You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Hamas ekwela ịtọhapụ mmadụ iri ha ji ma chọọ nkwụsị agha na-adịgide na nzaghachi mba Amerịka

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Mee 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Rọshịa esila n'ikuku wakpoo isi obodo Yukren

    Ihe dịka mmadụ iri na anọ (14) emirụọla ahụ dịka mba Rọshịa tụrụ ogbunigwe ma jiri duronu wakpoo Kyiv, isi obodo Yukren, ndị ọchịchị kwuru.

    Ha kọwara na Rọshịa tụrụ duronu ruru narị abụọ na iri ise (250) na ogbunigwe dị iri na anọ n’obodo Kyvi nke kpalitere ọkụ ọgbụgba n’ụlọ ebe ndị mmadụ bi.

    Nke a bụ mbuso agha ikuku kachasị ukwu nke e busoro obodo Kyiv kemgbe agha malitere mana ndịagha ikuku Yukren kwuru na ha gbaturu ogbunigwe isii na duronu narị abụọ na iri anọ na ise (245).

    Onyeisiala mba Yukren Volodymyr Zelensky kwuru n’akara X yana mwakpo ndị a na-egosi n’ihe na-akpata ịgbatị agha ahụ ogologo nọ n’aka mba Rọshịa.

    Zelensky gara n’ihu kwuo na ọ bụ nanị mmachi ezubere imegide akụkụ ndị dị mkpa nke akụ na ụba Rọshịa nwereike ime ka Rọshịa kwenye na nkwụsị ọkụ.

    Cheta na mba Rọshịa na Yukren kwekọrịtara ịgbanwe ndị mkpọrọ mgbe ndị nnọchiteanya mba abụọ ahụ mkparịtaụka na Tọọkị.

    N'izu gara aga, Rọshịa kwuru na Yukren tụrụ ọtụtụ narị duronu ndị na-agbawa agbawa na mba ha, gụnyere mwakpo n’isi obodo Rọshịa bụ Moscow.

    Minista na-ahụ maka nchekwa na Rọshịa kwuru na ha gbaturu duronu ruru 485.

  2. Mba DR Kongo ewezugala mkpuchi onyeisiala ha pụrụ apụ n’ihi ebubo mpụ

    Ụlọomeiwu sịnetị mba Democratic Republic of Congo ewezugala mkpuchi ‘immunity’ nke onyeisiala ha pụrụ apụ bụ Joseph Kabila.

    Ọnọdụ a ga-enye ohere ka e kpee Kabila ikpe maka ebubo ịkwado ndịagha nnupuisi na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba ahụ.

    Ndị ọchịchị boro ya ebubo ịgba mba DR Kongo mgba okpuru nakwa mpụ agha ma kwuo na e nwere “ọtụtụ ihe akaebe” gosiri na Kabila na ndị otu M23 na-emekọrịta ihe.

    Kabila dị afọ iri ise na atọ ekwubeghị okwu gbasara ebubo ahụ mana ọ nọrọla n’oge gara aga gọọ na e nweghị ihe jikọtara ya na otu ahụ na-eyi ndụ egwu.

    Ndị sịnetọ fọrọ ntakịrị ka ha ruo iri itoolu nọọrọ n’ụbọchị Tọzde kwado ka e kpee nwaamadị ahụ ikpe n’ihi ebubo ịgba mba DR Kongo mgba okpuru ebe ise n’ime ha gbara ụkwụ megide ya.

    Nwoke ahụ chịrị mba DR Kongo site n’afọ 2001 ruo 2019 abịaghị zara ọnụ ya n’ụlọomeiwu sịnetị.

    Oge ọ pụrụ n’ọchịchị, e chiri ya echichi “senator for life”, bụ nke ga-enye ya mkpuchi ruo n’ọnwụ.

  3. EU akpọọla oku maka nsọpụrụ dịka Trump yichara egwu ịmanye ụtụisi 50%

    Onyeisi ngalaba azụmahịa nke otu European Union ekwuola na otu ahụ mba iri abụọ na asaa mejupụtara dị njikere ka ha na mba Amerịka nwee nkwekọrịta azụmahịa nke ga-agbakwasa ụkwụ na “nsọpụrụ” na-abụghị “iyi egwu”.

