Rọshịa esila n'ikuku wakpoo isi obodo Yukren

Ebe foto si, Getty Images
Ihe dịka mmadụ iri na anọ (14) emirụọla ahụ dịka mba Rọshịa tụrụ ogbunigwe ma jiri duronu wakpoo Kyiv, isi obodo Yukren, ndị ọchịchị kwuru.
Ha kọwara na Rọshịa tụrụ duronu ruru narị abụọ na iri ise (250) na ogbunigwe dị iri na anọ n’obodo Kyvi nke kpalitere ọkụ ọgbụgba n’ụlọ ebe ndị mmadụ bi.
Nke a bụ mbuso agha ikuku kachasị ukwu nke e busoro obodo Kyiv kemgbe agha malitere mana ndịagha ikuku Yukren kwuru na ha gbaturu ogbunigwe isii na duronu narị abụọ na iri anọ na ise (245).
Onyeisiala mba Yukren Volodymyr Zelensky kwuru n’akara X yana mwakpo ndị a na-egosi n’ihe na-akpata ịgbatị agha ahụ ogologo nọ n’aka mba Rọshịa.
Zelensky gara n’ihu kwuo na ọ bụ nanị mmachi ezubere imegide akụkụ ndị dị mkpa nke akụ na ụba Rọshịa nwereike ime ka Rọshịa kwenye na nkwụsị ọkụ.
Cheta na mba Rọshịa na Yukren kwekọrịtara ịgbanwe ndị mkpọrọ mgbe ndị nnọchiteanya mba abụọ ahụ mkparịtaụka na Tọọkị.
N'izu gara aga, Rọshịa kwuru na Yukren tụrụ ọtụtụ narị duronu ndị na-agbawa agbawa na mba ha, gụnyere mwakpo n’isi obodo Rọshịa bụ Moscow.
Minista na-ahụ maka nchekwa na Rọshịa kwuru na ha gbaturu duronu ruru 485.

























