Hamas ekwela ịtọhapụ mmadụ iri ha ji ma chọọ nkwụsị agha na-adịgide na nzaghachi mba Amerịka

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Mee 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Mgbochi enyemaka na Gaza bụ mpụ agha – UNRWA

    Mgbochi enyemaka na Gaza bụ mpụ agha – UNRWA

    Ebe foto si, Getty Images

    Onye na-ahụ maka ụlọọrụ na-enyere ndi gbara ọsọ ndụ n'oge agha aka nke a na-akpọ United Nations Relief and Works Agency for Palestine Refugees in the Near East bụ Philippe Lazzarini kwuru na gọọmenti Izrel ji ụkọ nri mere ngwaagha.

    Ọ kwuru na nke a bụ makammachi mba Izrel machiri ibubata nri.

    Onyeisi UN Palestinian Authority gwara BBC na ihe ahụ mba Izrel na-eme na Gaza pụtara mpụ agha.

    Lazzarini kwuru na ike agwụla ndị mmadụ mana ọ bụrụ na e nweghị ihe e mere ngwangwa, agụụ ga-egbu ndị mmadụ n'oge na-adighị anya.

    Ọ kwara akwa arịrị sị na ụwa niile enweghị mmasị n'ihe na-eme ugbua.

    Mana o nwebeghị ihe mba Izrel kwuru banyere ebubo a Lazzaraini boro ha

  2. Akụnaụba Naịjirịa toro ngwangwa karịa ka anyị tụwara anya

    Akụnaụba Naịjirịa toro ngwangwa karịa ka anyị tụwara anya

    Ebe foto si, Bayo Onanuga/X

    Ụlọakụ mbaụwa bụ World Bank ekwuola na akụnaụba Naịjirịa toro ngwangwa karịa ka e siri hụta ya n’ime afọ iri gara aga.

    World Bank kwuru na ihe kpatara nke a bụ atụmatụ mwogharị dị iche iche gọọmenti tinyere mana ha dọrọ aka na ntị na ọnụahịa na-arị elu agaala n’ihu na-emetụta nde kwuru nde mmadụ.

    Nke a dị n’ozi ụlọọrụ ahụ mere ka o ruo ndị ntaakụkọ aka, nke kwuru na nchịkọta ihe niile e mepụtara na Naịjirịa (GDP) jiri pasenti 4.6 gbagoo na nkeji ikpeazụ nke afọ 2024.

    World Bank kwuru na nke a mere ka uto akụnaụba Naịjirịa bụrụ 3.4% - nke kachasị kemgbe afọ 2014.

    Ha kwuru na uto ahụ sitere na ngalaba mmanụ na gaasị tinyekwara mwulite nkanụzụ ọlọrọọhụrụ na ego.

    World Bank kelere ọchịchị Bola Ahmed Tinubu maka itinye atụmatụ mwogharị akụnaụba Naịjirịa kemgbe ọ banyere n’ọkwa n’afọ 2023.

    Ha kwuru na mwogharị ndị ahụ gụnyere iwezuga ego enyemaka mmanụ nakwa mbọ ndị a na-agba itutegharị ikikere ego Naịra.

    Ka o sinadị, ndekọ ahụ kwuru na atụmatụ ndị a etinyela ọtụtụ mmadụ n’ọnọdụ nnukwu ihe isiike ọkachasị ụmụ ogbenye.

  3. E bugaala Taiwo Awoniyi n'ụlọọgwụ maka mmerụ ahụ o nwetere n'afọ

    Taiwo Awoniyi

    Ebe foto si, Nottingham Forest

    A waala nwafọ Naịjirịa na-agbara Nottingham Forest bọọlụ bụ Taiwo Awoniyi afọ n’ihi mmerụ ahụ o nwetere n’asọmpi ha na Leicester City gbara n’ụbọchị Ụka.

    Nke a dị n’ozi otu egwuregwu Nottingham Forest wepụtara n’akara sosha midi ha.

    Ha kwuru na mmadụ niile nọ n’otu egwuregwu a na-ekpere Awoniyi ekpere ka ọ gbakee ngwa ngwa.

