Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na akụkọ kwuru na e jidere otu ụkọchụkwu a hụrụ isi mmadụ n'aka ya n'ụmunze dị n'Anambara steeti abụchaghị eziokwu.
Ha kwuru na ya bụ onye a na-enyo enyo abụghị ụkọchụkwu nke e ji ahụ isi mmadụ n'aka ya.
Ndị ntorobia Umunze wakporo Rev Bishop Elijah Chukwuebuka nke ụlọụka, "God of Light Ministry' bụ ụkọchukwu na-ewu ewu na Umunze nke a ma ama maka ibu amụma na ịrụ ọrụ ebube, tie ya ihe ma kpụrụ ya ya na ngwogwo na ngwongwo ha hụrụ n'ogige ya kpụga be eze obodo ha maka ebubo ịhụ isi mmadụ n'aka ya.
Otu onye nọ ebe ihe mere kwuru na "Ndị ntorobịa hụrụ ya ka ọ na-agba aja. A hụrụ isi mmadụ, ọtụtụ ọkpụkpụ, foto ndị mmadụ e kere eke nakwa Akwụkwọ Nso e kere eke."
"Ihe a bụ ụkọchukwu a ma ama n'Ihite Umunze dịka onye amụma na-ahụ ụzọ."
Mana Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru ya bụ okwu metụtara "ebubo ịgwọ ọgwụ".
O sị na " ọ bụghị isi mmadụ ka a hụrụ n'aka ya, ọ bụ isi ewu nke e ji akwa mmemme kee."
Mohammed gara n'ihu kwuo na nwoke ahụ bụ dịbịa na-ezo onwe ya dịka ụkọchụkwụ nke ndị ntorobịa wakporo ma mebie okwu arụsị ya, kpụrụ ya gawa be Igwe ha ebe ha bụ ndị uweojii bịara gbapụtara ya.
Ka ọ dị ugbua, Igwe obodo ahụ enyela ya bụ nwoke iwu ka o si n'ala ha pụọ.