You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Peter Obi awụbala otu ndọrọndọrọ ọchịchị ADC

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Disemba 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Farouk Ahmed, Gbenga Komolafe arịtuola n’oche dịka ndị isi ụlọọrụ NMDPRA na NUPRC

    Farouk Ahmed arịtuola n’oche dịka Onyeisi ụlọọrụ ‘Nigerian Midstream and Downstream Petroleum Regulatory Authority (NMDPRA)’ ebe Onyeisiala Bola Tinubu wegara ụlọomeiwu aha onye ga-anọchi ya.

    Bayo Onanuga bụ onye ndụmọdụ Onyeisiala Naịjirịa mere ka a mata nke a n’ihe o depụtara n’akara X soshal mịdịa ya.

    Gbenga Komolafe ritukwara n’oche dịka onyeisi ụlọọrụ 'Nigerian Upstream Petroleum Regulatory Commission' (NUPRC).

    Onyeisiala Tinubu wegara aha ndị ọ chọrọ ka ha nọchịe Farouk na Gbenga n’oche n’ụlọomeiwu makai me ha nnyocha.

    Oritsemeyiwa Amanorisewo Eyesan ka e wepụtara dịka onyeisi ụlọọrụ NUPRC ebe Saidu Aliyu Mohammed ga-anọ n’isi ụlọọrụ NMDPRA ma ọ bụrụ na ndị Sịneti Naịjirịa nabata ha.

    Cheta n'abalị ole ma ole garaaga ka Aliko Dangote bụ onye ji ego achụnta ego ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ Dangote Group kwuru na ọ bụ nrụrụaka dí n’ụlọọrụ Nigerian Midstream and Downstream Petroleum Regulatory Authority (NMDPRA) so emetụta ọnọdụ nrụpụta mmanụ ụgbọala na Naịjirịa.

    Dangote si na "etu onyeisi ụlọọrụ NMDPRA bụ Farouk Ahmed si eri ego na ndụ ya gafere ihe onye ọrụ gọọmenti ọbụla nwereike ime”.

    Dangote kpọrọ oku ka e mee nnyocha banyere ebubo o boro Farouk, n’okwu ya “ụlọọrụ na-ahụ maka ndị ọrụ bụ 'Code of Conduct Bureau' maọbụ ngalaba gọọmenti ọbụla na-ebu agha emegide nrụrụaka kwesiri ime nnyocha n’ebubo a”.

  2. Gọvanọ Mbah enyela mmadụ abụọ ọrụ kọmịshịọna ọhụrụ, nyekwa ọtụtụ ndị ọzọ ọrụ

    Gọvanọ Peter Mbah na-achị Enugwu steeti ewepụtala mmadụ abụọ a ga-enye kọmịshịọna nakwa ọtụtụ ndị ọzọ ga-abụ ndị isi ụlọọrụ dị icheiche.

    Dịka Odeakwụkwọ Gọọmenti Enugwu bụ Chidiebere Onyia mere ka a mata nke si kwuo “ndị Gọvanọ Mbah nyere ọrụ kọmịshịọna bụ Ọkaiwu Osinachi Nnajieze na Dọkịnta C. O. C. Egumgbe”.

    Ndị ọzọ o nyere ọrụ gunyere Kenechukwu Nnamani ga-abụ Onyeisi ụlọọrụ ‘Enugu State Investment Development Authority (ENSIDA), James Chukwuemeka Mbah ga-abụ odeakwụkwọ ‘Secretary, Enugu State Scholarship and Education Loans Board’, na Dọkịnta Eric Oluedo ga-abụ Odeakwụkwọ “Local Government Staff Pensions Board” Sylvia Onwubuemeli ga-abụ Odeakwụkwọ Enugu State Library Board, na ndị ọzọ.

    Chidebere Onyia kwuru na Gọọmenti Enugwu ezigala aha mmadụ abụọ ndị ahụ ga-abụ kọmịshịọna ka ụlọ omeiwu na steeti ahụ mee ha nnyocha.

  3. Ahmed Musa alaala ezumike nka n' ịgbara ‘Super Eagles’ Naịjirịa bọọlụ

    Ahmed Musa ekwuola na ya alaala ezumuike nka n’ịgbara ‘Super Eagles’ Naịjirịa bọọlụ.

    Musa kwuru nke a dịka ọ gbachara Naịjirịa bọọlụ afọ iri na ise.