    Awoniyi nwetere mmerụ ahụ a dịka ọ gbatịtị ụkwụ ka ọ gbabanye bọọlụ onye otu ya gbaara ya n’ime neetị ndị Leicester City.

    Ọ gara n’ihu na-agba bọọlụ dịka ọ natachara ọtụtụ ọgwụgwọ.

    Mana ndị otu Nottingham Forest chọpụtaziri na Awoniyi merụrụ nnukwu ahụ n’ụbọchị Mọnde nke mere e ji buru ya gawa n’ụlọọgwụ ozugbo.

    Onye nwe otu egwuregwu ahụ bụ Evangelox Marinakis gbarụrụ ihu maka mmerụ ahụ nakwa etu onye nchịkọta ha bụ Nuno Espirito Santos si hapụ ya ka ọ gaa n’ihu n’ịgba bọọlụ mgbe o merụchara ahụ.

  4. A sụrụ otiegwu Tory Lanez mma ugboro 14 n'ụlọmkpọrọ California

    Tory Lanez

    Ebe foto si, Getty Images

    E bugala otiegwu a ma ama bụ Tory Lanez ụlọọgwụ dịka a sụchara mma ugboro iri na anọ n’ụlọmkpọrọ dị na California.

    Nwafọ mba Kanada na-etiegwu hip-hop ka otu onye nọ na mkpọrọ wakporo ya n’ụtụtụ ụbọchị Mọnde n’ụlọ dị n’ime ụlọmkpọrọ California dịka onye ọrụ nchekwa si kọọrọ BBC.

    Nwamadị a dị afọ iri atọ na abụọ nwere ọtụtụ mmerụ ahụ - nke mere ngụngụ ya abụọ jiri kwụsị ịrụ ọrụ dịka ozi e wepụtara n’Instagram ya si kwuo.

    A tụrụ Lanez, onye ezigbo aha ya bụ Daystar Peterson mkpọrọ afọ iri maka ịgba otiegwu ibe ya bụ Megan Thee Stallion egbe n’afọ 2020.

    Ozi si n’Instagram ya kwuru na a sụrụ ya mma n’azụ ọkpụkpụ olu (torse), n’isi, nakwa n’ihu. E tinyeburu ya n’igwe e ji eku ume mana ugbua ọ na-ekuzi ume n’onwe ya.

    “Na-agbanyeghi na ọ nọ n’ahụ mgbu, ọ na-ekwu okwu ọfụma, ma na-ekele Chineke na ọ na-agbake,” ka ozi ha kwuru.

    Mwakpo ahụ mere n’ihe dịka elekere elekere asaa nke ụtụtụ n’oge ndị Amerịka dịka onye ọrụ ụlọmkpọrọ ahụ bụ Pedro Calderón si kwuo.

    Ndị ọrụ ụlọmkpọrọ ahụ buuru ụzọ malite onye Lanez ọgwụgwọ tupu e buru ya gawa n’ụlọọgwụ.

  5. Donald Trump agawala njem nleta na mba Saụdị Arabịa, Qatar, UAE

    Mohammed bin Salman na Donald Trump n’ọdọ ụgbọelu King Khalid airport dị na Riyadh

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mohammed bin Salman na Donald Trump

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ebidola njem nleta na mba Saụdị Arabịa, Qatar na United Arab Emirates.

    Mba atọ ndị a so na mba dị na mpaghara ụwa ‘middle east’ nakwa obodo ndị arakụba nwere nnukwu akụnụba.

    Mohammed bin Salman na Donald Trump

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mohammed bin Salman na Donald Trump

    Ọkpara eze mba Saụdị Arabịa bụ Mohammed bin Salman zutere ma kelee Donald Trump n’ọdọ ụgbọelu King Khalid dị na Riyadh.

    Odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Marco Rubio nọ n’oge Trump na Salman zutere.

  6. Nwafọ mba Isreal na Amerịka ndị Hamas ji ezutela ezinaụlọ ya ka a tọhapụrụ ya

    Alexander na ezinaụlọ ya

    Ebe foto si, IDF

    Nwafọ mba Isreal na Amerịka bụ Edan Alexander nke ndị otu Hamas tọhapụrụ ezutela ezinaụlọ ya kamgbe ọ nọchara ọnwa iri na itoolu n’aka ha.

