You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Hamas ekwela ịtọhapụ mmadụ iri ha ji ma chọọ nkwụsị agha na-adịgide na nzaghachi mba Amerịka

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Mee 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Peter Obi akatọọla etu e siri kpụrụ VeryDarkMan n’otu ụlọ akụ

    Onye ji bu otu ndọrọndọrọ ọchịchị Lebọ patị zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2023 bụ Peter Obi akatọọla etu e siri jide nwoke aha ya bụ Martin Vincent Otse a maama dịka VeryDarkMan (VDM).

    Peter Obi bụ onye mere ka a mata nke a n’akara soshal mịdịa ya kọwara na ihe dị etu ahụ na-arụtụ aka n’ọnọdụ ọchịchị onye kwuo uche ya, ime ihe iwu kwadoro nakwa ọnọdụ ikike dịrị mmadụ na Naịjirịa.

    N’okwu Peter Obi “a maara m na ndị ọrụ nchekwa nwere ikike ị kpụrụ mmadụ, mana ụzọ e siri kpụrụ Martin Vincent Otse a maama dịka VeryDarkMan (VDM) bụ nke na-etinye ụmụ amaala Naịjirịa niile n’ọnọdụ mmegharị anya”.

    Peter Obi dọrọ aka na ntị sị “Ọ ga-abụ ihe ịgba anya mmịrị ma ọ bụrụ na ndị Naịjirịa amaghịzị ihe dị iche mgbe ndị ntọ tọọrọ mmadụ na mgbe ọ bụ ndị ọrụ nchekwa kpọọrọ onye ahụ”.

    Obi kwuru na ihe dị etu a na-emetụta akụnụba Naịjirịa ma na-ebutere Naịjirịa ajọ aha n’ihu mba ụwa niile.

  2. Ndị Houthi atụọla ogbunigwe n’akụkụ ọdọụgbọelu Izrel

    Ogbunigwe a tụrụ site na Yemen adaala n’akụkụ ọdọụgbọelu Izrel bụ Ben Gurion airport.

    Ndị ọchịchị kwuru na nke a kpọtụrụ n’ụtụtụ Sọnde.

    Onyonyoo fesara n’ịntanetị nke a maghị ndị sere ya dị ka o gosiri ebe ndị ọkwọụgbọala kwụsịrị n’akụkụ ụzọ izere isi ha oge ogbunigwe ahụ dara.

    A hụkwara nnukwu anwụrụ ojii n’akụkụ ọdọụgbọelu ahụ dị na mpụga Tel Aviv.

    Ụlọmgbasaozi Izrel sị na ndị ọrụ gbatagbata kwuru na ogbunigwe ahụ merụrụ mmadụ anọ ahụ ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ merụrụ ahụ oge ha na-agbaga ebe ha ga-ezere isi ha

    N’ozi o wepụtara, Minista na-ahụ maka nchekwa n’Izrel bụ Israel Katz kwuru sị: “Onye ọbụla tiri anyị otu ugboro, anyị ga-eti ya ugboro asaa”.

    N’ozi a gbasara n’ụlọmgbasaozo tivii, ọnụ na-ekwuchitere ndịagha Houthi bụ Yahya Saree kwuru na ọdọụgbọelu Izrel “enweghịzi nchekwa maka njem ụgbọelu”.

  3. Ogbunigwe a tụrụ na mba Saụt Sụdan egbuola mmadụ asaa

    Opekatampe mmadụ asaa anwụọla oge a tụrụ ogbunigwe n’otu ụlọọgwụ nakwa n’ahịa dị na Saụt Sụdan, dịka a na-atụ egwu na agha ime nwere ike ịmaliteghachi.

    Ọ bụ otu obi ebere na-ahụ maka ahụike bụ Doctors Without Borders (Médecins Sans Frontières) kwuputara nke a.