    N’okwu ya o wepụtara n'akara ọbaozi ya ụbọchị Wenezde, Musa sịrị,“E nwere m mmasị ịla ezumike nka n’ịgbara Naịjirịa bọọlụ, nke a ga-eweta afọ iri na ise(15) m na-agbara ‘Super Eagles’ bọọlụ n’isi njedebe”.

    O ji ohere ahụ cheta ọtụtụ ihe mere ya obi ụtọ mgbe ọ na-agbara Naịjirịa bọọlụ.

    Ahmed Musa gbara Naịjirịa bọọlụ ugboro 111.

    Ọ gbara ndi U-20, gbaa U-23 tupu ọ banye na ‘Super Eagles’ ma mechaa bụrụ onye isi ọgba bọọlụ a na-akpọ ‘captain’ n’olu Bekee.

  4. A kpụpụla Naveed Akram, onye e boro ebubo igbu ọtụtụ mmadụ n'Ostrelia ụlọikpee

    A kpụpụla Naveed Akram bụ onye a na-enyo gbagburu ọtụtụ ndị mmadụ n'ikperemiri 'Bondi Beach' dị na Sydney, Ụbọchịụka, ụlọikpe maka ebubo 59 nke gụnyere igbu ọchụ nakwa iyi ndụ egwu,dika ndị uweojii New South Wales si kwuo.

    Nna ya bụ Sajid Akram gbara afọ 50 nwụrụ dịka ya na ndị uweojii kwarịtara mgbọ n'ebe ya bụ ihe mere.

    E gburu mmadụ 15 , ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ na mkpamkpa ahụ mere n'ogbe ndị Juu nọ n'Ostrelia dịka ha na-eme emume Hanukkah.

    Nke a bụ mgbọ a kwara n'ọha kachasị taa isi ndị mmadụ

    kemgbe afọ 1996.

  5. Igbo mma mma nụ o!

    Igbo mma mma nụ o!

    Ndụ mmiri, ndụ azụ!

    Bịa sonyere anyị ebe a maka akụkọ dị mkpa n'ụwa gbaa gburugburu taa.

  6. E jidela nwa Rob Reiner maka ebubo igbu ọchụ, ka a hụrụ ozu ya na nke nwunye ya

    Nwa nwoke onye na-emepụta ejije aha ya bụ Rob Reiner na nwunye ya bụ Michele Singer Reiner ka e jidere maka ebubo igbu ọchụ.

    A hụrụ ozu Rob Reiner na nwunye ya bụ Michele Singer Reiner n’ụlọ ha dị na Los Angeles.

    Ndị uweojii na Los Angeles kwuru na ha jidere Nick Reiner dị afọ iri atọ na abụọ, ma jichie ya na-enweghị ohere inweta ntọhapụ.

    Nwa Rob nke nwaanyị hụrụ ozu nne na nna ha n’ebe ha nwere ihe makasịa ya ahụ n’ụlọ ha dịka e si gwa CBS News.

  7. Onye a sị so gbagbuo mmadụ 15 n'Ọstrelia esila na nkubi ume kulie, na-agwa ndị uweojii okwu

    Ụlọ mgbasaozi na mba Ọstrelia ekwuola na otu onye n’ime mmadụ abụọ ahụ e jidere maka ebubo ịgbagbu mmadụ ruru iri na ise esila na nkubi ume kulie ma na-agwa ndị uweojii okwu.

    Nwoke ahụ aha ya bu Naveed Akram tetere n’ụlọọgwụ ma na-enye ndị uweojii ọsịsa ihe niile a jụrụ ya.

    Ụlọ mgbasaozi 9News kwuru na nwoke ojiegbe ahụ na ndị uweojii na-ekwu okwu ugbua.

    Cheta na ọ bụ mmadụ abụọ ka a na-arụaka gbagburu ndị mmadụ n’ụbọchị Sonde garaaga na Bondi Beach dị n'Ọstrelia.

    Sajid Akram bụ nna Naveed ka a hụrụ n'ozu n’ebe mkpamkpa ahụ kpara dịka ndị uweojii si kwuo.

    Mana BBC enweteghị ọsịsa n’aka ndị uweojii banyere ihe na-eme ugbua.

  8. Ndị uweojii Imo Steeti anwụchiela nwoke a na-ebo ebubo iji aka tigbuo nwunye ya na Mbaise

    Ndị uweojii si n’isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Ahịazụ Mbaise anwụchiela otu nwoke aha ya bụ Vitalis Nwoko maka ebubo igbu nwunye ya.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye kọọrọ anyị na Maazị Nwoko dị afọ iri ise na asatọ bụ onye Ụmụagba dị n’okpuru ọchịchị Ahịazụ Mbaise n’Imo Steeti.

