Gọọmentị Adamawa etinyela mmachi mkpagharị dịka ndị mmadụ wakporo ụlọ nchekwa nri

Akụkọ niile dị mkpa n'ọnwa Julaị

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Putin agaghị esonye ọgbakọ otu Brics - Gọọmentị mba Saụt Afrịka

    Cyril Ramaphosa

    Ebe foto si, AFP

    Gọọmentị mba Saụt Afrịka ekwuola na onyeisiala Russia bụ Vladimir Putin agaghi esonye ọgbakọ Brics na-abịa n’ọnwa Ọgọstụ.

    Ụlọikpe ụwa nke International Criminal Court (ICC) inyere iwu ka a nwụchie Putin maka ebubo metụtara ime mpụ n’agha ha na-ebuso mba Ukraine.

    Mba Saụt Afrịka so na mba binyereaka na nwekọrịta ICC nke pụtara na ọ gara ịbụ iwu na ha ga-anwụchi Putin mana Saụt Afrịka sokwa n’otu Brics bụ nke Russia nọ n’ime ya.

    Kemgbe agha Ukraine malitere, mba Saụt Afrịka ekwebeghi kwuo okwu nkatọ maọbụ okwu nkwado maka ya bụ agha, dịka okwu a tinyere mba n’ọnọdụ tara akpụ.

    Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Ramaphosa nke Saụt Afrịka kwuru:

    “Site na nkwekọrịta, onyeisiala Vladimir Putin nke mba Russia agaghị esonye ọgbajọ a mana minista mmekọ mba na mba nke Russia bụ Maazị Sergay Lavror ga-anochịte ya.”

    Ndị ọzọ ga-esonye onyeisiala Ramaphosa n’ọgbakọ a ga-aga n’ihu na Johannesburg gụnyere ndị isi ala mba Brazil, India na China.

    Brics bụ otu jịkọrọ mba ndị akụnaụba ha na-etolitesiike bụ ndị ụfọdụ na-ahụta dịka mba ndị nwereike ima otu G7 aka n’okwu akụnaụba.

    Mba ndị nọ n’otu Brics bụ mba Brazil, Russia, India, China na South Africa.

  2. NLC akatọọla atụmatụ usoro nkesa ihe enyemaka nke gọọmentị etiti wepụtara

    Joe Ajaero na-ekwu na gọọmentị na-ezuru n'aka ndị ogbanye enye ndị ọgaranya

    Ebe foto si, NLC/Facebook

    Nkọwa foto, Joe Ajaero na-ekwu na gọọmentị na-ezuru n'aka ndị ogbanye enye ndị ọgaranya

    Otu jịkọrọ ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ewepụtala ozi n’ụbọchị Tuzde katọọ atụmatụ gọọmentị etiti iji ego ruru ijeri narị 500 zụta ihe enyemaka a ga-ekesa nye ndị na-enweghi ka ọ hara ha n’akụkụ Naịjirịa maka ihe isi ike so mwepụ ego mbelata mmanụ ụgbọala.

    N’ozi a nke onyeisi otu a bụ Joe Ajaero binyereaka, o kwuru na gọọmentị etiti Naịjirịa na-achọ “itinye ndị mmadụ n’ọnọdụ ụbịa site na izuru ego n’aka ụmụafọ Naịjirịa ma were ya kwụọ ndị ọgaranya ụgwọ”.

    Ozi NLC kwuru na kama gọọmentị ga-achọ ụzọ kwụọ ndị ọrụ ụgwọ maka ọrụ ha, ha a “na-aga n’ihu na-eso usoro ọchịchị aka ike”.

    Ozi NLC kwuru:

    “atụmatụ ịnye ndị a sị bụ ezịnaụlọ ndị ogbanye nde 12 ego N8000 ruo ọnwa isii bụ mkparị nye amamihe anyị nakwa ihe ịkwa emo nye ndidi na ezi agwa anyị na-enye gọọmentị”

    Ozi ha gakwara n’ihu katọọ atụmatụ ndị ụlọomeiwu ibulie ego ụgwọ ọnwa ha ruo ijeri N70 nakwa ndị ikpe ruo ijeri N36dịka ha kwuru na ya bụ atụmatụ “dịka mmadụ ihe ga-ama ụma metụta ndị ọ ma bụrụ ụzọ iji tinye ego ọha n’akpa bụ nke ndị ọchịchị kwesịrị ị na-echeba”.

    Otu a kwukwara na atụmatụ ndị nwereike ịkpata ‘nzufu ego’ nakwa nrụrụaka nma ngalaba gọọmentị dị iche iche.

    NLC

    Ebe foto si, NLC

    NLC

    Ebe foto si, NLC

    NLC

    Ebe foto si, NLC

    NLC

    Ebe foto si, NLC

  3. NNPC ekwuola ihe mere ọnụego mmanu ụgbọala jiri rịa elu orji

    Mmnaụ ụgbọala bụ isisekpu ntị n'akụnaụba Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Mele Kyari bụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mmepụta mmanụ agbidi na Naịjirịa a kpọrọ Nigeria National Petroleum Company (NNPC) ekwuola ihe mere ọnụego mmanụ ụgbọala ji ‘rịa eli orji’ ugbua.