    Nwamadị a dị afọ iri abụọ na otu bụ onye agha mba Izrel na-echekwa okeala Gaza mgbe ndị otu Hamas tọọrọ ya n’ụbọchị 7 Ọktoba 2023.

    N’ụbọchị Mọnde, ka Izrel kwụsịtụrụ mwakpo ha na-eme na Gaza ruo awa ole ma ole iji hụụ na a tọhapụrụ nwamadị a. Otu onyeisi ndị Hamas gwara BBC na ntọhapụ nwamadị a bụ iji gosi mmasị ha ka e nwee nkwụsị nkwakọrịta mgbọ dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-akwado ịbịa na mpaghara Middle East n’ụbọchị Tuzde.

    A na-eche na Alexander bụ naanị nwafọ mba Amerịka ka fọrọ n’aka ndị Hamas ka dị ndụ.

    Onyeisiala Trump ziteere ezinaụlọ ya “ozi ekele” dịka a tọhapụrụ ya.

    Foto si n’ihe onyonyo TV gosiri la Edan Alexander na-achị ọchị dịka ọ makọrọ nne na nna ya na ụmụnne ya n’ogige ndịagha mba Izrel.

    N’ozi ezinaụlọ ya wepụtara, ha kelere onyeisiala mba Amerịka ma rụọ gọọmentị mba Izrel na ndị otu Hamas ka ha biko nwee nkwekọrịta maka ịtọhapụ mmadụ 58 a ka ji eji.

  7. Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ ndewo nụ ooo!

    Anyị ji aka na i hiri ụra ma teta ọfụma n'ụbọchị taa?

    Ngwa! Buru oche gị bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo ka ị gụọ akụkọ ndị gbapụtara ihe.

    Ndewo!

  8. Ndị mmadụ akatọọla Ganduje maka ịkpọ oku ka Naịjirịa nwee naanị otu pati

    Ndị mmadụ akatọọla Ganduje maka ịkpọ oku ka Naịjirịa nwee naanị otu pati

    Ebe foto si, Aminu Dahiru Ahmed/Facebook

    Ọtụtụ mmadụ agaala n’ihu na-akatọ onyeisi otu All Progressives Congress (APC) bụ Abdullahi Umar Ganduje maka ụfọdụ okwu o kwuru.

    Ganduje kwuru na ọ ga-adị mma ma pati niile e nwere na Naịjirịa bịakọta ọnụ ma banye APC.

    Mana ndị na-agba gọọmenti ụkwụ sịrị na okwu ahụ megidere ọchịchị onye kwuo uche ya.

    Onyeisi otu New Nigeria Peoples Party (NNPP) na Kano steeti bụ Hashim Sulaiman Dungurawa kwuru na ọ tụghị ya n’anya na Ganduje nwereike ikwu ụdị okwu ahụ.

    Dịka o siri kwuo, Ganduje amaghị uru ọchịchị onye kwuo uche ya ma ọ fọdụzie nhibe ọtụtụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị.

    Ọ gbakwunyere na usoro ọchịchị Ganduje chọrọ ka Naịjirịa nabata bụ nke a nabataghị ọbụnadị na mba ndị mepere emepe dịka Amerịka na Brịten.

  9. Ahịa mba Amerịka agbagoola dịka ha na Chaịna kwekọrịtara ibelata ụtụisi ha

    Ahịa mba Amerịka agbagoola dịka ha na Chaịna kwekọrịtara ibelata ụtụisi ha

    Ebe foto si, Reuters

    Ahịa mba Amerịka agbagoola dịka ha na Chaịna kwekọrịtara ibelata ụtụisi ha tinyere na ngwaahịa ha ruo ụbọchị iri itoolu.

    Ka o sinadị, ahịa mbaụwa gbagokwara n’ihi nkwekọrịta ahụ dị n’etiti Washington na Beijing.

    Nke a bụ mbelata ụtụisi kachasị elu kemgbe agha azụmaahịa malitere n’etiti Amerịka na Chaịna.