    Ozi Okoye wepụtara n’ụbọchị Sọnde 14 Disemba 2025 kwuru na a nwụchiri Vitalis Nwoko n’ihi mkpesa nwanne nwunye ya nke nwaanyị nyere.

    Okoye sịrị na nwanne nwunye Maazị Nwoko nyere mkpesa n’ụlọọrụ ndị uweojii, ma kwuo na di nwanne ya nwaanyị tiri nwunye ya ihe oge ha na-ese okwu.

    Oge ndị uweojii mere nnyocha, nwoke ahụ kwuru na nwunye ya dara mgbe ha na-alụ ọgụ n’ụbọchị 11 Disemba, 2025.

    “E bugara ya n’ụlọọgwụ Cecilia Hospital dị n’Ogbe, bụ ebe dọkịta kwupụtara na ọ nwụọla,” ka ndị uweojii sị nwoke ahụ kwuru.

    Ka ọ dị ugbua, e nyefeela nwoke ahụ a na-enyo enyo na ngalaba ndị uweojii State Criminal Investigation Department (SCID) dị n’Owere maka ime nnyocha miri emi nakwa ịkpụpụ ya n’ụlọikpe.

  9. Ndị ojiegbe awakpoola ụlọụka ECWA dị na Kogi Steeti, tọrọ ụfọdụ mmadụ

    Opekatampe otu onye anwụọla, ebe a tọọrọ ụfọdụ ndị ọzọ oge ndị ojiegbe wakporo otu ụlọụka dị na Kogi Steeti.

    N’ụtụtụ Sọnde ka e mere mwakpo ahụ n’otu ngalaba ụlọụka Evangelical Church Winning All (ECWA) dị n’obodo Àaaaz-Kiri n’okpuru ọchịchị Kabba/Bunu.

    Otu onye ọchịchị na Kogi Steeti gwara BBC okwu na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ndị ojiegbe wakporo ụlọụka ahụ oge ha na-efe ofufe ma malite ịkwa ha mgbọ.

    Ọ sịrị na ndị ojiegbe ahụ mechara kpọrọ ụfọdụ mmadụ gara ụka, ndị a na-apụghị ịkọwa ọnụọgụ ha.

    Ka ọ dị, ụfọdụ ụlọmgbasaozi dị na Kogi Steeti ekwupụtala gbasara ụdị mwakpo a n’ụfọdụ akụkụ steeti ahụ, na-enweghị ozi si n’aka gọọmenti iji kwado ya.

    Nke a bụ mwakpo nke abụọ a na-eme na mpaghara ahụ n’ime ọtụtụ izuụka.

    N’izuụka abụọ gara aga ka ndị ojiegbe wakporo ụlọụka dị n’obodo Ejiba, tọrọ ụkọchukwu, nwunye ya na ụfọdụ ndị ụka ahụ.

  10. NMDPRA ajụla inye ọsịsa banyere ebubo Dangote boro ha

    Aliko Dangote bụ onye ji ego achụnta ego ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ Dangote Group kwuru na ọ bụ nrụrụaka dí n’ụlọọrụ Nigerian Midstream and Downstream Petroleum Regulatory Authority (NMDPRA) so emetụta ọnọdụ nrụpụta mmanụ ụgbọala na Naịjirịa.

    Dangote mere ka a mata nke a n'oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'abalị gara aga.

    Dangote si na "etu onyeisi ụlọọrụ NMDPRA bụ Farouk Ahmed si eri ego na ndụ ya gafere ihe onye ọrụ gọọmenti ọbụla nwereike ime”.

    BBC kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ NMDPRA mana o ekweghị ekwu okwu maọbụ nye ọsịsa n’ajụjụ banyere ebubo ahụ Dangote boro onyeisi ha.

    Dangote kpọrọ oku ka e mee nnyocha banyere ebubo o boro Farouk, n’okwu ya “ụlọọrụ na-ahụ maka ndị ọrụ bụ 'Code of Conduct Bureau' maọbụ ngalaba gọọmenti ọbụla na-ebu agha emegide nrụrụaka kwesiri ime nnyocha n’ebubo a”.