    Otu ahụ kwuru na helikọpta tụrụ ogbunigwe na mpaghara ebe a na-ekesa ọgwụ n’ụlọọgwụ ahụ dị na Old Fangak na Jonglei steeti ma gbaa ya ọkụ tupu ha amalite ịgba egbe aghara aghara n’ime obodo ihe ruru nkeji iri atọ.

    Dịka MSF siri kwuo, droonu tụkwara ogbunigwe n’otu ahịa dị n’obodo ahụ.

    Ọ bụ naanị ụlọọgwụ ahụ dị na Fangak county nke ọnụọgụ mmadụ bi na ya karịrị otu narị puku na iri (110,000), ka MSF kwuru.

    Ha kwuru na e bibiri ọgwụ niile ha nwere n’ụlọọgwụ ahụ.

    Ya bụ otu obi ebere kọwara mwakpo ahụ merụrụ ihe karịrị mmadụ iri abụọ ahụ dịka “mmetọ iwu mbaụwa na-ahụ maka ọrụ enyemaka.”

  4. A na-akọtọ Donald Trump maka ikesa foto-AI mere ya ọ dị ka Popu

    Ọtụtụ ndị ụka katọlik ejirila iwe na-akatọ Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump maka i jiri aka ya kesaa foto-AI mere ya ọ dịka Popu.

    E kesere foto ahụ n’akara soshal midia gọọmenti Amerịka dị icheiche n'abalị garaaga. Nke a na-eme n’oge ndị ụka Katọlik na-eri uju maka ọnwụ Popu Francis bu onye nwụrụ n’Epril 21, 2025.

    Nzụkọ ụka Katọlik dị na New York kọwara ihe Trump mere dịka ị metọ okwukwe ndị ụka.

    Cheta na Trump kesere foto ahụ abalị ole ma ole garaaga ka ọ jichara egwuriegwu gwa ndị ntaakụkọ sị “ọ ga-amasị m ị bụ Popu”.

    Ndekọ na-egosi na Donald Trump abụghị Onyeisiala mba Amerika mbụ jiri ihe gbasara okwukwe ndị ụka katọlik mee ihe egwuriegwu.

    Onye bụbu Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden banyekwara n’oke nkatọ mgbe ọ gara mee akara nke obe na Tampa dị na Florida n’oge ndị na-akwado ị tepụ afọ ime na-eme ngagharị udo.

    Ọnụ na-ekwuru Vatican bụ Matteo Bruni ekweghị ekwu okwu maka foto AI Trump kesere dịka a na-achọ onye ga-anọchị anya Popu Francis.

  5. Ụmụ Igbo anyị ekele unu!

    Anyị ji obiụtọ anabata unu n'ọgbakọ BBC News Igbo nke ụbọchị taa bụ ụka abalị anọ nke ọnwa Mee, 2025.

    N'ụtụtụ a, ọ bụ Michael Ilediagu ga na-ewetara unu akụkọ niile mere n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka na ụwa niile ebe Chinonso Ugorji na Marvelous Obomanu ga-emecha sonyere ya.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị taa.

  6. E jidela mmadụ isii maka ọnwụ mmadụ atọ a gbagburu na Sweden

    Ndị uweojii Sweden ejidela mmadụ isii maka ọnwụ mmadụ atọ egburu n’ụlọ ebe a na-eme isi n’obodo Uppsala.

    Ndị ahụ ejidere gụnyere ndị dị afọ iri na asatọ (18) ruo afọ iri anọ na ise (45) dịka ụlọọrụ ndị ọkaiwu steeti siri kwuo.

    A na-enyo otu n’ime ha dịka onye gburu ndị ahụ na mgbede Tuzde.

    Otu onye dị afọ iri na isii ejidere mgbe awa ole na ole gachara ihe ọjọọ ahụ mere, ka a tọhapụrụ n’ụbọchị Fraịde.

