Ọkụ gbara n'ụlọ oringo dị na mba India ataala isi mmadụ 25
Ọkụ gbara n’ụlọ ebe a na-agba oringo a ma ama dị na mpaghara obodo Goa nke mba India egbuola mmadu iri abụọ na ise dịka ndị ọrụ obodo si kwuo.
Ọtụtụ ndị nke metụtara bụ ndị ọrụ ụlọ oringo ahụ a kpọrọ ‘Birch by Romeo Lane nightclub’, nke dị n’ọnụ mmiri a ma ama. Ndị bịara njem nlereanya sokwa na ndị nwụrụ anwụ.
Ndị uweojii kwuru na udummanụ gaasị gbawara n’usekwu ụlọ oringo ahụ, nke mere nnukwu ọkụ jiri malite ịgba n’ebe ahụ n’etiti abalị Satọde.
N’ụtụtụ Sọnde, onye ọrụ gọọmenti kwuru na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ anwụ esila na mmadụ iri abụọ na atọ gbagoo elu. Ndị hụrụ ka ihe a si mee gwara BBC na ọkụ gbara n’ụlọ oringp ahụ bụ ihe nkụja.
“Ọkụ ahụ kachasị agba na gburu gburu usekwu n’ala,” nke bụ ihe Alok Kumar, onyeisi ndị uweojii kwuru.
Ọtụtụ ozu ndị a hụrụ bụ n’akụkụ usekwu “nke gosiri na ndị ahụ bụ ndị ọrụ ụlọ oringo ahụ”, ka Maazị Alok Kumar gbakwụnyere.
Onye mịnịsta obodo Goa bụ Pramod Sawant gwara ndị ntaakụkọ na mmadụ atọ nwụrụ na mmerụ ahụ ọkụ gbara ha ebe ndị ọzọ nwụrụ site n’ikuku anwụrụọkụ kochiri ha ime na anya.
O kwuru na mmadụ anọ bịara njem nlereanya nwụrụ anwụ mana ọ kọwaghị mba ha si maọbụ mmadụ ole ha dị.
Ndị mmadụ jupụtara n’ụlọ Oringo ahụ maka na ọ na onye ngwakọta egwu nke Bollywood a ma na-eti egwu ebe ahụ.
Mpaghara ebe ọkụ ahụ gbara bụ ebe e nwere ọtụtụ mkpori ndụ n’oge abalị.