Gọọmenti Naijiria ewepụtala kọmitii ọhụrụ ga-arụ ọrụ maka ịgbanwe
ma kwalitekwa atụmatụ National Youth Service Corps (NYSC).
Dịka ha siri kwuo, ebumnuche nke a bụ ime ka atụmatụ ahụ sie
ike, baa uru maka ịkwalite uto mba, ma dabaa nke ọma maka mkpa ndị ntorobịa Naịjirịa.
Mkpebi a sochiri nsogbu na-arị elu maka nchekwa nke ndị òtù
corps na-efe ala nna ha, iji mara ma atụmatụ NYSC ọka dabara n'ọnọdụ ọha na akụnaụba
ugbua.
Ewepụtara kọmitii ahụ n'Abuja na Tuzde, ebe ndị isi sitere
na gọọmentị, ọha mmadụ, na ndị azụmaahịa bịara.
Minista na-ahụ maka mmepe ndị ntorobịa, Ayodele Olawande,
kwuru na NYSC arụwo ọrụ dị mkpa n'ịwulite ịdị n'otu obodo na inyere ndị ntorobịa
aka kemgbe 1973.
Otu n’ime ụgwọ ụtụisi ahụ na-achọ ịkagbu iwu hibere ụlọọrụ
na-ahụ maka ụtụisi Naịjirịa bụ Federal Inland Revenue Service (Establishment) ebe
nke ọzọ ga-eguzobe Joint Revenue Board (Establishment) ụgwọ 2025 ya na ụgwọ Nigeria
Revenue Service Bill 2025.
Ndị omeiwu kwadoro ụgwọ ụtụisi abụọ dịka kọmitii na-ahụ maka
ya tụlechara nkebiokwu ọbụla, ya na ịgụ ya nke ugboro atọ n’ọgbakọ Sinetị.
Cheta na Onyeisiala Bola Tinubu wegara mgbanwe ụgwọ ụtụisi
anọ n’ụlọ omeiwu Sinetị n’afọ 2024 ka ha tụlechara ma kwado ya.
Onyeisi ndị omeiwu sinetị Godswill Akpabio kwuru na mgbanwe ụgwọ
ụtụisi ahụ ga-eme ka ọchịchị dịkwuo mma ma gbanwee nchịkọta ụtụisi na nkesa ego
n'ofe Naịjirịa niile.
Awụrụ ọkụ ojii apụtala na Saint Peter's Square nke gosiri na ahọpụtabeghị Popu ọhụrụ
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndị na-azọ ọkwa ị bụ Popu site n'aka nri ruo aka ekpe Kadịnal Peter Kodwo Appiah Turkson, Kadịnal Pietro Parolin, Kadịnal Luis Antonio Gokim Tagle na Kadịnal Fridolin Ambongo Besungu
Dịka ndị Kadịnal
tụchara vootu nke atọ, awụrụ ọkụ ojii pụtara na Saint Peter's Square nke gosiri
na ahọpụtabeghị Popu ọhụrụ.
Nke a na-eme
dịka anya onye ọbụla nọ na chimney dị na vatịkan bụ ebe awụrụ ọkụ si apụta. Chimney
bụ ebe a na-agba akwụkwọ vootu ndị kadịnal
tụrụ ọkụ.
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Chimney
Cheta na n’afọ 2013 n’oge kọnklav họpụtara Pope Francis na ihe ha nọrọ bụ naanị abalị abụọ nakwa vootu ise.
N’afọ 2005 n’oge a họpụtara popu Benedict XVI na ọ bụ naanị abalị abụọ na vootu anọ ka a tụru ebe kọnklav họpụtara Popu John Paul II n’afọ 1978 nweere abalị atọ na vootu asatọ.
Ebe foto si, EBU
Nkọwa foto, Chimney dị na Vatịkan
Mana, etu awụrụ pụtara na Chimney si acha ga-enyereaka ka a mara na ndị kadịnal ahọpụtala Popu ọhụrụ maọbụ na ha ahọpụtabeghị ya.
Ihe awụru ojii pụtara bụ na ahọpụtabeghị Popu ọhụrụ, ebe awụrụ ọcha pụtara na ndị kadịna enweela nkwekọrịta onye ga-abụ Popu.