    Mmadụ atọ ahụ a gbagburu n’ụlọ ebe a na-eme isi dị afọ iri na ise na iri abụọ. Mwakpo ahụ mere na mgbede nke emume “Walpurgis spring”, mgbe nnukwu igwe mmadụ gbakọrọ n'okporoámá Uppsala.

    Ndị uweojii na-enyocha ma onwere ohere n’ịgba égbè ahụ jiri metụta mpụ ndị otu.

    Ndị mgbasa ozi obodo kwuru na ndị uweojii kwuru na otu onye n'ime ndị e gburu bụ onye ha ma ama.

    Onye ahụ tinyere aka na nyocha ndị uweojii mere maka ịwakpo onye ikwu onyeisi ndị otu bụ Ismail Abdo, dịka akụkọ si kwuo. Ebobeghị onye ahụ ebubo.

    Uppsala, obodo mahadum dị na mgbago ugwu Stockholm, bụ ebe onye ndu otu ndị ama Abdo na Rawa Majida.

  7. Ndị Ọstrelịa ahọpụtala Anthony Albanese dịka Praịm Minista nke ugboro abụọ

    Anthony Albanese onye bụ praịm minista mba Ọstrelịa eturula ugo na ntuliaka mba ahụ mere n’ụbọchị taa bụ Satọde Mee 3, 2025.

    Netwọk mpaghara ahụ kwuru na ndị Ọstrelịa họpụtara Albanese ịbụ Praịm Minista nke ugboro abụọ dịka otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya bụ Labọ pati meriri na ntuliaka mba ahụ mere.

    Nsonaazụ mbụ na-egosi na Albanese na ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya bụ Lebọ pati ritere uru site na ntụgharị mere n'ofe mba ahụ nke dị iche n’ebe Peter Dutton nke njikọ Liberal-National Coalition.

    Dutton onye oche ya nke Dickson furu efu kwetara mmeri a, wee sị na ọ kpọrọ Albanese ka o kelee ya.

    Cheta na ọnụ ego obibi, ahụike ọha na enweghị ike ịkwụ ụgwọ ụlọ bụ isi okwu, dịkwa ka ọchịchị onyeisiala Trump.

    Ọtụtụ ndị nweere onwe ha na ndị na-eme ntuliaka sitere na otu Greens, nwereike ikpebi nhazi ikpeazụ nke gọọmentị na nzukọ omeiwu.

  8. Osote onyeisiala Shettima awụchiela na Gabon maka idu iyi ọrụ onyeisiala

    Osote onyeisiala Naịjirịa Kashim Shettima awụchiela Libreville isi obodo Gabon iji nnọchiteanya mba Naịjirịa n’emume idu iyi ọrụ Onyeisiala nke mba ahụ Brice Clotaire Oligui Nguema.

    Onye bụ praịm minista mba Gabon Raymond Ndong Sima nabatara ya mgbe ọ wụchiri n’ọdụ ụgbọelu mba ahụ.

    N’ozi Stanley Nkwocha onye enyemaka pụrụ iche na mgbasa ozi nke ụlọọrụ Osote Onyeisiala Naịjirịa wepụtara kwuru na Osote Onyeisiala Shettima wụchiri Gabon n’ụbọchị Satọde Mee 3, 2025 dịka ọ hapụrụ Abụja n’ụtụtụ ụbọchị ahụ iji nnọchiteanya Onyeisiala Bola Tinubu n’emume ahụ.

    Cheta na Oligui Nguema, onye jere ozi dịka onye ndu nwa oge na Gabon kemgbe Ọgọst 2023, nwetara nnukwu mmeri na ntuliaka onyeisiala nke mba ahụ mere n'Eprel 12.

    Ndị Naịjirịa nọ na Gabon nabatara osote onyeisiala Shettima nke ọma dịka ha ji obi ụtọ na ekele nabata ya.

  9. Mba Tunishịa atụọla onye bụbu praịm minista mkpọrọ maka ebubo iyi ọha egwu

    Ụlọikpe Tunishịa atụọla onye bụbu praịm minister Ali Laarayedh mkpọrọ afọ iri atọ na anọ (34) maka ebubo iyi ọha egwu.

