Hamas ekwela ịtọhapụ mmadụ iri ha ji ma chọọ nkwụsị agha na-adịgide na nzaghachi mba Amerịka
Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Mee 2025.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere
Onyeisiala Tinubu arịọla nkwado ụlọomeiwu maka ịgbaziri $21.5b

Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook
Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu Onyeisiala Bola Tinubu edegarala ụlọomeiwu Sịneti akwụkwọ ma rịọ nkwado ha banyere ego dị ijeri dọla iri abụọ na otu na narị puku ise ($21.5) ọ chọrọ ịgbaziri site na mba ofesi nakwa ijeri narị asaa na iri ise na asatọ (₦758b).
Akwụkwọ ahụ Onyeisiala Tinubu degaara ụlọomeiwu ahụ, kwuru na ego ahụ bụ nke a ga-eji rụọ ọrụ dị mkpa gụnyere okporoụzọ, ngalaba ahụike, agụmakwụkwọ, mmiri na ịkwụ ụgwọ ezumike nká nye ndị ọru nọ n'otu Government Pension Scheme.
Ụlọomeiwu nyefere akwụkwọ ahụ n'aka Kọmitii ya na-ahụ maka mgbaziri ego ma kwuo na ha ga-enye nzaghachi ha n'ime izuụka abụọ.
Onyeisiala Tinubu gara n’ihu rịọrọ ụlọomeiwu nta ka ha nye ya ohere ịgbaziri ego dị ijeri dọla abụọ ọzọ site n'ahịa ụlọ iji tinye na mpaghara akụnaụba obodo dị mkpa.
Ụlọomeiwu gwara Kọmitii ya na-ahụ maka ụgwọ ka ha tụlee arịrịọ onyeisiala.
Cheta na Onyeisiala Tinubu degaara ụlọomeiwu nta akwụkwọ oge gara aga iji nweta nkwado maka atụmatụ ịgbaziri nke afọ 2025 ruo afọ 2026.
Ọrịa otoro tiwapụrụ na mba Sụdan egbuola mmadụ 346

Ebe foto si, Getty Images
Akwụkwọ akụkọ Sudan Tribune kwuru na opekatampe mmadụ 346 anwụọla n’ihi ntiwapụ ọrịa otoro na Khartoum dị na mba Sụdan dịka ọtụtụ ndị ọzọ butere ọrịa ahụ na-efesa ebe niile ugbua.
Onyeisi Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Fath Al-Rahman Al-Amin kwuru na ihe karịrị mmadụ 80 na-ebute ọrịa ahụ kwa ụbọchị.
Ọ sịrị na ha ehiwela ogige nlekọta 15 iji gbochie mfesa ọrịa ahụ.
N’ụbọchị 14 Mee 2025, ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ WHO na mkpirisi Bekee kwuru na ha ebunyela Mịnịstrị na-ahụ maka Ahụike na Sụdan ngwa ndị e ji elekọta ahụike dị tọọnụ 15 iji kwalite mbọ ha na-agba ịkwụsị mfesa ọrịa ahụ.
Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Sụdan kwuru na ha ga-amalite ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa otoro na Khartoum iji belata mfesa ọrịa ahụ.
Ụlọmgbasaozi ndị e nwere na mba ahụ kwuru na ihe butere ya bụ ntiwapụ ọrịa bụ iji mmiri na-adịghị ọcha eme ihe tinyere ogige ndị ruru unyi.
Ndị Zimbabwe eweela iwe dịka onyeisiala ha kwadoro ụtụisi maka iji gee redio n’ime ụgbọala

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa abịnyela aka n’iwu ga-eme ka ndị niile nwere ụgbọala zụta ikike e ji ege redio tupu ha enwee ike nweta mkpuchi ụgbọala.
Ụfọdụ ndị ọkwọụgbọala etiela mkpu dịka a tụrụ anya na ha ga na-akwụ $92 (£68) kwa afọ ọbụla iji nwee ike gee redio n’ime ụgbọala ha.
Ya bụ atụmatụ e webatara bụ akụkụ mbọ a na-agba ịkpatara ụlọmgbasaozi mba Zimbabwe ego, mana ndị nkatọ ekwuola na ụgwọ ikike ahụ dị nnukwu, ọkachasị ugbua ọnọdụ akụnaụba mba ahụ jọrọ njọ.
Otu n’ime ndị a ma ama na-agba ọchịchị mba ahụ ụkwụ bụ Nelson Chamisa kwuru na iwu ọhụrụ ahụ bụ “nke ezighị ezi, nke megidere ndị a na-achị nakwa nke na-egosi obi ịta mmiri”.
Anyị niile kwụrụ Liverpool n’azụ n’ihe ọdachi a dakwasịrị ha – Praịm Minista Starmer