Lee ihe a na-atụ anya na nkwekọrịta tarifu n’etiti mba Amerịka na Briten taa
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Donald Trump na Keir Starmer
Dịka a na-atụ
anya na mba Amerịka na Briten ga-ekwupụta nkwekọrịta ha abụọ nwere banyere
tarifu taa, lee ihe ndị a na-atụ anya n’ime ya.
Etu ọnọdụ si
dị ugbua, mba Amerịka manyere tarifu Pasenti 25 n’ụgbọala na igwe e si Briten ebubata n'Amerịka.
Ọzọ bụ na tarifu Pasenti iri nke mba Amerịka manyere n’ahịa niile si
mba ụwa abata n'Amerịka metụtakwara mba Briten.
Mana tarifu n’ụgbọala mbubata ahụ so na nke kacha metụta mba Briten dịka
ndị kacha ere ụgbọala ha rụpụtara n'Amerịka.
JLR bụ ndị
rere ụgbọala 100,000 na mba Amrịka n’afọ garaaga kwụsiri n’ọnwa garaaga ị buba ụgbọala n'Amerịka.
Dịka ndị na-arụpụta ụgbọala na Briten na-achọ ka e nwee mgbanwe na Tarifu ahụ, mba
Briten nwereike ịkwụsị maọbụ nwetuo ụtụisi pasenti abụọ ha na-amanye n’ọdọ ahịa
ịntanet si mba Amerịka dịka Amazon.
Ụmụ Igbo ụtụtụ ọma!
Ka chi
fotere taa nwetere anyị ọganiru dịka unu na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC News
Igbo.
Mara na ụtụtụ
taa bụ abalị atatọ nke ọnwa Mee, 2025, ọ bụ Michael Ilediagu na Marvelous
Obomanu ga-enwetara unu akụkọ niile mere n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka na ụwa
niile ebe Uzoamaka Ewuzie na Michael Ngenega-esonyere ha n’ehihe.
Biko gaa
n'ihu nọnyere anyị taa.
Mba Amerịka na Chaịna ga-amalite mkparịtaụka maka agha azụmaahịa n’izu a
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Mba Amerịka na Chaịna ga-amalite mkparịtaụka banyere agha azụmaahịa n’izu a
Ndị ọchịchị mba
Amerịka na Chaịna ejikerela ịmalite mkparịtaụka n’izu a maka agha azụmaahịa dị
n’etiti mba abụọ ahụ akụnaụba ha kachasị n'ụwa.
Mịnịstrị nke
ofesi Chaịna kwuru na onye osote onyeisiala Chaịna He Lifeng ga-aga mkparịtaụka
ahụ na mba Switzerland site na 9 ruo 12 Mee 2025.
Ụlọọrụ ahụ
kwupụtara na onye ode akwụkwọ ego nke mba Amerịka Scott Bessent na onye nnọchianya
azụmaahịa nke Amerịka Jamieson Greer ga-anọchi anya mba Amerịka na nzukọ ahụ.
Kemgbe ọ
laghachitere n’obi ọchịchị Amerịka White House, Onyeisiala Trump etinyela ụtụisi
ruru 145% na ngwaahịa niile na-abata mba Amerịka site na Chaịna.
N’aka nke ọzọ,
mba Chaịna gara n’ihu itinye tarifu mmegwara 125% na mbubata niile si mba Amerịka.
Mana ndị ọkachamara
n'ịzụ ahịa n'ụwa niile gwara BBC na ha na-atụ anya na mkparịtaụka ahụ ga-ewe ọtụtụ
ọnwa.
Nke a ga-abụ
mkparịtaụka mbụ dị elu n'etiti mba abụọ ahụ kemgbe osote onyeisiala Chaịna Han
Zheng gara idu iyi ọrụ Onyeisiala Trump na Jenụwarị 2025.
Sudan akwụsịla njikọ ya na mba UAE maka ebubo nkwado ndịagha nnupụisi
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Nkwupụta a na-esochi mwakpo ọdụ ụgbọmmiri Sudan nke mere abalị atọ
Mba Sudan ekwuola na ha ga-akwụsị mmekọrịta mba na mba dị n’etiti
ya na mba United Arab Emirates (UAE) n’ihi ebubo nkwado otu Rapid Support
Forces (RSF) n’agha obodo na-aga n’ihu na Sudan.
