Hamas ekwela ịtọhapụ mmadụ iri ha ji ma chọọ nkwụsị agha na-adịgide na nzaghachi mba Amerịka

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Mee 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Indịa eboola Pakịstan ebubo imetọ nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ ha nwere ugboro ugboro

    Ndị ntaakụkọ BBC nọ na Kashmir, kwuru na ha nụrụ ụda ogbunigwe n’ebe ahụ mana enweghị onye ma ebe o si.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị ntaakụkọ BBC nọ na Kashmir, kwuru na ha nụrụ ụda ogbunigwe n’ebe ahụ mana enweghị onye ma ebe o si.

    Indịa eboola Pakịstan ebubo imetọ nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ dị n’etiti mba abụọ ugboro ugboro ma kwuo na ndịagha ha ga-azaghachi agwa Pakịstan n’oge na-adịghị anya.

    Praịm Mịnịsta Pakịstan Shebaz Sharif oge ọ gwara ndị obodo ya okwu, kwuru na nkwekọrịta ahụ bụ maka ọdịmma mba abụọ ahụ mana o kwughị ihe ọbụla banyere ebubo ahụ India boro ha.

    Ndị ntaakụkọ BBC nọ na Kashmir, kwuru na ha nụrụ ụda ogbunigwe n’ebe ahụ mana enweghị onye ma ebe o si.

    N’ime izuụka a, India wakporo ọtụtụ ebe na Pakịstan iji zaghachi mwakpo ha kwuru na Pakịstan wakporo na Pahalgam n’ọnwa Eprel 2025, mana Islamabad kwuru na aka ha adịghị na mwakpo ahụ.

    Mpaghara Kashmir nke India na-elekọta, enweela ọtụtụ mwakpo ọtụtụ afọ gara aga nke gburu ọtụtụ mmadụ. Mana India na Pakịstan na-azọ mpaghara Kashmir.

  2. Indịa na Pakịstan ekwekọrịtala nkwụsị ọgụ mgbe mwakpo ụbọchị ole gafere

    Indịa na Pakịstan ekwekọrịtala nkwụsị ọgụ
    Nkọwa foto, Indịa na Pakịstan ekwekọrịtala nkwụsị ọgụ

    Indịa na Paskịstan ekwekọrịtala nkwụsị ọgụ ga-amalite ozugbu mgbe ọ kụrụ elekere ise nke mgbede n’oge nke mba ahụ.

    Indịa kwuru na ha kwenyere n’atụmatụ nkwụsị ịkwa mgbọ ahụ mana ndịagha ha ga-anọgide "n’ịmụ anya", ebe Pakịstan kwuru na ha ga na-agba mbọ iwete udo na nchekwa na mpaghara ahụ.

    Onyeisiala Donald Trump kwuru na nkwekọrịta nkwụsị ọgụ ahụ sitere n’ogologo mkparịtaụka ha nwere n’abalị pụtara taa. Nke a ga-egosipụta Onyeisiala Trump dịka onye ome udo nke mba ụwa niile.

    Cheta na Indịa tụrụ ogbunigwe n’obodo Kashmir nke mba Paskịstan na-achị na mmalite izu a iji megwara ajọ mwakpo ndịagha nnupụisi mere na Pahalgam n’ọnwa gara agbanyeghị n’otu Islamabad gọnarịrị n’aka ha adịghị na ya.

    Chetakwa na Kashmir nke ndị Indịa na-achị ahụla ọgbaghara ruru ọtụtụ iri afọ nke gburu ọtụtụ puku mmadụ.

    Indịa na Pakịstan na-ekwu na Kashmir bụ nke ha n’ozuzu oke.

  3. Yurop na Amerịka chọrọ ka Onyeisiala Putin kwenye na nkwụsị agha Yukren nke ụbọchị 30 – Starmer

    Mgbe ndị isi mba dị na Yurop nwere nzukọ na Yukren

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mgbe ndị isi mba dị na Yurop nwere nzukọ na Yukren

    Praịm minista mba UK Keir Starmer ekwuola na Yurop na Amerịka ga-akpọ Onyeisiala Putin ka mba Rọshịa kwenye na nkwụsị agha Yukren nke ụbọchị 30.