Ebe foto si, EPA
Nkọwa foto, Otu onye na-akwado Liverpool kwuru na ọ bụ obere ihe ka ya na enyi ya nwaanyị ji gbanarị ọdachi ahụ. Praịm Minista mba UK bụ Keir Starmer ekwuola na mba UK niile kwụrụ Liverpool n’azụ n’ihe ọdachị dakwasịrị ha n’abalị Mọnde 26, Mee, 2025.
Mmadụ 50 meruru ahụ oge onye ọkwọụgbọala sọbara n’ogige ndị nkwado otu egwu bọọlụ Liverpool na-enwe aṅụrị maka ugo ha tuuru n’asọmpi premier league.
Onyeisi mpaghara Liverpool bụ Steve Rotherham kwuru na mmadụ anọ meruru ahụ nke ukwuu ebe onye bubu onye nkụzi otu egwu bọọlụ Liverpool bụ Jurgen Kloop kwuru na ozi ọdachi ahụ wutere ya na ezinaụlọ ya.
Otu onye na-akwado Liverpool kwuru na ọ bụ obere ihe ka ya na enyi ya nwaanyị ji gbanarị ọdachi ahụ.
Akụkọ kwuru na ndị uweojii anwụchiela ọkwọụgbọala ahụ e kwuru na ọ gbara afọ 53.

Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisi mpaghara Liverpool Steve Rotherham 
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndị uweojii ji eriri gbachie ogige ahụ 
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndị uweojii nọ n'ogige ọdachi ahụ mere "Otu nwoke nwụrụ ka ogbunigwe o bu n'ahụ chọrọ ịbanye n'ogige ndịagha n'Abuja gbawara"

Ebe foto si, Nigerian Army/NEMA
Onye ji ogbunigwe n’ahụ ya chọrọ ịbanye n’ụlọọrụ ndịagha dị n’Abuja tupu ogbunigwe ahụ agbagbuo ya – NEMA
Ụlọọrụ gbata gbata bụ National Emergency Management Agency (NEMA) akọwaala ihe mere ogbunigwe jiri n’otu ebe dị nso n’ogige ndịagha dị n’Abuja.
N’ozi ụlọọrụ a wepụtara n’ụbọchị Tuzde ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Mee, ha kwuru na nke mere mgbe otu nwoke bu ogbunigwe n’ahụ ha chọrọ ịmabanye n’ogige ndịagha dị n’okporoụzọ Keffi, Abuja.
Mana dị ka ọ na-achọ ka o nwetere ohere ịbanye ka ogbunigwe ahụ gbawara ya n’ahụ, gbuo ya ma merụọ otu onye ọzọ ahụ.
Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na ngalaba ndị uweojii n’ahụ maka ogbunigwe achụsaala ndị mmadụ nọ nso n’ebe ahụ iji malite nnyocha.
Ndịagha Naịjirịa kwuru n’ezie na ogbunigwe gbawara n’ehihe ụbọchị Mọnde n’ihe dịka elekere abụọ nke ehihie n’otu ebe a na-akwụsị ụgbọala nke dị nso n’ogige ha.
Ndịagha Naịjirịa depụtara n’akara soshal midia X ma kwuo “anyị ewerela ọnọdụ” mana ha ekwughi ihe ọzọ.
“Ihe dị ka ogbunigwe gbawara n’ihu ogige ndịagha Mogadishu Cantonment dị n’Abuja mana anyị kụjụọla ebe ahụ. Ozi na-abịa n’uju.”
N’aka nke ọzọ ndị uweojii kwuru na ha nwetere ozi banyere ihe a gbawara ma kwuo na ha na-eme nnyocha n’ihe mere n’n’ogige ndịagha Mogadishu cantonment.
Ogige ahụ bụ ebe ndịagha Ụgbọelu na Ụgbọmmiri na-anọ.
N’ọnwa Jenụwarị, ogbunigwe gbakwara n’otu ụlọakwụkwọ dị na mpụta isiobodo Abuja, ndị nchekwa kwuru na ọ bụ mpekere ogbunigwe otu nwata akwụkwọ ji bịa n’ụlọakwụkwọ. Ogbunigwe a gbara n’ụlọakwụkwọ ndị okpukpere Alakụba gburu mmadụ abụọ ma merụọ abụọ ahụ.
Ụmụaka so na ndị merụrụ ahụ na Liverpool oge ụgbọala sọbara isi n'etiti ha