    Cheta na NMDPRA adịla na mbụ bo Dangote ebubo sị na ọ chọrọ ka ọ bụrụ naanị ya na-atụ mgbere nrụpụta mmanụ ụgbọala ma kwuo na mmanụ ọ na-arụpụta agaghị ezuoke na Naịjirịa dabere na ya.

    Nnsogbu Dangote na NMDPRA bụ okwu dị kamgbe nke ntọnaala ya bidoro n’ọnụ ahịa a kwesiri ire mmanụ ụgbọala nakwa nkesa mmanụ ahụ.

    Kamgbe ka Naịjirịa na-ere mmanụ agbịdị ma na-atụbata mmanụ ụgbọala mana ụlọọrụ nrụpụta mmanụ ụgbọala nke Dangote chọrọ ị na-azụrụ mmanụ agbịdị jiri ya na-arụpụta mmanụ ụgbọala ma na-ere ya na n’ọnụ ego naịra.

  11. A kwụsịla ụlọakwụkwọ ọbụla na Naịjirịa ịnabata nwataakwụkwọ SS3

    Mịnịstrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Naịjirịa amachiela ụlọakwụkwọ ọbụla ịnabata nwataakwụkwọ ọbụla na-agụ SS3.

    Ihe nke a pụtara bụ na nwataakwụkwọ ọbụla na-agụ SS3 enwghịzi ike ịhapụ ụlọakwụkwọ ya ga banye n’ụlọakwụkwọ ọzọ maka ule Waec.

    Akwụkwọ oziọỌnụ na-ekwuru mịnịstrị ahụ bụ Boriowa Folashade wepụtara, kwuru na nke a bụ iji gbochie mpụ na nrụrụaka n’ule Waec na Neco ma buo agha megide ogige ‘special centre’ juru ebe dị iche iche.

    Folashade kwuru na malite na Septemba 2026, ọ bụ naanị nwataakwụkwọ na-agụ SS1 na SS2 ka ụlọakwụkwọ ọbụla nwereike ịnabata n’ụlọalwụkwọ ha.

    Ọ gara n’ihu dọọ ndị isi ụlọakwụkwọ dị iche iche aka na ntị ka ha rube isi nye iwu a iji kwado mbọ gọọmenti na-agba iji wulite ọnọdụ agụmakwụkwọ ma chụọ nrụrụaka n’ule ọsọ ụkwụ eru ala.

  12. Onye na-ahazi ejije bụ Rob Reiner na nwunye ya Michele anwụọla

    Onye na-ahazi ejije na Hollywood mba Amerịka bụ Rob Reiner na nwunye ya bụ Michele anwụọla n’ụlọ ha dị na Los Angeles, mba Amerịka.

    Ndị ọrụ nchekwa kwuru na ha na-eme nnyocha iji chọpụta ihe gburu nwaamadị ahụ na nwunye ya n’ụbọchị Sọnde 14 Disemba, 2025.

    Ọnụ na-ekwuru ndị ọrụ Los Angeles Fire Department gwara BBC na ha nwetara oku ekwentị maka ọnọdụ gbata gbata n’out ụlọ dị na Brentwood bụ ebe ọtụtụ ndị a ma ama bi.

    Ndị uweojii kwuru ekwughị ihe ọbụla banyere ọnwụ ha maọbụ ihe ọbụla ha hụrụ oge ha ruru ebe ahụ. Mana osote onyeisi ndị uweojii bụ Alan Hamilton kwuru na ozu Rob na Michele dị n’ụlọ ha oge ha rutere.

    Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii kwuru na enweghị onye ọbụla e jidere maọbụ a na-eyo eyo n’aka ya dị n’ọnwụ mmadụ abụọ a ma kwuo na amalitela ime nnyocha zuruoke iji chọpụta ihe gburu ha.

    Rob Reiner malitere ime ihe ejije na 1960s mana ọ malitere iwu ewu na 1970s oge o mere ejije ‘All in The Family’. Ihe ejije ndị ọzọ ọ haziri gụnyere Stand By Me (1986), The Princess Bride (1987), When Harry Met Sally (1989), Misery (1990) na A Few Good Men (1992).

    Rob Reiner gbara afọ 78 ebe nwunye ya Michele gbara afọ 68 tupu ha anwụọ.

  13. A kpọpụtala aha mmadụ abụọ gbagburu mmadụ 15 n’Australia

    Ndị ọrụ nchekwa akpọpụtala aha mmadụ abụọ ndị ji egbe gbagbuo mmadụ iri na ise n’akụkụ mmiri n’ogige nlereanya a kpọrọ ‘Bondi Beach’ dị na mba Ọstrelia.

