Otu onye anwụọla ebe mmadụ isii merụrụ ahụ n'ihi mmanụ ọkụ "gas" tiwara n'ahịa Anambra
Ndị uweojii ekwuola na otu onye nwụrụ ebe mmadụ isii ndị ọzọ merụrụ ahụ dịka mmanụ ọkụ “gas” tiwara n’ahịa ọgbọ osisi dị nso n’Ọnịsha Bridge Head dị n’Anambara steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ihe mberede ahụ mere n’ụbọchị Fraịde 16 Mee 2025, mgbe onye welda ji karbide arụ ọrụ n’ígwè.
Ikenga kwuru na ndị uweojii ngalaba Ọnịsha Head Bridge tinyere aka site na-esonyere ndị na-anapụta ndị ahụ ntiwa mmanụ ọkụ “gas” merụrụ ahụ.
O kwuru na nnyocha mbụ gosiri na onye welda na-arụ n’ígwè mgbe silinda gas ya tiwara n'ihi oke okpomọkụ.
O kwuru na mmadụ isii ndị ahụ a napụtara n’ihe mberede ahụ na-enwete neleta n’ụlọọgwụ ugbua dịka e tinyere onye nwụrụ anwụ n’ọba ozu.
Ọ gara n’ihu kwuo na ndị uweojii emeela ihe iji chekwaa ebe ahụ ma gbochie ndị na-achọ iji ohere na ọnọdụ ahụ eme mpụ.