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụaka anọ so mmadụ iri ise merụrụ ahụ mgbe otu ụgbọala sọbara isi n’etiti igwe mmadụ na mgbede ụbọchị Mọnde, mgbe otu egwuregwu bọọlụ Liverpool na-eme ngagharị ngosi Iko asọmpi Premier League ha mabutere.
E buuru ihe ruru mmadụ iri abụọ na asaa gawa n’ụlọọgwụ ebe mmadụ abụọ - gụnyere otu obere nwata merụrụ nnukwu ahụ.
Ndị uweojii ngalaba Merseyside kwuru na ha anwụchiela otu nwoke, nwafọ mba Briten dị afọ iri ise na atọ e cheere bụ onye ọkwọụgbọala ahụ kama na ha anaghị ahụta agwa nwoke a kpara dịka ihe iyi ndụ egwu.

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi obodo Liverpool bụ Steve Rotheram gwara BBC na “ihe ọdachi a” anara ndị mmadụ “obi aṅụrị” ha n’ụbọchị a ma kwuo na ọ dị mkpa ka e nye ndị uweojii ohere ịrụ ọrụ ha.
Ndị uweojii kwuru na ha nwetere ozi n’ihe dịka elekere isii nke mgbede ụbọchị Mọnde 26 Mee, 2025 na otu ụgbọala sọbara isi n’ebe ndị ji ụkwụ eme njem nọ n’okporoụzọ a kpọrọ ‘Water Street’.
Praịm Minista mba Briten bụ Keir Starmer tiri ndị obodo Liverpool aka n’obi ma kwuo na mba Briten niile na-etinye ha n’ekpere ugbua.
O kelere ndị uweojii na ndị ọrụ gbata gbata maka mbọ ha gbara n’ịzọpụta ndị mmadụ ọkachasị ndị tọrọ n’okpuru ụgbọala ahụ.
O kwuru na onye ọbụla ọkachasị ụmụaka kwesịrị inwe aṅụrị ma too ndị bụ dike ha na-enweghi ịtụegwu ọbụla.

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Igbo mma mma nụ ooo!
Kedụ ka ụbọchị taa si dịrị gị ugbua? Anyị ji aka ma i tetara ụra nke ọma.
Ka ụbọchị taa maara gị na mma oooo!
Biko jisie ike sonyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo na Facebook, Instagram nakwa websaịt bụ bbcigbo.com
Ndị uweojii adọọla VDM aka na ntị megide ịkpali ọgbaaghara n’Anambra steeti