    Ọnọdụ a na-abịa dịka Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump yichara egwu itinye ụtụisi 50% na ngwaahịa niile e si EU tụbata n’Amerịka.

    “EU dị ezi njikere inwe nkwekọrịta ga-adabara onye niile,” ka kọmịshọna EU na-ahụ maka azụmahịa bụ Maros Sefcovic kwuru oge ya na onye nnọchiteanya azụmahịa Amerịka bụ Jamieson Greer na odeakwụkwọ ịtụ mgbere bụ Howard Lutnick nwechara mkparịtaụka n’ekwentị.

    “Azụmahịa dị n’etiti EU na Amerịka enweghị atụ ma bụrụkwa nke a ga-eji nsọpụrụ chịkọta, na-abụghị iyi egwu. Anyị dị ezigbo njikere ichekwa mmasị anyị,” ka o kwuru.

    N’ụbọchị Fraịde ka Trump gosipụtara enweghị ndidi gbasara ka mkparịtaụka azụmahịa dị ugbua n’etiti EU na Amerịka si aga ma kwuo na ya ahazichaala atụmatụ ibuli ụtụisi n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Juun.

  4. Ndị Gaza nọ n’ọnọdụ kachasị njọ ugbua - Ụlọọrụ UN

    Ụlọọrụ UN ekwuola na ndị Gaza nọ n'ọnọdụ kachasị njọ ugbua dịka ha na-agabiga 'obi ọjọọ' nke agha.

    Nke a na-eme dịka 9,000 gwongworo bu ihe enyemaka dị njikere ịgafe okeala Gaza na mba Izrel.

    Dịka Izrel na-ebelata mgbochi ihe enyemaka ịbanye na Gaza nke malitere n’izu iri na otu gara aga, odeakwụkwọ ukwu n’ụlọọrụ UN Antonio Guterres na-ekwu na ndị niile bi na Gaza - nde mmadụ 2.1 - nọ n'ihe ize ndụ maka oke agụụ.

    Ụmụnwaanyị agụụ ji na Gaza gwara BBC na ha enweghị ike inye ụmụ ha ara ma ụmụaka ndị ahụ a naghị akwụsị ibe akwa, dịka na onye na-eme bred kwuru na ntụ ọka ha nwereike ịgwụ n'ime ụbọchị abụọ na-abịa.

    N’aka nke ọzọ, Praịm minista mba Izrel Benjamin Netanyahu na-agba ndị isi mba ụwa gụnyere UK, Fransị na Kanada mgba, na-ebo ha ebubo ịkwado ndị Hamas mana Fransị na UK gọnarịrị ebubo ahụ ebe Kanada ekwubeghị ihe ọbụla.

    Nkwupụta nke Praịm Minista Izrel pụtara dịka ndị otu ahụ katọrọ mba Izrel maka ịga n’ihu na-ebuso ndị Gaza agha.

  5. Onyeisiala Trump eyiela egwu ịmanye tarifu na ngwaahịa si Yurop na ekwentị “Apple iPhones”

    Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump ekwuola na ya na-akwado ịmanye 50% pacentị na ngwaahịa niile si mba dị na Yurop abata mba Amerịka.

    “Mkparịtaụka anyị na ha enweghị ebe ọ na-aga,” o kwuru n’akara soshal midịa ya n’ụbọchị Fraịde 23 Mee 2025.

    O kwuru na tarifu ọhụrụ a ga-amalite n’ụbọchị mbu nke ọnwa Juun 2025.

    Nkwupụta a na-egosi nkawanye njọ nke agha azụmaahịa dị n’etiti mba ndị dị na Yurop na Onyeisiala Trump.

    Onyeisiala Trump bu ụzọ kwado 20% tarifu na ngwaahịa niile si Yurop mana o wedara ya na 10% ruo 8 Julaị iji nye oge maka mkparịtaụka.

    Onyeisiala Trump kwadoro ịmanye ụtụisi 25% na ekwentị iPhones ọbụla emepụtaghị na mba Amerịka.