    Ụtụisi Amerịka tinyere na ngwaahịa si mba Chaịna ga-abụzi 30% ugbua karịa 145% ọ bụbu.

    Ebe ụtụisi Chaịna tinyere na ngwaahịa si mba Amerịka ga-abụzi 10% ugbua karịa 125% ọ bụbu.

  10. ASUU ahọpụtala Ọkammụta Chris Piwuna dịka onyeisi ha ọhụrụ

    Emmanuel Osodeke na Chris Piwuna

    Ebe foto si, ASUU

    Otu jikọtara ndị nkuzi Mahadum na Naịjirịa bụ ASUU n’ịchafụ ahọpụtara onyeisi ha ọhụrụ bụ Ọkammụta Chris Piwuna, nke ngalaba ahụike metụtara ụbụrụ na echiche n’ụlọọgwụ mahadum Jos.

    Piwuna bụ onye nọchiri anya Emmanuel Osodeke rụburu ọrụ dịka osote onyeisi ndị ASUU n’oge gara aga ma bụrụkwa ‘Dean’ na-ahụ maka ọdịmma ụmụakwụkwọ na mahadum Jos.

    A họpụtara onyeisi ọhụrụ a na ntuliaka nke ugboro 23 otu ahụ mere na mahadum Benin nke Edo Steeti n’ụbọchị Sọnde 11 Mee, 2025.

    Ndị zọrọ ọkwa a gụnyere Ọkammụta Piwuna na Ọkammụta Adamu Babayo nke mahadum Abubakar Tafawa Balewa dị na Bauchi Steeti.

    Nhọpụta ya na-abịa dịka kepukepu na-ekwu na ndị nkuzi chọrọ ịgba abụbụọrụ na Naịjirịa n’ihi nsogbu n’okike ego mahadum na-enwete, nakwa etu ndị nkuzi si ahapụ Naịjirịa aga mba ọzọ.

    Ndị ọzọ meriri n’ọkwa gụnyere; Austen Sado bụ osote onyeisi, Peter Adamu bụ onye njikọ ego, Celestine Aguoru, odeakwụkwọ na ndị ọzọ.

    Osodeke nọrọ n’ọchịchị ugbuoro abụọ site n’afọ 2021 ruo 2025.

  11. Amerịka ekwuola na ha na mba Chaịna nwere nkwekọrịta banyere azụmaahịa

    Odeakọ akwụkwọ ego mba Amerịka bụ Scott Bessent na osote Praịm minister mba Chaịna bụ He Lifeng

    Mba Chaịna na Amerịka sị ha enweela ọganihu na mkparịtaụka azụmaahịa ha na-eme na mba Switzaland.

    Odeakọ akwụkwọ ego mba Amerịka bụ Scott Bessent kọwara mkparịtaụka ahụ dịka “ihe mịtaara mkpụrụ ma baa oke uru.” ebe osote Praịm minister mba Chaịna bụ He Lifeng kwuru na mkparịtaụka ụka ahụ “dị omimi” ma bụrụ “eziokwu”.

    Isiụlọọrụ Amerịka bụ White House kpọrọ ya “nkwekọrịta azụmaahịa” mana na-enyeghi nkọwa n’uju. A na-atụ anya na mba abụọ ga-ejikọta aka ọnụ ma wepụta ozu banyere nke a n’ụbọchị Mọnde.

    Ha abụọ nwere mkparịtaụka imeụlọ a na nzuzo n’ime ngwụcha izuụka niile, na nzukọ nke mbụ ha kamgbe Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump tinyere ụtụisi ọhụrụ megide mba Chaịna n’ọnwa Jenụwarị.

    Mkparịtaụka ihu na ihu mbụ mba abụọ na-enwe kamgbe Trump tinyere ụtụisi pasentị 145% na ngwaahịa niile e si mba Chaịna ebubata n’Amerịka ebe Chaịna zaghachịrị site n’itinye ụtụisi pasentị 125% na ngwaahịa ndị e si mba Amerịka ebubata obodo ha.

    Nnukwu ụtụisi a butere nsogbu n’azụmaahịa mbaụwa ma bute ụjọ na azụmaahịa mbaụwa nwereike ịdakpọ.