Ebe foto si, Anambra State Police Command
Ndị uweojii Anambra steeti adọọla ndị steeti ahụ aka na ntị ka ha zere ụfọdụ mmadụ kpọrọ onwe ha ndị na-ahụ maka ikike ruuru mmadụ, bụ ndị na-efesa akụkọ ụgha na soshal midịa iji kpalite ọgbaaghara n’etiti ọhanaeze na ngalaba gọọmenti, ndị uweojii na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ.
N’ozi ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga mere ka o rute anyị aka, ọ gwara ndị bi n’Anambra steeti ka ha wezuga onwe ha n’ihe ọbụla pụrụ iyi egwu megide udo nke ọhanaeze.
Ndụmọdụ a na-abịa n’ihi otu onyonyoo na-efegharị ugbua nke nwaamadị aha ya bụ Martins Vincent Otse a maara dịka Verydarkblackman (VDM) wepụtara, bụ nke ruru ndị uweojii aka n’ubọchị Satọde 24 Mee 2025.
Na ya bụ onyonyoo, a nụrụ ka Martins na-eyi egwu na ya ga-eduru ndị ngagharịiwe gaa n’ụlọorụ NAFDAC dị n’Anambra steeti.
Ikenga kọwara na omume NAFDAC bụ nke dabara na ntụziaka Gọọmenti Naịjirịa nyere ka e kpochapụ ọgwụ na ihe oriri ndị enweghị akara ndebanyeaha, ndị nke mebiri emebi, ndị a machiri amachi, ndị erughị ogogo a chọrọ, ndị bụ adịgboroja, ndị e ji ụzọ aghụghọ tụbata na ndị nke bụ ọgwụike n’ime ahịa ọgwụ atọ a ma ama na Naịjirịa, nke Anambra steeti bụ otu n’ime ha.
Ndị uweojii kwuru na ha emeela ka mkpesa ndị na-azụ ahịa ruo ụlọọrụ NAFDAC ntị dịka a tụrụ anya na ha ga-ama ihe ha ga-eme.
Ikenga kpughere na mkparịtaụka ndị uweojii na ndị ndu ahịa nwere chọpụtara na ọ bụ ụfọdụ ndị na-atụ mgbere n’ahịa ahụ na-akpali Verydarkblackman dịka ndị ndu ahịa gọpụrụ onwe ha n’atụmatụ ahụ ma kwe nkwa ịgbakọrọ ụlọorụ ndị kwesịrị ekwesị aka iji chọpụta ndị aka ha dị na ya.
Ndị uweojii anwụchiela di na nwunye na-atụ mgbere ụmụaka, napụta ụmụtakịrị 12 n'Abịa steeti

Ebe foto si, Abia State Police Command
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abịa steeti bụ Maureen Chinaka ekwuola na ndị ọrụ ha nwụchiri di na nwunye hibere ụlọ ụmụ na-enweghị nne na nna nke iwu akwadoghị n’okporoụzọ Ikot Ekpene dị n’Aba.
Chinaka kwuru na ndị ọrụ ha nwụchiri Blessing Emebo dị afọ iri anọ na itoolu na di ya bụ Sunday Emebo dị afọ iri anọ na abụọ dabere n’ozi dị mkpa ha nwetara n’ụbọchị 19 Mee 2025.
Dịka Chinaka siri kwuo, a chọtara ụmụaka iri na abụọ dị n’agbata ọnwa abụọ na afọ iri na anọ si n’ọnụmara dị iche iche n’Arọchukwu n’aka di na nwunye ahụ.
Ka ọ dị ugbua, e nyefeela ha bụ ụmụaka n’aka Mịnịstrị na-ahụ maka ụmụnwaanyị, ebe ndị uweojii malitere ime nnyocha.
Ndị uweojii kwuru na di na nwunye ahụ na-azara ọnụ ha ugbua na ngalaba ndị uweojii na-ahụ maka mpụ na omekome bụ CID dị n’Ụmụahịa ma kwuo na a ga-akpụpụ ha n’ụlọikpe oge e mechara nnyocha.
Aha ụmụaka ndị ahụ ndị uweojii napụtara gụnyere:
Ojiugo Caleb 'nwoke' dị afọ iri na anọ
Samuel okoro 'nwoke' dị afọ iri na atọ
Christian okoro 'nwoke' dị afọ iri na abụọ
Godwin Emmanuel 'nwoke' dị afọ iri
Clinton Nkemakolam 'nwoke' dị afọ itoolu
Ogechi Nkemakolam 'nwaanyị' dị afọ itoolu
Chinaza Okoro 'nwaanyị' dị afọ itoolu
David Emmanuel 'nwoke' dị afọ asaa
Anointing Okoro 'nwaanyị' dị afọ asaa
Osinachi Nkemakolam 'nwoke' dị afọ isii
Marvelous Emmanuel 'nwoke' dị afọ ise
Testimony Emebo 'nwoke' dị ọnwa abụọ
Ogbunigwe Izrel tụrụ na Gaza egbuola ọtụtụ ndị gbabara n’ụlọakwụkwọ

