Hamas ekwela ịtọhapụ mmadụ iri ha ji ma chọọ nkwụsị agha na-adịgide na nzaghachi mba Amerịka

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Mee 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Otu onye anwụọla ebe mmadụ isii merụrụ ahụ n'ihi mmanụ ọkụ "gas" tiwara n'ahịa Anambra

    Otu onye anwụọla ebe mmadụ isii merụrụ ahụ n'ihi mmanụ ọkụ "gas" tiwara n'ahịa Anambra

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Otu onye anwụọla ebe mmadụ isii merụrụ ahụ n'ihi mmanụ ọkụ "gas" tiwara n'ahịa Anambra

    Ndị uweojii ekwuola na otu onye nwụrụ ebe mmadụ isii ndị ọzọ merụrụ ahụ dịka mmanụ ọkụ “gas” tiwara n’ahịa ọgbọ osisi dị nso n’Ọnịsha Bridge Head dị n’Anambara steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ihe mberede ahụ mere n’ụbọchị Fraịde 16 Mee 2025, mgbe onye welda ji karbide arụ ọrụ n’ígwè.

    Ikenga kwuru na ndị uweojii ngalaba Ọnịsha Head Bridge tinyere aka site na-esonyere ndị na-anapụta ndị ahụ ntiwa mmanụ ọkụ “gas” merụrụ ahụ.

    O kwuru na nnyocha mbụ gosiri na onye welda na-arụ n’ígwè mgbe silinda gas ya tiwara n'ihi oke okpomọkụ.

    O kwuru na mmadụ isii ndị ahụ a napụtara n’ihe mberede ahụ na-enwete neleta n’ụlọọgwụ ugbua dịka e tinyere onye nwụrụ anwụ n’ọba ozu.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ndị uweojii emeela ihe iji chekwaa ebe ahụ ma gbochie ndị na-achọ iji ohere na ọnọdụ ahụ eme mpụ.

  2. A wụchiela onye bụbu praịm minista Chad n'ihi ebubo ịkpali ọgụ gburu ọtụtụ mmadụ

    Succès Masra

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Succès Masra bụ onye ama ama na-akatọ Onyeisiala Mahamat Déby

    Onye ọkaiwu ọha kwuru na a wụchiela onye bụbu praịm minista na mba Chad nke bụkwa onye ndu otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị mmegide, Succès Masra maka ebubo mkpalite ọgụ mere n’ụbọchị Wenezde 14 Mee 2025 na mpaghara ndịda ọdịda anyanwụ nke mba ahụ.

    Oumar Mahamat Kedelaye kwuru na a na-enyo Masra enyo na ọ bụ ya kesara ozi asị na soshal midịa nke kpalitere ọgụ nke ihe ruru mmadụ iri anọ na abụọ (42) nwụrụ na ya.

    Ndị otu Masra's Transformers pati kwuru na ndị ọrụ agha tọọrọ ya n'isi ụtụtụ ma katọọ njide ya, bụ nke ha kwuru na e mere ya n’ụzọ abụghị usoro ikpe ama ama.

    Masra bụ onye ama ama na-akatọ Onyeisiala Mahamat Déby bụkwa onye kwuru na ọ bụ ya meriri na ntuliaka mba ahụ mere n’afọ gara aga.

    Agbanyeghị na Onyeisiala Déby jiri pacentị 61% were merie, Masra boro ebubo na e zuru mmeri ya “n’aka ndị mmadụ”.

    Ọgụ Wenezde ahụ malitere n’obodo Mandakao nọ na mpaghara Logone Occidental dị nso n’okeala mba ahụ na Kameroon.

  3. Izrel amalitela nnukwu mwakpo maka 'jide na ịchịkwa' mpaghara Gaza

    Izrel amalitela nnukwu mwakpo maka 'jide na ịchịkwa' mpaghara Gaza

    Ebe foto si, Anadolu/Getty Images

    Nkọwa foto, Izrel amalitela nnukwu mwakpo maka 'jide na ịchịkwa' mpaghara Gaza

    Ndịagha mba Izrel ekwupụtala mmalite nke nnukwu mwakpo iji merie ndị Hamas ma nwete nnwere onwe nke ndị ejidere na Gaza.