    Ndị a gụnyere otu nwoke dị afọ iri ise bụ nwụrụ n’ebe ahụ na nwa ya nwoke dị afọ iri abụọ na anọ.

    Ndị ntaakụkọ ime obodo kpọpụtara aha ndị a dịka Sajid Akram na Naveed Akram.

    Ndị ha lekwasịrị anya na-agba egbe ahụ bụ ndị Juu ndị na-eme emume akpọrọ Hanukkah – ndị e gburu gụnyere otu nwata nwaanyị dị afọ iri, onye nkuzi Rabbi bụ nwafọ Briten, onye uweojii larala ezumike nka, na onye ọzọ lụrụ agha Holocaust.

    Praịm mịnịsta mba Ọstrelịa bụ Anthony Albanese kwuru na ọ ga-eme ka e hiwe iwu ikpachi etu ndị mmadụ si ebu egbe.

    Ndị uweojii kwuru na nwoke ahụ nwere egbe nke e nyere ya ikike na ọ bụ maka ịgba nta.

  14. Nwa ọnwa asatọ na otu nwaanyị anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ

    Ihe ọdachi mere n’okporoụzọ Ikorodu n’ụbọchị Sọnde 14 Disemba, 2025 oge nwa ọnwa asatọ na otu nwaanyị nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ.

    Ọdachi a mere na ncherịtaihu Olabode House, tupu Obanikoro dị na mpaghara Ikorodu nke Legọs Steeti.

    Ndị ụlọọrụ Lagos State Traffic Management Agency (LASTMA) kwuru na otu ụgbọala bọọsụ si Palmgrove na-aga Anthony ji nnukwu ọsọ na-agba tupu o chefuo onwe ya.

    Ha kwuru na ụgbọala ahụ gbapụrụ n’okporo ya ma banye n’okporo nke ọzọ. Ọ bụzi ebe ahụ ka ọ gara suo ụgbọala bọọsụ Volkswagen bu ndị njem si Anthony na-aga Palmgrove.

    LASTMA kwuru na ọdachi ahụ butere ọnwụ otu nwaanyị nọ n’ime ụgbọala bọọsụ Volkswagen tinyekwara nwata nwaanyị dị ọnwa asatọ n’ihi nnukwu mmerụahụ ha nwetara.

  15. O nweghi ihe ga-eme ka anyị ghara ime ngagharịiwe n’ihi enweghi nchekwa – NLC

    Joe Ajaero bụ Onyeisi otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ekwuola na ngagharịiwe ha na-akwado ime n’ụbọchị 17 Disemba, 2025 ga-aga n’ihu.

    O kwuru nke a mgbe ọ gara njem nleta n’ụlọ Onyeisi otu jikọtara ndị Gọvanọ Steeti mpaghara Ugwu Naịjirịa bụ Inuwa Yahaya nke Gombe Steeti.

    Ajaero kwuru na ngagharịiwe ahụ ga-eme ka gọọmenti teta n’ụra ma buo agha megide enweghi nchekwa nke na-emetụta mmadụ niile ma onye ukwu ma onye nta.

    O kwuru na ndị ekperima nakwa mpụ ndị ọzọ a na-eme na Naịjirịa bụ ihe ọgbara ọhụrụ n’omenala na-achịkwa Naịjirịa na e kwesịrị ịgbakọta aka ọnụ ma katọọ ya ma kwuo na ọ bụ akụkọ ọjọọ megide obodo.

    O kwuru na e nweghi nchekwa a na-emebi akụnaụba obodo ma na-akpagbu ohere Naịjirịa nwere ịnabata ndị na-abịa azụ ahịa si ofesi ma n’ụlọ.

    Ndị otu a nọọrọ n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Disemba kwuo na ha ga-eme ngagharịiwe n’onodo niile megide ọnọdụ enweghi ezi nchekwa.

    Ha katọrọ ntọrị a na-atọrị ụmụakwụkwọ ma ogbugbu a na-egbu ụfọdụ ndị nkuzi na ndị nlekọta ha.

  16. Ndị uweojii ekwuola na ndị ojiegbe gbagburu ihe ruru mmadụ 9 na Bondi Beach mba Ọstrelịa

    Ndị uweojii New South Wales ekwuola na mmadụ 9 anwụọla oge a gbara egbe n’ogige Bondi Beach dị na mba Ọstrelịa ebe mmadụ 11 dnị ọzọ gụnyere ndị uweojii abụọ merụrụ ahụ.