Ebe foto si, Reuters
E gbuola opekatampe ndị Palestine iri ise na anọ n’oge Izrel siri n’elu tụọ ogbunigwe na Gaza n’ime abalị.
Ndịisi ụlọọgwụ mere ka BBC News mata na ọtụtụ n’ime ndị e gburu bụ ndị gbabara n’ụlọakwụkwọ izere ndụ ha.
Ụlọakwụkwọ Fahmi Al-Jargawi dị na Gaza bụ nke ọtụtụ mmadụ si mpaghara Beit Lahia nọ na ya na-ezere ndụ ha n’ihi mwakpo ndịagha Izrel na-eme n’obodo ha.
Mana ugbua, e gbuola opekatampe mmadụ iri atọ na ise oge ogbunigwe tụtara ụlọakwụkwọ ahụ.
Ụlọọrụ Civil Defence dị na Gaza ndị otu Hamas na-elekọta kwuru na ha ebutela ọtụtụ ozu mmadụ gụnyere ụmụaka.
Ha sị na ọkụ ọjọọ gbara ọtụtụ n’ime ha oge ụlọ ọmụmụ ihe abụọ ha jiri mere ụlọ obibi gbara ọkụ.
Ndịagha Izrel kwuru na ha lekwasara anya n’ụlọọrụ ndị otu Hamas na ndịagha Jihad dị n’ebe ahụ mee ya bụ mwakpo.
Anyị nyochapụtara ogige a na-arụ ogbunigwe n'Anambra Steeti - Ndị uweojii

Ebe foto si, Anambra State Police Command
Ndị uweojii Anambra Steeti ekwuola na ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndịuweojii, ndịagha na ndị nche ọdịnala nyochapụtara ma mebie ogige ebe a na-arụpụta ogbunigwe dị n’obodo Isseke nke okpuruọchịchị Ihiala n’Anambra Steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steetị ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru na wuchiri n’ọgige ahụ n’ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Mee, ma chọpụta ọtụtụ akụrụngwa dị iche iche e ji arụ ogbunigwe.
Ọ gara n’ihu kwuo na ogige ahụ bụ otu n’ime ebe ndị otu chọrọ mnwereonwe Biafra gbara ezi mgbọrọgwụ ma na-akpa ike kamgbe afọ abụọ gara aga.
Ọ kwuru na “ọ dị mkpa ịmata na otu n’ime ogbunigwe ndị ahụ gbawara mgbe anyị wakporo ebe ahụ ma mebie okporoụzọ. Ogbunigwe bụ ihe ndị ekperima a ji gbochie ụzọ ka ndị ọrụ nchekwa ghara ịbata n’ogige ha. Onweghi onye nwụrụ n’oge nwakpo ahụ.”
Ikenga kwuru na dị ka ọ dị ugbua, na ndị ọrụ nchekwa ewerela ọnọdụ n’ogige ahụ.
Trump akpọọla Putin ‘onye ara’ maka mwakpo kachasị ibe Rọshịa mere na Yukren

Ebe foto si, Getty Images/Reuters
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na “obi adịghị ya mma” n’ebe ogbo ya nke Rọshịa bụ Vladimir Putin nọ maka mwakpo kachasị ibe nke mba Rọshịa wakporo Yukren.
N’okwu nkatọ Trump wepụtara: “Kedụ ihe mere ya? Ọ na-egbusi ọtụtụ mmadụ.” O mechara kpọọ Putin “ezigbote onye ara”.
Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky dị na mbụ kwuo na “nkịtị” mba Amerịka gbara mba Rọshịa na-akwado Putin, ma rịọ ka “akwanye ya ọkụ” – gụnyere mmachi siri ike nye mba ahụ.
E gburu ihe karịrị mmadụ iri na abụọ ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ n’ụbọchị Sọnde, mgbe Rọshịa tụrụ ogbunigwe ruru 367 - ọnụọgụgụ kachasị kwa otu abalị kamgbe Putin malite ịwakpo Yukren n’afọ 2022.
Opi na-egbu n’elu na-ada n’ọtụtụ ebe na mba Yukren n’ụtụtụ Mọnde iji dọọ ndị mmadụ aka ntị maka ogbunigwe.
Ihe karịrị mmadụ atọ, gụnyere nwata, merụrụ ahụ na mpaghara Ugwu nke obodo Kharkiv, dịka Onyeisi obodo bụ Terekhov si kwuo.
Na mpaghara Zaporizhzhia, mmadụ abụọ merụrụ ahụ dọka Onyeisi ha bụ Ivan Fedorov si kwuo.
Igbo ọma ndị hụrụ ụzọ
Udo dịrị gị n'izuụka ọhụrụ. Ihe ọma ọbụla ị na-achọ ga-eru gị aka.
Biko, jisie ike nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo n'izuụka ọhụrụ maka akụkọ ndị hiri odo na Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa.
Daalụ!
Ndị uweojii anwụchiela ọtụtụ ndị na-eyi ọha egwu n’Imo steeti