    Kyari mgbe o zutere osote onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima na Tuzde n’Abuja kwuru na ọ bụ etu ndị na-ebubata mmanụ ụgbọala si azụta ka ha jikwa ere.

    O kwuru site n’aka gọọmentị sepuru n’ibubata mmanụ ụgbọala, na o mere ka ọnụego ya rịa elu oge ụfọdụ maọbụ gbatuo ala.

    O kwuru na mbulie elu mmanụ ụgbọala site na N500 ruo N617 abụghị maka ụkọ mmanụ a, na ka nwere mmanụ ụgbọala ebe o buru ibu.

    O kwuru na ọ bụ ngalaba azụmaahịa ụlọọrụ NNPC ka ọ dị n’aka itinye ego n’ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala, na ha na-eme nke a site n’etu ahịa siri dị.

    “Nke a bụ ihe na-eme; ọ ga-eme ka ọnụego mmanụ ụgbọala rịa elu oge ụfọdụ ma gbatuo ala oge ụfọdụ.”

    Ọ gara n’ihu kwuo na ha nwere mmanụ ụgbọala ga-ezuru ndị Naịjirịa ruo ụbọchị iri atọ na abụọ, na mmanụ a akọghị ụkọ.

  4. Onyeisiala Tinubu enyela iwu ka e megharịa atụmatụ inye ndị ogbenye N8000 na Naịjirịa

    Bola Tinubu

    Ebe foto si, AFP

    Onyeisiala Bola Tinubu enyela iwu ka e cheregharịa echiche banyere atụmatụ gọọmentị inye ezinaụlọ nde 12 na-enweghi ka ọ hara ha dọla 10 ruo afọ isii iji belata ihe isi ike so mwepụ ego mbelata mmanụ ụgbọala.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ nkatọ malite ịpụta maka atụmatụ a dịka ụfọdụ kwuru ya bụ ego pere mpe.

    Ọnụ na-ekwuru onyeisiala Tinubu bụ Dele Alake kwuru na Onyeisiala Tinubu nyere ntuziaka ka “etinyeanya ma megharịa atụmatụ ego N8000 bụ nke e wepụtaburu iji nyere ezinaụlọ ndị na-enweghi ka ọ hara ha aka”

    Ọ gara n’ihu kwu na nke a so “ọtụtụ echiche ụmụafọ Naịjirịa kwupụtara megide atụmatụ a”.

    Onyeisiala gakwara n’ihu kwuo ka a gbaa n’anwụ ihe ndị ga-anọ n’ime akpa ihe enyemaka gọọmentị chọrọ inye ụmụafọ Naịjirịa.

    O nyekwara iwu ka enye ndị ọrụ ugbo mmadụ nde 50 fetilịaza ngwa ngwa nakwa mkpụrụosisi dị iche iche.

    Cheta na Tinubu gwara ndị ụlọomeiwu n’ụbọchị Tọọzde gara aga ka ha binyeaka n’akwụkwọ o zitere ha nke na-arịọ ka e bite nde dọla 800 bụ nke gọọmentị akachibụrụ Naịjirịa Muhammadu Buhari nabatara. Ego a bụ nke e kwuru a ga-eji kwalite atụmatụ inye na-enweghi ka ọ hara ha ihe enyemaka dị icheiche.

    Ego ime njem nakwa ọnụahịa ngwa nrị agaala n’ihu na-arị elu n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche kemgbe e wepụrụ ego mbelata mmanụ ụgbọala ala na ngwụcha ọnwa Mee.

    Gọọmentị Naịjirịa etinyela ọnọdụ gbata gbata n’okwu ikwalite nri na akụmakụ dị ọnụahịa mmanụ ụgbọala riri elu ruo pasentị 22. Iri elu ihe ahịa na Naịjirịa ugbua eruola pasentị 22.7 mana ọnụego ụgwọ ọnwa opekatampe ndị mmadụ ka nọ na N30,000.

  5. Ndị be anyị ndewoonụ

    Unu asaala chi?

    Ka taa maara anyị niile mma.

    Soro akụkọ ndị dị mkpa ịkọ taa niile ebe a.

  6. Ka chi fo

    Ka anyị gbado ya ebe a taa.

    Ka ọ dịnụ echi.

    Ya gazie.

  7. Tinubu etiela ezinụlọ mgbọ ndị NDLEA tugburu nwa ha na Delta Steeti aka n'obi

    Bola Ahmed Tinubu

    Ebe foto si, Presidency

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu etiela ezinụlọ Omhonrina aka n'obi maka ọnwụ nwa ha nwoke dị naanị afọ abụọ aha ya bụ Ivan Omhonrina, bụ onye mgbọ tụrụ dịka ndị ọrụ nchekwa NDLEA gbara egbe na mpaghara Okpanam, Delta Steeti.

    Tinubu kwuru na ọnwụ nwata ahụ bụ nnukwu ihe mwute ma kwukwaa na ndị aka ha dị n'ọnwụ nwata ahụ ga-enweta ntaramahụhụ dịịrị ha.

    "Ivan ekwesịghị ịnwụ n'ụzọ dị otu a," ka akwụkwọ ozi ahụ si n'aka ọnụ na-ekwuru Tinubu bụ Dele Alake kwuru.