    Praịm minista Starmer na ndị isi mba dị na Yurop gụnyere Volodymyr Zelensky, Emmanuel Macron, Friedrich Merz na Donald Tusk kwupụtara nke a mgbe ha gwara ndị ntaakụkọ okwu na mba Yukren.

    Mgbe ndị isi ahụ mechara nzukọ, ha gara n’ihu kwuo na ha ga-akpọ Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump oku ka ha kparịtaụka maka nkwụsịtụ agha Yukren site n’ụbọchị Mọnde izu ọzọ.

    Cheta na mba Rọshịa kwuru site n’ọnụ onye na-ekwuchitere ha Dmitry Peskov na mba ndị na-akwado Yukren ga-akwụsị inye ha ngwaagha tupu ya na Yukren enwe nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ.

    N’agbanyeghị na ndị isi a ma ama na Yurop bịara na Yukren itinye ọnụ n’okwu a, oghere Rọshịa na Yukren inwe nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ siri ezigbo ike ugbua.

    Chetakwa na mba Rọshịa jụrụ atụmatụ nkwụsị ịkwa mgbọ nke ụbọchị 30 mba Amerịka nyere ha n’ọnwa Maachị dịka Onyeisiala Putin wepụtara ọtụtụ ọnọdụ iji kwenye na ya.

  4. Saụt Afrịka katọrọ atụmatụ mba Amerịka ịnabata ndị ọcha Afrịka dịka ndị gbara ọsọ ndụ

    Saụt Afrịka katọrọ atụmatụ mba Amerịka ịnabata ndị ọcha Afrịka dịka ndị gbara ọsọ ndụ

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Saụt Afrịka katọrọ atụmatụ mba Amerịka ịnabata ndị ọcha Afrịka dịka ndị gbara ọsọ ndụ

    Saụt Afrịka akatọọla mba Amerịka dịka akụkọ kwuru na ha chọrọ ịnabata ndị ọcha si Saụt Afrịka dịka ndị gbara ọsọ ndụ na mbido izu ọzọ.

    Akwụkwọ ụlọ mgbasa ozi CBS ya na BBC na-arụkọ ọrụ na-akọwa mweghachi a dịka "ihe dị mkpa" n’ọchịchị Onyeisiala Donald Trump, agbanyeghị n’obi ọchịchị mba Amerịka bụ White House ekwenyebeghị n'ihu ọha oge nke a ga-abụ.

    Ozi mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi na Saụt Afrịka na-ekwu na ọ bụ ihe ndọrọndọrọ ọchịchị nke ewepụtara imebi ọchịchị onye kwuo uche ya nke mba Saụt Afrịka.

    Cheta na Onyeisiala Trump kọwaara ndị ọchị si mba Saụt Afrịka dịka ndị ọdachi “ikpa oke agbụrụ” metụtara n'usoro iwu o wepụtara n’ọnwa Febụwarị 2025, nke na-egosi na mba Amerịka nwereike ibigharịa ndị ahụ n’Amerịka.

  5. Starmer esorola ndị ndu mbaụwa gaa Yukren iji gwa Rọshịa ka ha kwụsị ịkwa mgbọ

    Starmer esorola ndị ndu mbaụwa gaa Yukren iji gwa Rọshịa ka ha kwụsị ịkwa mgbọ

    Ebe foto si, EPA

    Praịm Minista mba United Kingdom bụ Keir Stamer, Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron, Praịm Minista mba Poland bụ Donald Tusk na Chancellor mba Jamini bụ Friedrich Merz awuchiela isi obodo Yukren bụ Kyiv maka nzukọ ha na-akwado inwe iji kpọọ oku ka a kwụsị ịkwa mgbọ n’agha dị n’etiti Rọshịa na Yukren.

    N’ozi ha jikọtara aka bipụta, ndị ndu ahụ kwuru na ha “ga-akwanye Rọshịa ọkụ n’ahụ” dịkwa ka ha “dị njikere ịkwado mkparịtaụka udo”.

    Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky kwuru n’ụbọchị Fraịde na “e kwesịrị ijide Rọshịa maka mwakpo ha gara n’ihu na-eme”.

    Ọ bịara dịka otu mkpụrụ ụbọchị gara Rọshịa hazichara emume mmerị maka agha ụwa nke abụọ na Mosko, dịka ụbọchị Satọde ga-abụ ụbọchị ikpeazụ nke nkwụsị ịkwa mgbọ ụbọchị atọ onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin jiri aka ya kwupụta.