    Ndịagha nchekwa Izrel kwuru n’akara Hebrew X ya na ha achịkọtala ndịagha maka ọrụ pụrụ iche a kpọrọ "Operation Gideon's Chariots" iji weghara akụkụ dị mkpa nke mba ahụ.

    Ndị nchekwa obodo nke Hamas na-achị na mịnịstrị ahụike kwuru na mba Izrel egbuola ihe ruru mmadụ 250 kemgbe ụbọchị Tụzde 15 Mee 2025.

    Cheta na mba Izrel malitere igbochi ihe enyemaka mmadụ ịbanye Gaza kemgbe nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ dị n’etiti mba abụọ ahụ kwụsịrị n’ọnwa Maachị.

    Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump kwuru na ụbọchị Fraịde n’ọtụtụ mmadụ nọ n’agụụ na Gaza.

    Ọzọ, ndịagha mba Izrel kpọrọ ọrụ ndịagha ya na Gaza aha ọzọ n’akara X nke asụsụ bekee, mana ha kwuru na ọrụ ahụ agaghị akwụsị ma ruo mgbe otu Hamas abụghịzi ihe iyi egwu, na ndị niile e jidere erute n'ụlọ ha.

    Izrel na-aga n’ihu ịtụ ogbunigwe ya ma ikwado agha ndịagha na-ebu n'akụkụ okeala ya na Gaza n'agbanyeghị nrụgide mba ụwa na oku a na-akpọ ka ha maliteghachi mkparịtaụka nkwụsị ọgụ na nkwụsị mgbochi ya.

    Mmalite mwakpo a na-egosi na mbọ niile adaala.

  4. A tọhapụla Ali Bongo na ezinaụlọ ya

    A tọhapụla Ali Bongo na ezinaụlọ ya

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Gabọn a chụpụrụ n’ọkwa oge e nwere nkwatu ọchịchị n’afọ 2023 bụ Ali Bongo ahapụla obodo ya gaa Angola.

    Obi ọchịchị mba Angola kwuputara nke a n’ozi ha wepụtara na soshal midịa ma gbakwunye na a tọhapụla ezinaụlọ Bongo n’agbụ dịka ha nọ na Luanda ugbua.

    Ọkaiwu ezinaụlọ Bongo bụ François Zimeray nabatara ntọhapụ nwaamadị ahụ ma katọọ “mkpọro arụrụala a tụrụ ha”.

    Nwunye Bongo na nwa ha nwoke bụ Sylvia na Noureddin bụ ndị e boro ebubo nrụrụaka, bụ nke mere e jiri jichie ha kemgbe afọ 2023.

    Ha agwabeghị ọhanaeze okwu gbasara ebubo ndị ahụ kama Zimeray kọwara ndị ọ na-ekwuchitere ọnụ dịka ndị “e mekpara ahụ” oge e jichiri ha n’ihe ọ kọwara dịka mkpọrọ okpuruala.

    Zimeray kwuru na “Sylvia na Noureddin Bongo ga-enwezi ohere ugbua ịtụgharị ọnọdụ ha, gbakee ma hazigharịa ndụ ha”.

    BBC akpọtụrụla obi ọchịchị Gabọn ka ha kwuo okwu gbasara ntọhapụ ahụ nakwa ezinaụlọ Bongo gawara mba Angola.

    Ndị ọchịchị ahụ anọrọla n’oge mbụ kwuo na ha emesoghị Sylvia Bongo na nwa ya nwoke omume ọjọọ.

    Ka o sinadị, Ọkaiwu na-ekpe ha ikpe bụ Eddy Minang kwuru na ntọhapụ nwunye Bongo na nwa ha nwoke bụ nke agaghị egbu oge n’ihi na e mere ya maka ọnọdụ ahụike ha na-esichaghị ike.

    O kwuru na ikpe a na-ekpe mmadụ abụọ ahụ ga-aga n’ihu.