Nke a na-eme dịka a na-ata ndị RSF ụta maka mwakpo a
na-enwekarị n’ọdụ ụgbọmmiri Sudan, bụ nke malitere na Sọnde wee gaa n'ihu ruo ụbọchị
Wenezde.
N’ụbọchị Tuzde, minista na-ahụ maka nchekwa na mba Sudan bụ Yassin
Ibrahim boro mba UAE ebubo imebi ọchịchị nwere onwe nke mba ahụ site na otu RSF.
Mana mba UAE agọnarị ugboro ugboro ebubo inye otu ahụ nkwado
ego, ngwa agha na nkwado ọchịchị.
Cheta na ọgụ afọ abụọ na-aga n’ihu na mba Sudan egbuola puku
kwuru puku mmadụ, mee ka ọtụtụ nde mmadụ gbapụ n'ụlọ ha ma bute nsogbu enyemaka
mmadụ kacha njọ n'ụwa.
N'ihi nkwupụta nke minista nchekwa Sudan, a ga-ewepụ onye nnọchiteanya
Sudan na mba UAE, dịka Sudan ga-akwụsị ọrụ ndị nnọchiteanya ya na mba UAE.
Pakịstan ekwuola na ha ga-azaghachi ogbunigwe mba Indịa gburu mmadụ 26
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Akụkọ kwuru na ọ bụ ụda ogbunigwe kpọlitere ndị bi ebe ahụ n’ụra.
Mba Indịa
ekwuola na ha amalitela ịtụ ogbunigwe na mpaghara itoolu dị na mba Pakịstan
nakwa Kashmir nke mba Pakịstan na-achịkọta.
Akụkọ kwuru
na ọ bụ ụda ogbunigwe kpọlitere ndị bi ebe ahụ n’ụra.
Ozi Pakịstan
wepụtara mere ka o doo anya na ọ bụ ogbe isii ka ogbunigwe ahụ dara ma kwuo na
ha gbaturu ụgbọelu agha ise mba Indịa. Mana Indịa ekwubeghị ma nke a ọ bụ
eziokwu.
Ndịagha Indịa
kwukwara na ihe ruru mmadụ 10 nwụrụ site n’ogbunigwe mba Pakịstan turu n’ogige
oke ala ha.
N’aka nke ọzọ,
Pakịstan kwuru na ogbunigwe mba Idịa gburu mmadụ 26 ebe mmadụ 46 meruru ahụ dị
iche iche.
Ọgbaaghara
a dị n’etiti mba abụọ a malitere ngwa ngwa akụkọ kwuru na a wakporo ndị mba Indịa
bịara ilegharị anya na mpaghara Pahalgam n’ọnwa Eprel, 2025.
Indịa gwara
ndị ntaakụkọ na ha nwere ihe akaebe gosiri na ọ bụ mba Pakịstan wakporo ndị ahụ.
Ndị Kadịnal na-aka ụka Mass na Vatịkan tupu emume ịhọpụta Popu ọhụrụ amalite
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Mgbe ndị Kadịnal kara ụka Mass na Vatịkan tupu emume ịhọpụta Popu ọhụrụ amalite n'afọ 2013
Ihe karịrị ndị kadịnal mmadụ narị iri atọ (130) si mba dị
iche iche nwere ọgbakọ na Vatịkan iji malite usoro ịhọpụta Popu ọhụrụ n’ihi ọnwụ onyeisi ụka katọlik n'ụwa niile bụ Popu Francis.
N'ehihie a, ndị kadịnal ga-aga na Sistine Chapel ịtụ vootu
n'okpuru frescoes Renaissance a ma ama.
Ozugbo ndị Kadịnal batara n'ụlọ ụka ahụ, mgbe o jiri ihe dịka
ọkara gafee elekere ise nke mgbede (17:30) n'oge mpaghara (16:30 BST), ha na mba
ụwa niile agaghị enwe mkparịtaụka ruo mgbe a ga-ahọpụta Popu ọhụrụ.