  6. Indịa na Pakịstan na-eborịta onwe ha ebubo ịtụ ogbunigwe n’ogige ndịagha ha

    Indịa na Pakịstan na-eborita onwe ha ebubo ịtụ ogbunigwe n’ogige ndịagha ha

    Ebe foto si, Getty Images

    Indịa ekwuola na Pakịstan tụrụ ogbunigwe n’ogige ndịagha ha n’ime elekere ole na ole Pakịstan boro mba ahụ ebubo ịtụ ogbunigwe n’ogige ndịagha elu ha atọ.

    Ndịagha Indịa na-ebo Pakịstan ebubo “imefe ihe oke” na “ịkpali iwe” ebe ndịagha Pakịstan kwuru na ha ebibiela usoro nchekwa S-400 nke mba Indịa.

    Mana ndị ọchịchị na Delhi apụtala kọwaa nke ahụ dịka nnukwu asị.

    Na mmalite izuụka a, Indịa tụrụ ogbunigwe n’ụfọdụ ebe ndị ha bu n’obi na Pakịstan tinyekwara Kashmir nke Pakịstan na-elekọta.

    Ha mere nke ahụ iji megwara mwakpo ọjọọ ndịagha mere n’ogige nlegharịanya dị na mpaghara Pahalgam n’ọnwa gara aga, bụ nke Islamabad kwuru na aka ha adịghị na ya.

    Mba abụọ ahụ na-eborita onwe ha ebubo ịtụ ogbunigwe na iji droonu eme mwakpo kemgbe ndịagha Indịa malitere ibu agha.

    Puku kwuru puku mmadụ anwụọla n’ihi ọnọdụ enweghị nchekwa dị na mpaghara Kashmir nke Indịa na-alekọta kemgbe ọtụtụ afọ.

    Indịa na Pakịstan na-ekwu na Kashmir bụ nke ha.

  7. Ndị ọma, ụnụ asaala chi, Ọfọ anyị taa bụ ndụ mmiri, ndụ azụ. Mmiri atala ma azụ anwụla.

    Abọ ekele ka anyị na-ebutere gị maka isonyere ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde Orie 10 Mee, 2025.

    Chinonso Ugorji awuchiela n'ụtụtụ a iwetere gị akụkọ niile na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile mana Uzoamaka Ewuzie na Michael Ngene ga-emecha sonyere ya.

    Daalụ maka ịnọnyere anyị taa.

  8. Ụlọọrụ JAMB ewepụtala mpụtara ule 2025

    JAMB ewepụtala rịzọlt ule 2025

    Ebe foto si, JAMB/Facebook

    Nkọwa foto, JAMB ewepụtala rịzọlt ule 2025

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ule ụmụakwụkwọ ji abanye mahadum na Naịjirịa bụ Joint Admissions and Matriculation Board (JAMB) ewepụtala rịzọlt ule nke afọ 2025 ụmụakwụkwọ dere ihe dịka otu izu ụka gara aga.

    Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Ọkammụta Ishaq Oloyede, kwupụtara nke a n'isi ụlọọrụ ahụ dị n’Abụja n'ọgbakọ iji egosi ọha rịzọlt ule nke afọ a.

    Ụlọọrụ ahụ kwuru na ha jidere rịzọlt ụmụakwụkwọ dị puku iri atọ na itoolu, narị asatọ na iri atọ na anọ (39,834), bụ ndị ha kwuru na ha ga-enyocha maka ebubo nrụrụaka n'ule, na ihe dịka ụmụakwụkwọ iri asatọ bụ ndị a na-ebo ebubo mpụ metụtara ule, ebe steeti Anambra na-ebute ụzọ.

    Ndị ụlọọrụ ahụ kwukwara na n'ime ụmụakwụkwọ 2,030,862 debara aha maka ule a, n’ihe dịka mmadụ 71,705 enweghị ike ide ule ahụ n’afọ a.