  6. Mba Amerịka ga-amachi Sudan maka ebubo ji ngwa agha kemịkalụ agha alụ agha

    Mba Amerịka ekwuola na ọ ga-amalite ịmachi mba Sudan dịka ọ chọpụtara na Sudan ji ngwa agha kemịkalụ alụ agha ime obodo megide otu Rapid Support Forces (RSF), ngalaba steeti kwuru.

    A ga-amachibido mbupụ ngwaahịa si mba Amerịka ịbata na mba ahụ yana itinye oke ịgbazinye ego site n’ọnwa 6 Juun 2025, dịka nkwupụta sitere n’aka ọnụ onye na-ekwuchitere Tammy Bruce siri kwuo.

    Onye na-ekwuchitere gọọmentị Sudan kọwara ebubo a dịka "okwu na-enweghị isi na-enweghị ihe akaebe na-akwado ya".

    Cheta na a na-ebo ndịagha Sudan na ndịagha nnupụisi RSF ebubo ime mpụ agha mana ha niile gọnarịrị ebubo ndị ahụ.

    Ọzọ, ihe karịrị mmadụ otu narị puku na puku iri ise anwụọla n’agha ahụ malitere kemgbe afọ abụọ.

    N'ọnwa ndị na-adịbeghị anya, ndịagha Sudan eweghachila isi obodo Khartoum, mana ọgụ na-aga n'ihu n'ebe ndị ọzọ.

  7. DR Kongo napụrụ onye bụbu onye ndu ikike mkpuchi maka ebubo ịgba gọọmentị mgba okpuru

    Ndị omeiwu Sinetị nke mba Democratic Republic of Kongo a napụla onye bụbu Onyeisiala Joseph Kabila ikike mkpuchi maka ebubo ịgba gọọmentị mgba okpuru.

    Nke a nyere gọọmentị ikike na oghere ikpe Kabila ikpe maka ebubo ịkwado ndị nnupụisi nọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke mba ahụ.

    Ndị ọchịchị na-ebo ya ebubo ịgba gọọmentị mgba okpuru na mpụ agha dịka ha kwuru na e nwere ọtụtụ akwụkwọ, ihe akaebe na ihe onwunwe eziokwu jikọrọ Kabila na otu ndịagha nnupụisi M23, nke weghaara ọtụtụ obodo dị n’ọwụwa anyanwụ mba ahụ nwere akụ si na chi dị n’ala.

    Kabila dị afọ iri ise na atọ ekwubeghị ihe ọbụla maka ebubo ahụ mana n'oge gara aga, ọ gọnarị njikọ ọ bụla n’etiti ya na ndị nnupụisi ahụ.

    Ọ bụ ihe ruru ndị omeiwu mmadụ iri itoolu tụnyere vootu ịnapụ ya ikike mkpuchi ya n’ụbọchị Tọzde 22 Mee 2025.

    Onye ahụ bụbu onyeisiala, onye chịrị obodo ahụ n'agbata afọ 2001 na 2019, abịaghị n'ihu ndị sinetị iji zara ọnụ ya.

  8. Netanyahu eboola ebubo na Starmer na-adọnyere Hamas ukwu

    Praịm Minista Izrel bụ Benjamin Netanyahu amalitela ịkatọ Praịm Minista mba UK bụ Sir Keir Starmer na ndị ndu mba Fransị na Kanada, ma kwuo na ha “ekwuola ya n’eze wara awa na ha chọrọ ka otu Hamas nọgide n’ọchịchị”.

    O bokwara Starmer, Emmanuel Macron na Mark Carney ebubo ịdọnyere “ndị ogbuu mmadụ, ndị na-akwaso iko n’ike, ndị na-egbu ụmụaka na ndị ntọrị” ukwu.

    Oge ọ na-ekwu okwu gbasara mwakpo e mere n’ụlọnnọchiteanya Izrel dị na Washington n’ụbọchị Tọzde, Netanyahu sịrị na ndị ndu ụfọdụ na-agbakọrọ Izrel aka chọrọ ka ha “kwụsị mwakpo ma nabata ka ndịagha Hamas na-egbu mmadụ n’igwe dịrị”.

    Ka o sinadị, Downing Street azaghachibeghị okwu ahụ, mana ha rụtụrụ aka n’okwu Sir Keir Starmer kwuru na mbụ, bụ nke o jiri katọọ mwakpo e mere na Washington.

