Gọọmentị mba Kenya ekwuola na ọ bụ 'ihe ihere" akpụkọụkwụ a tụrụ Onyeisiala ha bụ William Ruto ebe ọ gara ọgbakọ mbara ama Ụbọchịụka.
Onye ntaakụkọ BBC bụ Basillioh Rukanga, onye dere akụkọ a kwuru na ihe onyonyo fegharịrị gosiri ka akpụkpọụkwụ tụrụ onyeisiala n'aka ekpe dịka ọ na-ekwu okwu.
Ọnụ na-ekwuru gọọmentị bụ Isaac Mwaura katọrọ ihe mere ma sị ka ' anwụchie " ndị mere ya.
Mwaura kwuru n'ozi o wepụtara n'akara ọbaozi ya na X, sị," Kedụ ihe ga-eme ma a sị onye ọbụla tụwa ibe ya akpụkpọụkwụ?"
"Kedụ ihe anyị na akụziri ụmụaka anyị ugbua?" dịka ọ kpọrọ oku ka a kwanyere onyeisiala ugwu.
Ụfọdụ ndị omeiwu katọkwara akpụkpọụkwụ ahụ bụ nke ha sịrị na o bụ nnukwu ihe metụtara nchekwa onyeisiala.
Onyeisiala Ruto na-agwa igwe ndị mmadụ okwu na Migori County dị n'Ọdịda Anyanwụ mba ahụ dịka ọ gara njem abalị atọ iji gbapee ụfọdụ ọrụ mmepe obodo a rụrụ nakwa malite ndị ọhụrụ..
Mana dịka ụfọdụ na-ekwu na ịtụ onyeisiala akpụkpọụkwụ bụ mkparị, ụfọdụ kwuru na ọ na-egosi obi adịghị ndị mmadụ n'ihi ndakpọ ọnọdụ akpụnaụba mba ahụ..
Ihe onyonyo nke Onyeisiala wepụtara n'akara X ya egosighị ebe ahụ a tụrụ ya akpụkpọụkwụ.
Mana o gosiri obere mmalite gidigidi n'etiti igwe mmadụ.
A na-anụ ka Onyeisiala na-agwa ndị ọrụ nchekwa chọrọ ịchọ onye mere ihe ahụ ka ha hapụ ndị mmadụ.
N'otu ntabianya , o nweghịkwa ihe ọzọ a hụrụ.
Akpụkpọụkwụ ahụ a tụrụ na-abịa dịka nsogbu nchekwa ndị ọchịchị obodo na-arị elu..
N'isuụka gara aga, ndị bu egbe bu ọgbatumtum gbagburu otu onye ụlọomeiwu nọ na pati abụghị nke nọ n'ọchịchị n' isobodo Nairobi.
Nelson Koech, bụ onye omeiwu nọ na pati onyeisial kwuru na ihe mere n'Ụbọchịụka bụ "ichere ọchịchị onyekwuoucheya aka mgba", ma kwukwa sị, "Anyị ewerela ekwemnaka a gafee nku aka".
"Chegodi ma ọ bụrụ na akpụkpọụkwụ ahụ bụ mgbọegbe.. Ndị mmadụ ji nchekwa Onyeisiala eme ihe egwu."?.
Ọ gwara ụlọntakụkọ 'Citizen TV' sị, "Anyị kwesirị ichekwa Onyeisiala."
Migori dị na mpaghara a na-ahụta ka ebe onye ndọrọndọọ ọchịchị nke pati anọghị na gọọmentị a ma ama bụ Raila Odinga, onye ya na Ruto zọkọrọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2022 si pụta.
Odinga na Ruto nwere nkwekọrịta n'ọnwa Maachị iji "nye aka ka odejijij na-ede na mba ahụ kwụsịlata", dịka ngagharịiwe megide ịkwụ ụtuisis kpọtụrụ na mba ahụ n'afọ 2024.
Kemgbe Ruto banyere ọkwa Onyeisiala n'afọ 2022, e nweela ngaghaịrwe megide mgbali ọnu ahịa nakwa mbuli ụtụisi.