  9. Amerịka akwadola atụmatụ iji ụlọọrụ nzuzo enyefe ihe enyemaka na Gaza

    Amerịka akwadola atụmatụ iji ụlọọrụ nzuzo enyefe ihe enyemaka na Gaza
    Nkọwa foto, Amerịka akwadola atụmatụ iji ụlọọrụ nzuzo enyefe ihe enyemaka na Gaza

    Agbanyeghị mkpu ụlọọrụ UN, mba Amerịka akwadola atụmatụ iji ụlọọrụ nzuzo enyefe ihe enyemaka mmadụ na Gaza dịka mba Izrel na-aga n’ihu egbochi ihe enyemaka mmadụ ịbanye na Gaza.

    Onye nnọchiteanya mba Amerịka n’Izrel Mike Huckabee kwuru na ndị ọrụ nchekwa na-elekọta ebe a na-eke ihe enyemaka, nke ga-abụ ebe esi enye ọtụtụ nde mmadụ nri na ihe ndị ọzọ, iji a gba mbọ ahụ na ndị Hamas anaghị ezu ihe enyemaka ndị ahụ.

    Ọ gọnarịrị na mba Izrel agaghị esonye na-eke ihe enyemaka mmadụ ndị a dịka ndị ọrụ nchekwa ha ga-agba mbọ ichekwa ogige ebe ndị ahụ.

    Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ UN kwughachiri na ha agaghị akwado nke a n'ihi ikesa ngwaagha na ụdị ihe enyemaka.

    "Anyị agaghị etinye aka," onye na-ekwuchitere ụlọọrụ UN nke na-ahụ maka ihe enyemaka mmadụ “Office for Coordination of Humanitarian Affairs (OCHA),” Jens Laerke, gwara BBC na Geneva.

    O kwuru na ha achọghị ịkwado usoro nke na-emegide òtù ọ bụla na-akwado ọrụ enyemaka.

    Cheta na kemgbe Maachị ka mba Izrel malitere igbochie ihe enyemaka mmadụ ịbanye Gaza nke gụnyere nri, ọgwụ, mmanụ ụgbọala na ụlọ nke kpalitere nsogbu ihe enyemaka mmadụ megịde mmadụ nde abụọ na otu narị bi na mba ahụ.

  10. Popu Leo akpọọla oku ka ụka megide enweghị okwukwe n’ụka Mass mbụ ya na Vatịkan

    Popu Leo

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mgbe Popu Leo na-aka ụka Mass mbụ ya na Vatịkan

    Popu ọhụrụ, Leo XIV, akpọọla oku ka ụka ​​Katọlik megide enweghị okwukwe n’ụka Mass mbụ ya na Vatịkan.

    Mgbe ọ na-ekwu okwu n’ụbọchị na-esote ụbọchị a họpụtara ya dịka Popu nke 267 na onye ndu nke ụka Katọlik mbụ si mba Amerịka, ọ dọrọ aka ná ntị na ndị mmadụ na-atụgharị n'okwukwe kama ọtụtụ ihe gụnyere "nkànaụzụ, ego, ihe ịga nke ọma, ike, maọbụ ihe ụtọ".

    Leo kwuru na a họpụtara ya ka ọ bụrụ "onye nchịkwa kwesịrị ntụkwasị obi" nke ụka nke ga-arụ ọrụ dịka "ọkụ nke na-enye ìhè n’ọchịchịrị abalị dị n’ụwa a".

    Ndị Katọlik ruru ijeri 1.4 n'ụwa niile na-eme emume maka nrịgoro n’ọkwa nke Robert Francis Prevost dịka Popu ọhụrụ, dịka oke ọñụ na-aga n’ihu n’ala nna ya bụ Amerịka na mba Peru, ebe ọ jere ozi afọ iri abụọ.

    Pope Leo dị afọ 69, yi uwe mwụda ọcha nke a kpara ọla edo ka ọ na-agwa ndị Kadịnal nọ ọdụ na Sistine Chapel okwu.

    N'okwuchukwu ya n’ụbọchị Fraịde Mee 9, Pope ọhụrụ ahụ kwuru na enwere ọtụtụ ntọala ebe a na-ewere okwukwe Ndị Kraịst dịka "ihe efu" – gụnyere ọnọdụ ebe ike, akụnaụba, na teknụzụ na-achị - mana ọ bụ ebe ndị ahụ ka a chọrọ ka ụka na-agbasa ozi ọma.