  9. Ọkụ emebiela ụlọ mmepụta mmanụ nri n’Ebonyi steeti

    O kwuru na ya gara ụka n’abalị mgbe ọ natara ozi gbatagbata n’aka ndị ọrụ ya.

    O kwuru na ọkụ ahụ mebisiri ọtụtụ ihe na-agbanyeghị mbọ ndị na-agbanyụ ọkụ gbara, malitere n’elekere asaa nke mgbede.

    Ofoke kwuru na akụrụngwa ụlọọrụ ya mebiri n’ọkụ ahụ ruru nde narị asatọ nke mere o jiri kpọọ gọọmentị na ndị mmadụ oku enyemaka.

    “O nweghị ihe ọbụla anyị wepụtara n’ọkụ ahụ. Ọtụtụ nkụrụngwa ọrụ gụnyere injin, mmanụ emepụtara na ihe ndị ọzọ gbachara ọkụ,” Ofoke kọwara.

    Ndị bi n’okporoụzọ Onwe dị n’Abakaliki, isi obodo Ebonyi steeti, nọ n’iru uju maka ọkụ gbara n’ụlọ ebe a na-emepụta mmanụ nri dị na mpaghara ahụ.

    Ihe mberede a mere n’ụbọchị 20 Mee 2025 dịka onye nwe ụlọ mmepụta mmanụ nri ahụ, Sylvanus Ofoke kwuru na nnukwu akụrụngwa eji arụ ọrụ gbarachara ọkụ.

  10. Ihe karịrị otu onye nwụrụ dịka ụgbọelu nkeonwe dara n'ụlọ na San Diego - Ndị ọchịchị

    E nwere nkwenye n’ọtụtụ mmadụ nwụrụ mgbe otu obere ụgbọelu kpọkara n’ụlọ obibi na mpaghara San Diego, dịka ndị ọchịchị si kwuo.

    Ha kwuru na onweghị ndị bi ebe ahụ nwere nnukwu mmerụrụ ahụ mana ihe karịrị otu onye nwụrụ n’ime ndị njem nọ n’ụgbọelu ahụ, osote onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ọkụ, Dan Eddy kwuru.

    E kwuru na ihe mberede ahụ mebiri ọtụtụ ụlọ na ụgbọala bụ ndị gbara ọkụ mgbe ụgbọelu ahụ dara n’ụtụtụ Tọzde 22 Mee 2025.

    Ihe ruru mmadụ narị ka a kpọpụrụ na mpaghara ahụ nọ na Murphy Canyon, ndị uweojii kwuru.

  11. A tọhapụla onye na-akwado mgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị a nwuchiri na Tanzania

    Otu onye na-akwado mgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke a nwuchiri na Tanzania ma tinye ya n’ụlọ mkpọrọ abalị atọ, ka a tọhapụrụ dịka mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi na Kenya rịọrọ arịrọ.

    Otu onye ọkwa ya dị elu na mịnịstrị ahụ Korir Sing'oei kwuru na X ya na Boniface Mwangi alọghachitela na mba ha ugbua.

    Onye bụ ọkaiwu na onye nkwado mgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị Khalid Hussein gwara BBC na ọ bụ ha niile nọkọrọ na mpaghara oke osimiri na mba Kenya.

    Cheta na ọ bụ ndị ọrụ agha a na-enyo enyo na amabeghị ebe ha nọ nwuchiri Boniface Mwangi na Dar es Salaam n’ụbochị Mọnde yana Agather Atuhaire nke Uganda.

    Ọzọ bụ na Onyeisiala Samia Suluhu Hassan dọrọ aka ná ntị n’ụbọchị Mọnde 20 Mee 2025 na ya agaghị ekwe ka ndị na-akwado mba ndị agbata obi 'tinye aka' n'ihe gbasara obodo ya wee kpata "ọgbaghara".

  12. Ndị uweojii ji anwụrụ ose chụpụ ụmụafọ Abuja na-eme ngagharịiwe ọsọ ụkwụ eru ala.

    Ndị uwe ojii chụpụrụ ndị ngagharị iwe n’ọnụ ụzọ ọgbakọ ulọ omeiwu nke etiti maka nhọpụta Solomon Adodo dịka onye nnọchite anya isi obodo Federal (FCT) na bọọdụ North Central Development Commission (NCDC).