  5. E kwuru na ogbunigwe Rọshịa tụrụ na Yukren egbuola mmadụ itoolu

    E kwuru na ogbunigwe Rọshịa tụrụ na Yukren egbuola mmadụ itoolu

    Ebe foto si, Sumy regional military administration

    Ndị ọchịchị kwuru na mmadụ itoolu anwụọla site n’ogbunigwe mba Rọshịa jiri dronu tụọ n’ụgbọala bọọsụ bu ndị mmadụ na mgbagougwu-owuwaanyanwụ mba Yukren.

    Ọchịchị ndịagha nke mpaghara Sumy kwuru na mmadụ anọ ndị ọzọ merụrụ ahụ n’obodo Bilopillya n’ụtụtụ Satọde.

    Ndị ọrụ ahụike, ndị ọrụ gbatagbata na ndị uweojii awuchiela na mpaghara ahụ dịka ha malitere ilebara ya bụ ọnọdụ anya.

    Mwakpo ahụ a na-ekwu maka ya bụ nke e mere oge Rọshịa na Yukren nwechara mkparịtaụka ihu na ihu nke mbụ ha maka udo kemgbe afọ 2022.

    N’ozi ha wepụtara n’ọbaozi Instagram, ọchịchị ndịagha Sumy kwuru sị: “N’ihi dronu ndị iro a tụrụ n’ụgbọala bọọsụ bu ndị njem n’akụkụ Bilopillya, mmadụ itoolu nwụrụ ma anọ ndị ọzọ merụrụ ahụ.”

    Ọ gbakwunyere na ụgbọala bọọsụ ahụ bụ nke nọ n’ụzọ na-aga isi obodo mpaghara ahụ bụ Sumy.

    N’ozi o ji onyonyoo gbasaa, Onyeisi mpaghara Sumy bụ Oleh Hryhorov kọwara mwakpo ahụ Rọshịa mere dịka “nke ndị obi tara mmiri”.

  6. Ụmụ Igbo, ụnụ asaala chi, Ka ụbọchị taa maara onye niile mma

    Anyị ji obiụtọ anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ụbọchị taa.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị maka akụkọ niile mere n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka na ụwa dum gbaa gburugburu.

  7. Ndị ọrụ Yukren na Rọshịa na-ezukọ maka mkparịtaụka ihu na ihu nke mbụ n'afọ atọ

    Ndị ọrụ Yukren na Rọshịa na-ezukọ maka mkparịtaụka ihu na ihu nke mbụ n'afọ atọ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ Yukren na Rọshịa na-ezukọ maka mkparịtaụka ihu na ihu nke mbụ n'afọ atọ

    Ndị ọrụ mba Yukren na mba Rọshịa amalitela nzukọ maka mkparịtaụka ihu na ihu nke mbụ kemgbe 2022 agha mba abụọ ahụ malitere.

    Nzukọ ahụ nke na-aga n’ihu n’isi obodo Tọkị bụ Istanbul, nwekwara ndị ọrụ mba Tọkị gụnyere minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi Hakan Fidan bụ ndị kwadoro mkparịtaụka udo ahụ.

    Onye ntaakụkọ BBC Vitaliy Shevchenko kwuru na mba Rọshịa na Yukren nwereike ịnọkọ n’otu ime ụlọ, mana ebumnauche ha abụọ ga-adịkwa iche iche.

    Cheta na Onyeisiala mba Yukren Volodymyr Zelensky kpọrọ oku maka “mmeghachi omume siri ike” ma ọ bụrụ na mba abụọ ahụ e nweghị nkwekọrịta maka nkwụsị ọgụ site na mkparịtaụka a.

    Mana Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump kwuru na ya chọrọ ka ya na Onyeisiala Putin nwee nzukọ n’oge adịghị anya dịka odeakwụkwọ mba Amerịka Marco Rubio kwuru na igbu mmadụ kwesiri ịkwụsị dịka ya na ndị ọrụ mba Tọkị nwere nzukọ n’Instanbul.