Nke a na-egosi mmalite nke ọgbakọ ịhọpụta Popu ọhụrụ akpọrọ
(conclave) - nke sitere n’okwu Latin "cum clave", pụtara "iji
igodo kpọchie"
Mgbe ha mechara vootu nke mbụ taa, anwụrụ ọkụ ga-esi na Sistine
Chapel pụta - anwụrụ ojii pụtara na-aga atụ vootu ọzọ echi, mana anwụrụ ọcha pụtara
na enwere popu ọhụrụ.
Ọ bụ ndị kadịnal kachasị elu n’ụka katọlik - ndị a na-akpọ kọleji
nke kadịnal nwere ikike ịhọpụta Popu ọhụrụ.
Ha ruru mmadụ narị abụọ na iri ise na abụọ (252) mana ọ bụ
mmadụ narị iri atọ n’ime ha bụ ndị tozuru oke ịtụ vootu ịhọpụta popu ọhụrụ.
Ogbunigwe na-ada na Rọshịa, Yukren ka ọ fọrọ abalị abụọ ka nkwekọrịta ị kwụsịtụ agha ụbọchị 30 bido
Ebe foto si, EPA
Nkọwa foto, Ụlọ ahịa dị Kharkiv, Yukren
Mba Yukren na Rọshịa ka na-atụ onwe ha ogbunigwe
aghara aghara ugbua na-agbanyeghị na ọ fọrọ naani abalị abụọ ka atụmatụ nkwekọrịta
ị kwụsịtụ agha ụbọchị iri atọ nke mba Amerịka na-akwado bido.
Rọshịa tụrụ ogbunigwe na mpagahara Nọt Kharkiv dị na
Yukren n’abalị nke mere ọkụ jiri gbaa ụlọ ahịa dị n’ebe ahụ.
Cheta na n’ọnwa Maachị ka Yukren nabatara nkwekọrịta ị
kwụsịtụ agha ụbọchị iri atọ nke Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump wepụtara
atụmatụ ya bụ nke a na-atụ anya na ọ ga-ebido na Mee 8, 2025.
N’aka nke ọzọ
mba Rọshịa na-ekwu na Yukren tụrụ zipụrụ droonu ogbunigwe aghara aghara n’abalị
bụ nke out n’ime ya dara n’akụkọ ọdọ ụgbọelu dị n’isi mba ahụ bụ Mosko, mana ndị
Yukren enwebeghị ihe ha kwuru maka nke a.
Cheta na mba Rọshịa wakporo mba Yukren n’ọnwa Febuwarị 2022 . Ugbua mba Rọshịa enwerela
mpaghara ala mba Yukren ruru pasenti iri abụọ.
Ụmụ Igbo ụtụtụ ọma!
Ekpere anyị taa bụ ka chi fotere taa nwetere anyị ọganiru dịka unu na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo.
Taa bụ abalị isii nke ọnwa Mee, 2025, mara na ọ bụ Michael Ilediagu ga na-ewetara unu akụkọ niile mere n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka na ụwa niile ebe Chinonso Ugorji na Marvelous Obomanu ga-emecha sonyere ya.
Biko gaa n'ihu nọnyere anyị taa.
EFCC ekwuola ihe mere ha ji nwụchie Very Dark Man
Ebe foto si, VDM/Facebook
Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) ekwupụtala na ọ bụ ha nwụchiri nwaokorobịa olu ya na-ada ụda bụ Martins Vincent Otse e ji Verydarkblackman (VDM) mara.
EFCC mere ka BBC Pidgin mata maka nnwụchi VDM n'ụbọchị Mọnde 5 Mee 2025.
Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ EFCC bụ Dele Oyewale kwuru na ha nwụchiri nwaamadị ahụ dabere n'ọtụtụ mkpesa ndị na-ewesara VDM iwe nyere n'ụlọọrụ ha.
Oyewale kwuru sị "anyị nwụchiri VDM ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ọtụtụ ebubo ụfọdụ mmadụ boro ya."
Oge a jụrụ ya ma aka ụlọakụ Guarantee Trust Bank (GTB) ọ dị na mkpesa ahụ, Oyewale sịrị na ha dị ọtụtụ mmadụ nyere ya bụ mkpesa ma kwuo na ọ gaghị akpọ aha ha iji chekwaa ha.