    "Anyị ga-ahụ na ihe a merenụ alaghị n'ụkpọrọ, hụkwa na o meghị onye ọzọ n'ọdịnihu."

    "Ana m ekpekwa ekpere maka mgbake ngwangwa maka Eronmonsele bụ onye merụkwara ahụ na ya bụ ihe mberede."

    "Anyị agaghị anabata a ihe a merenụ chaachaa, anyị ga-achọpụtarịrị ndị wetara anyammiri a n'ezinụlọ Omhonrina ma mee ka ha zute ikpe ziri ezi."

    Tinubu nyere ndị isi NDLEA iwu ka ha mee nnyocha miri emi ngwangwa ma chọpụta ndị aka ha dị n'ọnwụ nwata ahụ.

    NDLEA pụtara 'National Drug Law Enforcement Agency', bdị ọrụ ha bụ igbochi ịṅụ ọgwụike nakwa ịtụ mgbere ahịa ọgwụike na Naịjirịa.

    Akụkọ kwuru na ọ bụ mgbe ndị ọrụ NDLEA na-achụ ndị a na-enyo enyo maka ibu ọgwụike ka ha gbara egbe, mgbọegbe ahụ wee metụta ụmụaka abụọ ha na nna ha nọ n'ebe a na-akpụ isi.

    Otu n'ime ụmụaka abụọ ahụ nwụrụ, ebe onye nke ọzọ nọ n'ụlọọgwụ.

  8. Ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụzị N610 maọbụ karịa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ

    Ọnụahịa mmanụ ụgbọala

    Ndị bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa sokwa ata ikikiri eze taa bụ Tuzde dịka ọnụahịa mmanụ ụgbọala rịrị oke elu.

    BBC Igbo chọpụtara na ụlọahịa mmanụ ụgbọala dị icheiche emepeghi n'ụtụtụ Tuzde, dịka ndị ọrụ ha kwuru na ndị isi ha na-enwe ọgbakọ.

    Mana n'oge ehihie, dịka ọgbakọ ahụ kwụsịrị, ha malitere ire mmanụ ụgbọala n'ọnụ N610 maka otu lita. Tupu ụbọchị Tuzde, ihe a na-erebu otu lita bụ site na N540 maọbụ N550.

    Ụfọdụ ndị ọkwọ ụgbọala gwara BBC Igbo na nke a gbagwojuru ha anya maka na ọ pụtara na ihe na-akawanye njọ.

    Otu onye na-arụ ebe a na-ere mmanụ ụgbọala n'Enugwu, gwara BBC Igbo na ọ bụ nna ha ukwu kpọrọ ha n’ekwenti iji nye ha ntuziaka ka ha kwusịtụ ire mmanụ ụgbọala n'ụtụtụ. Mana ka ọ dị ugbua, ha amalitela rewe n'ọnụego N610.

    Abakiliki - Ebonyi Steeti

    Onye ntakụkọ anyị n'Abakiliki, isi obodo Ebonyi Steeti kwuru na ọnụahịa mmanụ ụgbọala ebe ahụ bụ n'etiti N617 ruo N620.

    O kwuru na nke a emeela ka ego ibanye ụgbọala rịa elu n'ebe dị icheiche.

    Ụmụahia, Aba - Abia Steeti

    Ndị bi n'Umuahia, isi obodo Abia Steeti gwara BBC na mmanụ ụgbọala na-ada n'etiti N600 ruo N620.

    Mana n'ụfọdụ obodo dị Umuahia nso, dịka Ikwuano, Oboro, ọnụahịa mmanụ ụgbọala ruchara N700, dịka otu onye ntaakụkọ si gwa BBC.

    Otu ihe ahụ na-emekwa n'Aba dịka ụfọdụ ndị bi ebe ahụ kwuru na ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụ bido na N620 ruo N650.

    Tupu taa, a na-erebu ya N520 maka otu lita, nke pụtara na o tinyere ihe ruru otu narị naịra.

    Owere - Imo Steeti

    N'Owerri, ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụ site na N615 ruo N650, onye ntaakụkọ bi ebe ahụ kwuru.

    Nke a bụ mgbali elu site n'ọnụahịa N520 maọbụ N530 a na-erebu ya.

    Ọka, Ọnịcha - Anambra Steeti

    Otu ihe ahụ na-ebekwa n'Anambra dịka ndị bi n'Ọka na Ọnịcha gwara BBC na ọ bụkwa N620 maọbụ N630 ka ha zụrụ otu lita mmanụ ụgbọala taa bụ Tuzde.

    Ka ọ dị ugbua, ebe e jibu N200 aga, bụzi N400 ka ndị ụgbọala na-ana.

  9. Etu anyị si memilaa ndị IPOB/ESN abụọ, nwuchie ise ọzọ n'Asaba - Ndị Agha

    Ndị a na-ebo ebubo maka ịbụ ndị Ipob/ESN

    Ebe foto si, Nigeria Army

    Ndị agha Naịjirịa ekwuola na ha gburu ndị otu Ipob/ESN abụọ ma nwụchie ise n'ime ha dịka ha wakporo mpaghara Fuji Junction n'Asaba, Delta Steeti.

    Onyema Nwachukwu, bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha, kwuru na ọ bụ ndị bi n'ogbe ahụ kpọrọ ndị agha oku enyemaka dịka ndị ekperima ahụ wakporo ha.

