka nke mere o ji raa ahụ iziga mpụtara ntuliaka nke ọkwa onyeisiala gaa n'ọbaozi ha dịka ha si kwe na nkwa.

  18. Ụlọikpe akụpụla akwụkwọ EFCC gbara Okorocha

    Rochas Okorocha

    Ebe foto si, Okorocha/Facebook

    Ụlọikpe Ukwu dị n’Abuja akụpụla akwụkwọ nke ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka gbara aka chịburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha n’ụbọchị Faide.

    EFCC kpụburu Okorocha ụlọikpe maka ebubo imefu ego dị ijeri naira abụọ na ụma itoolu(N2.9 bn) ego Imo steeti oge ọ nọ n’ọkwa dịka gọvanọ.

    Ọkaipe Jọstis Yusuf Halilu kpere ikpe ahụ kwuru na EFCC megidere usoro ikpe n’iweta ikpe ahụ n’ụlọikpe.

    Jọstis Haliru kwuru na EFCC gbaburu Okorocha akwụkwọ n’ebubo yiri nke ha wetara n’ihu ya n’Ụloikpe Ukwu nke Etiti n’ọnwa Disemba afọ 2022.

  19. Ihe mere ụlọikpe ji kụchapụ akwụkwọ Nnamdi Kanu gbara DSS

    Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya

    Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja akụchapụla akwụkwọ nke Nnamdi Kanu gbara ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ Department of State Services, maka ebubo na ha na-emegide ikike nkwanyeugwu dịịrị ya dịka mmadụ.

    Ọkaikpe James Omotosho kụchapụrụ mkpesa a nke ọkaiwu Nnamdi Kanụ Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor wetara n'ụlọikpe, ma kwuo na enweghị ihe akaebe ọbụla gosiri na ndị DSS tara Nnamdi Kanu ahụhụ maọbụ mekpaa ya ahụ n'ụdị ọbụla.

    Cheta na ndị ọkaiwu Kanu boro ebubo na ndị DSS na-akpaso ya oke ma na-emekpa ya ahụ dịka ha jụrụ na ọ gaghị agbanwe otu uwe ya bụ nke o yi kamgbe ọnwa Jun 2021 oge a nwụchiri ya na Kenya.

    Kanu kwuru na ndị DSS na-enye ndị mkpọrọ ndị ọzọ ohere iyi uwe ọbụla dị ha mma nakwa ịgbanwe uwe ha etu nakwa oge ọbụla ha chọrọ, mana ha ekweghị ka Kanu yie uwe 'Isi Agu' bụ ekike e ji mara ndị Igbo.

    O bokwara ebubo na ndị DSS na enye ya ntaramahụhụ dị icheiche nke megidere ikike dịịrị ya ka mmadụ.

    Mana ndị DSS, n'ọsịsa ha, gwara ụlọikpe na onwebeghị oge ọbụla ha mekpara Nnamdi Kanu ahụ n'ụzọ ọbụla.

    Ha kwukwara na ha egbochighi Kanu ịgbanwe uwe ya, mana na Kanu na-ekwu na ọ bụ uwe Isi Agu ka ọ chọrọ.

    Ndị DSS kọwara na Nnamdi Kanu nọ n'ime ụlọ mkpọrọ ebe ndị mkpọrọ ndị ọzọ nọ, na ọ bụghị eziokwu na ndị mkpọrọ ndị ọzọ nwere ohere iyi uwe ọbụla dị ha mma nke gụnyere uwe njirimara ndị Hausa na ndị Yoruba.

    Ha gara n'ihu kwuo na ụlọ mkpọrọ abụghị ụlọ ezumezu maọbụ ebe ngosipụta ọdịnala nke na onye ọbụla ga-enwe ohere iyi uwe iji gosi njirimara agbụrụ ya.

    "Ndị ezinụlọ Kanu na-ewetara ya uwe odinala bụ ụdị nke ndị chiri echichi n'omenala Igbo na-eyi, tinyekwara uwe ndị ọzọ nwere njirimara Biafra, akpụkpụ ụkwụ na-acha mmee mmee, na ihe olu dị icheiche e ji achọ mma, ka ọ na-eyi wee na-aga ụlọikpe," ndị DSS kwuru.