  8. Ndị uweojii amalitela nnyocha maka ọnwụ mmadụ abụọ a wakporo n’Anambara steeti

    Kọmishọna ndị uweojii n'Anambara steeti Ikioye Orutugu

    Ebe foto si, Anambra State Police Command

    Nkọwa foto, Kọmishọna ndị uweojii n'Anambara steeti Ikioye Orutugu

    Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na ha amalitela ime nnyocha maka ọnwụ mmadụ abụọ na na merụahụ onye ọzọ a wakporo n’Anambra steeti.

    N’ozi ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga wepụtara kwuru na Kọmishọna ndị uweojii Ikioye Orutugu na ndị isi ndị ọzọ gara n’ebe ajọ ihe ahụ mere n’obodo Egbebelu Nanka dị n’okpuru ọchịchị Orumba Nọt n’ụbọchị Tọzde 15 Mee 2025.

    O kwuru na ndị a maghị aha ha ji ọgba tum tum na egbe gburu mmadụ abụọ nke otu n’ime ha bụ onye ọkaiwu nke akụkọ kwuru na o nwetere mgbapụta nke onye eboro ebubo n’ikpe igbu ọchụ n’ụlọikpe ukwu dị n’Ekwulobia.

    Ikenga kwuru na nnyocha mbụ ndị uweojii mere na-egosi na a wakporo ndị ahụ mgbe ha si n’ụlọikpe na-alọta, ebe ndị omempụ sitere chụrụ ha ma jide ha.

    O kwuru na otu onye n’ime ndị ahụ dị ndu dịka ọ na-anata nleta n’ụlọ ọgwụ. Ọ gara n’ihu inye ndị uweojii ozi ga-enyere aka ịchọpụta, ya na i jide ndị ahụ kpara ajọ akwa ahụ.

    Ikenga kwuru na ezinaụlọ ndị nwụrụ anwụ a gaala hụrụ ndị nke ha dịka ndị uweojii nwetere otu ụgbọala Toyota Camry na-acha ụhie na-ebe ahụ ihe ahụ mere, mana a na-ele anya na ọ bụ otu n’ime ndị nwụrụ anwụ nwee ya.

  9. Mmadụ 50 anwụọla dịka ndị Palestine kwuru na mba Izrel tụrụ ogbunigwe n’ugwu Gaza

    Ndị Palestine na-agbapụ ọsọ ndụ dịka mwakpo ndị Izrel na-akawanye njọ na Gaza

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị Palestine na-agbapụ ọsọ ndụ dịka mwakpo ndị Izrel na-akawanye njọ na Gaza

    Ndị nchekwa obodo nke Hamas na-ahụ maka ya kwuru na e gbuola ihe ruru mmadụ iri ise (50) dịka mba Izrel wakporo mpaghara ugwu na Gaza.

    Ndị Palestine bi na mpaghara ugwu nke Gaza kwuru na mba Izrel amalitela isi n’ikuku na mmiri were wakpoo ha n’ụtụtụ ụbọchị Fraịde 16 Mee 2025, mana ndịagha mba Izrel ekwubeghị ihe ọbụla banyere nke a.

    Ndị bi n’obodo ahụ kwuru na mwakpo ahụ sitere n’ebe niile na-abịa nke gụnyere ụgbọmmiri agha, ogbunigwe si n’ikuku etiwapụ, na iji tankị agha akwa mgbọ.

    Mgbe ndị Palestine na-agbapụ ọsọ ndụ dịka mwakpo ndị Izrel na-akawanye njọ na Gaza

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mgbe ndị Palestine na-agbapụ ọsọ ndụ dịka mwakpo ndị Izrel na-akawanye njọ na Gaza

    Onye ntaakụkọ anyị na Gaza Rushdi Abualouf kwuru na nke a bụ mwakpo ala kachasị ukwuu na mgbago ugwu Gaza kemgbe Izrel maliteghachiri mwakpo ya na mbido Maachị 2025.

    N’aka nke ọzọ, Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump kwuru na ọtụtụ mmadụ nọ n’agụụ na Gaza ma kwe nkwa na mba Amerịka ga-elebara nke a anya.

