Mba Rọshịa ewelitela
aka n’ogbunigwe ha na-atụ na mpaghara ndịda Yukren bụ Odesa, nke mebiri ọtụtụ
akụrụngwa ọkụ latrik ma na-achọ imebi akụrụngwa njem ụgbọmmiri.
Osote Praịm
Minista mba Yukren bụ Oleksiy Kuleba kwuru na Mosko kpachara anya na
mwakpo a ha na-eme ma kwuo na ebe agha na-elekwasị anya ugbua bụ n’Odesa.
Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky kwuru na ọtụtụ
mwakpo a Mosko na-eme ha bụ iji gbochie ha emela njem n’ọgbọmmiri.
Na mbido ọnwa Disemba, Onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin
yiri egwu na ọ ga-emebi okporo njem ụgbọmmiri ndị Yukren iji megwara n’ogbunigwe
ha tụrụ ụgbọmmiri tanka ndị Rọshịa
a kpọrọ ‘shadow fleet’ n’osimiri ojii.
‘Shadow
fleet’ bụ ọtụtụ ụgbọmmiri Rọshịa na-eji agafe mpagara Yurope maka mmachi e nyere
ha kamgbe afọ 2022 ha wakporo mba Yukren.
Na mgbede Mọnde,
Rọshịa tụrụ ọtụtụ ogbunigwe n’ọdọmmiri Odesa mebie ụgbọmmiri mmadụ nwee dịka gọvanọ
mpaghara ahụ si kwuo.
Nke a so n’ọtụtụ
ogbunigwe a tụrụla na mpaghara ahụ kamgbe ụbọchị ole ma ole nke mebirila ọtụtụ
akụrụngwa ọkụ latrik ma merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ.
N’abalị Sọnde,
ogbunigwe mebiri ụdọ ọkụ latrik na-enye mmadụ puku 120 ọkụ ma gbaa ọdọụgbọmmiri
ọkụ, mebie ọtụtụ ngwaahịa dịka mmanụ nri na flọ.
N’izuụka
gara aga, ogbunigwe gbara n’ọdọụgbọmmiri Pivdenniy dị n’Ọwụwa Anyanwụ
Odesa gburu mmadụ asatọ ma merụọ mmadụ iri atọ ahụ.