    Otu onye ọkachamaara n’azụmaahịa gwara BBC na mkparịtaụka ahụ nwereike ibute mbelata ụtụisi ndị ahụ mana na ọ ka nwekwara ike ịdịtụ etu.

    N’ụbọchị Fraịde tupu mkparịtaụka ahụ amalite, mba Amerịka kwuru na ha agaghị ebudata ụtụisi ahụ ma ọ bụrụ n amba Chaịna anabataghị ụfọdụ ihe ndị ha chọrọ ebe Chaịna kwuru na ha nabatara mkparịtaụka ahụ maka nsogbu ụtụisi ndị a buteere n’azụmaahịa mbaụwa.

  12. Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ daalụ nụ ooo!

    Anyị ji obi sara mbara anabata gị n'izu a n'ọgbakọ BBC Igbo ma na-asị ka ụbọchị taa maara gị na mma.

    Biko nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa gbaa gburu gburu.

    Ndewo?

  13. Popu Leo akpọọla oku maka udo ga-adịgide adịgide n’ụwa

    Popu Leo akpọọla oku maka udo ga-adịgide adịgide n’ụwa

    Ebe foto si, Reuters

    Popu Leo agwala ndị isiala mba Yukren, Rọshịa, Izrel na Gaza ka ha kwụsị mwakpo ma nye udo ohere.

    Popu kwụrụ nke a na Vatịkan n’ụbọchị Sọnde 11 Mee, mgbe ọ na-ekwusa oziọma nke mbụ ya kemgbe e mere ya onyeisi ụka Katọlik

    O jiri ohere ahụ kpọọ ndị isi mba niile ka ha nye udo ohere.

    Popu Leo sị na obi dị ya ụtọ nke ukwu maka nkwekọrịta nkwụsi ọgụ n'etiti mba Indịa na Pakịstan, dịka ọ rịọrọ mba ndị ọzọ na-alụ agha ka ha kwụsị.

  14. Bọkịna Faso na-achọ enyemaka mba Rọshịa maka ịzụ ndị ntorobịa na teknụụzụ

    Bọkịna Faso na-achọ enyemaka mba Rọshịa maka inye ndị ntorobịa ọzụzụ teknụụzụ

    Ebe foto si, AFP

    Ụlọmgbasaozi RTB nke mba Bọkịna Faso nwe kwuru na onyeagha na-achị mba ahụ bụ Ibrahim Traore agwala onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin ka o welite aka n’enyemaka ya iji zụọ ndị ntorobịa Bọkịna Faso na ngalaba sayensị na nkanụụzụ nakwa ngalaba mmụta ndị ọzọ.

    Dịka ụlọmgbasaozi ahụ siri kwuo, Traore kpọrọ ya bụ oku oge ọ gara Mosko dịka “ọbịa pụrụiche” na mmemme e jiri cheta afọ iri asatọ mba Rọshịa meriri Nazi Jamini.

    Traore rụtụrụ aka na mkpa ọ dị Rọshịa ịzụ ndị ntorobịa Bọkịna Faso na ngalaba sayensị “iji nyere ha aka bugoo mba ahụ n’ogogo dị elu”.

    Ndị ndu abụọ ahụ kpakwara maka iwelite aka n’enyemaka ndịagha maka mba Bọkịna Faso.

  15. NAPTIP anapụtala nwata nwaanyị e rere n’ọnụego 100,000 n’Abuja

    NAPTIP anapụtala nwata nwaanyị e rere n’ọnụego 100,000 n’Abuja

    Ebe foto si, NAPTIP/X

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide ịtụ mgbere mmadụ na Naịjirịa bụ Nigeria Agency for the Prevention and Combating of Trafficking in Persons (NAPTIP) ekwuola na ha napụtara nwata nwaanyị dị afọ abụọ e si Abuja resị mmadụ n’Abịa steeti.

    Ozi ụlọọrụ NAPTIP wepụtara n’ụbọchị Fraịde kwuru na ndị ọrụ Department of State Security (DSS) nwụchiri onye ahụ rere ya bụ nwata n’ọnụego 100,000.