    Cheta na mba Izrel na-aga n’ihu na-egbochi ihe enyemaka mmadụ ọbụla gụnyere nri, ọgwụ na ihe ndị ọzọ ịbanye na Gaza kemgbe izu iri.

    Chetakwa na ndị nchekwa obodo nke Hamas kwuru na e gburu ihe karịrị mmadụ otu narị na iri abụọ (120) na Gaza n’ihi mwakpo mba Izrel na Tọzde 15 Mee 2025.

    Agbanyeghị nke a, mkparịtaụka nkwụsị ịkwa mgbọ na ịtọhapụ ndị eji eji n’etiti mba Izrel na Hamas na-aga n’ihu na Kataa mana ha e nwebeghị nkwekọrịta ọbụla.

  10. Trump ekwuola na ọ chọrọ izute Putin dịka mkparịtaụka udo n'etiti mba Rọshịa na Yukren na-amalite n'Istanbul

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ chọrọ ka ya na onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin nwee nzụkọ n’oge adịghị anya dịka a na-atụ anya ịmalite mkparịtaụka udo n’etiti Rọshịa na Yukren na Istanbul isi obodo Tọkị.

    Trump kwuru ụbọchị Tọzde 15 Mee, 2025 na ya na Putin kwesịrị izute iji mee ka mkparịtaụka ahụ mịta mkpụrụ.

    Mba Tọkị bụ mb ana-ahazi mkparịtaụka udo a, na-agba mbọ iji hụ na Yukren na Rọshịa nwere nkwekọrịta.

  11. Odeakwụkwọ gọọmenti Amerịka Marco Rubio anwụchiela Istanbul maka mkparịtaụka udo na Yukren

    Mkparịtaụka dị n’etiti Yukren na Rọshịa bụ nke e kwesiri ime ụbọchị Tọzde 15 Mee, 2025 na Istanbulu.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mkparịtaụka dị n’etiti Yukren na Rọshịa bụ nke e kwesiri ime ụbọchị Tọzde 15 Mee, 2025 na Istanbulu.

    Odeakwụkwọ gọọmenti Amerịka bụ Marco Rubio anwụchiela Istanbul maka mkparịtaụka iweta udo na Yukren. Nke a na-abịa dịka ọ gwara ndị ntaakụkọ na o nweghị olileanya na mkparịtaụka ahụ ga-amịta mkpụrụ ọbụla.

    Akụkọ kwuru na Rubio kwesiri izute ndị ọchịchị mba Yukren na Tọkị ụbọchị Tọzde mana o kwuru ọ bụ naanị nzukọ Onyeisiala Trump na Onyeisiala Putin ga-eme ka mkparịtaụka ọbụla mịta mkpụrụ.

    Cheta na Onyeisiala Trump na-eme njem abalị anọ na mpaghara etiti ọwụwa anyanwụ mana o doghị anya na ọ ga-aga Tọkị.

    Onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky kwuru na ọ ga-eziga minista ya na-ahụ maka nchekwa ka ọ nọchiteanya ya na mkparịtaụka ahụ.

  12. Ụtụtụ ọma ndị anyị ji eme ọnụ.

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Nkwọ Fraịde 16, Mee 2025.

    Ọfọ anyị na-agọrọ gị na ezinaụlọ gị bụ ije awele n'ọpụpụ gị na mbata gị.

    Sonyere akara soshal midia anyị maka akụkọ foto na vidio anyị na-ewetara gị taa.

    Daalụ nụ.

  13. Zelensky ekwuola na Rọshịa achọghị udo dịka minista na-ahụ maka nchekwa ga-anọchite anya ya na mkparịtaụka udo

    Mkparịtaụka dị n’etiti Yukren na Rọshịa bụ nke e kwesiri ime taa bụ Tọzde 15 Mee, 2025 na Istanbulu. Zelensky agwala onyeisiala Rọshịa Vladimir Putin ka ọ bịa mkparịtaụka ahụ.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mkparịtaụka dị n’etiti Yukren na Rọshịa bụ nke e kwesiri ime taa bụ Tọzde 15 Mee, 2025 na Istanbulu. Zelensky agwala onyeisiala Rọshịa Vladimir Putin ka ọ bịa mkparịtaụka ahụ.

    Onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky ekwuola na ọ ga-eziga mịnịsta ya na-ahụ maka nchekwa ka ọ nọchiteanya ya mkparịtaụka udo ha n amba Roshịa ga-enwe n’Istanbulu isi obodo Tọki.

    Mana Zelensky kwuru na Rọshịa adịghị njikere inwe mkparịtaụka iweta udo.

    Oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu na Ankara, Zelensky kwuru na ọ ga-eziga minista ya na mkaprịtaụka ahụ iji kwanyere onyeisiala Tọki Recep Tayyip Erdogan na onyeisiala Amerịka Donald Trump ugwu.

    Mkparịtaụka dị n’etiti Yukren na Rọshịa bụ nke e kwesiri ime taa bụ Tọzde 15 Mee, 2025 na Istanbulu. Zelensky agwala onyeisiala Rọshịa Vladimir Putin ka ọ bịa mkparịtaụka ahụ.

    Ka o doro anya na Onyeisiala Putin abịaghị mkparịtaụka ahụ, Onyeisiala Zelensky boro ya ebubo ma kwuo na ọ dịghị njikere maka udo.

    Na nzaghachi, mịnịstrị mba Rọshịa na-ahụ maka mmekọ mba ofesi kpọrọ Zelensky onye iberibe na onye angahị enwe mmeri

    Ka ọ dị ugbua, Onyeisiala Trump na-achị Amerịka kwuru na ọ dị mkpa ka Zelensky na Putin zute onwe iji hụ na e nwetara udo n’etiti mba Yukren na Rọshịa.

  14. Ụlọomeiwu nta ekwuola ka e hibe otu ebe a na-ede ule Jamb “CBT Centre” n’okpuru ọchịchị ọbụla

    Onyeisi ụlọomeiwu nta Tajudeen Abbas

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisi ụlọomeiwu nta Tajudeen Abbas

    Ụlọomeiwu nta nke Naịjirịa ekwuola ka e hibe ihe dịka otu ebe a na-ede ule computer-based testing (CBT) nke ụmụakwụkwọ ji abanye mahadum n’okpuru ọchịchị 774 dị n’obodo Naịjirịa.

    Ndị omeiwu nwere nkwekọrịta a n’ọgbakọ ha nwere n’ụbọchị Tụzde 15 Mee 2025 nke na-esochi nkwenye ụlọọrụ Joint Admissions and Matriculation Board (JAMB) banyere ọdachi dakwasiri ule Jamb nke afọ 2025.

    Dịka ndị omeiwu siri kwuo, nke a bụ maka iji akwụsị ụdị ihe mere n’ule nke afọ a ghara ime ọzọ.

    Ụlọomeiwu kpọkwara oku ka obi ndị mmadụ dị jụụ n'ihi nnabata Jamb n’ọdachi mere n’ule afọ 2025.

    Cheta na ụlọomeiwu Sinetị kpebiri n'ọnwa gara aga, na a ga-amapụta ego a ga-eji iguzobe CBT n’okpuru ọchịchị 774 nke Naịjirịa na bọjịt nke afọ 2026 .

  15. Ogbunigwe mba Izrel tụrụ egbuola mmadụ 100 na Gaza

    Ogbunigwe mba Izrel tụrụ egbuola mmadụ 100 na Gaza

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ogbunigwe mba Izrel tụrụ egbuola mmadụ 100 na Gaza

    Ụlọọrụ nchekwa obodo nke Hamas ekwuola na mba Izrel tụrụ ogbunigwe gburu ihe dịka mmadụ otu narị (100) na Gaza kemgbe ime abalị dịka ha dọrọ aka ntị maka agụụ.

    Nke a na-eme dịka mba Izrel na-aga n’ihu na-egbochi ihe enyemaka mmadụ ka ọ ghara ịbanye na Gaza.

    Cheta na ụlọọrụ iri na-ahụ maka enyemaka mmadụ ekwuola na ọnọdụ enyemaka na-akanyewa njọ na Gaza.