    O kwuru na oge ndị agha rutere, ndị ekperima ahụ malitere ịkwa ha mgbọ, mana ndị agha zaghachiri ha ma gbatuo mmadụ abụọ n'ime ha, mana ndị nke ọzọ gbalagara ọsọ gbaga ebe ha na-ezo n'akụkụ osimiri Okpanam.

    "Ndị agha chụwara ha ma jide ha. Ngwaọgụ a napụtara ha gụnyere otu egbe AK47, otu egbe 'pump action', mgbọ egbe 'cartride 15, otu mgbọegbe AK47, na otu ekwentị redio Baofeng," Nwachukwu kwuru.

    O rịọrọ ndị ọha obodo ka ha na-ewetara ndị ọrụ nchekwa ozi n'oge iji nye aka na nkwalite ọnọdụ nchekwa na mpaghara niile na Naịjirịa.

  10. Ndị ọkwọ ụgbọala ebeela akwa arịrị dịka ọnụahịa mmanụ ụgbọala rịrị elu n'ike

    Ndị chọrọ ịzụ mmanụ ụgbọala

    Ebe foto si, Getty Images

    Mkpu akwa pụrụ ọtụtụ ndị ọkwọ ụgbọala n'ọnụ na Naịjirịa dịka ha hụrụ na ọnụahịa mmanụ ụgbọala ejirila ihe karịrị pasentị 22 gbalielu n'ụbọchị Tuzde.

    Mmanụ ụgbọala a na-erebu ihe dịka narị naịra ise maka otu lita, gbaliri ruo ebe narị naịra isii na iri anọ n'ebe ụfọdụ, dịkaonye ntaakụkọ BBC si chọpụta.

    Onwebeghị nkwupụta ọbụla gọọmentị mere gbasara mgbali ọnụahịa mmanụ ụgbọala, mana otu jikọrọ ndị na-ere mmanụ ụgbọala bụ 'Independent Petroleum Marketers Association of Nigeria (IPMAN) kwuru na ihe kpatara nke a bụ mgbalielu ọnụahịa mmanụ agbịdị n'ahịa mba ụwa, ebe otu barel mmanụ agbịdị nọ na dọla iri asatọ, nke bụ ọnụahịa kacha kamgbe ọnwa Mee afọ a.

    Ọzọkwa bụ na ọnụahịa naịra iji gote dọla gbaturu dịka ọ nọzi na N776 maka otu dọla n'aka gọọmentị, mana ụfọdụ kwuru na ọnụahịa ya n'ebe ndị ọzọ ruru N820 maka otu dọla.

    Ego ole e ji ebuga mmanụ ụgbọala si Legọs gaa akụkụ Naịjirịa ndị ọzọ gbalikwara, nke metụtakwara ọnụahịa mmanụ ụgbọala n'ebe ndị a, n'ihi nke a, ndị bi na mpaghara Ugwu Naịjirịa ga na-azụ mmanụ ụgbọala n'ọnụahịa dị elu karịa ndị bi na ndịda.

    Naịjirịa bụ mba kacha emepụta mmanụ agbịdị n'Afrịka, mana ha na-esi mba ofesi ebubata ihe ruru pasentị 90 mmanụ ụgbọala, n'ihi na ha enweghị ike imepụta mmanụ ụgbọala na mba ahụ.

    N'ime ụbọchị ise gara aga, onyeisiala Bola Tinubu etinyela atụmatụ dị icheiche bụ nke ọ sị na ọ bụ iji kwalite ọnọdụ akụnụba Naịjirịa.

    Atụmatụ ndị a gụnyere ịkwụsị ịkwụ 'subsidy', bụ ego gọọmentị na-akwụbu ndị na-ere mmanụ ụgbọala iji butuo ọnụahịa ya maka ndị ọha obodo. Ọzọkwa bụ ime ka ọnụahịa e ji egote dọla bụrụ otu n'ebe niile na Naịjirịa.

    N'ihi nke a, ngụkọ nke ụlọọrọ 'National Bureau of Statistics' kwuru na ọnụahịa ihe gbaliri elu n'ọnwe Jun 2023 ruo pasentị 22.79 site na pasentị 22.41 o nọbụ n'ọnwa Mee.

    Manandị ọkachamara n'okwu akụnụba na-ekwu na ọnụahịa ka ga-agbali n'ọnwa Julaị.

  11. Twitter gbahapụrụ ndị ọrụ ha n’Afrịka ruo ọnwa asaa kemgbe a chụrụ ha n’ọrụ

    Twitter

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ruburu ụlọọrụ Twitter ọrụ n’Afrịka bụ ndị isi ụlọorụ ha nọ na Ghana na-ekwu na ụlọọrụ ha gbaziri ha na onye ọkaiwu ha nkịtị kemgbe ha na ụlọọrụ nwechara mkparịtaụka banyere nkwekọrịta ga-eso ịchụ ha n’ọrụ.

    Cheta na Elon Musk malitere ịchị ụlọorụ ahụ na Nọvemba 2022 ma were ịchụ ndị mmadụ n’ọrụ aghara aghara kpọọ ụlọọrụ ahụ ihu.