    Ọ bụ onye nkatọ a ma ama kachasị ọhụrụ nke onyeisiala mba ahụ ga-atụ mkpọrọ dịka ndị na-eme mkpọsa na mba ahụ.

    Nwoke ahụ dị afọ iri isii na itoolu (69) bụ onye a ma ama na-akatọ onyeisiala Kais Saied na onye ndu otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Ennadha pati – nke kachasị n’ụlọ omeiwu na- akwalite echiche Alakụba na mba ahụ.

    E boro Laarayedh na mmadụ asaa ndị ọzọ ebubo ịkwalite ​​​​ụlọnga ndị na-eyi ọha egwu na inyere ndị Tunishịa na-eto eto aka ịga mba ọzọ iji sonyere ndịagha Alakụba n’Ịrak na Sirịa.

    "Abụghị m onye omekome... Abụ m onye e merụrụ n'okwu a," ka o dere n'akwụkwọ ozi o degaara onye ọkaiwu ụlọikpe n'ọnwa gara aga, dịka ụlọọrụ mgbasa ozi AFP si kwuo.

    A mara ya ikpe n’ụbọchị Fraịde.

    N'ime izu ndị na-adịbeghị anya, opekatampe ndị nkatọ onyeisiala Tunishịa mmadụ iri anọ (40) ka ezigara n'ụlọ mkpọrọ - gụnyere ndị nnọchianya gọọmentị, ndị ọkaiwu na ndị ntaakụkọ.

  10. Izrel ga-ebibi ụlọ ndị gbara ọsọ ndụ karịrị 100 na Gaza

    Izrel ekwupụtala atụmatụ ọhụrụ nke ha ga-eji bibie ọtụtụ ụlọ na mpaghara West Bank ha kpachiri dịka ha na-aga n’ihu na-awakpo otu ndị Palestine bu ngwaọgụ.

    Onye ntaakụkọ BBC kwuru na eserese maapụ ọhụrụ ndị ọchịchị Izrel wepụtara gosiri na ha ga-ebibi ihe karịrị ụlọ otu narị (100) n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị na Tulkarm na Nurul Shams.

    Ozi ahụ Izrel wepụtara kwuru na a ga-enye ndị bi n’ogige ndị ahụ ọnwa atọ iji nwee ike kwapụ ngwongwo ha.

    Kemgbe Jenụwarị, amanyela ndị Palestine karịrị puku iri anọ (40,000) ka ha gbapụ n’ụlọ ha dị n’ime ogige atọ ndịagha Izrel mechiri na West Bank.

  11. Izrel ekwuola na ha wakporo Sirịa

    Ndịagha Izrel ekwupụtala na ha wakporo ndịagha Sirịa oge otu na-enyocha ọnọdụ kwuru na ha sitere n’elu tụọ ogbunigwe karịrị iri abụọ (20) n’akụkụ mba ahụ dị iche iche.

    Onye ntaakụkọ BBC sịrị na ụlọmgbasaozi Sirịa kwuru na ogbunigwe tiwara na mgbago ugwu Damascus nakwa n’akụkụ obodo Hama.

    E nwetakwara ozi gbasara mwakpo ndị ọzọ e mere na Latakia nakwa na mpaghara Idlib dị na mgbago ugwu-ọdịda anyanwụ mba ahụ.

    Ọnọdụ a na-abịa dịka Izrel siri n’elu tụọ ogbunigwe n’akụkụ obi ọchịchị dị na Damascus n’ụbọchị Fraịde.

  12. A tụọla Ọkaikpe mba Yuganda nga na UK

    A tụọla Ọkaikpe Otu Mbaụwa bụ United Nations n’asụsụ Bekee mkpọrọ afọ isii na ọnwa anọ maka ịmanye otu nwaanyị ka ọ na-arụrụ ya ọrụ n’ụlọ dịka ohu.

