You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Hamas ekwela ịtọhapụ mmadụ iri ha ji ma chọọ nkwụsị agha na-adịgide na nzaghachi mba Amerịka

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Mee 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Ụtụtụ ọma ndị be anyị

    Anyị na-asị gị nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ ahịa Orie Fraịde 2 Mee, 2025.

    Gaa n'ihu sonyere anyị n'akara soshal midia anyị dị iche iche maka ọtụtụ akụkọ ndị ọzọ na ihe onyonyo anyị ga-ewetara gị ebe ahụ.

    Ndewo.

  2. ‘Akwa ụnụ na-emetụ anyị n'obi’ – Ka Tinubu gwara ndị ọrụ Naịjirịa

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ekwuola na ọ ga-eme ihe niile o nwere ike ya ịhụ na ọnọdu ndi ọrụ gbanwere nke ọma iji mee ha obiọma.

    Tinubu kwere nkwa a site n'aka Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Muhammad Maigari Dingyadi n’ụbọchị 1 Mee 2025 oge a na-eme emume ụbọchị ndị ọrụ n'Abuja.

    O kwụrụ na goomenti ya na-eme ọtụtụ ihe ịhụ na ihe dịịrị ndi ọrụ mma.

    Ọ sịrị na ọ na-adị mma ka gọọmenti na ndị ọrụ na-enwe ohere ịkparịta ụka na ịgbanwerịta echiche maka ọdimma mmadụ niile.

    Ọ gara n’ihu kwuo na Naịjirịa na-achọ ịbịanye aka na nkwekọrịta Global Coalition for Social Justice nke otu International Labour Organisation iji hụ na usoro usoro ọrụ nke Naịjirịa abụghị naanị ihe na-emetụta ezi akparamaagwa n'ụlọoru, mana ka a na-anụ olu ndị ọrụ Naịjirịa nke ọma na mbaụwa niile.

    O mekwara ka ndị ọrụ mara mbọ gọọmenti na-agba ịhụ maka ọdimma ha ma hụ na a na-emeso ndị ọrụ niile omume ziri ezi dabere n'ogogo a nabatara na mbaụwa.

    O kwuru na ọ na-edozi nsogbu nke enweghị ọrụ.

    Maigari Dingyadi kwuru na mịnịstrị ya wepụtara ihe a kpọrọ Labour Employment and Empowerment Programme (LEEP) iji gbasaa ohere ọrụ ma nye ụmụ ntorobia ohere ịmụ ọrụaka dị oke mkpa.

  3. Anyi na-ata ahụhụ, ugwọọnwa anyị anaghị ezuru anyị - Ndị ọrụ Ebonyi steeti

    Ọtụtụ ndi ọrụ n'Ebonyi steeti ekwuola na ha na-ata ahụhụ ịkwụ ụgwọ ụlọ na ime ihe ndị ọzọ e ji ego eme.

    Ndi ọrụ kwuputara nke a n’ụbọchị 1 Mee 2025 oge a na-eme emume ụbọchị ndị ọrụ.

    Ha gara n’ihu kwuo na ọnụahịa arịala elu mana ugwọọnwa gọọmenti na-akwụ anaghị ezuru ha.

    Otu n’ime ndi ọrụ ahụ bụ Comrade Igwe Linus gwara BBC Igbo na "ubọchi taa ndị ọrụ na-enwe ohere ịgbakọ n’igwe were otu ọnụ gwa gọọmenti ụdị ahụhụ ha na-ata nakwa ihe ha chọrọ ka e meere ha."

    O kwuru na ndi ọrụ na-ata oke ahụhụ nke kpatara na ha rụchaa ọrụ nara ụgwọọnwa ha, o nweghị ihe bara uru ha na-enwe ike iji ya zụta n'ahia.

    Ọ gakwara n’ihu na-arịọ ka gọọmenti nyere ha aka site n'iwelite ụgwọọnwa ndị ọrụ ma rụọ ụlọ obibi dị ọnụ ala maka ụgwọ ụlọ n'Ebonyi steeti arịala elu.

    Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu bụ Happiness Ojeogu, o kwuru na e kwesịrị ime ka obiọma na-akpa ndi ọru mana ka ihe siri dị ugbua, obi ojọọ na emezi ha maka o nweghị uru ụgwọ a na-akwu ha na-abara ha.

    Cheta na ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee afọ ọbula ka a na-eme emume ụbọchị ndị ọru.

  4. Onye kachasị bụrụ okenye n’ụwa anwụọla ka ọ gbachara afọ 116

    Onye kachasị mee agadị n’ụwa dum bụ Sister Inah Canabarro anwụọla ka ọ gbachara afọ otu narị na iri na isii (116).

    Nwaanyị Brazịl ahụ bụ onye a mụrụ n’ụbọchị 8 Juun, 1908 na Rio Grande do Sul steeti dị na mpaghara ndịda mba ahụ.

    Sister Inah Canabarro malitere ọrụ dịka onyenkụzi n’ụlọụka oge ọ dị afọ iri abụọ (20).

    N’afọ 2018, Popu Francis gọziri Sister Inah Canabarro maka mbọ niile ọ na-agba ịga ozi dịka onye na-eso ụzọ Kraịst.

    Ezinaụlọ ya kwuru na ọ na-eji achịcha dị ka ọgbọ egwuruegwu bọọlụ echeta ụbọchị ọmụmụ ya kwa afọ n’ihi ịhụnanya o nwere maka egwuruegwu bọọlụ dịka ha sịrị na ọ na-akwado otu egwu bọọlụ Porte Alegre oge ọ dị ndụ.

    Otu n’ime ikwu na ibe Inah sịrị na agadị nwaanyị ahụ anataghị ụdị ọgwụgwọ ọbụla tupu ọ nwụọ mana ụfọdụ akụkụ ahụ ya kwụsịrị ịrụ ọrụ.

    Ka ọ dị ugbua, okpueze onye kachasị bụrụ okenye n’ụwa agaala n’isi nwaanyị England dị afọ otu narị na iri na ise (115) aha ya bụ Ethel Caterham.

  5. Mba DR Kongo na-achọ ka e wezuga mkpuchi Kabila bụụrụ onyeisiala ha

    Ndị ọchịchị mba DR Kongo na-achọ iwezuga ihe mkpuchi onye bụụrụ onyeisiala ha bụ Joseph Kabila n'ihi na ọ na-egbochi ha ikpe ya ikpe maka ebubo ịkwado ndị agha nnupuisi na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba ahụ.

    Minista na-ahụ maka ikpe ziri ezi na DR Kongo bụ Constant Mutamba kwupụtara n’ụbọchị Wenezde na e nwere “ọtụtụ akwụkwọ, akaebe na ihe ndị ọzọ anya na-ahụ” na-egosi na Kabila na ndị otu M23 nwere ihe jikọtara ha.

    Ka o si kwụrụ ugbua, ndị otu M23 na-elekọta mpaghara ọwụwa anyanwụ DR Kongo akụrụngwa ndị si na chi jupụtara na ya kemgbe ha kpachiri mpaghara ahụ na mmalite afọ a.

    Mana ka ọ dị, Kabila dị afọ iri ise na atọ (53) ekwubeghị okwu ọbụla gbasara ebubo ahụ mana ọ nọrọla n’oge gara aga kwuo na e nweghị ihe jikọtara ya na ndịagha nnupuisi ahụ.

    Cheta na Kabila chịrị mba DR Kongo afọ iri na asatọ (18) oge ọ nọchiri nna ya bụ Laurent, onye a gbagburu n’afọ 2001 oge Kabila ka dị afọ iri abụọ na itoolu (29).

    Oge ọ pụrụ n’ọchịchị, e chiri ya “senator for life” bụ nke nyere ya mkpuchi n’ụzọ iwu kwadoro.