    Mpaghara ozi ahụ kwuru sị “anyị napụtara Chiamaka Favour dịka e siri Abuja kpọgaa ya Aba n’ọnwa Febụwarị afọ 2025”.

    “Onye rere ya ka a na-ebo ebubo ịgbakọọrọ otu atọ na-atụ mgbere mmadụ n’Abuja aka. Ọ resịrị mmadụ ya bụ nwata n’ọnụego 100,000,” ka ozi ahụ kọwara.

    Ụlọọrụ NAPTIP kpọkwara oku ka ndị mụrụ nwata ahụ maọbụ ikwu na ibe ya were ọsọ kpọtụrụ ha iji kpọrọghachi ya.

  16. Ndị Gọvanọ, eze ọdịnala na mpaghara ugwu ekwuola ka steeti dị iche iche nwe ndị uweojii nke ha

    Ndị Gọvanọ na eze ọdịnaala na mpaghara ugwu Naịjirịa

    Ebe foto si, X/Senator Uba Sani

    Nkọwa foto, Ndị Gọvanọ na eze ọdịnaala na mpaghara ugwu

    Maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa, ndị Gọvanọ, ndị ndu obodo na ndị ọnụ na-eru n’okwu na mpaghara ugwu Naịjirịa ekwuola na ha kwadoro ka steeti dị iche iche nwe ndị uweojii nke ha.

    Ha mere ka a mata nke a n’ọgbakọ ha mere n’ụbọchị Satọde 10, 2025 n’ogige Sir Kashim Ibrahim dị na Kaduna steeti.

    Ndị Gọvanọ gunyere Muhammadu Inuwa Yahaya nke Gombe steeti na  Uba Sani nke Kaduna steeti

    Ebe foto si, X/Senator Uba Sani

    Nkọwa foto, Ndị Gọvanọ

    Ha kwuru mkpebi ha n’isi okwu ha wepụtara n’ọgbakọ ahụ nke Onyeisi otu jikọrọ ndị Gọvanọ mpaghara ugwu bụ Gọvanọ Muhammadu Inuwa Yahaya nke Gombe steeti gụpụtara.

    “Ọgbakọ ahụ kpebiri na ha na otu jịkọrọ ndị gọvanọ niile na Naịjirịa ga-akpa etu a ga-esi na-akwado ndị ọrụ nchekwa nke gọọmenti etiti”.

    Sultan nke Sokoto na ndị ọzọ

    Ebe foto si, X/Senator Uba Sani

    Nkọwa foto, Sultan nke Sokoto

    “Ọgbakọ ahụ ekwuola mkpebi ha nwere maka steeti dị iche iche inwe ndị uweojii nke ha ma kpọkuo ndị omeiwu Naịjirịa ka ha wepụta iwu ga-eme ka nke a bido”.

    Ndị bịara ọgbakọ ahụ gunyere ndị gọvanọ na steeti iri na itoolu dị na mpaghara ugwu, na ndị isioche otu jịkọrọ ndị eze ọdịnala na mpaghara ahụ.

  17. Adị m njikere izute Putin maka nkata Ịkwụsị agha - Zelensky

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Volodymyr Zelensky

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na ya dị njikere izute mba Rọshịa maka nkata banyere Ịkwụsị agha

    Zelensky mere ka a mata nke a na-agbanyeghị na ọ rụtụghịaka n’oku Onyeisiala mba Rọshịa kpọrọ ya ka ha gaa n'obodo Istanbul dị na Turkey gaa kpaa nkata maka udo.

    N’okwu Zelensky “ọ bụ ihe dị mma na mba Rọshịa ebidola ị che echiche etu a ga-esi kwụsị agha a”.

    “Ụwa niile na-eche maka nke a kamgbe. Ihe mbụ n’usoro ị nweta udo, kwụsị agha a bụ ka a kwụsị ịkwa mgbọ”.

    “Enweghị uru ọ bara na ndị mmadụ na-anwụ n’agha. Anyị na-atụ anya na mba Rọshịa ga-akweta ka akwụsị ịkwa mgbọ bido na Mee 12, 2025, ọzọ bụ na Yukren dị njikere izute Rọshịa”.