    Ụlọọrụ ndị ọkaiwu nke Agency Seventy-seven na-anọchịteanya ndị a kwuru na Twitter kwụsịrị ịgwa ha okwu kemgbe ọnwa May 2023 bụ mgbe mkparịtaụka ha nọzị n’ọnụ nchịkọta. Ndị rụrụ n’ụlọọrụ na-ekwukwa na enyebeghi ha ihe ruru ha dịka ndị a chụrụ n’ọrụ kemgbe afọ gara aga.

    Ụlọọrụ Agency Seventy-seven na-ekwu na ha na-achọzị ụzọ imanye Twitter ime he ndị a na Ghana mana ha achọghị ịkụrụ ụlọọrụ ndị mba ofesi ndị ọzọ ọrụ na mba ahụ.

    N’ọnwa Nọvemba 2022, Twitter mepere ụlọọrụ ya na Ghana ma wee ihe ruru mmadụ 12 n’ọrụ.

    Mgbe BBC zigaara ngalaba mgbasaozi Twitter ozi banyere okwu ndị a, ozi anyị wetere bụ ihe eserese nyiri nsị.

  12. Ọrịa Anthrax abatala na Naịjirịa dịka Gọọmentị si kwuo

    Ehi so n'ụmụanụmanụ ọrịa Anthrax na-emetụta

    Ebe foto si, Getty Images

    Ministri na-ahụ maka ọrụ ugbo ekwuola na ọrịa Anthrax abatala na Naịjirịa n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Joel Oruche wepụtara na Mọnde 17 Julaị 2023.

    Nke a na-abia akụkọ kwuru na a hụrụ ihe yiri njirimaara ọrịa n’otu ugbo ụmụanụmanụ dị na Gajiri n’ụzọ si Abuja gawa Kaduna n’okpuruọchịchị Suleja nke Niger Steeti.

    Mpụtara nyocha ngalaba na-ahụ maka ahụike ụmụanụmanụ na Plateau Steeti mere na 16 Jụlaị 2023, gosiri na ọrịa a dị ire na Naịjirịa.

    Nke a na-eso aka na ntị gọọmenti Naịjirịa dọrọ ka ndị mmadụ mụrụ akọ mgbe a chọpụtara Anthrax na mba Ghana dị nso n’izuụka ole ma ole gara aga.

    Gọọmentị etiti nakwa nke Niger steeti agbakọtala aka ọnụ ịhụ na a chịkwara ọrịa a aka ọ ghara ifesasị.

    A gbachiela ọrụ ugbo ebe a hụrụ ọrịa dịka e kesara ọgwụ mgbochi ọrịa a ruru puku iri ise (50,000).

    Gịnị bụ ọrịa Anthrax? Ọ bụ ọrịa ọjọọ na-esi na nje bacteria na Bacillus anthracis nke na-emetụtakaarị ụmụanụmanụ dịka ewu, ehi, atụrụ.

    Ọrịa a nwereike imetụta mmadụ ma ọ bụrụ na ha metụ anụmanụ bu ọrịa a ahụ maọbụkwanụ rie anụ ahụ n’ọnụ.

    Njirimaara Anthrax n’ebe ụmụanụmanụ gụnyere; ọnwụ otu ntabianya, ịgba ọbara site n’ọnụ maọbụ n’ime ha nakwa n’ike ha.

    Nje ọrịa a na-amụbawanye n’ebe unyi dị nakwa ebe ọbụla ha metụtara.

    Gọomentị amaala ọkwa ka ndị na-azụ anụmanụ nakwa ọha ka ha kpachara anya banyere ọrịa a ma mee mkpesa ma ọ bụrụ ha hụụ ihe dị aṅyaa.

  13. Igbo ndị ọma ndewo nụ!

    Anyị ji obiọcha na-anabata gị n'ọgbakọ anyị taa.

    Bịa gụrụ akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ọbaozi anyị nke si n'ụwa, Afrịka nakwa Naịjirịa.

  14. Ka ọ dị echi

    Anyị abịala n'isi njedebe mgbasaozi nke taa.

    Daalụ maka isonyere anyị.

    Anyị ga-amalite ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ Tuzde.

    Ndewo.

  15. Ndị uweojii na-enyocha nwokorobịa a sị gburu enyi ya nwaanyị na Legọs

    Killaboi na Augusta

    Ebe foto si, @KILLABOIGRAM/INSTAGRAM AND @AUSTA_XXO

    Ndị uweojii Legọs Steeti sị na ha amalitela inyocha akụkọ gbasara otu nwata nwoke a sị na o gburu enyi ya nwaanyị na Legọs.

    Akụkọ kwuru na nwata nwoke a aha ya bụ Benjamin, onye e ji Killaboi mara na soshal midia, ji aka ya depụta n'akara Instagram ya na ọ bụ ya gburu enyi ya nwaanyị aha ya bụ Onuwabuagbe Augusta Osedion na-amaghị ama oge ha abụọ na-aba mba n'ụlọ ya.

    Killaboi dere na ihe o mere wutere ya nke ukwuu n'ihi na ọ hụrụ nwa agbọghọ ahụ n'anya, o kwukwara na ya ga-enyefe onwe ya n'aka ndị uweojii.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Benjamin Hundeyin gwara BBC na nne nwata nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ bụ Onwabhagbe Cordelia wegara mkpesa gbasara ya bụ ihe n'aka ndị uweojii n'ụbọchị Satọde, Julaị 15.