  6. A gbagbuola onye omeiwu Kenya oge e mere mwakpo na Naịrobi

    A gbagbuola otu onye omeiwu mba Kenya bụ Charles Ong'ondo Were oge ndị ojiegbe bu ọgbaatumtum mere nwakpo n’ogbe ndị nọ n’isi obodo mba ahụ bụ Naịrobi.

    Ndị uweojii kwuru na ndị ojiegbe ahụ nọ kemgbe na-esogharị ụgbọala Charles Ong'ondo tupu otu n’ime ha awụtuo n’ọgbaatumtum ma nọrọ nso gbaa ya egbe.

    N’ozi ọ wepụtara, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Muchiri Nyaga sịrị na “ọdịdị arụ ahụ dị ka nke e yiri eyi ma kpachapụ anya mee.”

    Dịka ụlọmgbasaozi dị na Kenya siri kwuo, onye omeiwu ahụ bụụrụ onye pati na-agba gọọmenti ụkwụ nọọrọ ọnwa abụọ gara aga nye mkpesa maka egwu a na-eyi ndụ ya.

    Oge a gbachara egbe ahụ n’abalị Wenezde, onye ọkwọụgbọala ya na onye nche ya mgbọ na-atụtaghị gbalịrị bugaa onye omeiwu ahụ ụlọọgwụ Nairobi Hospital ozugbo bụ ebe a nọọrọ kwuputa na ọ nwụọla tupu ha abịaruo.

    E mere mwakpo ahụ n’okporoụzọ Ngong dị n’akụkụ otu ọgbaa gburugburu na-ekwo ekwo nke ndị ntụziaka okporoụzọ na onyonyoo nchekwa na-elekọta.

    Ndị uweojii sị na ha wụchiri n’ogige ahụ ngwangwa a gbachara ya bụ onye omeiwu egbe dịka ha malitere ime nnyocha ugbua.

    Onyeisiala Kenya bụ William Ruto agwala ndị uweojii ka ha mee ezigbo nnyocha miri emi gbasara mwakpo ahụ gbakwunye “na a ga-eme ka ndị aka ha dị na ya nata ụgwọ ha.”

    A matabeghị ihe mere e ji gbuo onye omeiwu ahu na-anaghị ekwusi okwu ike mana o boro ebubo na mgbe gara aga kwuo na ndị omekome e goro ego na-akpa nkata imemila ya n’ihi ndọrọndọrọ ọchịchị.

  7. Yukren, Amerịka bịnyere aka na nkwekọrịta akụ na ụba sitere n'okike maka ịkwụsị mwakpo Rọshịa

    Mba Yukren na Amerika binyere aka na nkwekọrịta akụ na ụba sitere n’okike n’etiti mba abụọ ahụ.

    Nkwekọrịta ahụ bụ ka ha abụọ kee uru a ga-enweta mgbe a ga-ere akụ na ụba sitere n’okike dị na Yukren na ọ dị n’ihu.

    Cheta na nke a na-abịa na mmezu ka ọ gachara ọnwa ole ma ole Onyeisiala mba abụọ ahụ wechere nhọtafe.

    Nke a bu ihe ga-enyere aka ka mba Amerịka nweike ị na-etinye ego na-akwado nchekwa mba Yukren.

    Mana ka mba abụọ a na-ebinyeaka na nkwekọrịta ahụ ka ogbunigwe mba Rọshịa tụrụ na Yukren gburu mmadụ abụọ ma meruo mmadụ ruru ise ahụ na mpaghara Odesa dịka gọọmenti ebe ahụ siri kwuo.

    Ugbua, a na-atụ anya ihe mba Rọshịa ga-eme dịka Amerịka na Yukren binyere aka na nkwekọrịta a.

  8. Ụmụ Igbo anyị ekele unu

    Ndenwo maka ị nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tozde 1 Mee, 2025.

    Ka ọnwa ọhụrụ a nwetere anyị niile udo na ọganiru.

    Mara na ọ bụ Michael Ilediagu ga-ewetara unu akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa, Afrịka na mba ụwa niile n'ụtụtụ a mana Chinonso Ugorji ga-esonyere anyị n'oge ehihie.

    Udo dịrị unu!