Amerịka ahụtala ọnụọgụgụ coronavirus kachasị kwa ụbọchị (131,000)
Ndị butere coronavirus n’Amerịka n’ụbọchị Tusde dị puku narị na puku iri atọ na otu bụ ọnụọgụgụ kachasị kwa ụbọchị.
Ọrị a gbukwara mmadụ ruru otu puku, narị atọ na iri anọ na asaa n’ime otu ụbọchị ahụ, nke kachasị kamgbe ọnwa Ọgọstụ.
Nke a mere ka ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa na mba Amerịka kamgbe ọ batara karịa nde iri na ụma abụọ, ebe ndị nwụrụla dị puku abụọ narị abụọ na puku iri atọ na itoolu, narị isii na iri asatọ na atọ.
Nke a dị n'ozi nyocha ngalaba ahụike mahadum John Hopkins wepụtara.