    Ngagharị Mkpesa nke emere na Wenezde 22 Mee, 2025 nke ndị ntorobịa akpọrọ ụmụ amaala FCT duziri, malitere n’udo tupu ọgbaghara abia, nke mere ka ndị ọrụ nchekwa mechie ọnụ ụzọ ámá nke ọgbakọ ulọ omeiwu nke etiti.

    Mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu tupu ngagharị iwe a agbasawanye, Ibn-Ja’far Paiko, otu onyeisi otu ahụ, katọrọ nhọpụta Adodo nwaafọ Benue steeti dịka nde ga-edu bọọdụ North Central Development Commission (NCDC) na FCT bụ mmebi ikike ụmụ amaala FCT.

    “Gọọmenti etiti wepụtara NCDC nke metụtara steeti isii dịka Benue, Plateau, Kogi, Niger, Kwara, Nassarawa na FCT, akwụkwkọ eji weputa ya nyere iwu na ndi isi ga-edu bọọdụ ahụ ga-abu ndi si na steeti nile metụtara ndị nọ na mpaghara etiti ugwu.

    Mana ka ọ di ugbu a, enweghị onye si na FCT enyere ohere ka osoro bụrụ ndị isi” Okwuru na ihe na-eme ha iwe bụ na Benue steeti sọsọ nwere mmadụ anọ na ndi ndu NCDC dịka enyere Adodo ohere ka ọ nọchiteanya ndị FCT ebe ọ bụ onye Benue steeti.

  13. Ndị Gaza na-atụ egwu maka mmalite oke ụkọ mmiri dịka mbuso agha Izrel na-aga n’ihu

    Ụkọ mmiri na-akawanye njọ na Gaza dịka mba Izrel na-aga n’ihu ibuso agha na Gaza nke chụpụrụ ọtụtụ mmadụ n’ụlọ ha ma kpalite ụkọ mmanụ ọkụ n’ụlọọrụ na-asa mmiri ka ọ dị ọcha.

    Ụlọọrụ UN na-ahụ maka enyemaka mmadụ kwuru na ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ dọrọ aka na ntị na ọ bụrụ na ebuteghị mmanụ ọkụ ozugbo na nnukwu ụkọ mmiri ga-amalite na ngwụcha izu a.

    Ụbọchị ole na ole ndị Izrel malitere igbochi ihe enyemaka ịbanye na Gaza na mbido ọnwụ Maachị 2025 - nke a na-egbochi ọkụ eletrik n’ụlọọrụ na-asacha mmiri – nke bụ isi iyi mmiri dị mkpa na Gaza.

    O kwuru na nke a bụ usoro ndị Izrel ji arụgide ndị Hamas ka ha were tọhapụ ndị ejieji fọdụrụ.

  14. A gbagbuola ndị ọrụ ụlọnnochite mba Israel abụọ na Washington

    A gbagbuola nwoke na nwaanyị na-arụ n'ụlọ nnọchiteanya Izrel n' mbara ụlọ nchekwa ihe gboo nke mba Izrel na Washington DC.

    Ndị uweojii kwuru na ọ bụ otu nwoke tiri mkpu, " Tọhapụ ndị Palestine, tọhapụnụ Palestine" gbagburu Yaron Lischinsky na Sarah Lynn Milgrim bụ ndị e kwuru na-akwado ịlụ onwe ha.

    Ka ọ dị ugbua, aka ndị uweojii akparala ya bụ nwa amadi bụ onye a kpọrọ Elias Rodriguez, gbara afọ 30 si Chicago, bụ onye ndị uweojii maliterela ịgba ajụjụ ọnụ.

    N'ụbọchị Wednezde, ndị uweojii nwetara ozi ekwentị ọtụtụ nke gwara maka egbe a wụụrụ n'ebe a na-eme emume na nso Capital Jewish Museum dị na Ndịda Washington DC.

    A hụrụ nwoke na nwaanyị tọgbọ ha anaghị eku ume, mechaa ha nwụọ.

    Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ha nụrụ ka egbe na-ada dịka a gbagburu ndị ịzrel abụọ na nso ụlọ nchekwa ihe gboo nke mba Izrel na mgbede Wenezde.

    Yoni Kalin na Katie Kalisher gwara BBC na nwamadi ahụ gbara egbe ahụ mechara bata n'ime ụlọ nchekwa ihe gboo ahụ "dị ka onye nọ na nsogbu" ma kwukwa na ọ bụ ya mere ihe ahụ.

    Kalin gwara BBC sị, "Ọ sịrị: 'Ọ bụ mere ya" ma gaa n'ihu kwu sị, : "Emere m ya maka Gaza. Tọhapụ Palestine."

    Ndị uweojii ngalaba 'Metropolitan Police Department (MPD)' kwuru na nwoke na nwaanyị ahụ si emume a na-eme na ụlọnchekwa ihe gboo ala oge ya bụ ihe mere.

    Onyeisiuweojii MPD bụ Pamela Smith kwuru na a hụrụ Rodriguez, ka ọ na-agbago na agbada n'iro ụl nchekwa ihe gboo ahụ tupu ọ malite gbawa mmadụ ano yịkọ ọnụ egbe.

    Ndị uweojii kwukwara na ọ gakwara n'ime ụlọ nchekwa ihe gboo ahụ bụ ebe a nwụchiri ya, dịka ọ nọ na-eti, "Tọhapụ Palestine".

    MPD na-ekwu na ihe anyammiri ahụ bụ mpụ metụtara iyi ndụ egwu maọbụ akpọmasị agbụrụ.

    Onye nnọchiteanya mba Izrel na Amerịka bụ Yechiel Leiter, bụ onye kwuru na ọdachi ahụ bụ ,"ihe obi mgbawa" nye ha, gwara ndị ntaakụkọ sị, "Nwata nwoke ahụ zụrụ ọla aka ọ ga-eji kwe nke nwaanyị nkwa ọlụlụ n'izu na-abịa na Jerusalem."

  15. Ndeewonụ, Igbo ndị ọma.

    Soro anyị ebe a maka akụkọ ndị dị mkpa n'ụwa taa.

  16. Ndị ọkwọụgbọala emeela ngagharịiwe n’Imo steeti n’ihi ebubo mmekpaahụ ndị ENTRACO

    Ndị na-akwọ ụgbọala bọọsụ n’isi obodo Imo steeti bụ Owere egosila iwe ha maka ebubo mmekpaahụ ndị ọrụ ENTRACO na steeti ahụ.

    Ụlọọrụ Environmental Transformation Commission (ENTRACO) bụ ha na-ahụ maka nnwogharị gburugburu n’Imo steeti.

    Oge ọ na-agwa onye ntaakụkọ BBC News Igbo okwu, otu n’ime ndị ọkwọụgọala ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ndị ọrụ ENTRACO na-enyekarị ha nsogbu oge ọbụla ha kwụsịrị ụgbọala ka ndị njem pụta ma kwuo na e nweghị ebe ọbụla gọọmenti wepụtara maka ịkwụsị maọbụ iburu ndị njem.

    O kwuru na ihe ọzọ ENTRACO ji enye ha nsogbu bụ maka mkpuchi ojii ha tinyere n’ụgbọala ha iji gbochie anyanwụ inye ha nsogbu oge ha na-akwọ ụgbọala.

    Onye nke ọzọ na-achọghịkwa ka a kpọọ aha ya kwuru na ndị ọkwọụgbọala kpebiri ime mkpesa ahụ n’ihi omume ọjọọ ndị ọrụ ENTRACO na-emeso ha.

    O kwuru na ihe ndị ENTRACO kpọrọ ugegbe ojii (tinted glass) bụ ihe ndị rụrụ ụgbọala bọọsụ ha tinyere na ya iji nyere ha aka ịhụ ụzọ nke ọma mgbe anwụ na-awa.

    Ha kwara arịrị gbasara ụzọ ha na ndị ENTRACO si azọ ụgbọala n’okporoụzọ nakwa puku naịra iri ise na otu a na-anapụ ha tinyere mmanye a na-amanye ha ka ha binye aka n’akwụkwọ na ha agaghị akwọ ụgbọala n’okporoụzọ ndị e nwere na steeti ahụ ọzọ, ma ọ bụghị ya gọọmenti eburu ụgbọala ha.