Ebe foto si, Imo State Police Command
Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela ọtụtụ ndị ekperima gụnyere ndị oji egbe ezu ohi, ndị ntọ, ndị ogbuu mmadụ, ndị na-edina nwaanyị n'ike, ndị na-anabata ihe e zuru ezu nakwa ndị oyi ọha egwu.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye mere ka anyị mata nke a n’ozi o wepụtara n’ụbọchị Sọnde 25 Mee 2025.

Ebe foto si, Imo State Police Command
Ndi uweojii kwuru na oge ha nwuchiri ọtụtụ mmadụ ahụ rụrụ 147, a napụtara ha ngwa ọgụ dị iche iche na akwụkwọ ego Biafra.
Okoye si na e jidere ndị ọjọọ ahụ na mpaghara Umuaka dị n’okpuru ọchịchị Njaba n’Imo steeti.

Ebe foto si, Imo State Police Command
Dịka Okoye siri kwuo, ndị ha nwụchiri gụnyere Ozioma Ihedoro dị afọ iri atọ na asaa ma bụrụkwa nwadibịa tinyere Chinonso Anayo a na-etu Pablo dị afọ iri abụọ na anọ, Emmanuel John dị afọ iri abụọ na otu nakwa Ifeanyi John dị afọ iri abụọ, ndị bụcha ụmụafọ Isiagu dị n’Ebonyi steeti.

Ebe foto si, Imo State Police Command

Ebe foto si, Imo State Police Command
Ndị ojiegbe agbaala Fada egbe na Benue steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ojiegbe agbaala ụkọchukwu Katọlik egbe n’okporoụzọ si Markurdi gawa Naka na Benue steeti.
Onye Chancellor na-elekọta Dayọsis Makurdi bụ Shima Ukpanya kpughere nke a n’otu ozi o wepụtara ma kpọọ oku ka onye niile tinye Fada ahụ a gbara egbe n’ekpere dịka ndị dọkịta na-agbalị ịzọpụta ndụ ya.
Ụkọchukwu ahụ aha ya bụ Rev. Fr. Solomon Atongo bụ onye ndị ojiegbe wakporo n’abalị Satọde 24 Mee 2025.
Akụkọ anyị nwetara kwuru na Fada Atongo bụ ụkọchukwu na-elekọta St. John’s Quasi Parish dị na Jimba.
E buuru ya gaa ụlọọgwụ ozugbo e mechara ya mwakpo ahụ mana ọnọdụ ya dị ezigbo njọ n’oge ahụ.
E kwuru na Fada Atongo na mmadụ abụọ ndị ọzọ nọ oge ndị ekperima ahụ wakporo ya. Oge ha gbachara ya egbe chee na ọ nwụọla, ha kpọọrọ mmadụ abụọ ndị nke ọzọ gawa ebe amaghị.
Ka o sinadị, enwebeghị ihe ndị uweojii Benue steeti kwuru gbasara ọnọdụ a.
Ịmaaka English Premier League ga-akụrụ ọnụ n’ụbọchị Sọnde