    Oriaku Cordelia kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Tuzde, Julaị 11 ka ọ matara na nwa ya nwaanyị bụ Augusta na enyi ya nwoke bụ Killaboi na-enwe nghọtahie, mana ya gbara mbọ ikpeziri ha abụọ kama ekwentị ha anaghị aga.

    O kwuru na ọ bụ enyi nwaanyị Augusta kpọrọ ya gaa n'ụlọ Killaboi dị na 'Oral Estate' n'Ikota, Ajah, Legọs bụ ebe ha hụrụ ụgbọala Mercedes Augusta mana ha enweghị ike ibanyenwu n'ime ụlọ ahụ.

    Ha gara kpesara ndị uweojii ha wee bịa gbakaa ụzọ ahụ tupu ha ahụzie ozu Augusta. Ndị uweojii ahụ kwuru na ụfọdụ akụkụ ahụ Augusta adịghị ya oge ha hụrụ ya.

    Ndị uweojii sịkwa na ha hụrụ ihe dị icheiche n'ahụ nwa agbọghọ ahụ nke gosiri na ya mmadụ lụrụ ọgụ tupu ọ nwụọ.

    "Ndị uweojii amalitela nnyocha ugbua, anyị ga-ahafe okwu a n'aka ngalaba SCID dị na Panti," Hundeyin kwuru.

    Onye bụ Killaboi?

    Killaboi

    Ebe foto si, @KILLABOIGRAM/INSTAGRAM

    N'akara Instagram ya, nwata nwoke a kpọrọ onwe ya Killaboi kwuru na ya bụ onye ọrụ Tekịnụzụ dịka ọ kpọrọ onwe ya "blockchain developer' nakwa 'crypto purveyor'.

    N'otu ihe o dere n'Instagram, ọ sịrị na ya eritela ego karịrị nde naịra narị atọ malite 2022 ruo 2023 site n'ịgba chacha nke a kpọrọ 'betting' na bekee.

    O dere na ya alaala ndụ ya n'iyi dịka ọ ka dị afọ 26 site n'iji aka ya gbuo enyi ya nwaanyị, ma kwukwaa na ọ maghị etu ọ ga-esi hụ ezinụla ya ugbua.

    Onye bụ Augusta?

    Augusta

    Ebe foto si, @AUSTA_XXO/INSTAGRAM

    Onuwabuagbe Augusta Osedion onye e jikwa Austa mara bụ nwa agbọghọ dị afọ 21 ma bụrụkwa nwata akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ 'Lead University' dị n'Ibadan, Oyo Steeti.

    O dere n'akara Twitter ya na ya bụ onye a ma ama. Ndị na-eso ya n'Instagram dị mmadụ puku 109. Foto ndị ọ na-etinyekwa n'akara Instagram ya gosiri na ọ bụ onye ịchọ mma na-amasị.

  16. Kyari anọchiela anya Adamu dịka onyeisioche pati APC

    Abudllahi Adamu na Abubakar Kyari

    Ebe foto si, APC/FAcebook

    Akụkọ si Abuja apụta ugbua na-ekwu na Abdullahi Adamu na Iyiola Omisore, bụ onyeisioche na odeakwụkwọ nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressives Congress' (APC), agbaala arụkwaghịm.

    Nke a pụtara ihe n'ọgbakọ nke ndị 'National Working Committee' nke pati ahụ na-enwe ugbua n'Abuja, bụ ebe a nọkwara họpụta Abubakar Kyari dịka onyeisioche ọhụrụ nke APC na nchereoge.

    O dobeghi anya ihe kpatara mmadụ abụọ a ji kwuo na ha anaghịkwa arụ ọrụ a, mana ụfọdụ ndị okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị doro anya na-ekwu na onyeisiala Bola Tinubu enweghịzi mmasị n'ọchịchị Adamu na Omisore.

    Ọ bụ Abubakar Kyari kwupụtara n'ọgbakọ ndị NWC nke otu APC taa, na Adamu na Omisore agbaala arụkwaghịm.

    Cheta na n'ọnwa Jun afọ 2022, oge ndị APC na-akwado ntuliaka imeụlọ ha maka onye ga-eji ọkọlọtọ pati ahụ zọọ ntuliaka ọkwa onyeisiala nke 2023, Adamu gwara ndị ntaakụkọ na ha na-akwado Ahmed Lawan, bụ onyeisi Sineti Naịjirịa n'oge ahụ, ka ọ bụrụ onye ga-azọrọ APC ọkwa ahụ, mana Tinubu mechara merie ntuliaka imeụlọ ahụ, ma merikwaa ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.

    Nke a mere ka ọtụtụ na-ekwu na mmekọrịta Abdullahi Adamu na onyeisiala Tinubu anaghị agacha werewere.

    Ọsọkwa bụ na Adamu katọrọ etu e si họpụta ndị isi ụlọ omeiwu ukwu na nke nta, dịka o kwuru na ha bụ ndị isi APC enyeghị nkwado ha maka ọtụtụ ndị a họpụtara. Mana ọtụtụ kwuru na onyeisiala n'onwe ya nyere nkwado maka ndị ahụ a họpụtara.