Ọ gbakwunyere na ha ga-atọhapụ ya ọ bụrụ ma o mezuo ọnọdụ beelụ ya ma kwuo na a ga-ebuga okwu ahụ ụlọikpe na-egbughị oge.
O mekwara ka o doo anya na ọ bụ n'Abuja ka ha nọọrọ nwụchie nwaokorobịa ahụ.
Ndị nnọchiteanya AU na IGAD abatala Saụt Sụdan maka mkparịtaụka udo
Ebe foto si, AFP
Onyeisioche nke otu mba Afrịka bụ African Union (AU) na Osote onyeisioche nke otu Intergovernmental Authority on Development (IGAD) erutela Saụt Sụdan iji kparịta ụka maka ịkwụsị nsogbu ma weta udo.
A na-atụ anya na Onyeisioche nke African Union bụ Mahmoud Ali Youssouf na Osote odeakwụkwọ ukwu nke Inter-Governmental Authority on Development (IGAD) bụ Mohamed Abdi Ware ga-awuchi Saụt Sụdan n'ụbọchị taa bụ Mọnde 5 Mee 2025.
Ha ga-eleba anya n'ihe banyere nsogbu ndọrọndọrọ ọchịchị nke na-aga n'ihu na-emebi mba ahụ.
E nwere olileanya na ha na ndị isi ọchịchị gọọmenti Saụt Sụdan dịka Minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Monday Semaya ga-enwe nzukọ tupu ha na Onyeisiala Salva Kiir Mayardit ezute.
Tinubu ga-ezute ụlọọrụ ndị na-ahụ maka ọkụ latrik n’ihi ụgwọ 4tn ha ji
Ebe foto si, TCN
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ga-ezute ndịisi ụlọọrụ
na-ahụ maka ọkụ latrik na mba ahụ iji kpaa maka ụgwọ taarị naịra anọ (4tn) ha
jikọrọ.
Ozi ọnụ na-ekwuru Minista na-ahụ maka ikike bụ Adebayo
Adelabu wepụtara n’ụbọchị Sọnde 4 Mee 2025 kwuru na gọọmenti etiti dị “njikere
igbo nsogbu ahụ”.
O wepụtara ya bụ ozi dịka e nwechara nzukọ n’etiti Minista
ahụ na ndịisi ụlọọrụ ọkụ latrik ndị ahụ n’ụbọchị Tuzde.
N’oge ha nwere nzukọ ahụ, Minista kwere ụlọọrụ ndị ahụ
na-emepụta ọkụ latrik (GenCos) nkwa na gọọmenti ga-elekwasa anya n’otu mpaghara ugwọ
ahụ ha ji.
Ozi ahụ sịrị “ọ dị ezigbo mkpa na anyị jiiri ego kwụọ
mpaghara ụgwọ ahụ, ọ bụrụzie ma e mechaa, anyị nwereike gbaziri ego kwụchapụ
ndị fọrọ afọ n’ọdịnihu.”
Ọ kọwara na ọnụego gọọmenti ga-akwụ ga-adabere na mkpebi
ha ga-enwe oge Onyeisiala ga-ezute ndịisi nke ụlọọrụ ndị ahụ.
EFCC akpụpụla nwoke na-agwaghị ndị ọdọ ụgbọelu na ya ji ego ruru $90,000 ụlọikpe
Ebe foto si, EFCC
Nkọwa foto, Ahmed Shaw
Ụlọọrụ na-ebuso mpụ na nrụrụ aka agha na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes
Commission, EFCC akpụpụla otu nwoke ụlọikpe maka na o ji ego ruru $90,000 ma hara ịgwa ndị ọdọ ụgbọelu.
EFCC na-ebo nwoke
ahụ aha ya bụ Alhaji Ahmed Shaw ebubo ị bupụ ego n'ụzọ megidere iwu Naịjirịa.
Dịka ọkwụkwọ
ozi EFCC wepụtara, ihe ahụ mere n’abalị abụọ nke ọnwa Mee afọ 2025 n’ọdọ ụgbọelu Murtala Muhammed International Airport, Ikeja, Lagos.