Ebe foto si, Getty Images
A ga-achịkọta ịmaaka English Premier League n’ụbọchị Sọnde 25 Mee 2025 site n’asọmpi iri ga-agụnye otu iri abụọ a ga-ahazi otu mgbe.
Ya bụ ịmaaka malitere n’ụbọchị 16 Ọgọst 2024 ma ka ọ dị ugbua, a haziela asọmpi narị atọ na iri asaa dịka otu egwu bọọlụ dị iche iche sụnyere ọkpụ goolu otu puku na iri itoolu na otu.
Mohamed Salah nke otu egwu bọọlụ Liverpool bụ ya kachasị sụnye ọkpụ goolu site na goolu iri abụọ na asatọ ọ sụnyere n’ịmaaka ahụ.
Otu egwu bọọlụ Liverpool enwetelarịị mmerị nke iri abụọ ha n’afọ a, nke bụkwa ugboro ole Manchester United mabutere iko ahụ.
Dịka ihe siri kwụrụ ugbua, otu egwu bọọlụ atọ gụnyere Leicester City, Ipswich Town na Southampton ga-enye ohere n’ịmaaka English Premier League.
Ihe fọdụrụ ugbua bụ otu egwu bọọlụ ndị ga-anọchite anya Ịngland n’ịmaaka Champions League, Europa League na Conference League.
Otu egwu bọọlụ Liverpool na Arsenal etozuola oke maka ịmaaka Champions League tinyekwara ndị mabutere iko Europe League bụ Tottenham.
Ugbua, ọ bụ naanị ohere atọ fọdụrụ na Premier League maka otu egwu bọọlụ ndị ga-aga ịmaaka Champions League.
Ogbunigwe Rọshịa tụrụ na Yukren egbuola ihe ruru mmadụ 12

Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Otu nwoke na-ekiri ụlọ ogbunigwe ndị Rọshịa gbariri n'obodo Kyiv mba Yukren Opekatampe egbuola ihe ruru mmadụ iri na abụọ ebe ọtụtụ ndị merụrụ ahụ n’ogbunigwe mba Rọshịa tụrụ na mba Yukren n’ime abalị dịka ndị ọrụ si kwuo.
E gburu ụmụaka atọ n’obodo Zhytomyr dị na mpaghara Kyiv, gbuo otu nwoke gbara afọ iri asaa n’obodo Mykolaiv, ka ndị ọrụ gbata gbata si kwuo.
Mwakpo a na-abịa n’ime otu ụbọchị e mechara mwakpo kaịrị ibe ya n’isiobodo Yukren bụ Kyiv kamgbe mba Rọshịa malitere ịwakpo Yukren.
Mwakpo a mere n’ụbọchị Satọde, e gburu mmadụ iri na atọ na-agbanyeghi mkparịtaụka a na-enwe ka a kwụsị agha, nke gụnyere ịgbanwerịta ndị mkpọrọ mana Rọshịa emetọọla oku a na-akpọ ka a kwụsị ịkwarịta mgbọ.
Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ
Ekpere anyị bụ ka ihe ọma rute gị aka n'ụbọchị ụka a.
Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ anyị n'izu a ọhụrụ.
Daalụ!
Ndịagha Izrel egbuola ụmụ itoolu nke dọkịta Gaza - Ụlọọgwụ kwuru

Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndị ikwu na-eru uju maka ndị nke ha nwụrụ na mwakpo Izrel n’ụlọọgwụ Nasser dị n’obodo Khan Yunis Ogbunigwe ndịagha Izrel tụrụ na Gaza egbuola ụmụ itoolu n’ime ụmụ iri nke otu dọkịta dịka ụlọọgwụ ọ na-arụ ọrụ n’obodo Khan Younis siri kwuo.
Ụlọọgwụ ahụ a kpọrọ Nasser kwuru na otu n’ime ụmụaka dọkịta Alaa al-Najjar na dị ya merụrụ ahụ, mana ha dị ndụ mgbe ogbunigwe ahụ dara n’ụlọ ha.
Graeme Groom, bụ dọkịta na-awa ahụ nke si mba Briten na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ ahụ, kwuru na ọ wara nwa nwoke dọkịta ahụ dị afọ iri na otu (11) dị ndụ, ahụ.
Oto ihe onyonyo onyeisi mịnịstrị ahụike nke ndị Hamas nke ụlọ mgbasa ozi BBC nyochara, gosiri obere ozu gbara ọkụ ka a na-ebuli elu site na mkpọmkpọ ebe a a wakporo na Khan Younis n’ụbọchị Fraịde.
Ụlọ mgbasa ozi BBC agakwurula ndịagha Izrel maka ịza ajụjụ banyere mwakpo ahụ.
Na nkwupụta ha nyere ọha mmadụ na Satọde, ndịagha nchekwa Izrel (IDF) kwuru na ha gbagburu ihe karịrị 100 n'ofe Gaza n'ụbọchị gara aga.
Mana ndị mịnịstrị ahụike kwuru na ndịagha Izrel egbuola ihe dịka mmadụ iri asaa na anọ n’otu ụbọchị bọrọ Satọde.