    Onye bụ Abubakar Kyari bụzi onyeisioche APC ugbua?

    Abubakar Kyari bụbu onye omeiwu nọchitere anya mpaghara Borno South n'ụlọ sineti Naịjirịa malite na 2015 ruo 2022, tupu a họpụta ya dịka osote onyeisioche APC.

    Ọ rụkwara ọrụ dịka kọmishọna na ngalaba gọọmentị dị icheiche na Borno Steeti oge Ali Modu Sheriff nakwa Kashim Shettima bụ gọvanọ.

    Kyari onye dị afọ 60 ugbua bụ nwa ọchịagha Abba Kyari bụbụ gọvanọ mpaghara Ugwu-etiti n'oge gara aga.

    Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị na sekọndịrị na Kaduna steeti tupu ọ gaa Mahadum na mba Amerịka.

  17. Mgbali elu ọnụahịa na Naịjirịa n'ọnwa June bụ nke kacha njọ kamgbe afọ 17

    Ngwa nri

    Ebe foto si, Jelilat Olawale

    Ụlọọrụ 'National Bureau of Statistics' ewepụtala nnyocha maka mgbali elu ọnụahịa na Naịjirịa n'ọnwa June afọ 2023, wee kwuo na ọ gbaliri elu ruo pasentị 22.7.

    Nke a bụ mgbali elu kacha njọ kamgba afọ 17.

    Mpụtara ngụkọ ha kwuru sị: "N'ọnwa Jun 2023, mgbali elu ọnụahịa rigoro ruo pasentị 22.79, karịa etu ọ dị n'ọnwa Mee bụ pasentị 22.41.

    "Nke a pụtara na ọnụahịa ihe ji pasentị 0.38 gbalie elu n'ọnwa Jun ma ị were ya tụnyere nke ọnwa Mee.

    "Ị were ya tunyere etu ọ dị n'ọnwa Jun nke afọ 2022, ọ pụtara na mgbalielu ọnụahịa ji pasentị 4.9 ka njọ ugbua karịa oge ahụ mgbe ọ bụ pasentị 18.60."

    Ọnụahịa ihe oriri na mmanya ọtọ bịrịbịrị bụ ihe kacha gbalie dịka ọnụahịa ha ji pasentị 11.81 rịa elu karịa etu ọ dị n'ọnwa Mee.

    Cheta na ụlọakụ mba ụwa kwuburu na ha na-atụ anya na ọnụahịa ihe ga-agbali nke ukwu na Naịjirịa dịka gọọmentị kwụsịrị ịkwụ ụgwọ 'subsidy', nke bụ ego ha na-akwụbu iji butuo ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

    Gọọmentị etiti kwuru na ha ga na-akwụ ezinụlọ ndị kacha daa ụbịam puku naịra asatọ kwa ọnwa iji nyere ha aka belata ihe nhịahụ si na mwepu 'subsidy'.

  18. Ndị uweojii Enugu anwụchiela otu onye a na-enyo maka ọnwụ onye nnọchiteanya Eha-Alumona

    Nelson Sylvester Nnacheta

    Ebe foto si, Nelson Sylvester Nnacheta/Facebook

    Ndị uweojii Enugu akọwaala na ha amalitela nnyocha n’okwu mgbagbu otu nwaamadị aha ya bụ Nelson Sylvester Nnacheta (Ofunwa) bụ onye nnọchiteanya mpaghara Eha-Alumona nke okpuruọchịchị Nsukka.

    Akụkọ na-ekwu na a gbagburu nwaamadị a n'obodo Umualoji nke mpaghara ahụ n’abalị Sọnde, ụbọchị 17 nke ọnwa Eprel.

    Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti abụ Daniel Ndukwe gbara ama na ha anwụchiela otu nwoke a na-enyo na aka ya dị n’ọnwụ nwaamadị a.

    Ozi dị uweojii kwuru na ha na-ama ima imi n’ala ugbua inyochapụta ihe niile so ọnwụ ya nakwa ịnwụchi ndị e chee mere ya bụ ihe.

    Ndị ma ya na-ezipụta ozi arịrị na soshal midia dịka a na-agbara ya ezi ama.

  19. Sit-at-home: Ndị Enugwu Steeti ji otu ụkwụ apụta ezi

    Okporoụzọ Otigba Enugwu

    Ndị Enugwu ji nwayọ nwayọọ apụta ezi taa bụ Mọnde 17 Julaị, 2023 dịka gọvanọ ha nyere iwu sị ka onye ọbụla gawa mkpa dịịrị ha.

    N'aka nke ọzọ ụlọakụ dị niile mechiri emechi, dịka onye ntaakụkọ BBC kpagharịrị n'Enugwu si chọpụta..

    Ahịa Artisan

    N’ahịa Artisan dị n’Enugwu ndị na-azụ ahịa bụ mkpụrụ mmadụ ole ma ole pụtara ebe imirikiti ebe ọtụtụ ha nọ n'ụlọ ha dị iche iche, ọtụtụ ụlọahịa gbachiri agbachi.

    N'okporoụzọ ndị dịka Ogui, China Town, New Haven nakwa Bisala, ka a hụrụ naanị mkpụrụ mmadụ ole ma ole n'ụzọ nakwa ụfọdụ ụlọahịa mepere emepe.

