Trump ekpuheela atụmatụ ịrụ ‘Golden Dome’ ga-echekwa ihu eluigwe mba Amerịka megide ogbunigwe
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekpugheela atụmatụ ha ịrụ ngwaagha ga-egbochi ogbunigwe ịda na mba ha.
Trump dị na mbụ kwepụta mmasị ya ịrụ ngwaagha nchekwa ahụ, nke ọ kpọrọ ‘Golden Dome’ na Bekee, ma ọ bụrụ ọ banye n’ọkwa n’afọ 2025 ma kwuo na ngwaagha nchekwa ga-arụ ọrụ tupu ọ na-arịtu n’ọkwa n’afọ 2029.
Onyeisiala Trump kwuru na ngalaba ndịagha ụgbọelu mba Amerịka ga-arụ ngwaagha nchekwa a, nke ọnụego ya bụ otu narị ijeri dọla na ijeri iri asa na ise ($175bn).
O kwuru na igwe mgbochi ogbunigwe a ga-enwe akụrụngwa tekịnụzụ ọgbara ọhụrụ, iji chekwaa mba ha megide ogbunigwe ndị e si n’elu tụbata site na mpaghara ụwa ọbụla.
O kwuru na mba Amerịka etinyekwala uche n’isonye n’atụmatụ nchekwa ahụ ga-agbaso ntọala nke ndị Izrel, bụ nke na-echekwa mba Izrel kamgbe afọ 2011.
Dịka ọ dị ugbua, e tinyela ego ruru ijeri dọla iri abụọ na ise ($25bn) n’ọrụ ahụ site n’agba mbụ nke mkpata na mmefu – gọọmentị Amerịka kwuru na ngwa nchekwa ahụ nwereike iri ọtụtụ ego karịa ihe a na-atụ anya ya.
Ndị ọrụ gọọmentị kwuru na ụdịrị nchekwa mba Amerịka nwere ugbua agaghị egbochinwu mwakpo site na mba na-ebuso ha agha bụ ndị ji tekịnụzụ ọgbara ọhụrụ arụpụta ngwaagha ha.
Onyeisiala Trump kwuru na onye ga-anọ n’isi ọrụ ahụ bụ ọchịagha Michael Guetlein nke ngalaba ndịagha nchekwa n’Amerịka ma bụrụkwa osote onyeisi ndịagha ụgbọelu.
O kwuru na ngwaagha nchekwa a ga-enyochapụta, gbochie ma mebie ogbunigwe ọbụla e si na mpaghara ọbụla na mbaụwa tụọ.