    Ogbunigwe mba Izrel tụrụ egbuola mmadụ 100 na Gaza
    Nkọwa foto, Ogbunigwe mba Izrel tụrụ egbuola mmadụ 100 na Gaza

    Otu nwoke gwara ụlọ mgbasa ozi BBC na ya anaghị emegharị ahụ nke ọma n’ihi oke agụụ, mana otu onye ọrụ enyemaka mmadụ n’obodo Gaza kwuru na nrị dị ụkọ nke mere ụmụaka jiri gbaa egwu mgbe ha natachara ngwugwu nri.

    Cheta na Hamas wakporo mba Izrel n’abalị asaa nke ọnwa Ọktoba n’afọ 2023, nke a gburu ihe dịka mmadụ ruru otu puku na narị abụọ (1,200) ma jide mmadụ 251.

    N’aka nke ọzọ, mịnịstrị ahụike nke ndị Hamas kwuru na agha mmegwara ndịagha mba Izrel egbuola ihe ruru mmadụ 52,829 na Gaza.

  16. Zelensky elutela Turkey, mana Putin agaghị abịa maka mkparịta ụka udo

    Volodymyr Zelensky

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Volodymyr Zelensky

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky elutela mba Turkey maka mkparịta ụka udo n’etiti mba ya na mba Rọshịa bụ nke e nyibere na Turkey.

    Cheta na tupuu ihe agbanwee, ụwa niile na-atụ anya na ọ bụ Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin na nke mba Yekren bụ Volodymyr Zelensky ga-ezute onwe ha ihu na ihu nwee mkparịta ụka udo ahụ.

    Mana mgbe ụgbọelu Onyeisiala mba Yukren bụ Zelensky dara n’ọdọ ụgbọelu Esenboga dị na Ankara, Turkey ka ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu ma kwuo na ya na ndị nnọchịtaanya mba Amerịka bụ ndị ga-eso nwee mkparịta ụka ahụ na-akpa kemgbe.

    Zelensky bụ onye kwuru na ya amaghị ọkwa ndị mba Rọshịa ga-eso mee mkparịtaụka ahụ kwuru na mba Yukren ga-etinye anya n’ihe ọzọ ha ga-eme ma ya na Onyeisiala mba Turkey bụ Recep Tayyip Erdoğan hụchaa.

    Etu ọnọdụ si dị ugbua ndị mba Rọshịa ga-eso nwee mkparịtaụka ahụ gunyere onye enyemaaka Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Medinsky, osote mịnịsta na-ahụ maka mba ofesi bụ Mikhail Galuzin na osote Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa mba ahụ bụ Alexander Fomin.

    Nke a pụtara na Onyeisiala mba Rọshịa bụ Putin agaghị eso bido mkparịta ụka ahụ.

  17. Onyeisiala Trump ekwuola na Amerịka na Qatar enweela nkwekọrịta dịka o toro onyeisiala mba Siria

    Onyeisiala Trump ekwuola na Amerịka na Qatar enweela nkwekọrịta dịka o toro onyeisiala mba Siria

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Trump ekwuola na Amerịka na Qatar enweela nkwekọrịta dịka o toro onyeisiala mba Siria

    Onyeisiala mba Amerika, Donald Trump ekwuputala ọtụtụ nkwekọrịta dị n'etiti mba Amerịka na Qatar, nke gụnyere nke ụgbọelu Boeing, n'abalị abụọ n'ime njem ụbọchị anọ ọ na-eme n’etiti mba ọwụwa anyanwụ

    Tupu Trump agawa Doha, o zutere onyeisiala Syria bụ Ahmed al-Sharaa na Riyadh ma gwa ya ka ọ gbanwee mmekọrịta ya na Izrel.

    Nzukọ a bịara ka Trump wepụrụ mmachi na Siria, ma kwuo na ọ "ga-enye ha ohere ịdị ukwuu"

    O kwụrụ na o nwereike iso na mkparịtaụka udo nke aga-eme na mba Tọki ụbọchị Tọzde, Mee 15, 2025 n’etiti Yukren na Rọshịa, nke Zelensky na Putin nwereike iso na ya.

