Onyeisiala mba Rọahịa bụ Vladimir Putin ga-ezute onye ozi pụrụiche nke mba Amerịka bụ
Steve Witkoff n’obodo Moscow n’ụbọchị Tuzde, dịka isiụlọọrụ gọọmenti ‘White House’
nke Amerịka kwuru na ha na-atụ anya inwe nkwekọrịta maka nkwụsị agha Yukren.
N’otu aka
ahụ, a na-atụkwa anya na Jared Kushner bụ ọgọ nwoke Onyeisiala Donald Trump nke
Amerịka ga-eso na mkparịtaụka ahụ.
Ọgbakọ ahụ
na-abịa n’ime ụbọchị abụọ mba Amerịka na Yukren zutechara onwe ha ma nwee mkparịtaụka
nke Witkoff na Kushner so na ya, nke ga-edozi atụmatụ nkwekọrịta udo nke Amerịka
wepụtara e kwuru na mba Rọshịa nabatara.
Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky kọwaara mkparịtaụka
ahụ dịka ihe “dị mma kwuo na e nwere ụfọdụ okwu ndị ọzọ siri ike e kwesiri ileba
anya.”
Mgbe ya na onyeisiala mba bụ Emmanuel Macron nwechara mkparịtaụka
n’ụbọchị Mọnde, Zelensky kwuru na ihe kachasị dị ha mkpa bụ Yukren ịkwụ onwe ya
dịka mba ma nwee nkwa nchekwa.
O kwuru na ihe gbasara okeala ka bụ okwu kachasị sir ike n’atụmatụ
udo ahụ dịka mba Rọshịa na-esi ọnwụ ka Yukren hapụrụ ha ụfọdụ okeala dị na
mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ nke ha ka ji.
Witkoff nwekwara mkparịtaụka n’etiti Praịm Mịnịsta mba Briten
bụ Keir Starmer, Zelensky nakwa onyeisi mkparịtaụka ọhụrụ nke mba Yukren bụ
Rustem Umerov ebe ndị ndu mba Yurop sonyere ha n’ọbaozi ịntanetị.