    Lydia Mugambe dị afọ iri ise (50) na-agụ akwụkwọ maka nzere PhD na ngalaba iwu na mahadum University of Oxford tupu ndị uweojii achọpụta na o nwere nwaagbọghọ bụ nwaafọ Yuganda na-agbara ya odibo ma na-ekuru ya nwa ọ naghị akwụ ụgwọ.

    Mugambe, onye bụkwa Ọkaikpe n’Ụlọikpe Ukwu dị na Yuganda bụ onye ụlọikpe Oxford Crown Court tụrụ nga n’ụbọchị Fraịde 2 Mee 2025 oge ha chọpụtara na aka ya dị na mpụ ịgba mmadụ ohu n’ọnwa Maachị.

    Oge ọ na-ama ya ikpe, Ọkaikpe David Foxton gwara Mugambe na “enweghị etu ọbụla o siri gosi nchegharị” maka omume ya kama ọ nọ na-achọ ụzọ ọ ga-esi “taa odibo ya ụta” maka ihe ahụ mere.

  13. Mba Ọstrelịa ga-ahazi ntuliaka Praịm Minista n’ụbọchị Satọde

    A ga-ahazi ntuliaka na mba Ọstrelịa dịka nde mmadụ iri na asatọ (18m) ga-ekpebi onye ọzọ ga-abụ Praịm Minista ha.

    E kwenyere na vootu ndị na-eto eto dị oke mkpa na ntuliaka ahụ ga-adị n’ụbọchị Satọde 3 Mee 2025.

    Ọnọdụ obibi ndụ, ọnọdụ nlekọta ahụike ọhanaeze na-adakpọ adakpọ na ụlọ obibi na-enweghị onye ọ na-eru aka bụcha ọkpụrụkpụ ihe dị oke mkpa a ga-elekwasa anya na ntuliaka ahụ.

    Praịm Minista Anthony Albanese nke otu Australian Labor Party na-achọ inweta ohere maka ọchịchị nke ugboro abụọ ya ebe Peter Dutton nke otu Liberal-National Coalition nọkwa n’aka nke ọzọ.

    Ndị ọzọ sooro na-azọ ọkwa ahụ gụnyere ndị kwụụrụ onwe ha nakwa ndị Greens.

    Mpụtara ntụliaka nke a kwadoro nwereike iwe ụbọchị ole na ole maọbụ ọtụtụ izuụka mana mpụtara ntuliaka ndị e nyeghị nkwado sitere n’ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na-emekarị ka a mata onye ga-anọ n’isi gọọmenti ọhụrụ.

  14. Igbo nwe mmadụ, ụnụ abọọla chi, Ka ụbọchị taa maara onye niile mma!

    Anyị ji obiụtọ anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo nke ụbọchị taa bụ Satọde Afọ 3 Mee 2025.

    N'ụtụtụ a, ọ bụ Chinonso Ugorji ga na-ewetara gị akụkọ niile mere n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka na ụwa niile ebe Uzoamaka Ewuzie na Michael Ngene ga-emecha sonyere ya.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị taa.

  15. Iwe ejula ndị Yuganda obi dịka nwa Onyeisiala kwuru na ya ji onye nche onye na-agba nna ya ụkwụ

    Nwa onyeisiala Yuganda bụ General Muhoozi Kainerugaba ekwupụtala na ọ bụ ya jichiri onye nche otu onye ndu na-agba nna ya ụkwụ, bụ onye furu kemgbe ụbọchị ise gara aga.

    Akụkọ kwuru na ndị a maghị ndị ha bụ yi uwe nkịtị nakwa uwe ndịagha tọọrọ Edward Sebuufu a maara dịka Eddie Mutwe n’ụbọchị Sọnde na mpaghara Kiwango.

    Ọnọdụ ahụ akpaliela iwe na ọnụma dịka ndị mmadụ na-enwe mmetụta gbasara nchekwa ya.