  18. Putin ekwuola na ya chọrọ ka Rọshịa na Yukren kpaa nkata udo n’ihu na ihu

    Foto Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin n’oge o zutere Onyeisiala mba Guinea-Bissau bụ  Umaro Sissoco Embalo na Mosko na Febuwari 26, 2025

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin

    Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ekwupụtala na ya chọrọ ka mba ya na mba Yukren kpaa nkata udo n’ihu na ihu.

    Putin kpọrọ mba Yukren ka ha sonye na "mkparịta ụka ozugbo" n’abalị 15 nke ọnwa Mee, 2025.

    Putin kwuru na Rọshịa na-achọ naanị "mkparịta ụka siri ike" nke ga-enyereaka “nwete udo na-adịgide adịgide”.

    Putin enwepụghị na mkparịta ụka ahụ ọ kpọrọ oku ya nwereike ime ka Rọshịa na Yukren kwete ịkwụsị ịkwa mgbọ ma nye udo ohere.

    Ma na o kwughị okwu maka nkwekọrịta nkwụsị agha ụbọchị 30 ozugbo.

    Onyeisiala mba Rọshịa kwuru na ya chọrọ ka e nwee mkparịta ụka ahụ n'obodo Istanbul dị na mba Turkey ma kwuo na ya ga-akpọ Onyeisiala mba Turkey bụ Recep Tayyip Erdogan n’ụbọchị ụka ma gwa ya ihe niile banyere atụmatụ nkata udo ọhụrụ ahụ ọ na-ekwu maka ya.

    Mana etu ọnọdụ si dị ugbua, mba Yukren enwebeghị ihe ha kwuru banyere oku Rọshịa kpọrọ ha.

  19. Ụmụ Igbo anyị sị unu ụtụtụ ọma!

    Ekpere anyị taa bụ ka chi fotere taa nwetere anyị ọganiru dịka unu na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo.

    Taa bụ abalị iri na otu nke ọnwa Mee, 2025, mara na ọ bụ Michael Ilediagu ga na-ewetara unu akụkọ niile mere n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka na ụwa niile, ebe Chinonso Ugorji na Marvelous Obomanu ga-emecha sonyere ya.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị.

  20. Gọọmentị UK ga-ewepụta atụmatụ mbata na ọpụpụ ọhụrụ na Mọnde

    Gọọmentị UK ga-ewepụta atụmatụ mbata na ọpụpụ ọhụrụ na Mọnde

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Gọọmentị UK ga-ewepụta atụmatụ mbata na ọpụpụ ọhụrụ na Mọnde

    Mba UK na-ejikere iwepụta atụmatụ mbata na ọpụpụ ọhụrụ n’ụbọchị Mọnde.

    Akụkọ kwuru na odeakwụkwọ nke ngalaba “UK Home Department” Yvette Cooper na-ejikere iwepụta iwu ọhụrụ ga-agbanwe etu ndị mba ọzọ ga-esi abata maọbụ apụ na mba UK ya n’ogologo oge ha nwereike ịnọ n’UK.

    Cooper ga-ewepụta akwụkwọ iwu mbata na ọpụpụ ọhụrụ a kpọrọ iweghachi njikwa maka usoro mbata na ọpụpụ "Restoring Control Over the Immigration System" nke ga-enye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Labour pati oghere ịhazi usoro mbata na ọpụpụ nke mba ahụ.

    E kwuru na nwereike n’ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị si mba ọzọ na-abata mba UK ịgụ akwụkwọ agaghị enweta ikike ibi n’UK ma ọbụrụ na ha gụchaa akwụkwọ na mahadum mba UK.

    Ọzọ bụ na ndị ọrụ na-abata mba UK ga-ama etu esi asụ asụsụ bekee ọfụma.

    E kwukwara na ha nwereike iwepụ ikike ụlọọrụ ndị anaghị agba mbọ inye ụmụamaala mba UK ọrụ, kama ha a na-achọ ịkpọrọ ndị ọrụ na mba ndị ọzọ, mana gọọmentị ga-akwụsị ha ịkpọbata ndị ọrụ si mba ndị ọzọ n’UK.