    Ha kpọkuru gọọmenti Imo steeti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka.

    Ka o sinadị, ụlọọrụ Imo State Environmental Transformation Commission (ENTRACO) ekwuola na ọ bụghị ndị ọrụ ha na-achụgharị ndị ọkwọụgbọala n’ihi ‘tinted glass’.

    Nke a dị n’ozi ọnụ na-ekwuchitere ENTRACO bụ Darlington Chidera Ibekwe mere ka o rute ndị ntaakụkọ aka n’ụbọchị Tuzde 20 Mee 2025.

    Ibekwe sịrị na ọ bụ aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma nọọrọ n’ụbọchị 23 Eprel 2025 nye iwu ka a kpachie ụgbọala bọọsụ niile nwere ugegbe ojii na steeti ahụ.

    Dịka o siri kwuo, Uzodimma nyere iwu ahụ dịka a chọpụtara na ụfọdụ ndị nwere ụdị ụgbọala ahụ ji ya na-eme arụ dị iche iche gụnyere ịtọrọ mmadụ, iji egbe ezu ohi na mpụ ndị ọzọ.

    Ibekwe gara n’ihu kọwaa na kọmịshọna na-ahụ maka ime njem n’Imo steeti bụ Emeka Okoronkwo hiwere otu ọtawa ike pụrụiche ga-ahụ maka itinye iwu ahụ n’ọrụ, bụ nke Chinasa Nwaneri nọ n’isi ya.

    Ọ kọwara na ndị mejupụtara otu ahụ bụ ndị si na mịnistrị na-ahụ maka njem, ndị otu NURTW, ndị ọrụ DSS, ndị uweojii na ndị Civil Defence.

  17. Izrel ji agụụ mere ngwa agha - Minista UK

    Mịnịsta na-ahụ maka mmepe na mba UK bụ Jenny Chapman ebola Izrel ebubo na ha ji agụụ dịka ngwa agha.

    Chapman kwuru nke oge o mere njem nleta na mpaghara West Bank.

    Nke a na-abịa otu abali odeakwụkwọ mba ofesi UK bụ David Lammy katọrọ mwakpo Izrel na-awakpo Gaza nke mere ka UK kwụsịtụ mkparịtaụka azụmahịa n’etiti ha na Izrel.

    Ndi Palestine nọ na Gaza na-eche ka ndị enyemaka bata dịka Izrel belatara mgbochi ha tinyere nke kemgbe izuụka iri na otu.

    Ndị ọrụ Izrel kwuru na nnukwu ụgbọala 93 batara Gaza ụbọchị Tuzde 20, Mee, 2025 ebe ndị ọrụ UN kwuru na ha enwegbeghị ike ikesa nri na ihe enyemaka ọbụla.

    Ndị bi na Gaza gwara BBC na ọnọdụ obibi ha na-akawanye njọ kwa ụbọchị ebe ndị ọkachamara na-ekwu na e nwereike inwe ụkọ nri ebe ahụ.

  18. E nwetala ọgwụ mgbochi Gonorrhea mbụ n'ụwa

    England ga-ab mba mbụ n'ụwa a ga-amalite ịgba ọnwụ mgbọchị ọrịa gonorịa bụ ọgwụ a na-enweta site na mmekọrịta nwoke maọbụ nwaanyị.

    Mana ọgwụ abghị maka onye ọbụla dịka a ga-agbado anya na ndị na edina ụdị ha nakwa ụmụnwoke na-edina ma nwoke, ma nwaanyị bụ ndị ha naọ ọtụtụ mmadụ dịnalara maọbụ ndị nwere ọrịa a na-ebute site na mmekọrịta.

    Mmalịte ọgbụgba ọgwụ a sị ji 30-30 pasent dị ire ga-amalite dịka nkesa ọrịa gọnọrịa na-arị elu n' Ingland.

    N'afọ 2023, e nwere mmadụ 85 butere ọrịa gonoria, nke bụ ọnụọgụgụ kachasị na ndị butere ọrịa ahụ kemgbe afọ 1918.