    N’ọtụtụ ozi o bipụtara n’akara ọbaozi X, General Kainerugaba, onye bụkwa onyeisi ndịagha Yuganda sịrị na Sebuufu “nọ m n’aka,” ma gbakwunye foto onye nche ahụ a kpụrụ isi kodo.

    O yikwara egwu imeso Sebuufu omume ihe ike.

    Ihe ahụ General Kainerugaba depụtara akpaliela iwe n’etiti ụmụafọ Yuganda dịka ha ji mkpesa #FreeEddieMutwe akpọ oku ka a tọhapụ Sebuufu ma katọọ njichi e jichiri ya.

    Gen Kainerugaba na-ebipụtakarị ozi ndọrọndọrọ ọchịchị n’ọbaozi soshal midịa, bụ nke ndị na-akatọ ya kwuru megidere iwu akparamaagwa ndịagha.

    O yiela ọtụtụ egwu ndị o mezubeghị ka ọ dị ugbua.

  16. Kọleji niile na-azụ ndị nkụzị na Naịjirịa ga-amalite inye nzere ‘degree’

    Gọọmenti Naịjirịa ekwuola na ha ga-amalite imejupụta atụmatụ ọhụrụ a kpọrọ Dual Mandate Policy na kọleji niile na-azụ ndị nkụzi gburugburu Naịjirịa dịka ọ dị n’iwu Colleges of Education Act 2023.

    N’ozi Mịnịstrị na-ahụ maka agụmaakwụkwọ wepụtara, ha kọwara na iwu ahụ ga-enye kọleji na-azụ ndị nkụzi ohere ịzụ ụmụakwụkwọ n’ogogo NCE na nke digrii.

    Minista na-ahụ maka agụmaakwụkwọ bụ Tunji Alausa kọwara atụmatụ ahụ dịka nke “dị oke mkpa nakwa nke ga-eweta ọganihu”.

    “Atụmatụ Dual Mandate Policy abụghị naanị nnwogharị kama ọ bụ mgbanwe gbara ọkpụrụkpụ nke ga-enye kọleji dị iche iche ohere inye asambodo NCE na nke digrii,” ka Minista ahụ kwuru na ya bụ ozi.

    Ọ gara n’ihu kwuo na “atụmatụ ahụ ga-eme ka kọleji dị iche iche gbasikwuo ike, nyekwuo ndị mmadụ ohere inweta agụmaakwụkwọ ma kwalitekwa ogogo nkụzi gburugburu Naịjirịa.”

  17. Seyi Tinubu agọọla sị na ya amaghị onye NANS boro ya ebubo ntọ, i nye ngarị N100m

    Nwa Onyeisiala Naịjirịa bụ Seyi Tinubu ejirila akara Instagram ya gọọ sị na ya amaghị otu nwoke ahụ boro ya ebubo sị na aka ya dị na ịtọrọ a tọọrọ ya ma tie ya ihe.

    Nwoke ahụ bụ onye onyonyo ya na-efeharị n’ịntanet boro Seyi Tinubu ebubo na aka ya dị n'ihe mere n'oge “ a tọrọ ya, kpụga ya ebe e tiri ya ihe maka na ya jụrụ ịnara ego ruru nde naịra (N100m) bụ ego e nyere ya ka ya na ndị otu ya na-kwado gọọmenti”.

    Mana n’ọsịsa Seyi Tinubu dere n’akara soshal mịdịa ya ka ọ zara sị “mụ na nwoke ahụ aha ya bụ Atiku Isah emebeghị nzụkọ maọbụ kpaa nkata, na Legos maọbụ ebe ọbụla n'ụwa niile”.

    Seyi kwukwara na “ebubo niile Atiku Isah boro ya bụ ihe na-emeghị eme”.