  11. Amerịka akwụsịla enyemaka na mba Zambịa maka izu ohi ọgwụ

    Amerịka akwụsịla enyemaka na mba Zambịa maka izu ohi ọgwụ

    Ebe foto si, US embassy in Zambia/Facebook

    Nkọwa foto, Amerịka akwụsịla enyemaka na mba Zambịa maka izu ohi ọgwụ

    Mba Amerịka ekwupụtala na ha ga-akwụsị enyemaka ego ruru nde dọla iri ise $50m (£37m) ha na-enye mịnịstrị ahụike na mba Zambịa n’ihi na mba ahụ emeghị ihe ọbụla gbasara "usoro ohi" nke ọgwụ enyere dịka ihe onyinye.

    Onye nnọchiteanya Onyeisiala mba Amerịka na Zambịa Michael Gonzales kwuru na ha nwere mkpebi a dịka ha dọrọ aka na ntị ugboro ugboro ka gọọmentị Zambịa mee ihe banyere nchekwa ọgwụ ewepụtara maka ndị ọrịa na-adịghị ike na mba ahụ.

    Ọ gbakwụnyere na mba Amerịka adịkwaghị njikere itinye ego na-aka ndị nrụrụaka mgbe ndị ọrịa na-enweghị ego na-aga n’ihu na-azọpụta ọgwụ eji azọ ndụ nke mba Amerịka nyere n'efu.

    Gọọmentị Zambịa kwuru na ya emeela ọtụtụ ihe iji kwụsị ya bụ ihe.

    N’aka nke ọzọ, minista na-ahụ maka ahụike Elijah Muchima kelere mba Amerịka maka “nkwado mmesapụ aka” ya, ma gaa n’ihu na-ekwu na nsogbu nke izu ohi ọgwụ bu gọọmentị ugbu a weghaara ọchịchị na 2021, ụzọ.

  12. Ndị nchekwa akatọọla mwakpo e mere n’okporoụzọ Okigwe

    Ndị nchekwa akatọọla mwakpo e mere n’okporoụzọ Okigwe

    Ebe foto si, Imo Police Command

    Ụlọọrụ ndị uweojii n’Imo steeti na njikọaka ha na ndịagha, ndị DSS na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ amalitela ịchọ ndị omekome a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu IPOB/ESN.

    Ha bụ ndị ekperima wakporo ndị na-eme njem n’okporoụzọ siri Okigwe gawa Owere n’ụzọ ụtụtụ Tọzde 8 Mee, 2025.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye mere ka anyị mata na ndị ekperima ahụ kere onwe ha ụzọ atọ ma mechie okporoụzọ dị n’agbata Umunna dị n’okpuru ọchịchị Onuimo na ụfọdụ akụkụ okpuru ọchịchị Okigwe mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere ise nke ụtụtụ.

    Okoye kọwara na ha bụ ndị ekperima gbara egbe aghara aghara ma mụnye ụgbọala dị iche iche gụnyere trọọkụ na ụfọdụ ọgbaatumtum ọkụ.

    O kwukwara na ndị ekperima ahụ butere ọnọdụ ọgbaaghara ma gbuo ụfọdụ mmadụ n’oge ahụ ha mere mwakpo.

    N’ozi o wepụtara, Okoye kwuru na kọmịshọna ndị uweojii n’Imo steeti bụ Aboki Danjuma duuru ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa dị iche iche gaa na mpaghara ahụ, nyere ndị nwetara mmerụahụ aka ma malitekwa ime nnyocha miri emi iji nweeike nwụchie ndị aka ha dị na mwakpo ahụ.

    N’otu aka ahụ, ụfọdụ mmadụ eboola ebubo na ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi wakporo ma tọrọ ụfọdụ ndị na-eme njem n’okporoụzọ si Owere gawa Aba.

    N’ihe onyonyoo fesara ebe niile, a hụrụ ka ndị mmadụ na-ekwu na e gburu ụfọdụ mmadụ ma tọrọ ndị ọzọ oge ndị ekperima a na-enyo enyo mere ya bụ mwakpo n’okpuru ọchịchị Ngor Okpala.

    Ka o si nadị, anyị ka na-eche ka ndị uweojii na ndị ọchịchị Imo steeti kwuo okwu gbasara ọnọdụ ahụ.

  13. Ndị ndu na mbaụwa ekeleela Popu Leo XIV

    Ndị ndu na mbaụwa ekeleela Popu Leo XIV

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ndu mba dị iche iche nakwa otu okpukperechi e nwere na mbaụwa ezigarala Popu Leo XIV a họpụtara ọhụrụ ozi ekele ha.