    Otu onye ojiegbe ahụ gburu ndị ahụ nwụrụ ebe onye otu ya merụrụ nnukwu ahụ nọ n’ụlọọwgụ.

    Praịm Mịnista Anthony Albanese akọwaala ihe mere dịka nnukwu ọdachi.

    Anyị ga na-ewetere gị akụkọ a dịka ọ na-abịa.

  17. Ndị uweojii na-achọ onye gbagburu mmadụ abụọ na mahadum Brown University mba Amerịka

    Ndị uweojii ekwuola na ha na-achọ nwaamadị e kwuru na ọ gbagburu ụmụakwụkwọ mmadụ abụọ ma merụọ mmadụ itoolu ọzọ ahụ na mahadum Brown University Rhode Island.

    Akụkọ kwuru na nwaamadị ahụ malitere ịgba egbe n’ebe ụmụakwụkwọ mahadum ahụ na-ele ule n’ụbọchị Satọde 13 Disemba, 2025.

    Ndị uweojii machiri mahadum ahụ kachasị ochie ma bụrụ ọkaibe na mba Amerịka ma gbochie ndị mmadụ ịbata n’ime ya dịka ha na-achọ onye kpara mkpa mkpa ahụ.

    A gwala ụmụakwụkwọ mahadum ahụ ka ha chekwaa onwe ruo oge ndị uweojii bịara kpọpụ ha.

    Ndị ọrụ ụlọọgwụ Rhode Island kwuru na ndị ahụ merụrụ ahụ na-enweta nleta.

    Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii ekwubeghị aha mmadụ abụọ ahụ nwụrụ.

  18. Ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ maka ebubo egbe a gbara Bondi Beach na mba Ọstrelia

    Ndị uweojii New South Wales mba Ọstrelịa ekwuola na ha anwụchiela mmadụ abụọ maka ebubo na aka ha dị n’egbe ahụ a gbara na Bondi Beach dịka a ka na-eme nnyocha zuru oke.

    Ozi ndị uweojii a wepụtara n’akara X ha mere ka o doo anya na ha na-eme nnyocha n’ihe ahụ mere ma dọọ ọhanaeze aka na ntị ka ha ghara ịga n’ogige Bondi Beach ma gwa ndị nọ ebe ahụ ugbua ka ha chekwaa onwe.

    Ọnụ na-ekwuru Praịm mịnịsta Anthony Albanese kwuru na ha maara maka ihe mere n’ebe ahụ ma kọwaa na ọ bụ ihe na-aga n’ihu ugbua.

    Ndị bi n’akụkụ ebe ahụ kwuru na ha nụrụ ụọ̄a egbe ma kwuo na ha amaghị ka e nwere onye merụ®ụ ahụ.

  19. Ụtụtụ ọma Igbi ndị ọma

    Nnọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 14 Disemba, 2025 ahịa Nkwo.

    Ọfọ anyị bụ ka ihe ọma meere gị na ezinaụlọ gị n'izuụka ọhụrụ a anyị banyere n'ime ya.

    Nnọọ.

  20. A nwụchiela ụmụ Naijiria 32 na Gana maka ihiwe ọdọ 'yahoo-yahoo'

    Ngalaba na-ebu agha megide mpụ intanet nke mba Gana bụ 'Cyber Security Authority' (CSA),Ghana, na ndị ọrụ nchekwa mba ahụ agbakọla aka nwụchie ụmụamala Naijiria 32 maka ebubo ihiwe u ọdọ mpụ wayo intanet na Tuba dị na mpaghara Kasoa dị na Gana.

    N'ozi ụlọọrụ ahụ wepụtara n'aka ọbaozi X ha, ha kwuru na ha gara ije ahụ n'ụtụtụ Satode ma nweta igwe intanet dị iche iche gụnyere kọpụta mpanụkwụ 31 na ekwentị 15 n'aka ndị a na na-enyo enyo bụ nke ha chere ha ji akpa mkpamkpa oge.

    Ha kwuru na ha ejichiela ndị ahụ n'ogige ha .dịka ha na-aga n'ihu ime nnyocha.

    Ndị ọrụ nchekwa mba ahụ ṅụrụ iyi "ichekwa ọnọdụ intanet na mba iji kusaa nkata ndị ekperima intanet".