Ndị nwere agba n'Igbo nakwa ala Yoroba ekwuola na Naijiria agaghị enwe ọganihu ọbụla ma ọ bụrụ na enweghị nhazigharị na mpaghara na mpaghara nke Bekee kpọrọ 'Restructuring'.
Ha kwuru nke a n'ọgbakọ 'Handshake Across the Niger' nke otu Njịkọ Ụmụnna hibere ụbọchị Monde ma kpoo noku ka ndị Igbo na ndị Yoroba jikọọ ọnụ were chọba ọdịmma Ndịda Anyanwụ.
Lee ihe ụfọdụ ndị bịara ọgbakọ ahụ e mere n'ikuku kwuru:
Okenye Yoroba bụ Ayọ Adebanjo gwara ndị Igbo sị, "a na-aghọgbu ụnụ si na-aga enye ụnụ ọkwa onyeisiala" ma sị na ọ kara onye ọbụla mma ka a hazịgharịa Naijiria, ugbua.
"E meghị otu a ị mara ihe a chọrọ bụ ka Naijiria kewasịa."
O kwuru na etu e siri hiwe Iwu Naijiria mere ya ka ọ bụrụ naanị otu mpaghara nwere ike ikpebi ebe onyeisiala ga-esi.
"Onye ọbụla megidere 'restructuring' bụ onye iro Naijiria. Buhari bụ onye iro Naijiria n'ihi na ọ jụrụ ịhazigharị Naijiria ugbua."
Otiegwu a ma ama bụ Onyeka Onwenu bụ onye jiri ngagharịiwe EndSARS maa atụ tụrụ arịrị sị na oge ọbụla e nwere nsogbu maọbụ nghọtahie na Naijiria, na ndị ọzọ na-ebokarị ya ndị Igbo.
"Aghọtaghị ihe butere oke akpọmasị a. Ọtụtụ ndị iji nnukwu anya ele gara n'ihe onyonyo TV kwuo na ndị Igbo bụ ha nyụrụ ihe na-esinụ."
O kwuru na oke asị e e nwere n'ebe ndị Igbo nọ mere ka ndị Igbo na-achị obi n'aka mgbe ọbụla.
Ọnwenu onye rụtụrụ aka na nkwenye ndị Yoroba na nke ndị Igbo yitere, kporo oku ka ha jịkọta ọnụ were chọba ihe dara mmiri.
Ihe so mee ka Naijiria na-akpụ afọ n'ala bụ na na anyị nwere ọchịchị bute ka e rie.
Utomi kwuru na nsogbu ọtụtụ nwere bụ na " anyị nwere bụ anyị anaghị agụ akwụkwọ maka ihe mere oge ochie" ọs ị na ọ bụ ya mere na ndị Igbo na ndị Yoroba si n'otu ezinaụlọ ma e lee asụsụ ha.
Nnamdi Kanu kwuru na ma e tere ogiri ma e tere ụgba, na nkwenye ya bụ na nnwereonwe nke a ga-esi na referadum nweta.