    Robert Prevost bụ Ụkọchukwu Katọlik mbụ si North Amerịka a na-ahọpụta dịka Popu.

    Prevost a mụrụ na Chịkago bụ onye a hụtara dịka onye na-eweta mgbanwe ma bụrụkwa onye gara ozi ọma ọtụtụ afọ na mba Peru tupu e chie ya archbishọpụ ebe ahụ.

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump akọwaala ya dịka “nnukwu nkwanyeugwu” inwe Popu si mba Amerịka.

    N’ụbọchị Fraịde na-abịa abịa, Popu ọhụrụ na ndị kadịnalụ họpụtara ya ga-edo maasị n’ụlọekpere Sistine Chapel.

  14. Ọhanaeze nwe mmadụ, ụnụ abọọla chi, Ka ụbọchị taa maara onye niile mma

    Obi aṅụrị ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ụbọchị taa bụ Fraịde Eke 9 Mee, 2025.

    N'ụtụtụ a, ọ bụ Chinonso Ugorji ga-ewetere gị akụkọ niile na-akpọtụ n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    N'oge ehihie, Uzoamaka Ewuzie na Michael Ngene ga-esonyere ya.

    Onye ọma, biko gaa n'ihu nọnyere anyị taa.

  15. Oge anwụrụ ọkụ ọcha pụtara iji gosi na a họpụtala Popu ọhụrụ

    Aha onyonyo, Robert Prevost gbara afọ 69.
  16. Ihe Trump na Starmer kwuru maka Popu ọhụrụ

    Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka na Keir Starmer

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka na Keir Starmer

    Ọtụtụ ndị isiala mbaụwa etoola ma kọwaa nhọpụta Popu Leo XIV dịka ihe ukwuu.

    Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka kwuru na ọ bụ ihe nkwanye ùgwù na Popu ọhụrụ a sị mba Amerịka.

    Praịm Mịnista UK bụ Keir Starmer kọwara nhọpụta a dịka ihe oké ọñụ nye ndị ụka Katọlik na mba UK nakwa n'ụwa niile. Starmer kwuru na ọ na-atụ anya izute Popu Leo XIV iji hụ na e wulite mmekọ dị n'etiti ụka Katọlik na mba UK.

  17. Okwu mbụ Popu Leo XIV gwara ndị gbakọrọ na Vatịkan

    Oge Popu Leo XIV na-agwa ndị Ụka Katọlik gbakọrọ na Vatịkan okwu mbụ ya dịka Popu ọhụrụ.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Oge Popu Leo XIV na-agwa ndị Ụka Katọlik gbakọrọ na Vatịkan okwu mbụ ya dịka Popu ọhụrụ.

    'Udo dịrị unu' bụ okwu mbụ Popu Leo XIV dịka onyeisi ọhụrụ ụka Katọlik na mba ụwa.

    Ọ gara n'ihu kwuo kwanyere Popu Francis lara mmụọ ugwu ma gwa ohanaeze gbakọrọ ebe ahụ ka onye ọbụla nyere ibe ya aka ma wulite udo na ịdị n'otu.

    Oge Popu Leo XIV na-agwa ndị Ụka Katọlik gbakọrọ na Vatịkan okwu mbụ ya dịka Popu ọhụrụ.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Oge Popu Leo XIV na-agwa ndị Ụka Katọlik gbakọrọ na Vatịkan okwu mbụ ya dịka Popu ọhụrụ.
    Oge Popu Leo XIV na-agwa ndị Ụka Katọlik gbakọrọ na Vatịkan okwu mbụ ya dịka Popu ọhụrụ.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Oge Popu Leo XIV na-agwa ndị Ụka Katọlik gbakọrọ na Vatịkan okwu mbụ ya dịka Popu ọhụrụ.
    Oge Popu Leo XIV na-agwa ndị Ụka Katọlik gbakọrọ na Vatịkan okwu mbụ ya dịka Popu ọhụrụ.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Oge Popu Leo XIV na-agwa ndị Ụka Katọlik gbakọrọ na Vatịkan okwu mbụ ya dịka Popu ọhụrụ.
  18. A họpụtala Robert Prevost dịka Popu ọhụrụ Ụka Katọlik.