A kpụgara Ahmed Shaw n’ụlọikpe dị elu nke ọkaikpe D.I.Dipeolu dị na Ikoyi,
Legos.
Ha sị na ọ bụ ndị ọrụ National Drug Law Enforcement Agency,
NDLEA bụ ndị jidere Ahmed Shaw ma nyefee ya n’aka ndị EFCC.
Rụwanda ekwuola na ha na Amerịka na-akparịta ụka gbasara ịnabata ndị mbịarambịa
Ebe foto si, Reuters
Rụwanda na ọchịchị Donald Trump amalitela mkparịtaụka iji
nabata ndị mbịarambịa mba Amerịka gbaara ụgbọ nwamkpi.
Minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ na Rụwanda bụ
Olivier Nduhungireh mere ka a mata nke a.
O kwupụtara nke a dịka Odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Marco
Rubio nọọrọ n'ọnwa gara aga kwuo na Washington "na-agbalị ịchọta" mba
ndị ga-anabata "ụfọdụ mmadụ ndị kachasị bụrụ ndị abaghị uru".
Nduhungireh kwuru na mkparịtaụka ahụ "abụghị ihe ọhụrụ
nye anyị" dịka Rụwanda nọọrọ mgbe gara aga kweta na ha ga-anabata ndị mbịarambịa
mba UK chụrụ ọsọ.
Ka o sina dị, mba UK gbahapụrụ atụmatụ ahụ nke ọtụtụ
mgbanwe iwu metụtara n'oge gọọmenti ọhụrụ banyere n'ọchịchị n'ọnwa Julaị afọ
gara aga.
A tụọla Onyeisiala Kenya akpụkpọụkwụ n'ọgbakọ mbara ama
Ebe foto si, William Ruto/X
Gọọmentị mba Kenya ekwuola na ọ bụ 'ihe ihere" akpụkọụkwụ a tụrụ Onyeisiala ha bụ William Ruto ebe ọ gara ọgbakọ mbara ama Ụbọchịụka.
Onye ntaakụkọ BBC bụ Basillioh Rukanga, onye dere akụkọ a kwuru na ihe onyonyo fegharịrị gosiri ka akpụkpọụkwụ tụrụ onyeisiala n'aka ekpe dịka ọ na-ekwu okwu.
Ọnụ na-ekwuru gọọmentị bụ Isaac Mwaura katọrọ ihe mere ma sị ka ' anwụchie " ndị mere ya.
Mwaura kwuru n'ozi o wepụtara n'akara ọbaozi ya na X, sị," Kedụ ihe ga-eme ma a sị onye ọbụla tụwa ibe ya akpụkpọụkwụ?"
"Kedụ ihe anyị na akụziri ụmụaka anyị ugbua?" dịka ọ kpọrọ oku ka a kwanyere onyeisiala ugwu.
Ụfọdụ ndị omeiwu katọkwara akpụkpọụkwụ ahụ bụ nke ha sịrị na o bụ nnukwu ihe metụtara nchekwa onyeisiala.
Onyeisiala Ruto na-agwa igwe ndị mmadụ okwu na Migori County dị n'Ọdịda Anyanwụ mba ahụ dịka ọ gara njem abalị atọ iji gbapee ụfọdụ ọrụ mmepe obodo a rụrụ nakwa malite ndị ọhụrụ..
Mana dịka ụfọdụ na-ekwu na ịtụ onyeisiala akpụkpọụkwụ bụ mkparị, ụfọdụ kwuru na ọ na-egosi obi adịghị ndị mmadụ n'ihi ndakpọ ọnọdụ akpụnaụba mba ahụ..
Ihe onyonyo nke Onyeisiala wepụtara n'akara X ya egosighị ebe ahụ a tụrụ ya akpụkpọụkwụ.
Mana o gosiri obere mmalite gidigidi n'etiti igwe mmadụ.
A na-anụ ka Onyeisiala na-agwa ndị ọrụ nchekwa chọrọ ịchọ onye mere ihe ahụ ka ha hapụ ndị mmadụ.
N'otu ntabianya , o nweghịkwa ihe ọzọ a hụrụ.
Akpụkpọụkwụ ahụ a tụrụ na-abịa dịka nsogbu nchekwa ndị ọchịchị obodo na-arị elu..
