Aka chịburu Abia steeti bụ Orji Uzor Kalu ekwuola na anya ya dị n'otu egwuregwu bọọlụ Arsenal nke mba Ịngland.
Kalu kwuru nke a n'akara Facebook ya na mgbede Mọnde.
O kwuru na ya chọrọ imere Arsenal ihe o meere otu egwuregwu bọọlụ Enyimba nke Aba oge ọ nọ n'ọchịchị.
Cheta na Enyimba chakere nnọọ ka ọnwa oge Orji Uzor Kalu bụ gọvanọ Abia steeti.
Kalu kwuru sị: "Ihe ọma niile anyị mere n'otu egwuregwu bọọlụ Enyimba malite n'afọ 2000 ruo 2007 mere ka mmasị m n'ebe egwuregwu bọọlụ nọ gbalie."
"Dịka ide nke egwuregwu n'Afrịka, ana m eche echiche ịzụrụ oke pasentị iri atọ na ise (35%) n'Arsenal."
"Ebumnobi anyị bụ ibuli iko Champions League nakwa iko Premier Legue dịka anyị si mee n'Enyimba."
Malite n'afọ 2000 ruo 2007, Enyimba buru iko asọmpi bọọlụ Naịjirịa a kpọrọ 'Nigeria Premier League' ugboro ise: 2001, 2002, 2003, 2005, 2007.
Ha bukwara iko 'Super cup' abụọ (2001 na 2003), iko 'Champions League' nke Afrịka abụọ (2003 na 2004) nakwa iko 'Super Cup' nke Afrịka abụọ (2004 na 2005)
Orji Uzor Kalu abụghị onye Naịjirịa mbụ chọrọ ịzụta oke n'Arsenal.
Ide ego bụ Aliko Dangote ekwukwaala ugboro ugboro na ya chọrọ ịzụrụ otu egwuregwu ahụ, mana o nwebeghị isi.
Ka anyị lewenụ anya ma Orji Uzor Kalu ọ ga-etinye ego ya ebe o tinyere ọnụ ya.