E duola ndị ọkaikpe Ụlọikpe Kachasị mmadụ asatọ
Ọkaikpe Kachasị nke Naijiria bụ Jọstịs Tanko Mohammed eduola ndị ọkaikpe Ụlọikpe Kachasị mmadụ asatọ iyi ọrụ taa bụ abalị isii nke ọnwa Novemba, afọ 2020.
Nke a welitere ọnụọgụgụ ndị ọkaikpe nke Ụlọikpe Kachasị site na iri na abụọ ha dịbu ruo iri abụọ.
Ndị e duru na ya bụ iyi ọrụ gụnyere Emmanuel Agim, onye 'South-South', Samuel Oseji, onye 'South-South',Helen Ogunwumiju, onye 'South-West' na Tijani Abubakar, onye 'North- East'.
Ndị ọzọ bụ Abdu Aboki, onye 'North West', M. M. Saulawa, onye 'North West' na Adamu Jauro, onye 'North East'.
Ha ṅụrụ iyi ịkwado Iwu ala Naijiria.