N'isuụka gara aga, ndị bu egbe bu ọgbatumtum gbagburu otu onye ụlọomeiwu nọ na pati abụghị nke nọ n'ọchịchị n' isobodo Nairobi.
Nelson Koech, bụ onye omeiwu nọ na pati onyeisial kwuru na ihe mere n'Ụbọchịụka bụ "ichere ọchịchị onyekwuoucheya aka mgba", ma kwukwa sị, "Anyị ewerela ekwemnaka a gafee nku aka".
"Chegodi ma ọ bụrụ na akpụkpọụkwụ ahụ bụ mgbọegbe.. Ndị mmadụ ji nchekwa Onyeisiala eme ihe egwu."?.
Ọ gwara ụlọntakụkọ 'Citizen TV' sị, "Anyị kwesirị ichekwa Onyeisiala."
Migori dị na mpaghara a na-ahụta ka ebe onye ndọrọndọọ ọchịchị nke pati anọghị na gọọmentị a ma ama bụ Raila Odinga, onye ya na Ruto zọkọrọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2022 si pụta.
Odinga na Ruto nwere nkwekọrịta n'ọnwa Maachị iji "nye aka ka odejijij na-ede na mba ahụ kwụsịlata", dịka ngagharịiwe megide ịkwụ ụtuisis kpọtụrụ na mba ahụ n'afọ 2024.
VE-Day: Emume ncheta afọ 80 mba Jamịnị dosere ngwaagha kwụsị ọgụ na Yurop ebidola
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndị Household Cavalry
Mba Briten
ebidola emume abalị anọ ha ji echeta ụbọchị ndịagha Nazi nke Jamini chiniru aka
elu sị na ha achọghịzị ị nụ agha.
Nazi na-eme
nke a ka ha busochara Briten na ndị
mpaghara Yurop agha ihe ruru afọ isii.
Nkọwa VE- Day
pụtara “Victory Day In Europe” bụ ihe mere n’abalị asatọ nke ọnwa Mee 1945.
Ọ bụ n’elekere 15:00 BST bụ mgbe Praịm mịnịsta Winston Churchill gara na redio kwuo na agha dị
na Yurop akwụsịla maka na mba Jamịnị edesola ngwaagha ha.
Nke a butere
Queen Elizabeth nke abụọ bụ adaeze n’oge ahụ
nakwa nwanne ya nnwaanyị bụ Princess Margaret gara n’oge ahụ sonyere ụmụamaala Briten nwee anụrị na London.
Ụmụ Igbo ụtụtụ ọma!
Ekpere anyị taa bụ ka chi fotere taa nwetere anyị ọganiru dịka unu na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo.
Taa bụ abalị ise nke ọnwa Mee, 2025, mara na ọ bụ Michael Ilediagu ga na-ewetara unu akụkọ niile mere n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka na ụwa niile ebe Chinonso Ugorji na Marvelous Obomanu ga-emecha sonyere ya.
Biko gaa n'ihu nọnyere anyị taa.
Ndị uweojii egbuola ndị ekperima atọ na Benue, nwụchie ọtụtụ ndị ntọ na Delta steeti
Ebe foto si, Olumuyiwa Adejobi/X
Ndị uweojii egbuola ndị ekperima atọ na Benue steeti mgbe ha na-eme nzukọ nzuzo ịwakpo ndị uweojii nọ na mpaghara Shitele na Ukum nke steeti ahụ.
Onye na-ekwuchitere ndị uweojii Naịjirịa bụ Muyiwa Adejobi kwuru na ndị ojiegbe ahụ na ndị uweojii kwara onwe ha mgbọ, dịka ndị ekperima atọ merụrụ ahụ ma nwụọ oge a na-ebuga ha ụlọọgwụ.
Ha nwetara ngwaagha dị iche iche dịka egbe ntụ abụọ na ụfọdụ mgbọ egbe.
N'ọzọ yiri ya, ndị uweojii nọ na Delta steeti nwụchiri ndị ntọ itoolu ma napụta mmadụ abụọ ndị ha ji kemgbe 26 Epril, 2025.
Ndị uweojii napụtakwara ha ọtụtụ ngwaọgụ dị iche iche ha ji arụ ọrụ.