    Ha kwukwara na ọkaikpe jibu ikpe Kanu bụ Binta Nyako nyere iwu na Kanu nwereike iji uwe ọbụla na-enweghị ihe e sere ya gbanwee uwe ya, mana ọ bụghị iyi uwe Isi Agu maọbụ uwe ndị echichi Igbo.

    Na mkpebi ya, Ọkaikpe Omotosho kwenyere n'ihe ndị DSS kwuru, ma kwuo na ebe ọ bụ na anaghị enye Kanu ntaramahụhụ ọbụla n'ụlọ mkpọrọ, ebubo mmekpa ahụ ọ na-ebo ndị DSS achịtaghị aja.

    O kwuru na iwu Naịjirịa kwadoro ikike nkwanye ugwu dịịrị mmadụ, mana iyi akwa ọbụla masịrị onye n'ụlọ mkpọrọ esoghị n'ikike ahụ.

    "Ị gaghị abịa n'ụlọikpe na-achọ ka e nye gị ikike nke na-adịghị n'akwụkwọ iwu," Omotosho kwuru.

    Ọ gara n'ihu kwuo na Kanu egosighi ihe akaebe ọbụla iji kwadoo ebubo o na-ebo na ndị mkpọrọ ndị ọzọ na-agbanwe akwa etu o si sọ ha.

    N'ihi nke a, o kwuru na mkpesa Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya achịtaghị aja, ya mere o ji kụchapụ ya

  20. Ndị na-eme ejije 'Hollywood' amalitela abụbụ ọrụ, lee ihe kpatara ya

    Ndị Hollywood na-agba abụbụọrụ

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị na-eme ejije Hollywood esonyerela ndị ogbo ha na-ede ejije n'ịgba abụbụ ọrụ, bụ nke a na-ahụbeghị ụdị ya mbụ kamgbe afọ 60.

    Ihe ruru ọnụọgụgụ mmadụ 160,000 kwụrụ ọrụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Fraịde na Los Angeles nke mere ka mmepụta ọtụtụ ejije na mba Amerịka kwụsịtụ ugbua.

    Otu a akpọrọ 'Screen Actors Guild' (SAG) chọrọ ka e welite aka n'ụgwọ a na-akwụ ha, nakwa ka nnukwu ụlọọrụ ejije na-akwụ ha ụgwọ karịa maka etu ndị mmadụ si ekiri ejije nke ha nọ na ya.

    Ha chọkwara nchekwa n'etu e nwereike iji were akụrụngwa tekịnụzụ a kpọrọ 'Artificial Intelligence' dochie anya ụfọdụ ndị na-eme ejije.

    Emily Blunt, Cillian Murphy na Florence Pugh

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ome ejije Emily Blunt, Cillian Murphy na Florence Pugh hapụrụ emume ngosipụta ejije Oppenheimer na Lọndọn dịka abụbụọrụ ahụ malitere

    Dịka abụbụọrụ a na-aga n'ihu, ndị na-eme ejije agaghị esonye na mmepụta ejije ọbụla, ha agaghịkwa esonye n'ọgbakọ ọbụla iji kwalite ejije ndị emerela eme.

    N'ihi nke a, ndị a ma ama dịka Cillian Murphy, Matt Damon na Emily Blunt hapụrụ mmemme ngosipụta ejije a kpọrọ Oppenheimer bụ nke a na-eme na London n'ụbọchị Tọzde.

    Ndị ejije ndị ọzọ a ma ama kwadokwara abụbụọrụ a gụnyere Bob Odenkirk nke so mee ejije 'Better Call Saul'; Cynthia Nixon nke so n'ejije 'Sex and the City'; na Jamie Lee Curtis bụ onye a ma ama na Hollywood.

    Ha ga-amalite ngagharịiwe ha na California n'ụbọchị Fraịde, n'ihu ogige isi ụlọọrụ Netflix, tupu he esizie ebe ahụ gawa ụlọọrụ Paramount, Warner Bros, na Disney.