  18. A maala otu nwaanyị ikpe na Saụt Afrịka maka ịtọrọ nwa ya nwaanyị

    Nne nwatanwaanyị mba Afrịka ahụ furu mgbe ọ dị afọ isii kemgbe ihe karịrị otu afọ gara aga bụ onye a mara ikpe maka ịtọrọ ma ree nwa ya nwaanyị.

    A nwụchiri Kelly Smith, enyi ya nwoke bụ Jacquen Appollis na enyi ha bụ Steveno van Rhyn oge nwa Smith bụ Joshlin furu n’ụlọ ha dị na Saldanha Bay n’akụkụ Cape Town n’ọnwa Febụwarị afọ gara aga.

    N’ụbọchị Fraịde, a chọpụtakwara na aka Appollis na Rhyn dị na ntọrị na ịtụ mgbere Joshlin. Mmadụ atọ ahụ nọọrọ mgbe gara aga kwuo na aka ha dị ọcha n’ebubo ndị a.

    Oge Joshlin furu, akụkọ ya tụrụ mmadụ niile n’anya na Saụt Afrịka ma n’agbanyeghị ozi a gbasara ebe niile na a na-achọ ya achọ, e nwebeghị onye hụrụ ya ruo ugbua.

  19. E bidola ijide ndị nọọsụ adịgboroja n'Enugwu steeti

    Maka i belata ọnwụ erughi eru na-emekari n’ụlọọgwụ site na-aka ndị nọọsụ adigboroja, Gọmentị Enugwu ewepụtala otu gbanụ gbanụ ga-ejide ndị nọọsụ adịgboroja.

    Otu gbanụ gbanụ ahụ malitere ọrụ na Nsukka ebe ha jidere ụmụnwaanyị atọ n’otu ụlọọgwụ a na-enye enyo na ha bụ nọọsu adịgboroja.

    Onyeisi otu gbanụ gbanụ ahụ nke ọchịchị gọvanọ Peter Mbah wepụtara kọwara na onye ọbụla chọrọ ịbụ nọọsụ n’ụlọọgwụ ọbụla n’Enugwu steeti ga abụrịrị onye gụrụ nọọsụ n’ụlọ akwụkwọ ma nweta ọzụzụ na asambodo o ji arụ ọrụ.

    Ọ kwara arịrị na ọtụtụ ndị enwetaghị ọzụzụ nọọsụ na-eyiri uwe ọcha na-arụ ọrụ n’udị aghụghọ were na-egbugasị mmadụ n’ihi na ha amaghị ọrụ.

    Otu nwoke, Onyeka Ede, anyị gbara ajụjụ ọnụ maka ya bụ ihe yọrọ gọọmenti Enugwu ka ọ gbaa mbọ jide onye ọbụla nwere ụlọọgwụ ma were nọọsụ adigboroja ọrụ.

  20. A hụla ndị uweojii Saụt Afrịka e gburu n’ime osimiri ka abalị isii gasịrị

    Ndị uweojii Saụt Afrịka na’agba mbọ ịchọpụta ndị gburu ndị otu ha atọ ma tunye ha n’ime osimiri.

    Ozi si n’aka ndị uweojii kwuru na ha malite ịchọ Boipelo Senoge gbara afọ 20, Cebekhulu Linda gbara afọ 24 na Keamogetswe Buys gbara fọ 30 kemgbe Wenezde 23 Eprel, 2025 ka ha hapụrụ ọdụ mmanụ ụgbọala dị na Joannesburg.

    Ka ọ dị ugbua a, a hụla ozu mmadụ atọ n’osimiri Hennops River ebe a hụkwara ụgbọala ha n’ime osimiri ahụ ụbọchị Tọzde Mee 1, 2025.

    Na mbụ, ndị uweojii kwuru na ha chere na ọ bụ ndị ntọ tọọrọ mmadụ atọ ahụ, mana ugbua, ha kwuru na ha na-eme nnyocha iji chọpụta ka ihe mberede okporoụzọ bụ ihe kpatara ọwnụ ha.