Samuel Akinfolarin, bụ onye omeiwu nta ma bụrụkwa onyeisi ngalaba omeiwu na-ahụ maka ndị ọrụ okporoụzọ bụ Federal Road Safety Corps (FRSC), ekwuola na onweghị mgbe o ji kwuo ka e nye ndị ọrụ FRSC egbe ka ha were na-echekwa onwe ha.
Akinfolarin gwara BBC Igbo na ihe ọ rụtụru aka bụ na iwu hiwere ndị ọrụ nchekwa n'afọ 2007 nyere ha ikike iji egbe chekwa onwe ha.
O kwukwara sị "Dịka ngaghariiwe End SARS na-ewu, o nweghị onye isi dị mma ga-ebido ikwu okwu maka inye ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ egbe".
Akinfolarin kwuru na ndị nzụkọ ụlọomeiwu na ndị otu FRSC nwere nzụko ebe ndị FRSC kwuru na ndị mmadụ na-awakpo ndị otu ha ọtụtụ oge n'ụzọ ebe ha na-arụ ọrụ ha.
O kwuru na a ga-enwe nzụko n'etiti ndị omeiwu, ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ na ngalaba ndị ọzọ okwu nchekwa ndị ọrụ FRSC metụtara ka ha mara etu ha ga-esi chekwa ha mgbe ha na-arụ ọrụ ha.
Nke a na-eme dịka ndị mmadụ na-egosipụta iwe ha dịka akụkọ pụtara n'ụfọdụ akwụkwọ mgbasa ozi na-ekwu na ndị ọrụ FRSC ga-ebido buwe egbe.
N'aka nke ọzọ, ndị ọrụ FRSC nke onye kwuchitere ha bụ Bisi Kazeem kwuru na ọ bụ nghọtahie.
Kazeem kọwara na Akinfolarin kwuru sị "Ọ bụrụ na ndị FRSC na-ebu egbe, mwakpo a na-awakpo ha agaghị adị nke ukwu".
Kazeem kwuru na ndị otu FRSC ga-eme ihe ọbụla gọọmentị si ha mee ma kwukwaa sị: "Anyị kpọtụrụ ndi ọrụ nchekwa ndị ọzọ, ha na-agbatara anyị ọsọ enyemaka ndi dịka ndị uweojii, ndị 'Civil Defense' maọbụ ụfọdu mgbe ndịagha".
O kwuru na e nwere ọtụtu ihe ha ga-etinye uche ma ọ bụru na a chọrọ inye ha egbe, nke gụnyere iwepụta ego maka ya, ikuziri ha maka egbe na ihe ndị ọzọ.
Kazeem kwuru na onweghị mgbe onye omeiwu jiri kwuo ka ndị FRSC buwe egbe kama ọ rụtụru aka na e nwere iwu nke nyere ndị ọrụ ha ikike ibu egbe maka nchekwa ha.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya na soshal Midịa
N'aka nke ọzọ ọtụtu ndi Naijirịa apụtala katọọ atụmatụ ọbụla nke ga-enye ndị ọru nchekwa okporoụzọ ikike ibu egbe.