    Ugbọala kọkwara ụkọ n'okporoụzọ a kpọrọ Okpara Avenue dị na New haven. Ụgbọala ndị a hụrụ n'ụzọ erughi ọnụọgụgụ nke a na-ahụ n'ụbọchị ndị ọzọ

    Okporoụzọ Enugwu
  20. Etu ndị agboro na-anakọ ego ụtụisi si akpa ike n'akụkụ Naijirịa

    Maazị Nwokuha kwuru na ọ na-arụ ọrụ ọma site na ịnyereaka kwara ọha ụzọ n'okpuruụzọ
    Nkọwa foto, Maazị Nwokuha kwuru na ọ na-arụ ọrụ ọma site na ịnyereaka kwara ọha ụzọ n'okpuruụzọ

    N’akụkụ Naịjirịa dị iche iche ụfọdụ ezinụlọ nwere agba na-ewe ndị mmadụ dịka otu nwoke kpọrọ onwe ya Kaptịn Nwokuha n’ọrụ maka atụmatụ nnakọ ego ụtụ isi n’aka ọha.

    Maazị Nwokuha na-ebu agba agba osisi akparịgharị n’okporoụzọ Port Harcourt, Rịvas steeti ji gosi ike ya dịka dimkpa.

    Ọrụ nwoke a gbara afọ 34 bụ ịnakọ ndị ọkwọ ụgbọala bọosụ nakwa ndị na-ebu ndị na-eme njem ego ụtụisi.

    Ọrụ a dị etu bụ ihe gbara afọ n’usoro ochie Naịjirịa mgbe ndị oji ego achọ ego na-akwụ ndị isi obodo ụgwọ maọbụ zitere ha onyinye iji nata ikike ịrụ ọrụ n’obodo mana ugbua ya bụ ihe aghọọla omenala nke ndị mmadụ na-akatọ dịka ‘ịna ego n’ike’.

    Ndị ọkwọ ụgbọala na-akwụ ndị agboro ihe ruru pasentị 20 ego ha ụgwọ njem ndị mmadụ na-enye ha.

    A na-akwụpụ ugegbe ụgbọala maka akwụkwọ akara njirimara ụgbọala ụgbọala na-ekwekweghi kwụọ ụgwụ ndị a, onye ju ndị dịka Maazị Nwokuha ewere agba agba osisi kupuo ya isi.

    Maazị Nwokuha onye ji nwunye na ụmụ abụọ kwuru na ọ na-anakọ ihe dịka N5000 ruo N7000 kwa ụbọchị. Ọ kọwara na ọ ne-eji ụfọdụ ego ahụ machie akpa ebe ezinaụlọ ise na mpaghara na-ekesa ya bụ ego.

    Ndị ọchịchị gọọmentị na steeti nakwa n’okpuruọchịchị dị iche iche n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche na-esi n’aka ndị agboro a anakọ ego ụtụ isi.

    Onye ọrụ nnakọ ụtụisi na-ekwopụ akara njirimara ụgbọala onye na-enyeghi ego ụtụisi
    Nkọwa foto, Onye ọrụ nnakọ ụtụisi na-ekwopụ akara njirimara ụgbọala onye na-enyeghi ego ụtụisi

    Michael Ango bụbu onye ọrụ ụtụ isi gọomentị kwuru “Ndị a na-etinye ego ndị n’ọbaego nke ha, nwere oke nke ha n’ime ego ụtụ isi a tupu ha enye gọọmentị oke nke ya”.

    Mana gọọmentị Onyeisiala Bola Tinubu aṅụọla iyi ibuso ndị agboro “, ndị ohi ndị were onwe ha n’ọrụ” agha.

    Ọrụ a Maazị Nwokuha na-arụ bụ ọrụ ndị ọchịchị okpuruọchịchị kwesịrị ị na-arụ. Naịjirịa nwere okpuruọchịchị 780 mana ha anaghị arụọrụ ha.

    Ọtụtụ ndị dịka Nwokuha na-eji ihe e ji egbochi ụgbọala ịgba n’ụzọ gbochi ndị njem ụgbọala ịgba ruo mgbe ha nyere ha ego ngafe.

    Otu onye na-agba nnukwu ụgbọala gwongworo gwara BBC na ọ na-akwụ ndị a ihe ruru N80,000 site na njem ya ibu bu si Legọs gaa Imo steeti.

    O dobeghi anya etu gọọmentị etiti ga-esi kwụsị ihe a mana ọ ga-abụ ihe ọrụ ya na steeti na okpuruọchịchị ga-ejịkọ aka ọnụ rụọ.

    Onyeisiala Tinubu kwuru na ọ chọrọ igbanwe usoro ọrụ ịnakọ ego ụtụisi iji kwalite akụnụba Naịjirịa.

    Ndekọ gọọmentị na-egosi na ego ụtụisi Naịjirịa na-ana nọ na pasentị 11 na 2021, nke dị ala karịa ihe ọtụ ụlọakụ ụwa ‘World Bank’ depụtara maka mba Kenya (13%) na South Africa (26%).

    Ka ọ dị ugbua, gọọmentịTinubu na-elekwasị anya na ụtụ isi na-ada n’elu ọnụahịanke a na-akpọ ‘Value-Added Tax (VAT)’.