    Aha a ga-eji mara ya bụ Popu Leo XIV.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Aha a ga-eji mara ya bụ Popu Leo XIV.

    Robert Prevost abụrụla Popu ọhụrụ Ụka Katọlik na mbaụwa niile.

    Robert Prevost gbara afọ 69.

    Aha a ga-eji mara ya bụ Popu Leo XIV.

    A họpụtara ya dịka anwụrụ ọcha pụtara ihe n'ebe ndị Kadịnal na-atụ vootu iji họpụta Popu ọhụrụ na Vatịkan.

    Nke a na-egosi na ụka katọlik enwetala Popu ọhụrụ bụ onye ga-anọchi anya Popu Francis nwụrụ n'ụbọchị Easter Mọnde 21 Eprel, 2025 dịka ọ gbara afọ 88.

    Ụka katọlik enwetala Popu ọhụrụ dịka anwụrụ ọcha pụtara na Vatịkan
    Nkọwa foto, Ụka katọlik enwetala Popu ọhụrụ dịka anwụrụ ọcha pụtara na Vatịkan

    Akụkọ kwuru na nke a mere ka ọtụtụ ndị ụka katọlik gbakọrọ n’ogige St Peter were malite inwe oke aṅụrị.

    Akụkọ gara n’ihu kwuo na-amatabeghị aha onye bụ Popu ọhụrụ ugbua – mana a na-atụ anya na Popu ọhụru ahụ ga-apụta na mbara ogige St Peter n’oge na-adịghị anya.

    Kadịnal dị elu ga-akwado mkpebi ahụ n'oge na-adịghị anya site n'okwu ndị a "Habemus Papam" – nke pụtara "anyị nwere Pope" na Latin.

    Ọ ga-aga n’ihu igosi ndị mmadụ Popu ọhụrụ ahụ ma kwupụta aha ya.

    Ụka katọlik enwetala Popu ọhụrụ

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ụka katọlik enwetala Popu ọhụrụ
    Ụka katọlik enwetala Popu ọhụrụ

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ụka katọlik enwetala Popu ọhụrụ
  19. APGA ga-akwado Onyeisiala Tinubu na 2027 - Gọvanọ Chukwuma Soludo

    Bola Tinubu
    Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu

    Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo ekwela nkwa na otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressive Grand Alliance (APGA) ga-akwado Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu na ntuliaka 2027.

    Chukwuma Soludo mere ka a mata nke a n'oge Onyeisiala Bola Tinubu bịara njem igbape ọtụtụ ihe Soludo rụrụ n'Anambra Steetị.

    Bola Tinubu
    Nkọwa foto, Onyeisiala Naíjiría bụ Bola Tinubu

    N'okwu Soludo "n'afọ 2014/2015 mgbe a zọrọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa, APGA kwuru na ha na-akwado Onyeisiala n'oge ahụ".

    "Ihe m na-agwa gị bụ na ntọnaala ahụ agbanwebeghị. N'afọ 2027, APGA ga-akwado gị".

    Soludo gara n'ihu gwa Onyeisiala Naịjirịa atụmatụ ọrụ mmepe obodo nke gọọmenti etiti wepụtara mana mpaghara Saụt East esoghị rite erere na ya bụ nke Tinubu kwere nkwa na ọ ga-agbanwe.

  20. Ihe Onyeisiala Tinubu kwuru gbasara idemmiri oge a nabatara ya n'Anambra

    Gọvanọ Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo na Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu

    Ebe foto si, X/@PBATMediacenter

    Nkọwa foto, Gọvanọ Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo na Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu

    Gọvanọ Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo anabatara Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu maka na steeti ahụ.

    Gọvanọ Soludo nabatara Tinubu n’emume ịgbape ọrụ dị icheiche ọ rụrụ na steeti ahụ.

    Onyeisiala Tinubu gbapekwara ngaraba agụmaakwụkwọ “Emeka Anyaoku Institute of International studies and Diplomacy” dị na mahadum Nnamdi Azikiwe, n’Awka, Anambra steeti.

    Ihe ndị ọzọ onyeisiala Naịjirịa kpapere gunyere Solution Funcity bụ nke Anambra Country club, Family Fun House, water Park ma ebe egwuriegwu (Amusement park) dị na ya.