  18. Lee ihe Donald Trump mere na Saụdị Arabia nke nyere igwe mmadụ obi ụtọ na Damaskus, mba Sịrịa

    Ndị na-enwe anụlị na Damaskus

    Ebe foto si, NurPhoto

    Nkọwa foto, Ndị na-enwe anụlị na Damaskus

    Dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump gara mba Qatar bụ ebe ọ gara njem nleta, ọtụtụ ihe o megoro bụ okwu a kpụ n’ọnụ ugbua.

    Otu n’ihe ọ mere bụ nke butere igwe mmadụ jiri bido na-enwe aṅụlị na Damaskus dị na mba Sirịa.

    Ihe ahụ bụ ịwepụ mmachị mba Amerịka nyere mba Sịrịa kemgbe afọ iri ise garaaga.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, zutere Onyeisiala nchereoge mba Sịrịa bu  Ahmed al-Sharaa

    Ebe foto si, ANADOLU

    Nkọwa foto, Donald Trump na Ahmed al-Sharaa

    Ịwepụ mmachị ahụ Amerịka nyere Sịrịa ga-enyere aka ka mba Turkey nakwa mba Saụdị Arabia nweike nyereaka n’ọrụ mmepe mba Sịrịa nakwa azụmahịa n’etiti mba ahụ dị icheiche.

    Akụkọ kwuru na Donald Trump wepụrụ mmachị ahụ mgbe Mohammed bin Salman nakwa Onyeisiala mba Turkey bụ Tayyip Erdogan nyọrọ ya bịkọ maka ya.

    Ihe nke abụọ nyere ndị mmadụ obi ụtọ na Sịrịa bụ na Donald Trump zutere Onyeisiala nchere oge ha bụ Ahmed al-Sharaa.

    Cheta na mba Amerịka n’oge garaaga manyere ego ruru $10m n’isi Al-Sharaa maka onye ọbụla ga-agbaama ka ha jide ya maka ebubo na e nwere ihe jịkọrọ ya na ndị al-Qaeda.

  19. Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ ndewo

    Anyị ji aka na i hiri ụra ma teta ọfụma n'ụbọchị taa?

    Biko, buru oche bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo ka ị gụọ akụkọ ndị gbapụtara ihe.

  20. Otu ‘council’ na-achị Naịjirịa akwadola ‘Medipool’ iji belata ọnụahịa ọgwụ

    Otu ‘council’ na-achị Naịjirịa akwadola ‘Medipool’ iji belata ọnụahịa ọgwụ

    Ebe foto si, Ali Pate/X

    Gọọmenti Etiti Naịjirịa akwadola atụmatụ ọhụrụ a maara dịka Medipool, bụ nke nwereike ibelata ọnụahịa ọgwụ na ihe ndị ọzọ e ji akwalite ahụike maka ndị Naịjirịa.

    Nke a bụ otu akụkụ mkpebi e nwere n’oge nzukọ otu kansul na-achị Naịjirịa a haziri n’obi ọchịchị n’ụbọchị Mọnde 12 Mee 2025, bụ nke onyeisiala Bola Tinubu nọ n’isi ya.

    Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na nkwalite obodo bụ Ọkankụzi Ali Pate kwuru na Medipool bụ otu na-ejikọta aka zụbata ihe maka ibelata ọnụahịa ma bụrụkwa ndị ga-atụbata ọgwụ ndị dị oke mkpa na ngwa nlekọta ahụike gburugburu Naịjirịa.

    Dịka o siri kwuo, Medipool bụ nke a haziri iji zute oku ndị mmadụ na-akpọ n’ụlọahụike ndị dị nta nakwa ụlọọgwụ ukwu nke gọọmenti etiti.

    Ọ sị na atụmatụ a ga-enyere gọọmenti aka ịgbakwasa ụkwụ n’ikike ịzụbata ngwaahịa n'ebe ọ dị ọtụtụ iji belata ọnụahịa ọgwụ.