    Gonorịa bụ ọrịa anaghị egosi onwe ya mgbe abụala mgbe mana oge ụfọdụ ọ na-eji ahụ ụfụ, ọzịza ahụ nwoke maọbu ahụ nwaanyị , mmiri ahụ na-acha etu o kwesịghị na amụtaghị nwa, abịa.

    Na mba Briten, ndị ọrịa gonorịa kachasị metụta bụ ndị dị agbata afọ 16 rue afọ 25, ụmụnwoke maọbụ ụmụnwaanyị na-edina ibe ha amọbụ ndị na-edina ma nwoke, ma nwaanị nakwa ndị isiojii na ndị si mba mmiri Karibian.

  19. Mmadụ ise anwụọla dịka ogbunigwe gbara ụgbọala ụmụakwụkwọ na Pakistan

    Ogbunigwe a tụrụ ụgbọala bụ ụmụakwụkwọ na mpaghara Balochistan dị na pakistan egbo=la opekata mpe mmadụ ise ,ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụụ ahụ.

    ụgbọala ahụ bụ ụmụakwụkwọ 40 gbara n'Elekere Asaa na mpaghara obodo Khuzdar,dịka ndịuweojii siri gwa BBC.

    Mmadụ atọ n'ime ndị nwụrụ bụ ụmụaka dịka ndị uweojii siri kwuo.

    Foto ihe mere na-efegharị na soshal midia gosiri akpakara ụgbọala gbara ọkụ nakwa akpa akwụkwọ ụmụakwụkwọ fesasịrị ebe nile.

    O nwebeghị ndị kwuru na aka ha dị na mkpamkpa ahụ.

    Mana Balochistan bụ mpaghara dị n'ọdịda anya nwụ mba ahụ bụ ebe a na-nwe nsogbu ndị agha nnupusi nakwa mbibi ikike dịịrị onye.

  20. A maala onye bụbu Praịm Minista mba DR Congo ikpe maka mpụ ego

    A maala onye bụbu praịm minista mba Democratic Republic of Congo (DRC) ikpe ma nye ya ntaramahụhụ ịrụ ọrụ siri ike ruo afọ iri n’ihi mpụ na nrụrụaka ego.

    Ụlọikoe mara Augustin Matata Ponyo ikpe maka izu ego ruru nde dọla 245 ($245m) nke pụtara nde yuro 182 (£182), nke a sị ya Deogratias Mutombo bụbu onyeisi ụlọụka etiti mba ha.

    Ọkaiwu Matata gwara ụlọọrụ ntaakụkọ Reuters na ikpe ahụ ezighi ezi na aka ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị na ya.

    Ụfọdụ ego ndị ahụ ka e si n’ego a hiwere iji wulite ọnọdụ ọrụ ugbo maka igbo nsogbu ụkọ nri dị n amba DR Congo.

    Matata rụrụ ọrụ dịka praịm minista mba DRC site n’afọ 2012 ruo n’afọ 2016 ma bụrụ onyendu ngalaba na-ahụ maka ndị ndu na mwulite ọchịchị na mba ha ugbua.

    Tupu ọ bụrụ praịm minista, ọ bụbu minista na-ahụ maka akụnaụba, ebe ụlọakụ mbaụwa bụ IMF toro ya maka ime ka akụnaụba mba ha gbasie ike.

    N’otu aka ahụ, a makwara onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti ha ikpe ma nye ya ntaramahụhụ ịrụ oke ọrụ ruo afọ ise.

    Mmanye ịrụ ọrụ ike a bụ iwu n amba DR Congo ma ọ bụrụ na ụlọikpe nye iwu ahụ.

    Mmadụ abụọ agaghị arụrụ ọha ọrụ maọbụ zọọ ọchịchị ruo afọ ise malite na ngwụcha ọrụ ike e nyere ha.

    Both men have been barred from public service for five years from the end of their terms of forced labour, the AFP news agency reports.

    Matata agọọla ọtụtụ mgbe na aka ya dị ọcha n’ebubo ndị ahụ e boro ya.

    E kpele ikpe ahụ ihe ruru afọ anọ kamgbe ụlọọrụ na-ahụ maka akụnaụba chọpụtara ma kwupụta maka ego ahụ.